Ndụ na Ije Ozi Jisọs
Jisọs Dị Ndụ!
MGBE ndị inyom ahụ hụrụ na ili Jisọs tọgbọrọ n’efu, Meri Magdalini gbapụrụ ije kọọrọ Pita na Jọn. Otú ọ dị, o yiri ka ndị inyom ndị ọzọ ahụ nọdụrụ n’akụkụ ili ahụ. N’oge na-adịghị anya, otu mmụọ ozi bịara wee gwa ha ka ha bata n’ime.
N’ebe a, ndị inyom ahụ hụkwara mmụọ ozi ọzọ, otu n’ime mmụọ ozi ndị ahụ wee gwa ha, sị: ‘Unu onwe unu atụla egwu: n’ihi na amatawo m na unu na-achọ Jisọs, onye a kpọgbuworo. Ọ nọghị n’ebe a; n’ihi na e mere ka o si n’ọnwụ bilie, dị ka o kwuru. Bịanụ, lee ebe ọ tọgbọrọ. Gaakwanụ ọsọ ọsọ, gwa ndị na-eso ụzọ ya na e mere ka o si n’ọnwụ bilie.’ Ya mere, site n’egwu na oké ọṅụ, ndị inyom ndị a gbapụkwara ọsọ.
Ka ọ dị ugbu a, Meri achọtawo Pita na Jọn, o wee kọọrọ ha, sị: “Ha ebupụwo Onyenwe anyị n’ili, anyị amataghịkwa ebe ha tọgbọrọ ya.” Ozugbo ahụ, ndị ozi abụọ ahụ wee gbapụ ọsọ. Jọn na-agbasi ọsọ ike karị—ihe àmà gosiri na ọ bụ okorobịa karị—o wee buru ụzọ ruo ebe ili ahụ dị. Ka ọ di ugbu a, ndị inyom ahụ apụworị, ya mere ọ dịghị onye nọ n’ebe ahụ. N’ihulata ala, Jọn lebara anya n’ime ili ahụ wee hụ ihe okike ndị ahụ, ma ọ nọdụrụ n’abanyeghị n’ime.
Mgbe Pita bịarutere, o cheretụghị echeretụ kama ọ banyere n’ime ozugbo. Ọ hụrụ ihe okike ndị ahụ ka ha chịsa n’ebe ahụ, hụkwa ákwà ahụ e ji fụchie isi Jisọs. A pịakọtara ya apịakọta wee debe ya n’otu ebe. Jọn batakwara n’ime ili ahụ ugbu a, o wee kwere ihe ahụ Meri gwara ha. Ma Pita ma Jọn adịghị nke ọ bụla ghọtara na a kpọlitewo Jisọs site n’ọnwụ, ọ bụ ezie na Ọ gwawo ha na a ga-akpọlite Ya. N’ịbụ ndị nke a gbagwojuru anya, ha laghachiri n’ụlọ ha, ma Meri, bụ́ onye bịaghachiworo n’ili ahụ, nọgidere n’ebe ahụ.
Ka ọ dị mgbe ahụ, ndị inyom ndị ọzọ ahụ na-aga ọsọ ọsọ ịkọrọ ndị na-eso ụzọ na a kpọlitewo Jisọs site n’ọnwụ, dị ka ndị mmụọ ozi ahụ nyere ha iwu ime. Ka ha nọ na-agba ọsọ ruo ókè ha nwere ike, Jisọs zutere ha wee sị: “Ṅụrịanụ ọṅụ.” Mgbe ha dara n’ụkwụ ya, ha kpọrọ isi ala nye ya. Mgbe ahụ, Jisọs sịrị: “Unu atụla egwu: jeenụ kọọrọ ụmụnna m ka ha jee Galili, n’ebe ahụ ka ha ga-ahụkwa m.”
Tupu mgbe ahụ, mgbe ala ọma jijiji ahụ mere, ndị mmụọ ozi wee pụtakwa, ibubo nwụrụ ndị agha na-eche nche n’ebe ahụ n’ahụ nke ukwuu nke na ha dị ka ndị nwụrụ anwụ. Mgbe ha mataghachiri onwe ha, ha banyere n’ime obodo ahụ ozugbo wee kọọrọ ndị isi nchụaja ihe meworonụ. Mgbe ha na “ndị okenye” nke ndị Juu kwurịtasịrị okwu, e mere mkpebi ịgbalị izochi ihe ahụ merenụ site n’inye ndị agha ahụ ihe iri ngó. A gwara ha, sị: “Sịnụ, Ndị na-eso ụzọ ya bịara n’abalị, zuru ya n’ohi mgbe anyị na-arahụ ụra.”
Ebe ọ bụ na a pụrụ igbu ndị agha Rom egbu maka ihi ụra n’ihu ọrụ ha, ndị nchụaja ahụ kwere nkwa, sị: “Ọ bụrụkwa na [akụkọ banyere ihi ụra unu] nke a ruru ntị onye isi, anyị onwe anyị ga-arafu ya, mee ka unu ghara ichegbu onwe unu.” Ebe ọ bụ na ihe iri ngó e nyere ha buru ibu nke ukwuu, ndị agha ahụ mere dị ka a gwara ha. N’ihi nke a, akụkọ ụgha ahụ nke bụ na e zuuru anụ ahụ Jisọs n’ohi gbasara ebe dum n’etiti ndị Juu.
Iru újú rikpuru Meri Magdalini, bụ́ onye nọgidere n’ebe ili ahụ. Olee ebe ọ pụrụ ịbụ na Jisọs nọ? N’ihulata ala wee leba anya n’ime ili ahụ, ọ hụrụ ndị mmụọ ozi abụọ ahụ yi uwe mwụda dị ọcha, ndị pụtaghachiworonụ! Otu na-anọdụ n’isi, nke ọzọkwa n’ebe ụkwụ nke ebe ahụ ozu Jisọs tọgbọbu. Ha jụrụ, sị, “Nwanyị, gịnị mere ị na-akwa ákwá?”
Meri zaghachiri, sị, “N’ihi na ha bupụrụ Onyenwe m, amataghịkwa m ebe ha tọgbọrọ ya.” Mgbe ahụ, o wee tụgharịa ma hụ onye jụghachiri ya ajụjụ ahụ, sị: “Nwanyị, gịnị mere ị na-akwa ákwá?” Onye nke a jụkwara, sị: “Ònye ka ị na-achọ?”
N’iche na onye a bụ onye na-elekọta ogige nke ili ahụ dị n’ime ya, ọ gwara ya, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na gị onwe gị bupụrụ ya, gwa m ebe ị tọgbọrọ ya, mụ onwe m ga-ebupụkwa ya.”
Onye ahụ sịrị, “Meri.” Ozugbo ahụ, site n’ụzọ ahụ ọ na-esi agwa ya okwu, bụ́ nke ọ maara nke ọma, ọ matara na ọ bụ Jisọs. O tiri mkpu, sị, “Rabonaị!” (nke pụtara “Onye Ozizi!”). N’ihi inwe oké ọṅụ, ọ makụrụ ya. Ma Jisọs sịrị: “Emetụla m aka; n’ihi na akarịgoghị m lakwuru Nna m: ma gakwuru ụmụnna m, sị ha, Ana m arịgo lakwuru Nna m na Nna unu, na Chineke m na Chineke unu.”
Ugbu a, Meri gbapụrụ jee n’ebe ndị ozi na ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ zukọtaworo. Ọ tụkwasịrị akụkọ nke ya n’ihe ndị inyom ndị ọzọ ahụ kọworo banyere ịhụ Jisọs ahụ nke e meworo ka o si n’ọnwụ bilie. Ma n’agbanyeghị nke a, o yiri ka ndị ikom ahụ, bụ́ ndị na-ekwenyeghị ihe ndị inyom mbụ ahụ kwuru, ekwenyeghịkwa ihe ndị inyom ahụ kwuru. Matiu 28:3-15; Mak 16:5-8; Luk 24:4-12; Jọn 20:2-18.
◆ Mgbe ha hụsịrị na ili ahụ tọgbọrọ n’efu, gịnị ka Meri Magdalini mere, oleekwa ahụmahụ ndị inyom ndị ọzọ ahụ nwere?
◆ Gịnị bụ mmeghachi omume Pita na Jọn mgbe ha hụrụ na ili ahụ tọgbọrọ n’efu?
◆ Gịnị ka ndị inyom ndị ọzọ ahụ zutere mgbe ha nọ n’ụzọ ije kọọrọ ndị na-eso ụzọ Jisọs banyere mbilite n’ọnwụ ya?
◆ Gịnị mere ndị agha na-eche nche n’ebe ahụ, gịnịkwa ka e mere mgbe ha kọọrọ ndị nchụaja akụkọ ha?
◆ Gịnị mere mgbe Meri Magdalini nọ nanị ya n’ili ahụ, mmeghachi omume dịkwa aṅaa ka ndị na-eso ụzọ mere banyere akụkọ ndị inyom ahụ?