Chọọnụ Ndị Obi Ha Ziri Ezi Maka Ndụ Ebighị Ebi
“Ha wee kwere na Jisọs, ka ha hà, bụ́ ndị e doro ịnata ndụ ebighị ebi.”—ỌRỤ 13:48.
1. N’ihe banyere obi mmadụ, ikike dị aṅaa ka Jehova nwere?
JEHOVA CHINEKE pụrụ ịmata ihe dị n’obi mmadụ. E mere ka nke a pụta ìhè mgbe onye amụma bụ Samuel jere ite nwa Jesi mmanụ dị ka eze Israel. Mgbe ọ hụrụ Elaịab, Samuel “wee sị, N’ezie, ọ nọ n’ihu Jehova, bụ́ onye nke ya e tere mmanụ. Ma Jehova sịrị Samuel, Elegidela ihu ya anya, elegidekwala ogologo nke ịdị elu ya; n’ihi na ajụwo m ya: n’ihi na Jehova adịghị ahụ dị ka mmadụ si ahụ; n’ihi na mmadụ na-ele ihe anya n’ahụ, ma Jehova na-ele obi.” E wee duzie Samuel ite Devid mmanụ, onye gosipụtara onwe ya ịbụ onye ‘dị ka obi Chineke si chọọ.’—1 Samuel 13:13, 14; 16:4-13.
2. Gịnị gbanyere mkpọrọgwụ n’ime obi ihe atụ nke mmadụ, otú a kwa, gịnị ka anyị na-agụ banyere nke a n’ime Akwụkwọ nsọ?
2 Mmadụ na-egosipụta otu àgwà pụtara ìhè. Ọ na-enwe otu akparamagwa nke gbanyere mkpọrọgwụ n’obi ihe atụ ya. (Matiu 12:34, 35; 15:18-20) Otú a, anyị na-agụ banyere mmadụ onye ọ bụ “nanị agha ka obi ya bụ.” (Abụ Ọma 55:21) A gwara anyị na “onye na-enwe ọnụma hie nne na-ejehie hie nne.” Anyị na-agụkwa, sị: “E nwere ndị enyi ọ na-amasị ibibirịta onwe ha, ma e nwere enyi nke na-arapara n’ahụ karịa nwanne.” (Ilu 18:24, NW; 29:22) Ọ bụ ihe obi ụtọ na ọtụtụ ndị na-egosipụta onwe ha ịbụ ndị dị ka ndị Jentaịl ahụ nọ n’Antiọk nke Pisidia n’oge ochie. Mgbe ha nụrụ banyere ndokwa Jehova mere maka nzọpụta, “ha ṅụrịa, nyekwa okwu [“Jehova,” NW] Chineke otuto: ha wee kwere na Jisọs, ka ha hà, bụ́ ndị e doro ịnata ndụ ebighị ebi.”—Ọrụ 13:44-48.
Ndị Kwere Ekwe Bụ Ndị “Dị Ọcha n’Obi”
3, 4. (a) Olee ndị bụ ndị dị ọcha n’obi? (b) Olee ụzọ ndị ahụ dị ọcha n’obi si na-ahụ Chineke?
3 Ndị ahụ kwere ekwe n’Antiọk ghọrọ ndị Kraịst e mere baptism, ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ime ha pụkwara iji okwu Jisọs ahụ mee ihe banyere onwe ha, nke bụ: “Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị ndị dị ọcha n’obi: n’ihi na ndị ahụ ga-ahụ Chineke.” (Matiu 5:8) Ma olee ndị bụ “ndị dị ọcha n’obi”? Oleekwa otú ha si ‘na-ahụ Chineke’?
4 Ndị dị ọcha n’obi dị ọcha n’ime. Ịdị ọcha nke ha bụ nke inwe obi ekele, mmetụta ịhụnanya, ọchịchọ, na mkpali. (1 Timoti 1:5) Ha na-ahụ Chineke ugbu a n’echiche nke bụ na ha na-ahụta ka ọ na-emere ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe ihe dị iche iche. (Tụlee Ọpụpụ 33:20; Job 19:26; 42:5.) Okwu Grik ahụ a sụgharịrị n’ebe a ịbụ ‘hụ’ pụtakwara “iji uche wee hụ, ịghọta, ịmata.” Ebe ọ bụ na Jisọs gosipụtara ụdị onye Chineke bụ n’ụzọ zuru okè, “ndị dị ọcha n’obi” na-enwe nghọta nke ọdịdị onye ahụ, bụ́ ndị nwere okwukwe na Kraịst nakwa n’àjà mkpuchi mmehie ọ chụrụ, ha na-enweta mgbaghara maka mmehie ha, ha nwekwara ike ife Chineke n’ụzọ ọ na-anara nke ọma. (Jọn 14:7-9; Ndị Efesọs 1:7) Nye ndị e tere mmanụ, ịhụ Chineke na-eru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu mgbe ha bilitere n’ọnwụ gaa n’eluigwe, bụ́ ebe ha ga-ahụ Chineke na Kraịst n’ezie. (2 Ndị Kọrint 1:21, 22; 1 Jọn 3:2) Ma ịhụ Chineke site n’ezi ihe ọmụma na ezi ofufe kwere omume nye ndị nile dị ọcha n’obi. (Abụ Ọma 24:3, 4; 1 Jọn 3:6; 3 Jọn 11) Ha nwere obi ziri ezi maka ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ bụ n’elu ala nke bụ paradaịs.—Luk 23:43; 1 Ndị Kọrint 15:50-57; 1 Pita 1:3-5.
5. Ọ̀ bụ nanị n’ụzọ dị aṅaa ka mmadụ pụrụ isi ghọọ onye kwere ekwe na ezi onye na-eso ụzọ Jisọs Kraịst?
5 Ndị ahụ na-enweghị obi ziri ezi maka ndụ ebighị ebi agaghị aghọ ndị kwere ekwe. O kweghị ha omume inwe okwukwe. (2 Ndị Tesalọnaịka 3:2) Karịsịa, ọ dịghị onye pụrụ ịghọ ezi onye na-eso ụzọ Jisọs Kraịst ọ gwụlakwa ma ọ bụ onye a pụrụ izi ihe, Jehova, onye na-ahụ ihe dị n’obi, ga-adọtakwa onye ahụ. (Jọn 6:41-47) N’eziokwu, n’ikwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, Ndịàmà Jehova adịghị ebu ụzọ kpebie ihe onye ọ bụla bụ. Ha apụghị ịhụ ihe dị n’obi, kama ha na-ahapụ ka Chineke nke na-ahụ n’anya kpebie ihe ga-emenụ.
6. (a) Gịnị ka e kwuworo banyere izute ndị mmadụ ihu na ihu n’ije ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ? (b) Ndokwa dịgasị aṅaa ka e meworo iji nyere Ndịàmà Jehova aka ịchọta ndị ahụ obi ha ziri ezi maka ndụ ebighị ebi?
6 Otu onye ọkà mmụta ekwuwo n’ụzọ ziri ezi, sị: “[Pọl] kụziri eziokwu ahụ n’ihu ọha na site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ọ bụghị nanị site n’ikpo okwu, kamakwa nye ndị mmadụ o zutere n’otu n’otu, o kwusara Kraịst. Ọtụtụ mgbe, izute mmadụ ihu na ihu na-adị irè nke ukwuu karịa ụzọ ime ihe ọ bụla ọzọ n’irute ná mkpụrụ obi ndị mmadụ.” (August Van Ryn) Akwụkwọ ndị dị ka Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ Ije-ozi Ọchichi-Chineke, Reasoning From the Scriptures, na Ozi Alaeze Anyị na-enyere Ndịàmà Jehova aka ikwu okwu na iji ohere ndị ha nwere izute ndị mmadụ n’otu n’otu mee ihe n’ụzọ kasị mma n’ozi ubi ha. Ihe ndị ọzọ na-enyekwa aka bụ ihe ngosi ndị a na-eme ná Nzukọ Ije Ozi na ndụmọdụ a na-enye n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ndị na-eje ụlọ akwụkwọ ahụ na-anata ọzụzụ bara uru n’ọdịdị okwu ndị dị ka okwu mmeghe ndị dị mma, iji Akwụkwọ nsọ mee ihe nke ọma, nkọwapụta nwere ezi izu, ịrụ ụka doro anya, iji ihe atụ dị iche iche na-eme ihe, na okwu mmechi ndị dị irè. Ka anyị hụ ụzọ Bible na-esi atụkwasị ihe n’ọzụzụ nke a nke pụrụ ime ka ndị Chineke bụrụ ndị dị irè karị ka ha na-achọ ndị ahụ obi ha ziri ezi maka ndụ ebighị ebi.
Okwu Mmeghe Ndị Na-akpali Iche Echiche
7. Gịnị ka okwu mmeghe nke Jisọs n’Ozizi Elu Ugwu ahụ na-akụziri anyị banyere okwu mmeghe?
7 Site n’ihe nlereanya nke Jisọs, ndị ahụ na-akwadebe maka ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ pụrụ ịmụta ihe banyere okwu mmeghe ndị na-akpali mmasị. N’ịmalite Ozizi Elu Ugwu ya, o jiri okwu ahụ bụ “obi ụtọ” mee ihe ugbo itoolu. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha, ebe alaeze eluigwe bụ nke ha. . . . Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, ebe ha ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:3-12, NW) Ahịrịokwu ndị ahụ guzo kwem, dookwa anya. O dokwara anya na okwu mmeghe ahụ kpaliri mmasị, nweekwa mmetụta n’ebe ndị na-ege ya ntị nọ, n’ihi na ọ̀ dị onye ọ na-agaghị amasị inwe obi ụtọ?
8. N’ije ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ, olee ụzọ a pụrụ isi malite okwu n’isiokwu nkwurịta okwu?
8 E kwesịrị ikwu okwu mmeghe n’isiokwu nkwurịta okwu ọ bụla e ji eme ihe n’ozi ụlọ n’ụlọ n’ụzọ ziri ezi, dịkwa ụtọ. Ma ọ dịghị onye kwesịrị iji okwu mmeghe ndị na-anwụ ibubo n’ahụ, dị ka, “Ana m ewetara gị ozi nke sitere na mbara igwe.” Ọ bụ ezie na ozi ọma ahụ sitere n’eluigwe, ma okwu mmeghe dị otú ahụ pụkwara ime ka onye nwe ụlọ chee ma à ga-ewere ihe Onyeàmà ahụ na-ekwu dị ka ihe dị mkpa ma ọ bụ na a ga-eme ka ọ pụọ ngwa ngwa.
Ikwuzi Okwu nke Chineke
9. (a) Olee ụzọ e kwesịrị isi webata akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche, gụọ ha, kọwaakwa ha, mgbe a na-eje ozi? (b) Ihe nlereanya dị aṅaa ka e hotara iji gosi otú Jisọs si jiri ajụjụ mee ihe?
9 N’ozi ubi, dịkwa ka mgbe a nọ n’ikpo okwu, e kwesịrị ịkpọpụta akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche n’ụzọ dị mma, jiri imesi ihe ike gụọ ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị, kọwaakwa ha n’ụzọ doro anya, nke zikwara ezi. Ajụjụ ndị na-eme ka onye nwe ụlọ chee echiche banyere isi ihe ndị dị n’Akwụkwọ nsọ pụkwara inye aka. Ọzọkwa, ụzọ ndị Jisọs si mee ihe na-ezikwa anyị ihe. N’otu mgbe, otu nwoke nke maara Iwu Mosis nke ọma, jụrụ ya, sị: “Onye ozizi, ọ̀ bụ gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?” Ná nzaghachi Jisọs jụrụ, sị: “Gịnị ka e deworo n’akwụkwọ iwu? Ì si aṅaa agụ ya?” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jisọs maara na nke a bụ ajụjụ nwoke ahụ pụrụ ịza. Ọ zara nke ọma, na-asị: “Hụ Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] Chineke gị n’anya site n’obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, na ike gị dum, na uche gị dum; hụkwa onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” Nke a dujere Jisọs n’ịja ya mma, mkparịta ụka ahụ gakwara n’ihu.—Luk 10:25-37.
10. Gịnị ka mmadụ kwesịrị iburu n’uche n’ihe banyere isiokwu nkwurịta okwu ya, gịnịkwa ka e kwesịrị izere mgbe a na-ajụ ndị nwe ụlọ ajụjụ?
10 Ndị ahụ na-agba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ kwesịrị ime ka isi ihe dị n’isiokwu nkwurịta okwu ha pụta ìhè, meekwa ka ọ pụta ìhè, bụ́ ihe mere ha ji na-agụ akụkụ Bible ndị e ji ewulite isiokwu ahụ. Ebe ọ bụ na Onyeàmà ahụ na-achọ irute n’obi onye nwe ụlọ, o kwesịrị izere ịjụ ajụjụ ndị na-emenye mmadụ ihere. N’iji Okwu Chineke eme ihe, ‘ka okwu anyị na-adị n’amara mgbe nile, ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.’—Ndị Kọlọsi 4:6.
11. N’iji Akwụkwọ nsọ eme ihe iji gbazie echiche n’ezighị ezi, ihe nlereanya dị aṅaa ka anyị nwere n’ọnwụnwa Setan nwara Jisọs?
11 Karịsịa n’oge a na-eme nletaghachi, ọ pụrụ ịdị mkpa ịgbazi echiche ndị na-ezighị ezi site n’igosi ihe Akwụkwọ nsọ kwuru n’ezie ma ọ bụ ihe ihe o kwuru pụtara. Jisọs mere ihe yiri nke ahụ n’ịzaghachi ịma aka Setan, bụ́ onye kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, tụda onwe gị n’ala [site n’ụlọ elu nke ụlọ nsọ ahụ, dị ka onye na-achọ igbu onwe ya]: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Ndị mmụọ ozi ya ka ọ ga-enye iwu banyere gị: ọ bụkwa n’elu aka ha ka ha ga-eburu gị, ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume ma eleghị anya.” Abụ Ọma 91:11, 12, nke Setan hotara okwu site na ya, adịghị akwado mmadụ itinye ndụ, nke bụ onyinye sitere n’aka Chineke, n’ihe ize ndụ. N’ịghọta na ọ bụ ihe na-ezighị ezi itinye Jehova n’ule site n’iji ndụ ya gwurie egwu, Jisọs gwara Setan, sị: “Ọzọkwa e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Anwala Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] Chineke gị.” (Matiu 4:5-7) N’eziokwu, Setan abụghị onye na-achọ eziokwu. Ma mgbe ndị nwere ezi uche kwupụtara echiche ndị na-ezighị ezi, ndị pụrụ igbochi ọganihu ime mmụọ ha, onye ozi nke okwu Chineke kwesịrị iji akọ gosi ihe Akwụkwọ nsọ kwuru n’ezie na ihe ọ pụtara. Ihe a nile so ‘n’ikwuzi okwu nke eziokwu ahụ’—bụ́ otu n’ime ihe ọmụmụ ndị dị mkpa a na-akụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.—2 Timoti 2:15.
Ikwu Okwu n’Ụzọ Ga-eme Ka E Kwenye Nwere Ọnọdụ nke Ya
12, 13. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ịgbalị ime ka mmadụ kwere n’ije ozi ahụ?
12 Ikwu okwu n’ụzọ ga-eme ka e kwenye nwere ọnọdụ kwesịrị ekwesị n’ije ozi ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, Pọl gbara onye ọrụ ibe ya bụ Timoti ume ka ọ nọgide n’ihe ndị ọ mụtaworo, ndị ‘e mewokwara ka o kwere.’ (2 Timoti 3:14) Na Kọrint, Pọl ‘na-ekwu okwu n’ụlọ nzukọ ụbọchị izu ike nile, na-emekwa ka ndị Juu na ndị Grik kwenye.’ (Ọrụ 18:1-4) N’Efesọs, o nwekwara ihe ịga nke ọma ‘n’ikwu okwu n’ihe nile banyere alaeze Chineke, na-emekwa ka ha kwenye ha.’ (Ọrụ 19:8) Mgbe e nyere ya iwu ka ọ ghara ịhapụ ebe obibi ya na Rom, onyeozi ahụ kpọkọtara ndị mmadụ n’ebe ọ nọ wee gbaara ha àmà, “na-emekwa ka ha kwenye,” ụfọdụ ndị ghọkwara ndị kwere ekwe.—Ọrụ 28:23, 24.
13 Otú ọ dị, n’agbanyeghị otú Onyeàmà gbalịruru n’ime ka e kwere ihe ọ na-ekwu, ọ bụ nanị ndị ahụ obi ha ziri ezi maka ndụ ebighị ebi ga-aghọ ndị kwere ekwe. Ịrụ ụka n’ụzọ ga-eme ka e kwenye na inye nkọwa n’ụzọ doro anya, nke e wepụtara n’ụzọ akọ, pụrụ ịkpali ha ikwenye. Ma gịnị ọzọ pụrụ inye aka n’ime ka ha kwere?
Nwee Ezi Izu, Na-ekwukwa Ihe Doro Anya
14. (a) Gịnị ka okwu nwere ezi izu, na njikọ gụnyere? (b) Gịnị ka ịrụ ụka doro anya chọrọ n’aka mmadụ?
14 Otu n’ime ọdịdị okwu ndị a na-emesi ike n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke bụ nkọwapụta nwere ezi izu, na njikọ. Nke a metụtara ido echiche nile ndị bụ isi na ihe ndị dị mkpa n’okwu ahụ n’usoro ezi uche dị na ya. Ịrụ ụka doro anya dịkwa mkpa, bụ́ nke chọrọ ka mmadụ tọọ ezi ntọala, na-enyekwa ihe nnwapụta ndị guzosiri ike. Ihe yiri nke a bụ inyere ndị na-ege ntị aka ịtụgharị uche site n’ịnọgide n’ihe gị na ha kwekọrịtara na ya, na-ewulite isi ihe dị iche iche nke ọma, na-etinyekwa ha n’okwu n’ụzọ dị irè. Ọzọkwa, akwụkwọ nsọ na-enye nduzi.
15. (a) Olee ụzọ Pọl si dọta mmasị, guzobekwa ihe ya na ndị mmadụ kwekọrịtara na ya mgbe o kwuru okwu n’Ugwu Mars? (b) N’okwu Pọl, ihe àmà dị aṅaa ka anyị nwere nke okwu nwere ezi izu na njikọ?
15 Ọdịdị okwu ndị a pụtara ìhè n’okwu Pọl ahụ a maara nke ọma n’Ugwu Mars nke dị n’Atens oge ochie. (Ọrụ 17:22-31) Okwu mmeghe ya dọọrọ mmasị ndị mmadụ, guzobekwa otu ihe ya na ha kwekọrịtara na ya, n’ihi na o kwuru, sị: “Ndị ikom nke Atens, n’ihe nile ahụwo m na unu na-asọpụrụ ndị mmụọ unu nke ukwuu.” Nye ha, ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a yiri okwu ịja mma. Mgbe ọ kpọtụsịrị uche n’otu ebe ịchụàjà nke a raara ‘Nye Chi nke A Na-amaghị Ama,’ Pọl gara n’ihu ná mwulite okwu ya nke nwere ezi izu na njikọ, na ịrụ ụka nke doro anya. O mere ka ọ pụta ìhè na Chineke nke a nke ha na-amaghị bụ onye “kere ụwa na ihe nile dị n’ime ya.” N’adịghị ka Athena ma ọ bụ chi ndị Grik ndị ọzọ, ‘ọ dịghị ebi n’ụlọ nsọ e ji aka wuo, ọ dịghịkwa mkpa iji aka mmadụ jeere ya ozi.’ Onyeozi ahụ gara n’ihu igosi na Chineke nke a nyere anyị ndụ, na ọ hapụghịkwa anyị ka anyị na-asọgharị ìsì ịchọta ya. Mgbe ahụ Pọl tụgharịrị uche n’Onye Okike anyị, bụ́ onye lefuruworo oge nile nke ife arụsị n’amaghị ihe anya, “na-agwa mmadụ ka ha nile chegharịa n’ebe nile.” N’ụzọ ezi izu dị na ya, nke a dujere n’isi ihe ahụ nke bụ na ‘Chineke ga-ekpe ndị bi n’elu ụwa dum ikpe n’ezi omume site n’aka otu nwoke onye ọ kpọliteworo site ná ndị nwụrụ anwụ.’ Ebe ọ bụ na Pọl anọwo “na-ezisa ozi ọma nke Jisọs na mbilite n’ọnwụ ya,” ndị Atens ahụ maara na Onye ikpe nke a ga-abụ Jisọs Kraịst.—Ọrụ 17:18.
16. Olee ụzọ okwu Pọl kwuru n’Ugwu Mars na ọzụzụ a na-anata n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke pụrụ isi metụta ije ozi mmadụ?
16 N’eziokwu, Pọl adịghị agba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’elu Ugwu Mars. Ma site n’okwu o kwuru na ọzụzụ a na-enye n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, Ndịàmà Jehova pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu nke pụrụ imeziwanye ozi ubi ha. Ee, ihe ndị a nile na-enye aka ime ka ha bụrụ ndị ozi dị irè karị, ọbụna dị ka nkọwapụta nwere ezi izu na ịrụ ụka doro anya nke Pọl mere ka ụfọdụ n’ime ndị Atens ahụ kwenye ịghọ ndị kwere ekwe.—Ọrụ 17:32-34.
Jiri Ihe Atụ Ndị E Ji Ezi Ihe Na-eme Ihe
17. Ụdị ihe atụ dịgasị aṅaa ka e kwesịrị iji mee ihe n’ije ozi?
17 Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-enyekwara ndị ozi Chineke aka iji ihe atụ ndị dị mma na-eme ihe n’ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ nakwa n’akụkụ ndị ọzọ nke ije ozi ha. Iji mesie isi ihe ndị dị mkpa ike, e kwesịrị iji ihe atụ ndị dị mkpirikpi, ndị dịkwa mma, na-eme ihe. Onyeàmà ahụ kwesịrị isi n’ọnọdụ ndị a ma ama nweta ha, leziekwa anya ime ka nkọwa ha doo anya. Ihe atụ ndị Jisọs jiri mee ihe ruru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nile ndị a.
18. Olee ụzọ Matiu 13:45, 46 pụrụ isi baa uru n’ije ozi?
18 Dị ka ihe atụ, tụlee okwu Jisọs bụ: “Alaeze eluigwe yiri onye ahịa na-achọ pearl ọma: ma mgbe ọ hụrụ otu pearl dị oké ọnụ ahịa, o jee, ree ihe nile o nwere, ka ha hà, wee zụta ya.” (Matiu 13:45, 46) Pearl bụ nkume dị oké ọnụ ahịa a na-achọta n’ime mkpò elu nke ejula mmiri bụ́ oyster na ụdị ejula mmiri ndị ọzọ. Ma ọ bụ nanị pearl ụfọdụ bụ ndị ‘dị mma.’ Onye ahịa ahụ nwere nghọta dị mkpa iji mata uru dị ukwuu nke otu pearl nke a, dịkwa njikere ire ihe nile o nwere iji nweta ya. Eleghị anya n’oge a na-eme nletaghachi ma ọ bụ n’oge ọmụmụ Bible ebe obibi, a pụrụ iji ihe atụ nke a mee ihe iji gosi na mmadụ nke ghọtara abamuru nke Alaeze Chineke n’ezie ga-eme ihe dị ka onye ahịa ahụ. Onye ahụ ga-edebe Alaeze ahụ n’ọkwa mbụ ná ndụ ya, na-amara na o ruru eru iji ihe ọ bụla ọzọ chụọ àjà n’ihi ya.
Jiri Ihe Mkpali Mechie Okwu Gị
19. N’ije ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ, gịnị ka okwu mmechi kwesịrị igosi onye nwe ụlọ?
19 N’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ndị Chineke na-amụtakwa na mmechi nke okwu ma ọ bụ nkwurịta okwu kwesịrị inwe njikọ doro anya n’ebe isiokwu ahụ dị, o kwesịkwara igosi ndị na-ege ntị ihe ha ga-eme, gbaakwa ha ume ime ya. N’ije ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ọ dị mkpa ka e gosi onye nwe ụlọ kpọmkwem ụzọ a tụrụ anya ka ọ gbasoo, dị ka ịnara akwụkwọ e ji amụ Bible ma ọ bụ ikwe ka a bịara ya nletaghachi.
20. Ezi ihe nlereanya dị aṅaa n’okwu mmechi nke na-akpali akpali ka anyị na-ahụ na Matiu 7:24-27?
20 Mmechi nke Ozizi Elu Ugwu nke Jisọs na-enye ezi ihe nlereanya. Site n’iji ihe atụ nke dị mfe nghọta wee mee ihe, Jisọs gosiri na ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ige ntị n’okwu ya. O mechiri okwu ya, sị: “Ya mere onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a, na-emekwa ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nwere uche, onye wuru ụlọ ya n’elu oké nkume: mmiri wee zoo, osimiri ruokwa, ifufe feekwa, wee makwasị ụlọ ahụ; ma ọ daghị: n’ihi na a tọrọ ntọala ya n’elu oké nkume ahụ. Ma onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a, ma ọ dịghị eme ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nke bụ onye nzuzu, onye wuru ụlọ ya n’elu ájá: mmiri wee zoo, osimiri ruokwa, ifufe feekwa, wee tikwasị ụlọ ahụ; o wee daa: ọdịda ya dịkwa ukwuu.” (Matiu 7:24-27) Lee nnọọ ka nke a si egosi nke ọma na ndị ozi Chineke kwesịrị ịgbalịsi ike ịkpali ndị nwe ụlọ!
21. Gịnị ka ntụle anyị meworo ka ọ pụta ìhè, ma gịnị ka a na-aghaghị ịghọta?
21 Isi ihe ndị a tụlesịworo ugbu a na-eme ka ọ pụta ìhè ụzọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke pụrụ isi nyere ọtụtụ ndị aka ịghọ ndị ruru eru ịbụ ndị nkwusa Alaeze. N’eziokwu, n’ụzọ bụ isi, iru eru na-esite n’ebe Chineke nọ. (2 Ndị Kọrint 3:4-6) N’agbanyeghịkwa otú onye ozi si bụrụ onye ruru eru, ọ dịghị onye pụrụ ime ka ụmụ mmadụ ghọọ ndị kwere ekwe ọ gwụlakwa ma Chineke ọ̀ dọtara ha site na Kraịst. (Jọn 14:6) Ma n’agbanyeghị nke ahụ, o doro anya na ndị Chineke kwesịrị iji onyinye ime mmụọ nile Jehova nyeworo na-eme ihe ka ha na-achọ ndị ahụ obi ha ziri ezi maka ndụ ebighị ebi.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Olee ndị bụ “ndị dị ọcha n’obi,” oleekwa ụzọ ha si ‘na-ahụ Chineke’?
◻ Isi ihe dịgasị aṅaa ka e kwesịrị ịtụle mgbe a na-akọwapụta ozi Alaeze ahụ n’ọrụ ụlọ n’ụlọ?
◻ Olee ụzọ a pụrụ isi kwuzie Okwu Chineke nke ọma n’ije ozi?
◻ Gịnị ga-enye aka ikwu okwu n’ụzọ nwere ezi izu, dookwa anya, n’ozi ubi?
◻ Gịnị ka e kwesịrị icheta banyere ihe atụ ndị a na-eji eme ihe n’ije ozi?
◻ Gịnị ka okwu mmechi ndị a na-eji eme ihe n’ọrụ ịgba àmà kwesịrị ịrụzu?
[Foto dị na peeji nke 16]
Jisọs kwuru na ‘ndị dị ọcha n’obi ga-ahụ Chineke.’ Gịnị ka nke a pụtara?
[Foto dị na peeji nke 18]
E kwesịrị iwebata akụkụ akwụkwọ nsọ n’ụzọ dị mma, jiri imesi ihe ike kwesịrị ekwesị gụọ ha, kọwaakwa ha n’ụzọ doro anya, nke zikwara ezi