Ezi Omume Abụghị Site n’Omenala A Kụziri n’Okwu Ọnụ
“Ọ bụrụ na ezi omume unu adịghị akarị ezi omume ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nke ukwuu, unu agaghị aba n’alaeze eluigwe ma ọlị.”—MATIU 5:20.
1, 2. Gịnị mere nwa mgbe nta tupu Jisọs ezie Ozizi Elu Ugwu ya?
JISỌS anọwo abalị ahụ dum n’elu ugwu. Eluigwe nke jupụtara na kpakpando gbasapụrụ n’elu isi ya. Ụmụ anụ nta ndị na-aga n’abalị na-agbagharị wee na-eme ụmụ obere mkpatụ n’ime ọhịa. N’ebe ọwụwa anyanwụ, mmiri nke Osimiri Galili na-eme obere mkpatụ n’ụsọ osimiri ahụ. Ma ọ pụrụ ịbụ na Jisọs amachaghị banyere ịdị nwayọọ na ịma mma nke gbara ya gburugburu. Ọ nọwo na-ekpe ekpere ogologo abalị ahụ nile nye Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova. Ọ dị ya mkpa inweta nduzi nke Nna ya. Ụbọchị na-eche ya ihu dị oké mkpa.
2 N’ebe ọwụwa anyanwụ, ihu eluigwe ji nwayọọ nwayọọ na-agbasawanye. Nnụnụ dị iche iche malitere ifegharị, jirikwa olu dị nwayọọ na-ebe ube ha. Okooko osisi dị iche iche na-efegharịkwa mgbe ifufe na-ebugharị ha. Ka ìhè anyanwụ mbụ wapụtara, Jisọs kpọkọtara ndị na-eso ụzọ ya n’ebe ọ nọ wee site n’etiti ha họpụta 12 ịbụ ndị ozi ya. Mgbe ahụ, ọ kpọọrọ ha nile malite ịrịdata akụkụ ugwu ahụ. A malitelarị ịhụ ìgwè mmadụ ndị na-enubata site na Galili, Taịa na Saịdọn, Judia na Jerusalem. Ha bịara ka a gwọọ ha ọrịa ha dị iche iche. Ike sitere n’aka Jehova si n’ahụ Jisọs na-apụ ka ọtụtụ ndị na-ebitụ ya aka, na-abụkwa ndị a gwọrọ ọrịa ha. Ha abịawokwa ịnụ okwu ya, bụ nke dị ka mmanụ na-agwọ ọrịa nye mkpụrụ obi ha ndị nọ ná nsogbu.—Matiu 4:25; Luk 6:12-19.
3. N’ihi gịnị ka ndị ahu na-eso uzọ na ìgwè mmadu ndị ahụ ji nọrọ n’oké olileanya mgbe Jisọs malitere ikwu okwu?
3 Ná nnọkọ ozizi ihe ndị ha na-enwe, ndị rabaị na-anọdụkarị ala, n’ụtụtụ nke a nke oge opupu ihe ubi nke afọ 31 O.A., nke ahụ bụkwa ihe Jisọs mere, ma eleghị anya n’ebe dị larịị nke dịtụ elu karị n’akụkụ ugwu ahụ. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya na ìgwè mmadụ ahụ hụrụ nke a, ha ghọtara na otu ihe pụrụ iche gaje ime, ha wee jiri olileanya gbaa ya gburugburu. Mgbe ọ malitere ikwu okwu, ha na-echeresi okwu ya ike; mgbe o kwusịrị okwu mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ihe ha nụworo tụrụ ha n’anya nke ukwuu. Ka anyị lee ihe kpatara ya.—Matiu 7:28.
Ụdị Ezi Omume Abụọ
4. (a) Ụdị ezi omume abụọ dị aṅaa ka a na-ekwu okwu ha? (b) Gịnị bụ nzube nke omenala a kụziri n’okwu ọnụ, è mezukwara nzube ahụ?
4 N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, nke a kọrọ akụkọ ya na Matiu 5:1-7:29 nakwa na Luk 6:17-49, Jisọs gosiri nnukwute ọdịiche dị n’etiti òtù abụọ: ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na ndị nkịtị ndị ha na-akpagbu. 0 kwuru okwu banyere ụdị ezi omume abụọ, ezi omume ihu abụọ nke ndị Farisii ahụ na ezi omume bụ ezie nke Chineke. (Matiu 5:6, 20) Ezi omume onwe onye nke ndị Farisii gbanyere mkpọrọgwụ n’omenala a kụziri n’okwu ọnụ. A malitere ndị a n’ime narị afọ nke abụọ T.O.A. dị ka “ogige a gbachibidoro Iwu ahụ” iji chebe ya pụọ ná mwabata nke Hellenism (omenala ndị Grik). A malitewo ile ha anya dị ka akụkụ nke Iwu ahụ. N’eziokwu, ọbụna na ndị odeakwụkwọ ahụ doro omenala a kụziri n’okwu ọnụ n’ọkwá dị elu karịa Iwu ahụ e dere ede. Mishnah ahụ na-asị: “A na-emesi ihe ike banyere idebe okwu ọnụ nke Ndị Odeakwụkwọ ahụ [omenala ha kụziri n’okwu ọnụ] karịa n’idebe Iwu ahụ e dere ede.” Ya mere, kama ịbụ “ogige a gbachibidoro Iwu ahụ” iji chebe ya, omenala ha belatara ike Iwu ahụ nwere wee mee ka ọ ghara ịdị ire, dị nnọọ ka Jisọs kwuru, sị: “Unu na-ajụ ihe Chineke nyere n’iwu nke ọma, ka unu wee debe ozizi nke e nyere n’aka unu idebe.”—Mak 7:5-9; Matiu 15:1-9.
5. (a) Gịnị bụ ọnọdụ ndị nkịtị ahụ biara ige Jisọs ntị, oleekwa otú ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii si lee ha anya? (b) Gịnị mere ka omenala ndị ahụ a kụziri n’okwu ọnụ bụrụ oké ibu arọ n’ubu nke ndị ikom na-arụ ọrụ?
5 Ndị nkịtị ndị ahụ gbakọtara ige Jisọs ntị nọ n’ụkọ ihe ime mmụọ, na-abụ ndị ‘a na-esogbu, na-achụsakwa dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.’ (Matiu 9:36) Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ji ibuli onwe onye elu n’ụzọ mpako na-akwa ha emo, na-akpọ ha ‘am-ha-’a’rets (ndị elu ala), na-agbakụtakwa ha azụ dị ka ndị na-amaghị ihe, ndị mmehie a bụrụ ọnụ, bụ ndị na-erughị eru inweta mbilite n’ọnwụ n’ihi na ha adịghị edebe omenala a kụziri n’okwu ọnụ. N’oge Jisọs, omenala ndị ahụ ehiwo nne nke ukwuu, bụrụkwa ọnọdụ na-akpagbu akpagbu nke ụmụ irighiri iwu e ji achọpụta mmejọ n’ụzọ na-enweghị isi, bụ nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe a na-apụghị izere ezere—nke jupụtara n’ụmụ ihe omume omenala ndị na-egbu oge—nke na ọ dịghị nwoke ọ bụla na-arụ ọrụ nke pụrụ idebezu ha. Ka a sịkwa ihe mere na Jisọs katọrọ omenala ndị ahụ dị ka ‘ibu arọ nke dịkwasị n’ubu ndị mmadụ.’—Matiu 23:4; Jọn 7:45-49.
6. Gịnị bụ oké ihe ijuanya dị n’okwu ndị Jisọs kwuru ná mmalite, mgbanwe dị aṅaa ka ha gosikwara maka ndị na-eso ụzọ ya nakwa maka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii?
6 Ya mere, mgbe Jisọs nọdụrụ ala n’akụkụ ugwu ahụ, ndị ahụ bịara ya nso ige ntị bụ ndị na-eso ụzọ ya na ìgwè ndị ahụ e debere agụụ n’ụzọ ime mmụọ. Ọ ghaghị ịbụworị ihe ijuanya nye ndị a ịnụ okwu mmeghe ya. ‘Obi ụtọ na-adịrị ndị bụ ogbenye, obi ụtọ na-adịrị ndị nọ n’agụụ, obi ụtọ na-adịrị ndị na-akwa ákwá, obi ụtọ na-adịrị ndị a kpọworo asị.’ Ma òle ndị pụrụ inwe ọbi ụtọ mgbe ha bụ ogbenye, nọrọ n’agụụ, na-akwa ákwá, bụrụkwa ndị a kpọrọ asị? E kwupụtakwara na ahụhụ na-adịrị ndị bụ ọgaranya, ndị na-eriju afọ, ndị na-achị ọchị, nakwa ndị e nwere mmasị n’ebe ha nọ! (Luk 6:20-26, NW) N’iji nanị mkpụrụ okwu ole na ole mee ịhe, Jisọs gbanwegharịrị ụzọ nile a na-esibu ele ihe anya nakwa ụkpụrụ nile ụmụ mmadụ nabataworo. Ọ bụ oké mgbanwe nke otú ihe dị iche iche dịbu, n’ikwekọ n’okwu Jisọs mesịrị kwuo, bụ: “Onye ọ bụla nke na-eweli onwe ya elu, a ga-eweda ya; ma onye na-eweda onwe ya, a ga-eweli ya elu.”—Luk 18:9-14.
7. Mmetụta dị aṅaa ka okwu mmeghe Jisọs na-aghaghị inweworị n’ahu ìgwè mmadu ahụ nọ n’Agụụ ime mmụọ, bụ́ ndị na-ege Jisọs ntị?
7 N’ụzọ na-eyighị ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ahụ onwe ha juru afọ, ndị ahụ na-abịakwute Jisọs n’ụtụtụ ụbọchị ahụ maara ọnọdụ ọjọọ ha nọ na ya n’ụzọ ime mmụọ. Okwu mmeghe ya aghaghị imeworị ka ha jupụta n’olileanya: “[Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha, NW]: n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị ahụ.” Leekwa nnọọ otú a ga-esiworị kpalie mmụọ ha mgbe o kwukwara, sị: “[Obi ụtọ, NW] na-adịrị ndị agụụ ezi omume na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ na ya: n’ihi na ndị ahụ ka afọ ga-eju”! (Matiu 5:3, 6; Jọn 6:35; Mkpughe 7: 16,17) Ezi omume ga-eju ha afọ, ee, ma ọ bụghị ụdị nke ndị Farisii ahụ.
O Zughị Ezu Ịbụ “Ndị Ezi Omume n’Anya Mmadụ”
8. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ga-ejiworị chee echiche banyere otú ezi omume ha ga-esi dị ukwuu karịa nke ndị odeakwụkwọ na nke ndị Farisii, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ọ na-aghaghị ịdị otú ahụ?
8 Jisọs sịrị, “Ọ bụrụ na ezi omume unu adịghị akarị ezi omume ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nke ukwuu, unu agaghị aba n’alaeze eluigwe ma ọlị.” (Matiu 5:17-20; lee Mak 2:23-28; 3:1-6; 7:1-13.) Ụfọdụ ga-echeworị, sị: ‘Inwe ezi omume karịrị nke ndị Farisii? Ha na-ebu ọnụ, na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri, na-enyekwa onyinye ebere, na-etinyekwa ndụ ha n’ịmụ Iwu ahụ. Olee otú ezi omume nke anyị ga-esi nwee ike ịkarị nke ha?’ Ma ọ ghaghị ịkarị ya nke ukwuu. Ọ pụrụ ịbụ na ụmụ mmadụ na-ele ndị Farisii ahụ anya n’ụzọ dị elu, ma Chineke adịghị ele ha anya otú ahụ. N’otu oge ọzọ, Jisọs gwara ndị Farisii ndị a, sị: “Unu onwe unu bụ ndị na-agụ onwe unu ná ndị ezi omume n’anya mmadụ; ma Chineke maara obi unu: n’ihi na ihe dị elu n’etiti mmadụ bụ ihe arụ n’anya Chineke.”—Luk 16:15.
9-11. (a) Gịnị bụ otu ụzọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii chere na ha ga-esi nweta ọnọdụ ezi omume n’anya Chineke? (b) Site n’ụzọ nke abụọ dị aṅaa ka ha chere na ha ga-esi nweta ezi omume? (ch) Gịnị bụ ụzọ nke atọ ha dabeere na ya, gịnịkwa ka Pọl onyeozi kwuru nke mere ka nke a kụọ afọ n’ala?
9 Ndị rabaị emepụtawo iwu ndị nke ha maka inweta ezi omume. Otu bụ na ọ bụ ihe ruuru mmadụ site n’ịbụ onye sitere n’usoro ọmụmụ Abraham: “Ndị na-eso ụzọ nna anyị bụ Abraham na-enwe ọṅụ n’ụwa nke a, ha na-eketakwa ụwa ahụ nke na-abịanụ.” (Mishnah) Ma eleghị anya, ọ bụ iji megide omenala nke a ka Jọn Onye Na-eme Baptism ji dọọ ndị Farisii ahụ bịakwutere ya aka ná ntị, sị: “Mịanụ mkpụrụ kwesịrị nchegharị unu; unu echekwala ikwu n’ime onwe unu, sị, Anyị nwere Abraham ná nna [dị ka à ga-asị na nke ahụ ezuwo].”—Matiu 3:7-9; Leekwa Jọn 8:33-39.
10 Ụzọ nke abụọ e si enweta ezi omume, dị ka ha si kwuo, bụ site n’inye onyinye ebere. Akwụkwọ Apocrypha abụọ nke ndị Juu ji okpukpe kpọrọ ihe dere n’ime narị afọ nke abụọ T.O.A. gosipụtara echiche omenala ahụ. Otu ihe e kwuru n’akwụkwọ Tobit sịrị: “Inye onyinye ebere na-azọpụta mmadụ pụọ n’ọnwụ, ọ na-akachapụkwa mmehie ọ bụla.” (12:9, The New American Bible) Akwụkwọ Sirach (Ecclesiasticus) kwetara, na-asị: “Mmiri na-emenyụ ọkụ na-enwu enwu, inye onyinye ebere na-ekpuchikwa mmehie.”—3:29, NAB.
11 Ụzọ nke atọ ha si chọọ ezi omume bụ site n’idebe Iwu ahụ. Omenala okwu ọnụ ha kụziri na ọ bụrụ na ihe ka ukwuu n’ihe mmadụ na-eme dị mma, na a ga-azọpụta ya. Ikpe “bụ site n’ịchọpụta nke ka ibe ya n’etiti ọrụ ọma na ọrụ ọjọọ.” (Mishnah) Iji wee bụrụ ndị e lere anya ọma n’ikpe, ihe dị ha mkpa bụ “inweta omume ọma ndị ga-akarị mmehie ha.” Ọ bụrụ na ihe ọma mmadụ mere ejiri otu karịa ihe ọjọọ ndị o mere, a ga-azọpụta ya—dị ka à ga-asị na Chineke na-ekpe ikpe site n’ime ihe ndekọ nke ụmụ obere ihe omume ha nile! (Matiu 23:23, 24) N’iwepụta echiche ziri ezi banyere ya, Pọl dere, sị: “Site n’ọrụ nile nke iwu ọ dịghị mmadụ ọ bụla a ga-agụ n’onye ezi omume n’ihu [Chi-neke].” (Ndị Rom 3:20) N’ezie, ezi omume ndị Kraịst aghaghị ịdị ukwuu karịa nke ndị ode-akwụkwọ na nke ndị Farisii!
“Unu Nụrụ Na E Kwuru, Sị”
12. (a) Mgbanwe dị aṅaa n’ụzọ ọ na-esikarị ezo aka n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ka Jisọs mere n’Ozizi Elu Ugwu ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Gịnị ka anyị na-amụta site n’ojiji nke isii e jiri okwu ahụ bụ “E kwuru, sị” mee ihe?
12 N’oge ndị mbụ Jisọs hotara okwu site n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ọ sịrị: “E dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị.” (Matiu 4:4, 7, 10) Ma ugbo isii n’Ozizi Elu Ugwu ahụ, o wepụtara okwu ndị yiri ka hà sitere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru site n’ikwu, sị: “E kwuru, sị.” (Matiu 5:21, 27, 31, 33, 38, 43) N’ihi gịnị? N’ihi na ọ na-ezo aka n’Akwụkwọ nsọ dị ka e si kọwaa ya n’ịdabere n’omenala ndị Farisii ndị megidere ihe ndị Chineke nyere n’iwu. (Deuterọnọmi 4:2; Matiu 15:3) E mere ka nke a pụta ìhè n’izo aka nke isii, bụkwa nke ikpeazụ Jisọs mere n’usoro nke a: “Unu nụrụ na e kwuru, sị, Hụ mmadụ ibe gị n’anya, kpọọkwa onyeiro gị asị.” Ma, ọ dịghị iwu Mosis nke sịrị, “Kpọọ onyeiro gị asị.” Ọ bụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii kwuru otú ahụ. Nke ahụ bụ nkọwa ha nke Iwu ahụ nke ịhụ onye agbata obi gị n’anya—onye agbata obi gị bụ onye Juu, ọ bụghị ndị ọzọ.
13. Olee ụzọ Jisọs si dọọ aka ná ntị megide ọbụna mmalite nke omume ndị pụrụ iduje n’igbu mmadụ n’ezie?
13 Ugbu a, tụlee nke mbụ n’ime usoro nke a nke okwu isii. Jisọs kwuru, sị: “Unu nụrụ na a gwara ndị ochie, sị, Egbula mmadụ; ma onye ọ bụla nke gburu mmadụ ga-enye onwe ya n’aka ikpe: ma mụ onwe m sị unu, na onye ọ bụla nke na-ewe iwe megide nwanne ya ga-enye onwe ya n’aka ikpe.” (Matiu 5:21, 22) Iwe nke dị n’obi pụrụ iduje n’okwu ọjọọ, sitekwa n’ebe ahụ duje n’amamikpe, ọ pụkwara imesị duje n’igbu mmadụ kpọmkwem. Iwe nke e mere ka ọ dịgide n’obi ruo ogologo oge pụrụ ịrụpụta ihe dị oké njọ: “Onye ọ bụla nke na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ.”—1 Jọn 3:15.
14. Olee ụzọ Jisọs si nye anyị ndumọdụ ka anyị ghara ọbụna ịmalite ịgbaso ụzọ ahụ nke na-eduje n’ịkwa iko?
14 Ihe ọzọ Jisọs kwuru bụ: “Unu nụrụ na e kwuru, sị, Akwala iko: ma mụ onwe m sị unu, na nwoke ọ bụla nke na-ele nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya, ọ kwasịwo ya iko n’obi ya ugbu a.” (Matiu 5:27, 28) Ọ̀ bụ na ị gaghị akwa iko? Ya bụrụ otu ahụ, amalitela ịgbaso ụzọ ahụ site n’ime ka echiche banyere ya dịgide n’obi gị. Chee obi gị nche, bụ ebe ihe ndị dị otú ahụ na-amalite. (Ilu 4:23; Matiu 15:18, 19) Jemes 1:14,15 na-adọ aka ná ntị, sị: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe agụụ ihe ọjọọ nke aka ya na-adọkpụfu ya, e wee rafuo ya. Mgbe ahụ agụụ ihe ọjọọ ahụ, mgbe ọ tụrụworo ime, o wee mụpụta mmehie: mmehie ahụ, mgbe o tozuru okè, o wee mụpụta ọnwụ.” Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-asị: ‘Amalitela ihe ị na-apụghị imecha.’ Ma n’ọnọdụ nke a, anyị kwesịrị ịsị: ‘Amalitela ihe ị na-apụghị ịkwụsị.’ Ụfọdụ ndị kwesịworo ntụkwasị obi ọbụna mgbe e yiri ha egwu mgbagbu ihu ọha emesịwo daba n’ọnyà aghụghọ nke omume mmekọahụ rụrụ arụ.
15. Olee ụzọ ọnọdụ Jisọs weere n’ihe banyere ịgba alụkwaghịm si dịwaga nnọọ iche n’omenala a kụziri n’okwu ọnụ nke ndị Juu?
15 Anyị na-abịa ugbu a n’okwu nke atọ nke Jisọs. Ọ sịrị: “E kwukwara, sị, Nwoke ọ bụla nke ga-ahapụ nwunye ya, ya nye ya akwụkwọ nkewa: ma mụ onwe m sị unu, na nwoke ọ bụla nke na-ahapụ nwunye ya, ma ọ́ bụghị n’ihi ịkwa iko, ọ na-eme nwanyị ahụ ka ọ nọọ n’ọnọdụ onye a kwara iko megide: onye ọ bụla nke ga-alụkwa ya mgbe a hapụsịrị ya [ya bụ onye a hapụrụ n’ihi ihe na-abụghị ịkwa iko], ọ na-akwa iko.” (Matiu 5:31, 32) Ụfọdụ ndị Juu mesoro ndị nwunye ha omume n’ụzọ aghụghọ wee na-agba ha alụkwaghịm n’ihi obere ihe ọ bụla. (Malakaị 2:13-16; Matiu 19:3-9) Omenala a kụziri n’okwu ọnụ nyere mmadụ ohere ịgba nwunye ya alụkwaghịm “ọbụna ma a sị na o siteghịrị ya nri nke ọma” ma ọ bụ “ọ bụrụ na ọ hụ nwanyị ọzọ ka ya mma.”—Mishnah.
16. Olee ihe omume ndị Juu nke mere ka ịṅụ iyi ghara ịbụkwa oké ihe, ọnọdụ dịkwa aṅaa ka Jisọs weere?
16 N’ụzọ dịkwa otú ahụ, Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Ọzọkwa, unu nụrụ na a gwara ndị ochie, sị, Aṅụla iyi ụgha, . . . ma mụ onwe m na-asị unu, Aṅụla iyi ma ọlị.” Ka ọ dị mgbe ahụ, ndị Juu ejighịzi ịṅụ iyi kpọrọ ihe ọ bụla, ha na-aṅụkwa iyi banyere ụmụ irighiri ihe dị iche iche n’emezughị ihe ha ṅụrụ n’iyi. Ma Jisọs sịrị: “Aṅụla iyi ma ọlị . . . Ma ka okwu unu bụrụ, Ee, ee; Ee e, ee e.” Ụkpụrụ o setịpụrụ dị nnọọ mfe: Na-ekwu eziokwu n’oge nile, n’emeghị ka ọ dị mkpa na ị ga-aṅụ iyi ka e wee kwere ihe i kwuru. Debe ịṅụ iyi ka ọ dịrị ihe ndị dị oké mkpa.—Matiu 5:33-37; tụlee 23:16-22.
17. Ụzọ dị aṅaa nke ka mma karịa “anya laara anya, ézé laara ézé” ka Jisọs kụziri?
17 Ihe ọzọ Jisọs kwuru bụ: “Unu nụrụ ka e kwuru, sị, Anya laara anya, ézé laara ézé: ma mụ onwe m sị unu, Eguzogidela onye bụ ajọ onye: kama onye ọ bụla na-akpụ gị ụra na ntì aka nri, tụgharịkwaara ya ntì [nke] ọzọ.” (Matiu 5:38-42) Ihe Jisọs na-ekwu okwu ya n’ebe a abụghị ihe otiti nke e bu n’uche ka o merụọ mmadụ ahụ, kama ọ bụ n’ihe otiti mkparị nke e ji azụ aka tie mmadụ. E wedala onwe gị ala site n’iji mkparị kwụghachi n’ọnọdụ mkparị. Ekwela ka i jiri ihe ọjọọ kwụghachi ihe ọjọọ. Kama nke ahụ, jiri ihe ọma kwụghachi, wee si otú ahụ “were ezi ihe merie ihe ọjọọ.”—Ndị Rom 12:17-21.
18. (a) Olee otú ndị Juu si gbanwee iwu ahụ metụtara ịhụ onye agbata obi gị n’anya, ma olee ụzọ Jisọs si megide nke a? (b) Gịnị ka Jisọs zara otu onyeọkà iwu nke chọrọ ịkpara nkọwa nke “onye agbata obi” ókè?
18 N’ihe nlereanya nke isii, nke bụkwa nke ikpeazụ, Jisọs mere ka ọ pụta nnọọ ìhè otú e si jiri omenala ndị rabaị mee ka Iwu Moses ghara ịdị ike: “Unu nụrụ na e kwuru, sị, Hụ mmadụ ibe gị n’anya, kpọọkwa onyeiro gị asị: ma mụ onwe m sị unu, Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwa ekpere [maka, NW] ndị na-esogbu unu.” (Matiu 5:43, 44) Iwu Moses ahụ e dere ede etinyeghị ịkpa ókè ọ bụla n’ịhụnanya. “Hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị.” (Levitikọs 19:18) Ọ bụ ndị Farisii ahụ bụ ndị jụrụ ihe a e nyere n’iwu, iji zere ya, ha kpaara okwu ahụ bụ “onye agbata obi” ókè ka ọ dịrị nanị ndị na-edebe omenala ndị ahụ. Otú ahụ ka o si bụrụ na mgbe Jisọs mesịrị chetara otu onyeọkà iwu banyere ihe ahụ e nyere n’iwu, bụ ‘ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị,’ nwoke ahụ rụrụ obere ụka wee jụọ, sị: “Ònye bụkwa onye agbata obi m?” Jisọs zara ajụjụ ahụ site n’ịtụ ilu ahụ metụtara ezi onye Sameria ahụ—mee onwe gị onye agbata obi nye onye ọ dị mkpa ịnata enyemaka gị.—Luk 10: 25-37.
19. Ụzọ dị aṅaa Jehova si emeso ndị mmebi iwu ihe ka Jisọs gbara anyị ume ịgbaso?
19 N’ịga n’ihu n’ozizi ihe ya, Jisọs kwupụtara na ‘Chineke gosiri ndị mmebi iwu ịhụnanya. O mere ka anyanwụ na-awakwasị ha, ka mmiri na-ezokwasịkwa ha. Ọ dịghị ihe pụrụ iche dị n’inwe ịhụnanya nanị n’ebe ndị hụrụ gị n’anya nọ. Ndị mmebi iwu na-emekwa otú ahụ. E nweghị ihe a ga-eji kwụghachi ụgwọ ọrụ n’ihi nke ahụ. Gosipụta onwe unu ụmụ nke Chineke. Mee onwe gị onye agbata obi nye mmadụ nile, hụkwa onye agbata obi gị n’anya. Otú a, “[bụrụnụ ndị zuru] okè, dị ka Nna unu nke eluigwe zuru okè.” (Matiu 5:45-48) Lee nnọọ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ dị oké elu nke a bụ ịgbalị iru! Leekwa ka o si gosi na ezi omume nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii dị nnọọ ala!
20. Kama iwezụga Iwu Mosis ahu n’ụsọ, olee otú Jisọs si mee ka mmetụta ya sawanye mbara, dịwanyekwa omimi, debekwa ya ọbụna n’ọnọdụ dị elu karị?
20 Ya mere, mgbe Jisọs zoro aka n’akụkụ dị iche iche nke Iwu ahụ wee kwuokwa, sị, “Ma mụ onwe m sị unu,” ọ bụghị na ọ na-ewezụga Iwu Mosis n’ụsọ ma jiri ihe ọzọ na-edochi anya ya. Ee e, kama ọ na-eme ka ike o nwere dịwanye omimi, sawanyekwa mbara, site n’igosi mmụọ nke mere e ji nye ya. Iwu ka elu nke ịbụ ụmụnna na-ele iwe a nọgidere na-ebu n’obi anya dị ka igbu mmadụ. Iwu ka elu nke ịdị ọcha na-akatọ echiche rụrụ arụ nke a nọgidere na-ebu n’uche dị ka ịkwa iko. Iwu ka elu nke alụmdi na nwunye na-ajụ ịgba alụkwaghịm n’ihi ihe na-enweghị isi dị ka ụzọ nke na-eduje ná nlụgharị di na nwunye nke ịkwa iko. Iwu ka elu nke ikwu eziokwu na-egosi na ịṅụ iyi ugboro ugboro adịghị mkpa. Iwu ka elu nke ịdị nwayọọ na-ewezụga imegwara ihe n’ụsọ. Iwu ka elu nke ịhụnanya na-achọ ịhụnanya yiri nke Chineke, nke a na-akparaghị ókè ọ bụla.
21. Gịnị ka ndụmọdụ Jisọs kpughere banyere ezi omume onwe onye nke ndị rabaị, gịnị ọzọkwa ka ìgwè mmadụ ahụ ga-amụta?
21 Lee nnọọ mmetụta dị omimi ndụmọdụ ndị ahụ a na-anụtụbeghị mbụ ga-enweworị ná ntị ndị ahụ na-anụ ha nke mbụ! Lee nnọọ ka ha si mee ka ezi omume onwe onye nke ihu abụọ ahụ nke na-abịa site n’ịbụ ohu nke omenala ndị rabaị bụrụ ihe na-abaghị n’ihe! Ma, ka Jisọs gara n’ihu n’Ozizi Elu Ugwu ya, ìgwè mmadụ ndị ahụ agụụ ezi omume Chineke na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ na ya, gaje ịmụta kpọmkwem ụzọ ha ga-esi nweta ya, dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi.
Ajụjụ Ntụleghachi
◻ N’ihi gịnị ka ndị Juu ji guzobe omenala ha a kụziri n’okwu ọnụ?
◻ Oké mgbanwe dị aṅaa ka Jisọs mere n’ihe banyere ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na ndị nkịtị?
◻ Olee ụzọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii lere anya isi nweta ọnọdụ ezi omume n’ihu Chineke?
◻ Olee ụzọ Jisọs gosiri a pụrụ isi zere ịkwa iko?
◻ Site n’igosipụta mmụọ e ji n’ihi ya nye Iwu Mosis ahụ, ụkpụrụ dịgasị aṅaa ndị ka elu ka Jisọs guzobere?