Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 12/15 p. 8-13
  • Na-aṅụrịnụ Ọṅụ n’Olileanya Alaeze Ahụ!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-aṅụrịnụ Ọṅụ n’Olileanya Alaeze Ahụ!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezi Ọṅụ—Àgwà nke Dị n’Obi
  • Ịṅụrị Ọṅụ n’Olileanya ahụ n’Agbanyeghị Ihe Isi Ike
  • Idebe Olileanya Anyị Nso n’Uche
  • Ịṅụrị Ọṅụ Ugbu a n’Olileanya Paradaịs Ahụ
  • Olileanya nke Na-eme Ka Ndụ Bụrụ Ihe E Kwesịrị Ịdị Adị
  • Olileanya I Nwere Maka Ọdịnihu Agaghị Emenye Gị Ihere
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Na-ele Anya Jehova Ma Nwee Obi Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Na-aṅụrịnụ Ọṅụ n’Ime Jehova!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Fee Jehova Ofufe n’Ọṅụ nke Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 12/15 p. 8-13

Na-aṅụrịnụ Ọṅụ n’Olileanya Alaeze Ahụ!

“N’akụkụ olileanya unu, na-aṅụrịnụ ọṅụ; n’akụkụ mkpagbu unu, na-enwenụ ntachi obi.”—NDỊ ROM 12:12.

1. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nweta ọṅụ n’iso Jehova na-akpakọrịta, gịnịkwa ka Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst ume ime?

“CHINEKE nke obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11, NW] Lee nnọọ ụzọ nke a si kọwaa Jehova nke ọma! N’ihi gịnị? N’ihi na ọrụ ya nile na-ewetara ya oké obi ụtọ. Ebe Jehova bụ Isi Iyi nke ezi ihe nile na ihe nile na-enye obi ụtọ, ihe nile o kere eke, bụ́ ndị nwere ọgụgụ isi pụrụ inweta obi ụtọ ná mkpakọrịta ha na ya. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst ume ka ha ghọta ihe ùgwù na-enye ọṅụ ha nwere nke ịmara Jehova Chineke, ka ha nwee ekele maka onyinye Ya nile dị ebube nke ihe e kere eke, ka ha ṅụrịakwa ọṅụ n’ịhụnanya obi ebere Ọ na-egosi ha. Pọl dere, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’Onyenwe anyị mgbe nile: m ga-asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ.”—Ndị Filipaị 4:4; Abụ Ọma 104:31.

2. Olileanya dị aṅaa na-eweta oké ọṅụ, gịnịkwa ka a gbara ndị Kraịst ume ime n’ihe banyere olileanya nke a?

2 Ndị Kraịst hà na-agbaso agbamume nke a Pọl nyere? N’ezie ha na-eme otú ahụ! Ụmụnna ime mmụọ nke Jisọs Kraịst na-aṅụrị ọṅụ n’olileanya ahụ dị ebube nke Chineke megheere ha. (Ndị Rom 8:19-21; Ndị Filipaị 3:20, 21) Ee, ha maara na ha ga-ekere òkè n’imezu oké olileanya ahụ maka ọdịnihu nke ihe a kpọrọ mmadụ, ma ndị dị ndụ ma ndị nwụrụ anwụ, site n’iso Kraịst jee ozi n’ọchịchị Alaeze eluigwe ya. Cheedị nnọọ echiche ókè ha ga-enweru n’ọṅụ n’ihe ùgwù ha nile dị ka ndị so na-eketa ihe, ndị na-eje ozi dị ka ndị eze na ndị nchụaja! (Mkpughe 20:6) Lee aha obi ụtọ ga-abụ nke ha ka ha nọ na-enyere ihe a kpọrọ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi aka irute n’izu okè, na-enyekwa aka n’iduzi mweghachite nke Paradaịs n’elu ala anyị! N’eziokwu, ndị ohu Chineke nile nwere ‘olileanya nke ndụ ebighị ebi, nke Chineke, onye na-apụghị ikwu okwu ụgha, kwere nkwa ya tupu mgbe ebighị ebi eruo.’ (Taịtọs 1:2) N’iburu olileanya nke a dị ebube n’uche, Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst nile ume, sị: “Na-akụkụ olileanya unu, na-aṅụrịnụ ọṅụ.”—Ndị Rom 12:12.a

Ezi Ọṅụ—Àgwà nke Dị n’Obi

3, 4. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ “ịṅụrị ọṅụ” pụtara, ugbo olekwa ka ndị Kraịst kwesịrị ịdị na-aṅụrị ọṅụ? (b) Gịnị bụ ezi ọṅụ, gịnịkwa ka ọ dabeere na ya?

3 “Ịṅụrị ọṅụ” pụtara inwe na igosipụta ọṅụ; ọ pụtaghị ịnọgide n’ọnọdụ oké obi ụtọ ma ọ bụ nke oké mkpali mgbe nile. Ngwaa ndị kwekọrọ n’okwu Hibru na Grik ndị e jiri mee ihe n’ime Bible maka “ọṅụ,” “obi ụtọ,” na “ịṅụrị ọṅụ” na-egosipụta ma mmetụta ime obi ma ngosipụta a na-ahụ anya nke ọṅụ. A gbara ndị Kraịst ume ka ha ‘na-aṅụrị ọṅụ,’ ‘na-aṅụrị ọṅụ mgbe nile.’—2 Ndị Kọrint 13:11; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:16.

4 Ma olee ụzọ mmadụ pụrụ isi na-aṅụrị ọṅụ mgbe nile? Nke a kwere omume n’ihi na ezi ọṅụ bụ àgwà nke dị n’obi, àgwà dị n’ime ime obi, nke ime mmụọ. (Deuterọnọmi 28:47; Ilu 15:13; 17:22) Ọ bụ mkpụrụ nke mmụọ Chineke, nke Pọl depụtara kpọmkwem mgbe o desịrị ịhụnanya. (Ndị Galetia 5:22) Dị ka àgwà ime obi, ọ dabereghị n’ihe ndị a na-ahụ anya, ọ dabereghị ọbụna n’ebe ụmụnna anyị nọ. Kama ọ dabeere ná mmụọ nsọ Chineke. Ọ na-abịakwa site n’afọ ojuju ahụ dị omimi dị n’ime obi nke ịmara na i nwere eziokwu ahụ, olileanya Alaeze ahụ, na ị na-emekwa ihe na-atọ Jehova ụtọ. N’ihi ya, ọṅụ abụghị àgwà nkịtị e ji mara mmadụ nke anyị bu pụta ụwa; ọ bụ akụkụ nke ‘mmadụ ọhụrụ ahụ,’ bụ́ nchịkọta nke àgwà dị iche iche ndị mere ka Jisọs Kraịst pụọ iche.—Ndị Efesọs 4:24; Ndị Kọlọsi 3:10.

5. Òle mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka a pụrụ inwe ngosipụta a na-ahụ anya nke ọṅụ?

5 Ọ bụ ezie na ọṅụ bụ àgwà nke ime obi, a pụkwara igosipụta ya mgbe ụfọdụ. Gịnị bụ ngosipụta ụfọdụ ndị a a na-ahụ anya nke ọṅụ? Ha pụrụ ịbụ ihe ọ bụla site n’ihu dị jụụ ruo n’ịmali elu n’ihi ọṅụ. (1 Ndị Eze 1:40; Luk 1:44; Ọrụ 3:8; 6:15) Ya mere nke a ọ̀ pụtara na mmadụ ndị na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu ma ọ bụ ndị na-adịghị emumu ọnụ ọchị mgbe nile enweghị ọṅụ? Ee e! Ezi ọṅụ adịghị egosipụta onwe ya n’ịnọ na-ekwu okwu mgbe nile, na-achị ọchị, na-emumu ọnụ ọchị, ma ọ bụ na-ajakasị eze. Ọnọdụ dị iche iche na-eme ka ọṅụ pụta ìhè n’ụzọ dị iche iche. Ọ bụghị nanị ọṅụ na-eme ka anyị nwee omume enyi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, kama nke ahụ, ọ bụ mmetụta na ịhụnanya ụmụnna anyị nwere.

6. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị iji na-aṅụrị ọṅụ mgbe nile ọbụna mgbe ha na-eche ọnọdụ ndị na-adịghị mma ihu?

6 Ọnọdụ ọṅụ nke na-adịgide adịgide bụ ndịgide ọ na-adịgide n’ime dị ka akụkụ ime obi nke mmadụ ọhụrụ onye Kraịst. Ọ bụ nke a mere o ji kwe omume ịnọ na-aṅụrị ọṅụ mgbe nile. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, a pụrụ inwe ihe na-enye anyị nsogbu, ma ọ bụ anyị pụrụ iche ọnọdụ ndị na-adịghị enye obi ụtọ ihu, ma anyị ka pụrụ inwe ọṅụ n’ime obi anyị. Ụfọdụ ndị Kraịst oge ochie bụ ndị ohu, na-enwe ndị nwe ha, bụ́ ndị ọ na-esi ike ime ihe na-atọ ha ụtọ. Ndị Kraịst dị otú ahụ hà pụrụ ịnọ na-enwe ọṅụ? Ee, n’ihi olileanya Alaeze ha na ọṅụ nke dị n’ime obi ha.—Jọn 15:11; 16:24; 17:13.

7. (a) Gịnị ka Jisọs kwuru banyere inwe ọṅụ n’okpuru mkpagbu? (b) Gịnị na-enyere anyị aka inwe ntachi obi n’okpuru mkpagbu, ònyekwa setịpụrụ ihe nlereanya kachasị mma n’ihe banyere nke a?

7 Ozugbo Pọl onyeozi kwusịrị, sị: “N’akụkụ olileanya unu, na-aṅụrịnụ ọṅụ,” o kwukwara, sị: “N’akụkụ mkpagbu unu, na-enwenụ ntachi obi.” (Ndị Rom 12:12) Jisọs kwukwara okwu banyere inwe ọṅụ n’okpuru mkpagbu mgbe o kwuru na Matiu 5:11, 12, sị: “Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị unu mgbe ọ bụla ha na-ata unu ụta, na-esogbukwa unu . . . ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọọkwa unu ụtọ nke ukwuu: n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe.” Ọ dịghị mkpa na nṅụrị ọṅụ na obi ụtọ dị ukwuu e kwuru okwu ya n’ebe a ga-abụ ngosipụta elu ahụ efu; ọ bụ n’ụzọ bụ isi afọ ojuju ahụ dị omimi dị n’ime nke mmadụ na-enwe n’ihi na ọ na-eme ihe na-atọ Jehova na Jisọs Kraịst ụtọ mgbe ọ na-eguzosi ike n’okpuru ule. (Ọrụ 5:41) N’eziokwu, ọ bụ ọṅụ na-enyere anyị aka inwe ntachi obi mgbe anyị nọ n’okpuru mkpagbu. (1 Ndị Tesalọnaịka 1:6) Na nke a, Jisọs setịpụrụ ihe nlereanya kachasị mma. Akwụkwọ nsọ na-agwa anyị, sị: “N’ihi ọṅụ e debere n’ihu ya, ọ tachiri obi n’osisi ịta ahụhụ.”—Ndị Hibru 12:2, NW.

Ịṅụrị Ọṅụ n’Olileanya ahụ n’Agbanyeghị Ihe Isi Ike

8. Nsogbu dịgasị aṅaa ka ndị Kraịst pụrụ iche ihu, ma n’ihi gịnị ka nsogbu dị iche iche na-adịghị anapụ onye Kraịst ọṅụ ya?

8 Ịbụ ohu Jehova adịghị eme ka mmadụ nwere onwe ya pụọ n’ihe isi ike nile. A pụrụ inwe nsogbu ezinụlọ, ihe isi ike akụ na ụba, ọnọdụ ahụ ike na-adịghị mma, ma ọ bụ ọnwụ nke ndị a hụrụ n’anya. Ọ bụ ezie na ihe ndị dị otú ahụ pụrụ ịkpata iru újú, ha adịghị anapụ anyị ihe ndabere nke nṅụrị ọṅụ anyị n’olileanya Alaeze ahụ, bụ́ ọṅụ ahụ dị omimi nke anyị nwere n’ime obi anyị.—1 Ndị Tesalọnaịka 4:13.

9. Nsogbu dịgasị aṅaa ka Abraham nwere, oleekwa ụzọ anyị si mara na o nwere ọṅụ n’ime obi ya?

9 Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Abraham. Ndụ abụrụghị ya ihe ụtọ mgbe nile. O nwere nsogbu ezinụlọ. Iko ya nwanyị, bụ́ Hega, na nwunye ya, bụ́ Sera, adịghị ná mma. E nwere esemokwu. (Jenesis 16:4, 5) Ishmael chịrị Aịsak ọchị, na-akpagbukwa ya. (Jenesis 21:8, 9; Ndị Galetia 4:29) N’ikpeazụ, nwunye Abraham ọ hụrụ n’anya, bụ́ Sera nwụrụ. (Jenesis 23:2) N’agbanyeghị nsogbu ndị a, ọ ṅụrịrị ọṅụ n’ihi olileanya nke Mkpụrụ Alaeze ahụ, bụ́ Mkpụrụ nke Abraham, onye ezinụlọ dum nke ụwa ga-esite na ya gọzie onwe ha. (Jenesis 22:15-18) Site n’ọṅụ nke dị n’ime obi ya, ọ tachiri obi n’ijere Jehova ozi ruo otu narị afọ mgbe ọ hapụsịrị obodo nke aka ya bụ Ua. N’ihi nke a, e dere banyere ya, sị: “Ọ na-ele anya obodo ahụ nke nwere ntọala ahụ, nke Chineke bụ onye ọkà ya na onye rụrụ ya.” N’ihi okwukwe Abraham nwere n’Alaeze Mesaịa ahụ nke na-abịanụ, Onyenwe anyị Jisọs, mgbe Chineke họpụtasịworo ya rịị ịbụ Eze, pụrụ ikwu, sị: “Obi tọrọ . . . Abraham ụtọ nke ukwuu ịhụ ụbọchị m; o wee hụ ya, ṅụrịakwa ọṅụ.”—Ndị Hibru 11:10; Jọn 8:56.

10, 11. (a) Ịgba mgba dị aṅaa ka anyị nwere dị ka ndị Kraịst, oleekwa ụzọ a na-esi adọpụta anyị? (b) Gịnị na-emejuru anyị ike anyị na-enweghị ịlụ ọgụ ahụ megide anụ ahụ anyị nke na-emehie emehie n’ụzọ zuru okè?

10 Dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, anyị nwekwara anụ ahụ anyị nke na-emehie emehie dị ka ihe anyị ga-alụso ọgụ, ịgba mgba nke a nke ime ihe dị mma pụkwara iweta oké ihe isi ike. Ma, ọgụ anyị na-alụso adịghị ike anyị nile apụtaghị na anyị enweghị olileanya. Pọl nwere nhụjuanya n’ihi mburịta agha nke a, o kwukwara, sị: “Ònye ga-adọpụta m n’ahụ nke ọnwụ a? Ma ekele dịrị Chineke ná ndọpụta sitere n’aka Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 7:24, 25) Site na Jisọs Kraịst na ihe mgbapụta ahụ o nyere, a na-adọpụta anyị.—Ndị Rom 5:19-21.

11 Àjà mgbapụta Kraịst na-emejuru anyị ike anyị na-enweghị ịlụ ọgụ ahụ n’ụzọ zuru okè. Anyị pụrụ ịṅụrị ọṅụ n’ihe mgbapụta nke a n’ihi na ọ na-eme ka o kwe omume anyị inwe akọ na uche e mere ka ọ dị ọcha na mgbaghara nke mmehie anyị nile. Ná Ndị Hibru 9:14, Pọl kwuru okwu banyere “ọbara Kraịst” nke nwere ike “ime akọ na uche anyị ka ọ dị karị ọcha nke ukwuu hie nne pụọ n’ọrụ nile nwụrụ anwụ.” Otú a, ọ dịghị mkpa ka akọ na uche ndị Kraịst bụrụ nke e bogburu n’ibu nke nkatọ na mmetụta amamikpe. Nke a, tinyere olileanya ahụ anyị nwere, mejupụtara ihe siri ike nke na-eme ka anyị jiri ọṅụ nwee obi ụtọ. (Abụ Ọma 103:8-14; Ndị Rom 8:1, 2, 32) N’ịtụgharị uche n’olileanya anyị, anyị nile ga-abụ ndị a gbara ume ibu agha ahụ n’ụzọ gara nke ọma.

Idebe Olileanya Anyị Nso n’Uche

12. Olileanya dị aṅaa ka ndị Kraịst e tere mmanụ pụrụ inwe?

12 Ọ dị mkpa ka ma ihe ahụ fọdụrụ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ma atụrụ ọzọ ahụ buru ‘olileanya nzọpụta’ ha n’uche, na-eyikwasị ya dị ka okpu agha nke nchebe. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:8) Ndị Kraịst e tere mmanụ pụrụ ịtụgharị uche n’ihe ùgwù dị ebube nke inweta anwụghị anwụ n’eluigwe, na-enwe ike irute Jehova Chineke nso, na-enwekwa mmekọrịta onwe onye n’etiti ha na Jisọs Kraịst ahụ e meworo ka ọ dị ebube na ndị ozi ahụ na ndị ọzọ so na 144,000, ndị ahụ nọgidere ná nguzosi ike ha n’ezi ihe n’ọtụtụ narị afọ gaworo aga. Lee nnọọ ezi mkpakọrịta a na-apụghị ịkọwa akọwa nke a bụ!

13. Olee mmetụta ndị e tere mmanụ ka nọ n’elu ala na-enwe banyere olileanya ha?

13 Olee mmetụta mmadụ ole na ole ahụ fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ n’elu ala na-enwe banyere olileanya Alaeze ha? A pụrụ ịchịkọta nke a n’okwu F. W. Franz kwuru, bụ́ onye isi oche nke Watch Tower Society, onye e mere baptism na 1913: “Olileanya anyị bụ ihe e ji n’aka, a ga-emezu ya n’ụzọ zuru ezu nye nke ọ bụla n’ime 144,000 ndị so n’ìgwè atụrụ nta ahụ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ karịrị ọbụna ihe anyị cheworo n’echiche mgbe ọ bụla. Anyị, ndị so n’ihe ahụ fọdụrụ, bụ́ ndị nọ ya na 1914, mgbe anyị tụrụ anya na anyị nile ga-eje eluigwe, atụfubeghị echiche anyị nke uru nke olileanya ahụ. Ma anyị ka jigidesiri ya ike dị ka anyị ji ya na mbụ, anyị na-enwekwa ekele maka ya karị ka anyị na-echerekwu ruo ogologo oge maka mmezu ya. Ọ bụ ihe kwesịrị ichere, ọbụna ma a sị na ọ chọrọ ka e chere ya ruo otu nde afọ. Eji m olileanya anyị kpọrọ ihe dị oké ọnụ ahịa karịa mgbe ọ bụla na mbụ, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla m chọrọ ka obi ekele m nwere maka ya funarị m. Olileanya nke ìgwè atụrụ nta ahụ na-emekwa ka ọ bụrụ ihe e ji n’aka na ihe oké ìgwè mmadụ ahụ na-atụ anya ya ga-emezu karịa otú kasị mma anyị chetụworo ya, n’enweghị obi abụọ ọ bụla ma ọ̀ ga-emekwa eme. Ọ bụ ya mere anyị ji ejigidesi aka ike ruo kpọmkwem n’oge hour nke a, anyị ga-anọkwa na-ejigidesi aka ike ruo mgbe Chineke ga-egosipụtaworị n’ezie na ya ga-emezu ‘nkwa nile ahụ dị oké ọnụ ahịa, dịkwa ukwuu hie nne.’”—2 Pita 1:4; Ọnụ Ọgụgụ 23:19; Ndị Rom 5:5.

Ịṅụrị Ọṅụ Ugbu a n’Olileanya Paradaịs Ahụ

14. Olileanya dị aṅaa ka ọ dị mkpa ka oké ìgwè mmadụ ahụ buru n’uche?

14 Nkwupụta dị otú ahụ nke okwukwe e ji ọṅụ nwee na-akụnye n’ime ndị ahụ so n’oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ oké ihe ndị mere ha ga-eji ṅụrịa ọṅụ. (Mkpughe 7:15, 16) Ọ dị mkpa ka ndị dị otú ahụ buru n’uche olileanya nke ịlanarị Amagedọn. Ee, na-atụ anya ịhụ ka Alaeze Chineke wepụrụ ịbụ ọkaaka eluigwe na ala dum nke Jehova n’ụta, meekwa ka aha ya dị ebube dị nsọ site n’iweta oké mkpagbu ahụ, nke ga-asachapụ ajọ mmadụ nile n’ụwa, bụ́ ndị Ekwensu bụwooro chi. Lee nnọọ ọṅụ ọ ga-abụ ịlanarị oké mkpagbu ahụ!—Daniel 2:44; Mkpughe 7:14.

15. (a) Ọrụ ọgwụgwọ ọrịa dị aṅaa ka Jisọs rụrụ mgbe ọ nọ n’elu ala, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Gịnị ga-abụ mkpa ahụ ike nke ndị lanarịrị Amagedọn, n’ihi gịnịkwa ka ha ji dị iche site ná ndị ahụ e mere ka ha bilite n’ọnwụ?

15 Banyere oké ìgwè mmadụ ahụ, Mkpughe 7:17 na-asị: “Nwa Atụrụ ahụ . . . ga-azụ ha dị ka atụrụ, ọ ga-edurukwa ha gaa n’isi iyi nke mmiri nke ndụ: Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha.” Ọ bụ ezie na amụma nke a nwere mmezu ime mmụọ ugbu a, ndị lanarịrị Amagedọn ga-ahụ ka e mezuru ya n’ụzọ nkịtị. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Ee, gịnị ka Jisọs mere mgbe ọ nọ n’elu ala? Ọ gwọrọ ndị nwere nkwarụ, mee ka ndị ngwụrọ gaa ije, meghee ntị nke ndị ntị chiri na anya nke ndị ìsì, ọ gwọrọ ọrịa ekpenta, ọrịa ahụ mkpọnwụ, na “ọrịa nile dị iche iche na nrịrịa nile dị iche iche.” (Matiu 9:35; 15:30, 31) Nke ahụ ọ́ bụghị ihe dị ndị Kraịst mkpa taa? Oké ìgwè mmadụ ahụ ga-eburu nkwarụ na ahụ esighị ike nile nke ụwa ochie nke a banye n’ime ụwa ọhụrụ ahụ. Gịnị ka anyị tụrụ anya ka Nwa Atụrụ ahụ mee banyere nke ahụ? Mkpa nke ndị lanarịrị Amagedọn ga-adị iche ná mkpa nke ndị a ga-eme ka ha si n’ọnwụ bilite. O yiri ka ndị ahụ si n’ọnwụ bilite hà ga-abụ ndị e keghachiri, na-enwe ahụ zuru ezu, n’enweghị ntụpọ, nweekwa ahụ ike, ọ bụ ezie na ha enwebeghị izu okè nke mmadụ. N’ihi ọrụ ebube nke mbilite n’ọnwụ, o yighị ka ọ̀ ga-adị ha mkpa mgbe nke ahụ gasịrị, inwe ndozi nke nkwarụ ndị e nweburu mbụ site n’ọrụ ebube nke ịgwọ ọrịa. N’aka nke ọzọ, n’ihi ahụmahụ ha nke pụrụ iche nke ịlanarị Amagedọn, idozi nkwarụ n’ụzọ ọrụ ebube bụ ihe ọtụtụ ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ ga-achọ, ọ bụkwa ihe ha ga-enweta. Ọ pụtara ìhè na otu nzube bụ isi nke ọgwụgwọ ndị Jisọs gwọrọ bụ iji seere oké ìgwè mmadụ ahụ onyinyo nke olileanya ahụ na-enye ọṅụ nke bụ na ọ bụghị nanị na ha ga-alanarị, kama na a ga-agwọkwa ha ọrịa mgbe nke ahụ gasịrị, maka agbamume ha.

16. (a) Olee mgbe ọgwụgwọ ọrụ ebube nke ndị lanarịrị Amagedọn pụrụ iwere ọnọdụ, gịnịkwa ga-esi na ya pụta? (b) N’olileanya dị aṅaa ka anyị ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ n’ime Narị Afọ Iri ahụ?

16 N’ụzọ ezi uche dị na ya, ọgwụgwọ ọrụ ebube dị otú ahụ ga-ewere ọnọdụ n’etiti ndị lanarịrị Amagedọn n’oge na-adịghị oké anya mgbe Amagedọn gasịrị, n’ezi oge tupu mbilite n’ọnwụ ahụ amalite. (Aịsaịa 33:24; 35:5, 6; Mkpughe 21:4; tụlee Mak 5:25-29.) Mgbe ahụ, ụmụ mmadụ ga-atụfusị enyo anya, mkpara, osisi mkpaabụ e ji aga ije, oche ndị ngwụrọ, ihe ndị e ji dochie anya ézé ndị dapụsịrị adapụsị, ihe ndị na-enye aka ịnụ ihe nke ọma, na ihe ndị yiri ha. Lee nnọọ ihe na-enye ọṅụ ọ ga-abụ! Lee nnọọ ụzọ dị mma ọrụ mweghachi dị otú ahụ Jisọs ga-arụ n’ezigbo oge ga-esi kwekọọ n’ọrụ ndị lanarịrị Amagedọn ga-arụ dị ka ntọala nke ụwa ọhụrụ ahụ! A ga-ewepụchasị ọrịa ndị na-akpata nkwarụ ka ndị a lanarịrịnụ nwee ike iji ịnụ ọkụ n’obi na-aga n’ihu, na-enwesi olileanya ike maka ọrụ dị ebube nke a ga-arụ n’ime Narị Afọ Iri ahụ nke na-agbatịpụ ha n’ihu, n’abụghị ndị ihe isi ike ọ bụla nke ụwa ochie ahụ pụrụ iwetaworo ha na-adọghachi azụ. Mmadụ nile ndị ga-anọkwa n’ime Narị Afọ Iri ahụ ga-aṅụrị ọṅụ n’olileanya ahụ nke iru n’ozuzu nke ndụ mmadụ zuru okè n’ọgwụgwụ nke puku afọ ahụ.

17. Ọṅụ dịgasị aṅaa ka a ga-enwe ka ọrụ nke iweghachite Paradaịs na-aga n’ihu?

17 Ọ bụrụ na nke ahụ bụ olileanya gị, tụgharịakwa uche n’ọṅụ nke ikere òkè n’iweghachite Paradaịs n’elu ala. (Luk 23:42, 43) Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na ndị lanarịrị Amagedọn ga-enye aka n’ime ka ụwa dị ọcha, wee si otú a mee ka e nwee ebe ndị dị mma a ga-akpọghachite ndị nwụrụ anwụ na ha. A pụrụ iji nnọkọ nnabata nke ndị ahụ a kpọlitere n’oge mbilite n’ọnwụ ahụ, gụnyere ndị anyị hụrụ n’anya daworo n’ụra ọnwụ, dochie anya nnọkọ olili ozu. Cheekwa echiche banyere mkpakọrịta na-enye obi ụtọ dị ukwuu nke a ga-eso ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi site na narị afọ ndị gafeworo agafe wee nwee. Olee onye ọ ga-amasịkarị gị iso kwurịta okwu? Ọ̀ bụ Ebel, Ịnọk, Noa, Job, Abraham, Sera, Aịsak, Jekọb, Josef, Mosis, Joshua, Rehab, Debọra, Samsọn, Devid, Elaịja, Elaịsha, Jeremaịa, Ezikiel, Daniel, ka ọ̀ bụ Jọn Onye Na-eme Baptism? Ya bụrụ otú ahụ, olileanya nke a na-enye obi ụtọ bụkwa akụkụ nke ihe ị na-atụ anya ya. Ị ga-enwe ike iso ha kparịta ụka, mụta ihe site n’ọnụ ha, sorokwa ha rụkọọ ọrụ n’ime ka elu ala dum ghọọ paradaịs.

18. Ọṅụ ndị ọzọ dị aṅaa ka anyị pụrụ ịtụgharị uche na ha?

18 Cheekwa echiche banyere nri dị mma, mmiri dị ọcha, na ikuku dị ọcha, ebe e weghachiworo elu ala anyị ná nhazi nke ihe ndị dị na ya n’ụzọ Jehova kere ya ka ọ dịrị. Ndụ a na-adị mgbe ahụ agaghị abụ ịnọ nkịtị na-ekpori ndụ n’izu okè, kama ọ ga-abụ ịrụsi ọrụ ike na ikere òkè n’ụzọ bara uru n’ọrụ ndị na-enye ọṅụ. Tụgharịa uche banyere òtù ụmụ mmadụ zuru ụwa ọnụ nke na-enweghị imempụ, ibuli onwe onye elu, ikwo ekworo, esemokwu—òtù ụmụnna ebe mmadụ nile na-azụlite, na-amịpụtakwa mkpụrụ nke mmụọ ahụ. Lee ka nke a si bụrụ ihe na-akpali akpali!—Ndị Galetia 5:22, 23.

Olileanya nke Na-eme Ka Ndụ Bụrụ Ihe E Kwesịrị Ịdị Adị

19. (a) Olee mgbe a ga-enwe nṅụrị ọṅụ ahụ nke e hotara ná Ndị Rom 12:12? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ịghara ikwe ka ibu arọ nile nke ndụ kwazụga olileanya anyị n’ụsọ?

19 E mezuhaala ihe a na-atụ anya ya, ọ bụghịzikwa olileanya, ya mere, nṅụrị ọṅụ ahụ nke Pọl gbara ume ya ná Ndị Rom 12:12 bụ nke a ga-enwe ugbu a. (Ndị Rom 8:24) Nanị iche echiche banyere ngọzi ọdịnihu ndị Alaeze Chineke ga-eweta bụ ihe mere anyị ga-eji ṅụrịa ọṅụ n’olileanya ahụ ugbu a. Ya mere, kpebisie ike ịghara ikwe ka ibu nile nke ndụ a na-adị n’ime ụwa nke rụrụ arụ kwazụga olileanya dị ebube i nwere n’ụsọ. Ekwela ka ike gwụ gị ma ọ bụ ka ị kụda aka, na-akwụsị ilekwasị anya n’olileanya na-eche gị n’ihu. (Ndị Hibru 12:3) Ịgbakụta ụzọ ndị Kraịst azụ agaghị egbo mkpa gị nile. Cheta, ọ bụrụ na mmadụ akwụsị ijere Chineke ozi n’ihi ibu arọ nile nke ndụ a na-adị ugbu a, ibu arọ ndị ahụ ka ga-adịkwasị ya, ma olileanya na-efunarị ya, ọ na-atụfukwa ọnọdụ nke ịbụ onye nwere ike ịṅụrị ọṅụ n’ihe ndị dị ebube a na-atụ anya ha n’ọdịnihu.

20. Mmetụta dị aṅaa ka olileanya Alaeze ahụ na-enwe n’ahụ ndị nakweere ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

20 Ndị Jehova nwere ezi ihe mere ha ga-eji nwee ndụ obi ụtọ. Olileanya ọma ha nke na-akpali akpali na-eme ka ndụ bụrụ ihe e kwesịrị ịdị adị. Ha adịghị edebekwa olileanya nke a na-enye ọṅụ maka nanị onwe ha. Ee e, ha na-agbalịsi ike iso ndị ọzọ kerịta ya. (2 Ndị Kọrint 3:12) Otú ahụ ka o si bụrụ na ndị ahụ na-anabata olileanya Alaeze ahụ bụ ndị nwere obi ike, ha na-achọkwa ịgba ndị ọzọ ume site n’ịgwa ha ozi ọma sitere n’ebe Chineke nọ. Nke a na-eji olileanya kasị dịrị ebube e nyetụworo ihe a kpọrọ mmadụ mgbe ọ bụla mejupụta ndụ nke ndị nakweere ozi ahụ—olileanya nke Alaeze ahụ nke ga-eweghachite Paradaịs n’elu ala. Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ anakwereghị ozi ọma ahụ, anyị na-anọgide na-enwe ọṅụ n’ihi na anyị nwere olileanya ahụ. Ọ bụ ndị ahụ na-ajụ ịnụrụ ya ka ihe na-efunarị; ọ bụghị anyị onwe anyị.—2 Ndị Kọrint 4:3, 4.

21. Gịnị dị ezi nso ugbu a, oleekwa ụzọ anyị kwesịrị isi lee olileanya anyị anya?

21 Nkwa Chineke bụ: “Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ.” (Mkpughe 21:5) Ụwa ọhụrụ ahụ, ya na ngọzi ya nile na-akpali akpali ndị na-adịghị agwụkwa agwụ dị nso. Olileanya anyị—maka ndụ n’eluigwe ma ọ bụ n’elu ala nke bụ paradaịs—bụ ihe dị oké ọnụ ahịa; jigidesie ya aka ike. N’oge ikpeazụ ndị a dị oké egwu, karịa otú i meworo na mbụ, lee ya anya “dị ka arịlịka nke mkpụrụ obi, nke bụ ihe e ji n’aka na ihe na-eguzosi ike.” Ebe anyị kedosiri olileanya anyị ike n’ebe Jehova nọ, bụ́ “oké nkume na-adịru mgbe ebighị ebi—Oké Nkume nke ọgbọ nile,” o doro anya na anyị nwere ihe siri ike, na-enyekwa ọṅụ ugbu a mere anyị ga-eji ‘ṅụrịa ọṅụ n’olileanya ahụ’ nke e debere anyị n’ihu.—Ndị Hibru 6:19; Aịsaịa 26:4, The Amplified Bible.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’ime afọ 1992, Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa ga-enwe dị ka isiokwu na-eduzi afọ ahụ: ‘Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’olileanya unu. . . . Na-anọgidesinụ ike n’ekpere unu.’—Ndị Rom 12:12.

Ajụjụ Maka Ntụleghachi

◻ Gịnị bụ olileanya kasị ukwuu ihe a kpọrọ mmadụ nwere?

◻ Gịnị bụ ezi ọṅụ?

◻ Olee mgbe o yiri ka ọgwụgwọ ọrụ ebube nke ndị lanarịrị Amagedọn ga-ewere ọnọdụ?

◻ N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị ikwe ka ibu nile nke ndụ kwazụga olileanya anyị n’ụsọ?

◻ Ọṅụ dịgasị aṅaa ka ị na-ele anya ha n’ime ụwa ọhụrụ ahụ?

[Foto dị na peeji nke 9]

Ọṅụ ọ́ gaghị ejupụta obi gị ịhụ ụdị ọgwụgwọ ndị Jisọs gwọrọ?

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndị na-aṅụrị ọṅụ n’Alaeze ahụ na-agba ndị ọzọ ume site n’iso ha kerịta olileanya ha

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya