Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 3/15 p. 30-32
  • Dịrị “Ọcha n’Obi” n’Oge A Dị Oké Egwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Dịrị “Ọcha n’Obi” n’Oge A Dị Oké Egwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka “Ịdị Ọcha n’Obi” Pụtara?
  • ‘Ịdị Ọcha n’Obi’ Adịghị Mfe
  • Otú Ịdị Ọcha n’Obi Ga-esi Mee Ka Anyị Merie Ọchịchọ Anụ Ahụ́
  • Otú “Ịdị Ọcha n’Obi” Ga-esi Nyere Anyị Aka Mgbe Anyị Nwere Nsogbu
  • Nweta Obi nke Dị Ka Jehova Si Chọọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ì Nwere ‘Obi Ị Ga-eji Mara’ Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Jiri Obi Gị Dum Na-ejere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Chebe Obi Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 3/15 p. 30-32

Dịrị “Ọcha n’Obi” n’Oge A Dị Oké Egwu

ODEAKỤKỌ Chọọchị Katọlik aha ya bụ Vitorio Mesori kwuru banyere nsogbu dị iche iche ịkwa iko kpatara na Chọọchị Katọlik n’Ịtali n’oge na-adịbeghị anya, sị: “O doro ewu na ọkụkọ anya na ịkwa iko bụ nsogbu Chọọchị Katọlik nwere taa. Ọ bụrụgodị na ndị ụkọchukwu amalite ịlụ nwaanyị, nsogbu a agaghị akwụsị n’ihi na mmadụ asatọ n’ime mmadụ iri ọ bụla n’ime ndị ahụ kwara iko bụ ndị ikom na ndị ikom, ya bụ, ndị ụkọchukwu na ndị ikom torola eto nakwa ha na ụmụaka ndị nwoke.”—Akwụkwọ akụkọ bụ́ La Stampa.

Ihe ọjọọ nke jupụtara ebe niile na-egosi n’ezie na anyị nọ “n’oge ikpeazụ” nke usoro ihe a. (2 Tim. 3:1-5) Dị ka akụkọ na-egosi, omume rụrụ arụ na-eduhie ma ndị nkịtị ma ndị sị na ha bụ ụmụ Chineke. Ha na-eme ihe rụrụ arụ n’ihi na obi ha rụrụ arụ. (Efe. 2:2) Ka a sịkwa ihe Jizọs ji kwuo na ọ bụ “n’obi ka echiche ọjọọ, igbu ọchụ, ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, ịkwa iko, izu ohi, ịgba akaebe ụgha, nkwulu, si apụta.” (Mat. 15:19) N’agbanyeghị nke a, Jehova Chineke chọrọ ka ndị ohu ya hụ “ịdị ọcha n’obi n’anya.” (Ilu 22:11) Ya mere, olee otú Onye Kraịst nwere ike isi dị ọcha n’obi n’oge ikpeazụ a dị oké egwu?

Gịnị Ka “Ịdị Ọcha n’Obi” Pụtara?

A na-ejikarị ‘obi’ eme ihe atụ na Baịbụl. Otu akwụkwọ kwuru na mgbe ọ bụla Baịbụl kwuru okwu banyere obi na ihe ọ na-ekwu bụ “ihe mmadụ bụ n’ime” nakwa na “ọ bụ ya bụ ebe kacha dịrị Chineke mkpa n’ahụ́ mmadụ, ọ bụ na ya ka adịm ná mma mmadụ na Chineke na-agbado ụkwụ, ọ bụkwa ya na-enyere mmadụ aka ịkpa ezigbo àgwà.” Obi anyị na-anọchite anya ihe anyị bụ n’ime. Akwụkwọ a anyị kwuru okwu ya ná mbụ na-egosi na Jehova na-enyocha obi ndị ohu ya, nakwa na ọ na-enwe mmasị n’ihe dị n’ime ya.—1 Pita 3:4.

Na Baịbụl, “ọcha” nwere ike ịpụta mmadụ ịdị ọcha n’elu ahụ́. Ọ pụtakwara ihe a na-emerụghị emerụ. Mgbe Jizọs na-ezi Ozizi Elu Ugwu, ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị ọcha n’obi.” Ọ nọ na-ekwu banyere ndị dị ọcha n’ime. (Mat. 5:8) Omume ha, ọchịchọ ha, na otú ha si eche echiche, dị ọcha. Ha ji obi ha dum hụ Jehova n’anya n’ihi na ha nwere obi ụtọ maka ihe ọ na-emere ha, ha abụghịkwa ndị ihu abụọ. (Luk 10:27) Ọ̀ bụ na ị chọghị ịdị ọcha?

‘Ịdị Ọcha n’Obi’ Adịghị Mfe

‘Aka ohu Jehova nakwa obi ya’ kwesịrị ‘ịdị ọcha.’ (Ọma 24:3, 4) Ma, ọ na-esiwanyere ndị ohu Chineke ike ‘ịdị ọcha n’obi’ taa. Setan na ụwa ọ na-achị, nakwa anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè, na-agbasi mgba ike ịhụ na anyị na Jehova adịghị ná mma. Anyị kwesịrị “ịdị ọcha n’obi,” nọgidesiekwa ike na-adị ya ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịgbaso ha mgba. Nke a ga-echebe anyị ma mee ka anyị na Chineke nọgide na-abụ enyi. Olee otú anyị nwere ike isi nọgide na-enwe obi dị ọcha?

Akwụkwọ Hibru isi atọ amaokwu iri na abụọ dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ụmụnna m, lezienụ anya ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ịmalite inwe ajọ obi nke na-enweghị okwukwe site n’ịhapụ Chineke dị ndụ.” Anyị agaghị anọgide na-adị “ọcha n’obi” ma ọ bụrụ na anyị enwee ajọ obi nke “na-enweghị okwukwe.” Olee echiche dị iche iche Setan bụ́ Ekwensu na-agbasa iji mee ka ndị mmadụ ghara inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ? Ha gụnyere ozizi ndị mmadụ na-ezi na mmadụ si n’enwe, okwu ha na-ekwu na onye ọ bula nweere onwe ya ịkpa àgwà otú dị ya mma ma ọ bụkwanụ ikpe okpukpe otú o si chọọ, nakwa okwukwe ndị ụfọdụ na-ekweghị na ọ bụ ike mmụọ nsọ ka e ji dee Akwụkwọ Nsọ. Anyị ekwesịghị ikwe ka ụdị echiche ọjọọ a duhie anyị. (Kọl. 2:8) Ihe ndị ga-akacha enyere anyị aka ịgbaso echiche ọjọọ a mgba bụ ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị nakwa ịtụgharị uche na ya nke ọma. Ọ bụrụ na anyị amara Okwu Chineke nke ọma, anyị ga-ahụkwu Jehova n’anya, nwekwuokwa obi ụtọ maka otú o si emeso ndị mmadụ ihe. Anyị aghaghị inwe ịhụnanya na obi ụtọ dị otú a ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịjụ ozizi ụgha ndị ahụ ma mee ka okwukwe anyị nwere n’ebe Jehova nọ sikwuo ike ka anyị wee nwee ike nọgide na-adị ọcha n’obi.—1 Tim. 1:3-5.

Otú Ịdị Ọcha n’Obi Ga-esi Mee Ka Anyị Merie Ọchịchọ Anụ Ahụ́

Ihe ọzọ nke nwere ike ime ka anyị ghara “ịdị ọcha n’obi” bụ ọchịchọ anụ ahụ́ na ịchụ akụnụba. (1 Jọn 2:15, 16) Ịhụ ego n’anya ma ọ bụ ịchọ ịkpakọwa ihe niile nwere ike imerụ obi Onye Kraịst wee mee ka ọ malite imebi iwu Chineke. Ụfọdụ ndị anaghị akwụwa aka ọtọ n’ebe ha na-arụ ọrụ, ụfọdụ na-aghọgbu ndị ọzọ ma ọ bụ na-ezudị ohi.—1 Tim. 6:9, 10.

Ma, ọ bụrụ na anyị na-atụ egwu ime ihe na-adịghị Jehova mma wee hụ ikpe ziri ezi n’anya, kpebiekwa na anyị agaghị eme ihe ga-enye akọnuche anyị nsogbu, anyị na-egosi na anyị hụrụ “ịdị ọcha n’obi” n’anya. Ịhụnanya a ga-eme ka anyị nọgide “na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.” (Hib. 13:18) Ndị mmadụ nwere ike na-ekwu okwu ọma banyere anyị ma ọ bụrụ na anyị na-akwụwa aka ọtọ. Emilio, bụ́ Onyeàmà Jehova bụ́ onye Ịtali, onye na-anya ụgbọala n’otu ụlọ ọrụ nke nwere ọtụtụ ụgbọala ha ji ebu ndị mmadụ, tụtụtara akpa nke ihe ha ka iri puku naịra itoolu na isi, narị naịra ise na iri isii dị na ya. Ọ tụrụ ndị ọrụ ibe ya n’anya na o nyere onyeisi ọrụ ya akpa ahụ, bụ́ onye mechara nye ya onye nwe ya. Ihe a Emilio mere masịrị ụfọdụ n’ime ndị ọrụ ibe ya nke mere ka ha malite inwe mmasị na Baịbụl, e wee malite ịmụrụ ha ihe. Nke a mere ka mmadụ asaa si n’ezinụlọ abụọ ghọọ Ndịàmà Jehova. N’ezie, mmadụ iji obi ọcha na-akwụwa aka ọtọ nwere ike ime ka ndị ọzọ malite ito Chineke.—Taị. 2:10.

Ihe ọzọkwa nke nwere ike ime ka obi Onye Kraịst ghara ịdị ọcha bụ otú ndị ọzọ si ele mmekọahụ rụrụ arụ anya. Obi Onye Kraịst nwere ike kwụsị ịdị ọcha ma ya lewe mmekọahụ anya otú ọtụtụ ndị si ele ya anya. Ha na-ewere mmekọahụ nke ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụkwanụ nke ndị lụrụla alụ, nakwa nwoke na nwoke inwe mmekọahụ, dị ka ihe ziri ezi anya. Onye na-akwa iko nwere ike ịna-ezochi ihe ọ na-eme wee na-ebi ndụ ihu abụọ. Nke ahụ anaghị egosi na onye ahụ dị “ọcha n’obi.”

E mere Gebriele baptizim mgbe ọ dị afọ iri na ise, ọ malitekwara ịsụ ụzọ ozugbo ahụ. Ma, ka oge na-aga, ọ malitere iso ndị enyi ya na-aga ebe a na-eri oriri na nkwari n’abalị. (Ọma 26:4) Mgbe ahụ ka ọ malitere ibi ndụ rụrụ arụ nakwa ndụ ihu abụọ, bụ́ nke mere ka a chụọ ya n’ọgbakọ. Ahụhụ ahụ Jehova nyere ya mere ka o chebara onwe ya echiche. Gebriele chetara ihe mere, wee sị: “M malitere ime ihe niile m na-ejitụghị kpọrọ ihe na mbụ. M malitere ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị, wee na-anụ ihe Jehova na-ekwu. M malitekwara ịgụ akwụkwọ dị iche iche ọgbakọ Jehova bipụtara. Mgbe ahụ ka m bidoro ịhụ uru dị n’inwe ọmụmụ ihe onwe onye, nakwa otú ịgụ Baịbụl na isi n’ala ala obi na-ekpe ekpere si eme ka okwukwe mmadụ sie ike.” Ihe a niile mere ka Gebriele kwụsị omume rụrụ arụ wee lọghachi n’ọgbakọ.

Ugbu a, Gebriele amalitela ịsụ ụzọ ọzọ, ya na nwunye ya. Ihe a anyị kọrọ banyere Gebriele na-egosi otú ịmụ Baịbụl nakwa akwụkwọ dị iche iche “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-ebipụta nwere ike isi nyere mmadụ aka ịdị ọcha n’obi wee jụ omume rụrụ arụ.—Mat. 24:45; Ọma 143:10.

Otú “Ịdị Ọcha n’Obi” Ga-esi Nyere Anyị Aka Mgbe Anyị Nwere Nsogbu

Mkpagbu, ụkọ ego, na ọrịa ọjọọ, na-akụda ụfọdụ n’ime ndị ohu Chineke mmụọ. Nke a nwekwara ike ime ka ha ghara ịdị ọcha n’obi. Ụdị ihe a mere Eze Devid. Ọ sịrị: “Ike na-agwụkwa mmụọ m n’ime m; obi m adawo mbà n’ime m.” (Ọma 143:4) Olee ihe nyeere ya aka imeri nke a? Devid chetara otú Chineke si emeso ndị ohu ya ihe, chetakwa otú o sirila napụta ya. Ọ tụgharịrị uche n’ihe Jehova merela n’ihi aha ukwu ya. Devid tụgharịrị uche n’ọrụ dị iche iche Chineke rụrụla. (Ọma 143:5) Ọ bụrụ na anyị na-eme ka Devid, wee na-atụgharị uche banyere onye kere anyị na ihe niile o meere anyị, na ndị nke ọ ka na-emere anyị, anyị ga-enwe ike iguzosi ike mgbe anyị nọ ná nsogbu.

Mgbe e mejọrọ anyị, ma ọ bụkwanụ mgbe anyị chere na e mejọrọ anyị, iwe nwere ike iwe anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-eche banyere nke a mgbe niile, o nwere ike ime ka anyị na-eche ihe na-adịghị mma banyere ụmụnna anyị. Anyị nwere ike izewe ndị ọzọ eze wee na-agara onwe anyị. Ma, nke a ọ̀ na-egosi na anyị chọrọ ịnọgide na-adị “ọcha n’obi”? O doro anya na otu n’ime ihe mere anyị ji adị ọcha n’obi bụ ka anyị mara otú anyị ga-esi na-emeso ụmụnna anyị, marakwa ihe anyị ga-eme ma anyị na ha see okwu.

Ebe ọ bụ na anyị bụ́ ezigbo Ndị Kraịst “hụrụ ịdị ọcha n’obi n’anya,” anyị kwesịrị ịdị iche n’ụwa a nke omume rụrụ arụ na-arịwanye elu na ya. Anyị na-ebi ndụ dị mma n’ihi na obi ruru anyị ala maka na anyị na-eme uche Chineke. Nke ka nke bụ na anyị na Onye kere anyị, bụ́ Jehova Chineke, dị n’ezigbo mma, bụ́ onye hụrụ “ndị obi ha dị ọcha” n’anya. (Ọma 73:1) N’eziokwu, anyị nwere ike iso ná ndị ga-enwe obi ụtọ n’ihi na, dị ka Jizọs kwere ná nkwa, “ha ga-ahụ Chineke,” bụ́ onye na-enyere ndị dị “ọcha n’obi” aka.—Mat. 5:8.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya