-
‘Ya Mere, Gaanụ Mee Ndị Na-eso Ụzọ’Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2020 | Jenụwarị
-
-
1-2. Olee ihe mmụọ ozi gwara ụmụ nwaanyị ahụ n’ebe e liri Jizọs, oleekwa ihe Jizọs gwara ha ka ha mee?
N’ISI ụtụtụ, n’abalị iri na isii n’ọnwa Naịsan afọ 33, ụfọdụ ụmụ nwaanyị na-atụ egwu Chineke gara n’ili Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Anya mmiri juru ha n’anya. O ruwela abalị abụọ kemgbe e liri ya. Ha gara ebe ahụ ka ha tee ozu Jizọs mmanụ na-esi ísì ụtọ. Mgbe ha ruru ebe ahụ, o juru ha anya na ozu Jizọs adịghịzi n’ili ahụ. Otu mmụọ ozi gwara ha na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ. Ọ gwakwara ha, sị: “O buruwo unu ụzọ gawa Galili; n’ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya.”—Mat. 28:1-7; Luk 23:56; 24:10.
-
-
‘Ya Mere, Gaanụ Mee Ndị Na-eso Ụzọ’Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2020 | Jenụwarị
-
-
4 Jizọs chọrọ ka ndị niile na-eso ụzọ ya na-ekwusa ozi ọma. Ọ bụghị naanị ndịozi ya iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi ka o nyere iwu ahụ. Olee otú anyị si mata? Ọ̀ bụ naanị ndịozi Jizọs nọ mgbe o nyere iwu ahụ n’ugwu dị na Galili? Cheta na mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwaanyị ahụ bịara n’ili Jizọs, sị: “[Na Galili] ka unu ga-ahụ ya.” N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na ụmụ nwaanyị kwesịrị ntụkwasị obi so gaa nnọkọ ahụ. Ma, e nwere ihe ọzọ. Pọl onyeozi kwuru na Jizọs “pụtara n’ihu ihe karịrị narị ụmụnna ise n’otu mgbe.” (1 Kọr. 15:6) N’ebee?
-