Echiche nke Bible
Olee Otú Ndị Kraịst Kwesịrị Isi Lee Mas Anya?
NDỊ ji Katọlik kpọrọ ihe na-ekwenyere Popu John Paul nke Abụọ, bụ́ onye, dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times si kwuo, ‘kwusikwara ya ike ọzọ na nso nso a na chọọchị na-ewere ya na onye Katọlik hapụrụ ije Mas mere njọ.’ Gịnị bụ Mas? Chọọchị na Bible hà kwekọrịtara n’okwu a?
N’akwụkwọ bụ́ Things Catholics Are Asked About, ụkọchukwu Katọlik bụ́ Martin J. Scott na-akọwa Mas otú a: “Mas bụ àjà na-enweghị ọbara nke Ahụ na Ọbara Kraịst. Calvary bụ ebe a chụrụ àjà nwere ọbara nke Kraịst. N’ụzọ bụ́ isi, Mas na àjà ahụ a chụrụ n’obe bụ otu ihe. Nke a abụghị atụmatụ okwu, ọ bụghị okwu ihe atụ, ma ọ bụ ikwubiga okwu ókè.” Ọ na-ekwukwa, sị: “A sịrị na Mas na-eme ka Ọkpara Chineke gbadata n’elu ọlta anyị, jiri Ya chụọrọ chi Atọ n’Ime Otu àjà.”
Mas Ọ̀ Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ?
Ndị Katọlik nwere obi eziokwu kwere na Mas dabeere n’ozizi Akwụkwọ Nsọ. Ha na-arụtụ aka n’okwu Jisọs kwuru n’oge ọ na-eri ihe a na-akpọkarị Nri Anyasị Ikpeazụ, dị ka ihe akaebe. Ka ọ na-ekesara ndị ozi ya achịcha na mmanya, Jisọs kwuru mgbe ọ na-ezo aka n’achịcha ahụ, sị: “Nke a bụ ahụ m.” Mgbe ọ na-ezo aka ná mmanya ahụ, o kwuru, sị: “Nke a bụ ọbara m.” (Matiu 26:26-28)a Ndị Katọlik kwere na Jisọs mere n’ezie ka achịcha na mmanya ahụ ghọọ ahụ na ọbara ya mgbe o kwuru ihe ndị a. Otú ọ dị, akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia (1967) na-adọ aka ná ntị, sị: “Anyị ekwesịchaghị iwere okwu ahụ bụ́ ‘Nke a bụ ahụ m’ ma ọ bụ ‘Nke a bụ ọbara m’ n’ụzọ nkịtị. . . . N’ihi na ná nkebi ahịrịokwu ndị dị ka ‘owuwe ihe ubi bụ ọgwụgwụ ụwa’ (Mt 13.39) ma ọ bụ ‘mụ onwe m bụ ezi osisi vine ahụ,’ (Jn 15.1) [ngwaa ahụ bụ́ “ịbụ”] pụtara nanị igosi ihe ma ọ bụ ịnọchi anya ihe.” N’ihi ya, ọbụna akwụkwọ nkà ihe ọmụma a a na-akwanyere ùgwù kwetara na ihe e kwuru na Matiu 26:26-28 adịghị egosi na a gbanwere achịcha na mmanya ahụ ịghọ ahụ na ọbara nkịtị nke Jisọs n’oge Nri Anyasị Ikpeazụ ahụ.
Mmadụ pụrụ icheta na Jisọs kwuru n’otu oge, sị: “Abụ m achịcha ahụ dị ndụ nke siworo n’eluigwe rịdata. . . . Onye ọ bụla nke na-eri ahụ m ma na-aṅụ ọbara m nwere ndụ ebighị ebi.” (Jọn 6:51, 54) Ụfọdụ n’ime ndị na-ege Jisọs ntị ghọtara okwu ya n’ụzọ nkịtị, ọ wụkwara ha akpata oyi n’ahụ. (Jọn 6:60) Ma anyị pụrụ ịjụ, sị, Jisọs ò mere ka ahụ ya ghọọ achịcha n’oge ahụ? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ nọ na-ekwu ya n’ụzọ ihe atụ. O jiri onwe ya tụnyere achịcha n’ihi na site n’àjà ya ọ ga-enye ihe a kpọrọ mmadụ ndụ. Jọn 6:35, 40 na-egosi n’ụzọ doro anya na iri ihe na ịṅụ ihe ahụ ga-abụ site n’inwe okwukwe na Jisọs Kraịst.
Ebe ọ bụ na Mas bụ ememe bụ́ isi nke Chọọchị Katọlik, mmadụ pụrụ iche na Akwụkwọ Nsọ kwadoro ya. Ọ kwadoghị ya. Akwụkwọ bụ́ The Catholic Encyclopedia (mbipụta nke 1913) kọwara ihe kpatara ya: “Ebe bụ́ isi anyị si nweta ozizi anyị . . . bụ ọdịnala, bụ́ nke malitere mgbe gboo na-ekwupụta uru Àjà Mas ahụ a na-enweta site n’ịrịọ arịrịọ.” Ee, Mas ndị Roman Katọlik dabeere n’ọdịnala, ọ bụghị na Bible.
N’agbanyeghị ókè e jiruru ezi obi kwere na ya, Chineke adịghị anabata ọdịnala na-emegide Bible. Jisọs baara ndị ndú okpukpe nke oge ya mbá, sị: “Unu emewo ka okwu Chineke ghara ịdị irè site n’ọdịnala unu.” (Matiu 15:6) Ebe ọ bụ na Jisọs jiri Okwu Chineke kpọrọ ihe, ka anyị jiri Akwụkwọ Nsọ nyochaa ihe a na-akụzi banyere Mas.
A Chụọ Kraịst n’Àjà—Ugboro Ole?
Chọọchị Katọlik na-akụzi na mgbe ọ bụla e doro Mas, a na-achụ Jisọs n’àjà, ọ bụ ezie na ọ na-ekwusi ike na ọ naghị anwụ n’ezie nakwa na a dịghị awụsị ọbara n’àjà ahụ. Bible ò kwenyere n’echiche a? Rịba Ndị Hibru 10:12, 14 ama: “[Jisọs] achụwo otu àjà n’ihi mmehie, wee nọdụzie ala n’oche ya ruo mgbe ebighị ebi n’aka nri Chineke. Site n’otu àjà ahụ, o mewo ka ndị nile a na-eme ka ha dị nsọ zuo okè ruo mgbe ebighị ebi.”
Otú ọ dị, onye Katọlik nwere obi eziokwu pụrụ ịrụ ụka, sị: ‘Jisọs ọ́ gaghị achụ onwe ya n’àjà ọtụtụ ugboro? Anyị nile na-eme mmehie ọtụtụ ugboro.’ E dekọrọ ihe Bible zara ná Ndị Hibru 9:25, 26: “[Kraịst] agajeghị ịchụ onwe ya n’àjà ugboro ugboro. . . . Ọ pụtawo ìhè otu mgbe ruo mgbe nile, n’ọgwụgwụ nke oge ikpeazụ ahụ, iji wepụ mmehie site n’ịchụ onwe ya n’àjà.” Rịba nnọọ nke a ama: Kraịst “agajeghị ịchụ onwe ya n’àjà ugboro ugboro.” Ná Ndị Rom 5:19, Pọl onyeozi na-akọwa ihe kpatara ya: “Site ná nnupụisi nke otu onye [nke Adam] ọtụtụ ghọrọ ndị mmehie, n’ihi ya site n’ezi omume nke otu onye [nke Jisọs] ọtụtụ ndị ga-aghọ ndị ziri ezi.” Otu nnupụisi nke Adam mere ka anyị nile na-anwụ anwụ; otu mgbapụta nke Jisọs ghọrọ ihe ndabere nke a ga-eji gbaghara anyị nile nwere okwukwe n’àjà ahụ mmehie anyị ugbu a na nke inweta ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.
Gịnị bụ ọdịiche dị n’ịchụ Jisọs n’àjà otu ugboro na ịchụ ya n’àjà ọtụtụ ugboro? Ọ bụ ihe banyere inwe ekele maka uru nke àjà Jisọs. Nke ahụ bụ onyinye kasịnụ e nyetụworo—onyinye dị nnọọ oké ọnụ ahịa, zuru nnọọ okè, nke na ọ gaghị adị mkpa mgbe ọ bụla inye ya ọzọ.
N’ezie, o kwesịrị ka e cheta àjà Jisọs. Ma e nwere ọdịiche dị n’icheta ihe omume na imeghachi ya. Dị ka ihe atụ, di na nwunye na-eme ememe mgbaafọ nke agbamakwụkwọ ha pụrụ icheta ụbọchị ha lụrụ di na nwunye, n’emeghị ememe agbamakwụkwọ ahụ ọzọ n’ezie. Kwa afọ, Ndịàmà Jehova na-eme ememe mgbaafọ nke ọnwụ Jisọs, na-eme otú ahụ dị ka Jisọs nyere n’iwu—“iji cheta,” ọ bụghị iji chụọ ya, n’àjà. (Luk 22:19) Ọzọkwa, mgbe nile n’afọ ndị Kraịst ndị a na-agbalị isite n’aka Jisọs Kraịst soro Jehova Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya site n’ime ka ndụ ha, omume ha, na nkwenkwe ha kwekọọ n’Akwụkwọ Nsọ.
Mgbe mgbe, ime otú ahụ na-apụta ime mgbanwe n’ụzọ ha si eche echiche. Ma Ndịàmà na-aṅụrị ọṅụ n’ịmara na ọ bụrụ na ha ejiri ikwesị ntụkwasị obi kwadoo Okwu Chineke kama ịkwado ọdịnala mmadụ, a ga-agọzi ha. Ọ bụrụkwa na ha enwee okwukwe n’ọbara Jisọs a chụrụ n’àjà, nke a wụsịrị otu mgbe ruo mgbe nile ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, ọ ga-asachapụ ha mmehie nile.—1 Jọn 1:8, 9.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Akụkụ Akwụkwọ Nsọ nile e hotara n’isiokwu a si na New Jerusalem Bible nke ndị Katọlik.
[Foto dị na peeji nke 26]
Ememe Mas nke St. Giles (nsebiri)
[Ebe E Si Nweta Foto]
Erich Lessing/Art Resource, NY