“Mee Ndị nke Mba Nile Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ”
“YA MERE, gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, na-eme ha baptism n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” Nke a bụ otú New World Translation si sụgharịa iwu Jisọs nke dị na Matiu 28:19. Otú ọ dị, a katọwo nsụgharị a. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ nta okpukpe na-azọrọ: “Nanị nsụgharị ihe odide Grik pụrụ ịnabata bụ: ‘Mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ!’” Nke a ọ̀ bụ eziokwu?
Nsụgharị a, “Mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ,” pụtara n’ọtụtụ nsụgharị Bible, ọ bụkwa nsụgharị nkịtị nke okwu Grik ahụ. Ya mere, olee ihe ndabere e nwere maka nsụgharị bụ́, “Mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, na-eme ha baptism”? Ihe a na-ekwu. N’ụzọ doro anya, okwu ahụ bụ́ “na-eme ha baptism” na-ezo aka n’ebe ndị mmadụ nọ, ọ bụghị n’ebe mba nile nọ. Onye Germany bụ́ ọkà mmụta bụ́ Hans Bruns na-ekwu: “[Okwu] ahụ bụ́ ‘ha’ adịghị ezo aka ná mba nile (nke Grik ya nwere ọdịiche pụtara ìhè), kama ná ndị mmadụ nọ ná mba nile.”
Ọzọ, e kwesịrị ịtụle ụzọ e si mezuo iwu Jisọs. Banyere ozi Pọl na Banabas na Dabe, obodo ukwu dị n’Asia Minor, anyị na-agụ: “Mgbe ha zisasịịrị obodo ahụ ozi ọma, meekwa ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị na-eso ụzọ, ha laghachiri na Listra, na Aịkọniọm, na Antiọk.” (Ọrụ 14:21, NW) Rịba ama na Pọl na Banabas mere ka, ọ bụghị obodo Dabe, kama ụfọdụ ndị Dabe ghọọ ndị na-eso ụzọ.
N’ụzọ yiri nke ahụ, banyere oge ọgwụgwụ, akwụkwọ Mkpughe buru amụma, ọ bụghị na mba nile ga-efe Chineke, kama na “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile na ndị nile na asụsụ nile” ga-eme otú ahụ. (Mkpughe 7:9, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Otú a, a na-ewepụ nsụgharị New World Translation n’ụta dị ka nsụgharị a pụrụ ịtụkwasị obi nke ‘Akwụkwọ Nsọ nile, nke si n’obi Chineke pụta.’—2 Timoti 3:16.