Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 123 p. 282-p. 283 para. 1
  • Ekpere Jizọs Kpere Mgbe Ihe Na-ewute Ya nke Ukwuu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ekpere Jizọs Kpere Mgbe Ihe Na-ewute Ya nke Ukwuu
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Oké Ihe Mgbu n’ime Ogige ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Oké Ihe Mgbu n’Ime Ogige ahụ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ụbọchị Ikpeazụ nke Ndụ Jisọs Dị Ka Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ịkwadebe Ndị Ozi ahụ Maka Ọpụpụ Ya
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 123 p. 282-p. 283 para. 1
Ebe Jizọs na-ekpe ekpere n’ogige Getsemeni, Pita, Jems, na Jọn ana-ehi ụra

ISI NKE 123

Ekpere Jizọs Kpere Mgbe Ihe Na-ewute Ya nke Ukwuu

MATIU 26:30, 36-46 MAK 14:26, 32-42 LUK 22:39-46 JỌN 18:1

  • MGBE JIZỌS NỌ N’OGIGE GETSEMENI

  • ỌSỤSỌ YA DỊ KA ỌBARA NKE NA-ATAPỤSỊ N’ALA

Mgbe Jizọs na ndịozi ya kpechara ekpere, ya na ha bụrụ abụ ma gaa n’Ugwu Oliv. (Mak 14:26) Ha gawara n’ogige a na-akpọ Getsemeni, bụ́ ebe ọ na-agakarị. Ogige a dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jeruselem.

Ozugbo ha ruru n’ogige a mara mma osisi oliv juru, Jizọs hapụrụ ndịozi ya asatọ ma baa n’ime ogige a. O nwere ike ịbụ na ọ hapụrụ ha ná mbata ogige a n’ihi na ọ sịrị ha: “Nọdụnụ ala n’ebe a ka m gaa ebe nke ọzọ wee kpee ekpere.” Ọ kpọọrọ ndịozi ya atọ aha ha bụ Pita, Jems, na Jọn baa n’ime ogige ahụ. O bidoro ichegbu onwe ya nke ukwuu ma gwa ha, sị: “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu, ọbụna ruo ọnwụ. Nọrọnụ n’ebe a, sorokwanụ m na-eche nche.”—Matiu 26:36-38.

Mgbe Jizọs gatụkwuru n’ihu, “ọ dara n’ala wee malite ikpe ekpere.” Gịnịkwanụ ka ọ na-arịọ Chineke ka o meere ya n’oge a? Ọ sịrị Chineke: “Nna, ihe niile kwere omume n’ebe ị nọ; wepụ iko a n’ebe m nọ. Ma ọ bụghị ihe m chọrọ, kama ihe ị chọrọ.” (Mak 14:35, 36) Olee ihe okwu Jizọs pụtara? Ọ̀ chọrọ ịgbara àjà Chineke chọrọ ka o jiri ndụ ya chụọ ọsọ, bụ́ ihe a ga-eji gbapụta ụmụ mmadụ? Mba.

Jizọs anọrọla n’eluigwe hụ otú ndị Rom si emekpọ ndị ha na-egbu ọnụ. Ugbu a ọ bụ mmadụ, o nwere obi ọmịiko, ihe na-emetụkwa ya n’ahụ́. N’ihi ya, ọ naghị agụsi ya agụụ ike ka mgbe a ga-ata ya ahụhụ ruwe eruwe. Ma, ihe kacha eme ka ọ na-echegbu onwe ya bụ na ọ ma na ọnwụ ọ na-aga ịnwụ ka onye omekome nwere ike ime ka a kọchaa aha Nna ya. N’awa ole na ole, a ga-akpọgide ya n’osisi ka à ga-asị na ọ bụ onye na-ekwulu Chineke.

Mgbe Jizọs kpechara ekpere ruo ogologo oge, ọ laghachiri ebe ndịozi ya atọ ahụ nọ ma hụ na ha na-ehi ụra. Ọ gwara Pita, sị: “Ọ̀ bụ na unu enweghị ike iso m chee nche ruo ọbụna otu awa? Na-echenụ nche ma na-ekpe ekpere mgbe niile, ka unu wee ghara ịbanye n’ọnwụnwa.” Jizọs ghọtara na ike gwụchara ndịozi ya ahụ nakwa na chi ejimiela. N’ihi ya, o kwuru, sị: “N’ezie, mmụọ dị njikere, ma anụ ahụ́ adịghị ike.”—Matiu 26:40, 41.

Jizọs gaghachiri ebe ahụ ọ nọ na-ekpe ekpere ma rịọ Chineke ka o wepụrụ ya “iko a.” Mgbe ọ laghachiri ebe ahụ ndịozi ya atọ nọ, ọ hụrụ ha ọzọ ka ha na-ehi ụra mgbe ha kwesịrị ịna-ekpe ekpere ka ha ghara ịdaba n’ọnwụnwa. Mgbe Jizọs gwara ha okwu, “ha amaghị ihe ha ga-aza ya.” (Mak 14:40) Jizọs gaghachikwara ebe ọ na-ekpe ekpere ma gbuo ikpere n’ala kpee ekpere.

Jizọs na-echegbu onwe ya nke ukwuu otú ọnwụ ọ na-aga ịnwụ ka onye omekome ga-esi mee ka a kọchaa aha Nna ya. Jehova nọ na-anụ ekpere Ọkpara ya. N’ihi ya, o nwere mgbe o ruru, ya ezite mmụọ ozi ya ka o mee ka Jizọs dị ike. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs akwụsịghị ikpegara Nna ya ekpere. Ọ nọ “na-ekpesi ekpere ike karị.” Jizọs na-echegbu onwe ya nke ukwuu. Ihe dị ya n’aka abụghị obere ihe. Ndụ ebighị ebi nke ya na nke ụmụ mmadụ ndị kweere na Chineke dị ya n’aka. Ihe ndị a mere ka ‘ọsụsọ ya dịrị ka ọbara nke na-atapụsị n’ala.’—Luk 22:44.

Mgbe Jizọs gaghachiri na nke ugboro atọ ya n’ebe ahụ ndịozi ya nọ, ọ hụkwara ha ka ha na-ehi ụra. Ọ sịrị ha: “N’ụdị oge dị otú a ka unu na-ehi ụra, na-ezu ike! Lee! Oge awa ahụ eruwo nso ka a rara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmehie. Bilienụ, ka anyị pụọ. Lee! Onye ga-arara m nye abịawo nso.”—Matiu 26:45, 46.

ỌSỤSỌ YA DỊ KA ỌBARA NKE NA-ATAPỤSỊ N’ALA

Luk onye ọgwọ ọrịa ekwughị otú ọsụsọ Jizọs si ‘dị ka ọbara nke na-atapụsị n’ala.’ (Luk 22:44) O nwere ike ịbụ na Luk ji okwu ahụ mee ihe atụ, ya bụ, na ọsụsọ ya yiri ọbara si n’ebe mmadụ merụrụ ahụ́ na-atapụ. N’otu akwụkwọ ndị na-ahụ maka ahụ́ ike dere, dọkịta aha ya bụ William D. Edwards kwuru ihe ọzọ o nwere ike ịbụ. Ọ sịrị: ‘Ọsụsọ ya na ọbara gwakọtara nwere ike ịna-agbapụta mmadụ n’ahụ́, ọ bụ eziokwu na ọ naghị emekarị. Ọ bụrụ na mmadụ echegbuo onwe ya gabiga ókè n’ihi nsogbu ọ nọ na ya, irighiri akwara ndị dị onye ahụ n’ahụ́ nwere ike ịgbawa, ọbara esi ebe ahụ gbapụta, ya na ọsụsọ agwakọta. Mmadụ hụzie ọsụsọ ahụ ya echee na ọ bụ naanị ọbara.’

  • Mgbe Jizọs na ndịozi ya pụtachara n’ọnụ ụlọ dị n’elu, olee ebe Jizọs kpọ ha gaa?

  • Gịnị ka ndịozi Jizọs atọ nọ na-eme mgbe Jizọs na-ekpe ekpere?

  • Olee ihe ọsụsọ Jizọs ịdị ka ọbara na-egosi banyere otú obi dị ya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya