“Mgbe Ịgba Nkịtị, na Mgbe Ikwu Okwu”
UGBORO ole ka ị kwaworo arịrị, sị, “Ọ dị m ka ya bụrụ na mụ ekwughị ihe ahụ”? Ma, ị pụrụ icheta oge ndị ọzọ ị na-ekwuliteghị okwu. N’ileghachi anya azụ, ị pụrụ icheworị, sị, ‘Ọ dị m ka ya bụrụ na ọ dị ihe m kwuru.’
Bible na-ekwu na e nwere “mgbe ịgba nkịtị, na mgbe ikwu okwu.” (Eklisiastis 3:7) Ya bụrụ otú ahụ, ọ bụ ebe a ka nsogbu dị—ikpebi mgbe a ga-ekwu okwu na mgbe a ga-agba nkịtị. Ọdịdị mmadụ anyị na-ezughị okè na-akpalikarị anyị ime ihe na ikwu ihe n’oge na-ekwesịghị ekwesị. (Ndị Rom 7:19) Olee otú anyị pụrụ isi chịkwaa ire anyị na-adịghị ekwe nchịkwa?—Jemes 3:2.
Ụzọ Dị Iche Iche Isi Zụọ Ire
Iji nyere anyị aka ikpebi mgbe a ga-ekwu okwu na mgbe a ga-agba nkịtị, ọ dịghị mkpa inwe ndepụta dị ogologo nke a haziri ịgụnye ọnọdụ nile pụrụ ịdapụta. Kama nke ahụ, ọ dị anyị mkpa ịbụ ndị àgwà ndị bụ akụkụ bụ isi nke ọdịdị ndị Kraịst na-eduzi. Gịnị bụ àgwà ndị a?
Jisọs Kraịst kọwara na ịhụnanya bụ àgwà bụ isi nke na-akpali ndị na-eso ụzọ ya. O kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Ka anyị na-egosipụtakwu ụdị ịhụnanya ụmụnna dị otú ahụ, anyị ga na-achịkwakwu ire anyị n’ụzọ ka mma.
Àgwà abụọ yiri ibe ha ga-enyekwara anyị aka nke ukwuu. Otu n’ime ndị a bụ ịdị umeala n’obi. Ọ na-enyere anyị aka ‘ịgụ ndị ọzọ ná ndị ka anyị mma.’ (Ndị Filipaị 2:3) Nke ọzọ bụ obi umeala, bụ́ nke na-eme ka anyị “na-anagide ihe ọjọọ.” (2 Timoti 2:24, 25) Anyị nwere ihe nlereanya zuru okè nke otú e kwesịrị isi gosipụta àgwà ndị a n’ime Jisọs Kraịst.
Ebe ọ bụ na o siri ike karị ịchịkwa ire anyị mgbe anyị nọ ná nrụgide, ka anyị tụlee abalị ahụ tupu ọnwụ Jisọs—oge obi ‘lọrọ Ya mmiri’ nke ukwuu. (Matiu 26:37, 38) Ọ bụghị ihe ijuanya na Jisọs nwere ụdị mmetụta a, ebe ọ bụ na ọdịnihu ebighị ebi nke ihe nile a kpọrọ mmadụ dabeere na ya ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke.—Ndị Rom 5:19-21.
N’ezie nke a bụụrụ Jisọs oge ịgwa Nna ya nke eluigwe okwu. Ya mere ọ pụrụ ịga kpee ekpere, na-agwa mmadụ atọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eche nche. Mgbe oge gatụrụ ọ bịara wee hụ ha ka ha na-ehi ụra. Mgbe ahụ ọ gwara Pita, sị: “Ùnu dị otú a na-enweghị ike iso m chee nche otu oge hour?” Ihe sochiri ịba mba ịhụnanya a bụ okwu ndị gosiri na ọ ghọtara adịghị ike ha. Ọ sịrị: “Mmụọ nke mmadụ dị ọkụ n’ezie, ma anụ ahụ adịghị ike.” Ka e mesịrị, Jisọs bịakwara ọzọ wee hụ ka ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụra. O ji obi ọma gwa ha okwu wee “hapụ ha . . . jee, kpee ekpere nke ugbo atọ.”—Matiu 26:36-44.
Mgbe Jisọs hụrụ ka ndị na-eso ụzọ ya na-ehi ụra nke ugboro atọ, o jighị olu ike kwuo okwu kama ọ sịrị: “N’ụdị oge a ka unu na-arahụ ụra ma na-ezuru ike! Lee! Oge hour adịwo nso ka a rara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmehie.” (Matiu 26:45, NW) Ọ bụ nanị onye nwere obi nke jupụtara n’ịhụnanya, onye nwere mmụọ nwayọọ na umeala n’obi n’ezie, pụrụ ijiworị ire ya mee ihe n’ụzọ dị otú ahụ n’ụdị oge ahụ siri ike.—Matiu 11:29; Jọn 13:1.
Ngwa ngwa mgbe nke ahụ gasịrị, e jidere Jisọs ma kpee ya ikpe. N’ebe a anyị na-amụta na ọ kasị mma mgbe ụfọdụ ịgba nkịtị, ọbụna mgbe a nọ n’ozi ndị Kraịst. N’izubesi ike iwepụta ihe àmà iji ma Jisọs ikpe, ndị isi nchụàjà ahụ enweghị mmasị ọ bụla n’ịnụ ihe bụ eziokwu. Ya mere n’ọnọdụ ahụ pụrụ ịkpata ọgba aghara, Jisọs gbachiri nkịtị.—Tụlee Matiu 7:6.
Otú ọ dị, Jisọs anọgideghị gbachi nkịtị mgbe onye isi nchụàjà ahụ jụrụ, sị: “Ewere m Chineke dị ndụ gbaa Gị iyi, ka Ị gwa anyị ma Gị onwe gị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke.” (Matiu 26:63) Ebe ọ bụ na a gbawo Jisọs iyi, ọ bụ oge ọ ga-eji kwuo okwu. Ya mere ọ zaghachiri, sị: “Gị onwe gị kwuru: otú ọ dị, asị m unu, Site n’ugbu a unu ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka Ọ na-anọdụ n’aka nri nke ike, na-abịakwa n’elu igwe ojii nile nke eluigwe.”—Matiu 26:64.
N’ime ụbọchị ahụ dị ịrịba ama, Jisọs chịkwara ire ya n’ụzọ zuru okè. N’ọnọdụ nke ya, ịhụnanya, ịdị nwayọọ, na ịdị umeala n’obi bụ akụkụ ndị bụ isi nke ọdịdị ya. Olee otú anyị pụrụ isi jiri àgwà ndị a chịkwaa ire anyị mgbe anyị nọ ná nrụgide?
Ịchịkwa Ire Mgbe Iwe Ji Mmadụ
Mgbe iwe were anyị, ọtụtụ mgbe anyị adịghị achịkwa ire anyị. Dị ka ihe atụ, n’otu oge Pọl na Banabas nwere ndịrịta iche nke echiche. “Banabas wee zube ikurukwa Jọn, onye a na-akpọ Mak, ka ya na ha yikọọ jee. Ma ọ dịghị Pọl mma ka ha kuru onye ahụ ka ya na ha yikọọ jee, bụ́ onye si na Pamfilia hapụ ha laghachi, ghara isokwa ha jee ọrụ ha. Oké iwe wee pụta n’etiti ha, nke mere ka ha kewaa otu onye n’ebe ibe ya nọ.”—Ọrụ 15:37-39.
Michael,a bụ́ onye rụworo ọrụ ruo afọ ụfọdụ n’ọrụ iwu ihe dị iche iche, na-akọ, sị: “Ọ dị otu onye n’ebe ahụ a na-ewu ihe nke m maara nke ọma ma na-akwanyere ùgwù. Ma o yiri ka ọ na-akatọ ọrụ m mgbe nile. O wutere m, kpasuokwa m iwe ma ejidere m onwe m. Otu ụbọchị ọ kpọtụrụ akpọtụ mgbe ọ katọrọ otu ọrụ m ka rụsịrị.
“Ekwupụtara m ihe nile dị m n’obi. N’ịbụ onye iwe ji nke ukwuu, amaghị m echiche na-adịghị mma nke a ga-enyeworị ndị nile nọ anyị gburugburu. Ụbọchị ahụ nile, achọghị m ikwunyere ya okwu ma ọ bụ ọbụna ịhụ ya anya. Ugbu a achọpụtara m na emesoghị m nsogbu ahụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ọ gaara akaworị nnọọ mma ịgba nkịtị ma kwuo okwu mgbe iwe m dajụlatara.”
N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ịhụnanya ndị Kraịst kpaliri mmadụ abụọ a idozi nghọtahie ha. Michael na-akọwa, sị: “Mgbe anyị nwesịrị nkwurịta okwu ụfọdụ sitere n’obi eziokwu, anyị ghọtara ibe anyị nke ọma karị, anyị nwekwara ọbụbụenyi siri ike ugbu a.”
Dị ka Michael mụtara, ọ bụrụ na iwe ewee anyị, mgbe ụfọdụ ọ bụ ihe amamihe ịgbachi nkịtị. “Onye mmụọ ya jụrụ ajụrụ bụ onye nghọta,” ka Ilu 17:27 na-ekwu. Nghọta na ịhụnanya ụmụnna ga-enyere anyị aka ịchịkwa mkpali anyị ikwupụta ihe na-egbu mgbu n’obi. Ọ bụrụ na a kpasuwo anyị iwe, ka anyị soro onye nke ọzọ nanị ya kwurịta okwu na mmụọ dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, n’ebumnobi nke ime ka udo dịghachi. Gịnị ma ọ bụrụ na ntiwapụ nke iwe ewereworị ọnọdụ? Mgbe ahụ ịhụnanya ga-akpali anyị iloda nganga anyị ma jiri ịdị umeala n’obi chọọ imezi okwu. Nke a bụ oge ikwu okwu, ikwupụta mwute anyị ma jiri nkwurịta okwu sitere n’ezi obi dozie mkpasu iwe.—Matiu 5:23, 24.
Mgbe Ịgbachi Nkịtị Na-abụghị Ihe Ngwọta
Iwe ma ọ bụ mkpasu iwe pụrụ ime ka anyị kwụsị ikwunyere onye kpasuru anyị iwe okwu. Nke a pụrụ imebi ihe. “N’afọ mbụ nke alụmdi na nwunye anyị, e nwere mgbe ụfọdụ m na-agaghị ekwunyere di m okwu ruo ọtụtụ ụbọchị,” ka Maríab na-ekwupụta. “Ọ naghị abụkarị n’ihi nsogbu ndị siri ike, kama, n’ihi ntụkọba nke ụmụ obere mkpasu iwe. M na-anọgide na-ewe iwe n’ihi mkpasu iwe ndị a nile ruo mgbe ha ghọrọ ihe isi ike yiri ugwu. Ọ na-eruzi mgbe m na-agaghị edilikwa ha ọzọ, m na-akwụsịkwa nnọọ ikwunyere di m okwu ruo mgbe obi ilu m gabigara.”
María na-ekwukwa, sị: “Otu akụkụ Bible kpọmkwem—‘ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe gị’—nyeere m aka ịgbanwe echiche m. Mụ na di m rụsiri ọrụ ike imeziwanye nkwurịta okwu anyị ka nsogbu wee ghara ịkwakọba. Ọ dịbeghị mfe, ma mgbe afọ iri nke ndụ alụmdi na nwunye gasịrị, obi dị m ụtọ ikwu na oge ndị a nke ịgbachi nkịtị adịghị adịkebezi. Otú ọ dị, aghaghị m ikweta na m ka na-arụ ọrụ ịchịkwa mmetụta a.”—Ndị Efesọs 4:26.
Dị ka María chọpụtara, mgbe mmadụ abụọ nwere nghọtahie, enweghị nkwurịta okwu abụghị ihe ngwọta ya. N’ọnọdụ ndị ahụ, ibu iwe n’obi yiri ka ọ ga-etolite, a pụkwara imebi mmekọrịta ahụ. Jisọs kwuru na anyị kwesịrị ‘ime ọsọ ọsọ n’idozi okwu.’ (Matiu 5:25) “Okwu e kwuru na mgbe kwesịrị ya” pụrụ inyere anyị aka ‘ịchọ udo.’—Ilu 25:11; 1 Pita 3:11.
Ọ dịkwa anyị mkpa ikwupụta uche anyị mgbe anyị chọrọ enyemaka. Ọ bụrụ na anyị na-ahụju anya n’ihi nsogbu ime mmụọ ụfọdụ, anyị pụrụ ịla azụ inye ndị ọzọ nsogbu. Ma ọ bụrụ na anyị agbachi nkịtị, nsogbu ahụ pụrụ nnọọ ịka njọ. Ndị okenye ndị Kraịst a họpụtara ahọpụta na-eche banyere anyị, ọ bụrụkwa na anyị ga-ekwe ha, obi abụọ adịghị ya na ọ dị ha ọkụ n’obi inye aka. Nke a bụ oge anyị kwesịrị ikwu okwu.—Jemes 5:13-16.
Karịsịa ihe nile, anyị kwesịrị ịdị na-agwachi Jehova okwu anya n’ekpere sitere n’obi, dị ka Jisọs mere. N’ezie, ka anyị ‘wụsịa obi anyị’ nye Nna anyị nke eluigwe.—Abụ Ọma 62:8; tụlee Ndị Hibru 5:7.
“Mgbe Ikwu Okwu” Banyere Alaeze Chineke
Ozi ndị Kraịst bụ ọrụ Chineke nyere nke a na-aghaghị ịrụzu tupu ọgwụgwụ ihe nile eruo. Ya mere, dị ka ọ na-adịtụbeghị mbụ, ọ dị oké mkpa na ndị ohu Jehova ga-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. (Mak 13:10) Dị ka ndị ozi ahụ, ezi ndị Kraịst ‘apụghị nnọọ ịghara ikwu ihe nile ha hụrụ nụkwa.’—Ọrụ 4:20.
N’ezie, ọ bụghị mmadụ nile chọrọ ịnụ ozi ọma ahụ. N’eziokwu, mgbe ọ na-ezipụ ndị na-eso ụzọ ya ịga mee nkwusa, Jisọs dụrụ ha ọdụ ka ha ‘chọta ndị kwesịrị.’ Ebe ọ bụ na ọ dịghị mgbe Jehova na-amanye onye ọ bụla ife ya ofufe, anyị agaghị eji ikwesi olu ike nọgide na-agwa onye jụwapụrụ ozi Alaeze ahụ isi okwu. (Matiu 10:11-14) Ma obi dị anyị ụtọ ikwu okwu banyere ọbụbụeze Jehova gwa ndị “e doro ịnata ndụ ebighị ebi.”—Ọrụ 13:48; Abụ Ọma 145:10-13.
Ịhụnanya, ịdị nwayọọ, na ịdị umeala n’obi bụ àgwà ndị pụrụ inyere anyị aka ịchịkwa ọchịchọ anyị na-ezughị okè ikwu okwu ngwa ngwa ma ọ bụ ịdaba n’ịgbachi nkịtị kpam kpam. Ka anyị na-eto n’àgwà ndị a, anyị ga-enwe ike karị ịmata oge kwesịrị ekwesị na oge na-ekwesịghị ekwesị ikwu okwu.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụghị ezigbo aha ya.
b Ọ bụghị ezigbo aha ya.
[Foto dị na peeji nke 23]
A pụrụ idozi nsogbu dị iche iche site n’ezi nkwurịta okwu