-
Olee Otú Anyị Ga-esi Dịrị Ọcha Otú Chineke Chọrọ?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
4. Kwụsị ịkpa àgwà ọjọọ
Jehova ga-enyeliri anyị aka ịkwụsị ịkpa àgwà ọjọọ
Ọ bụrụ na ị na-aṅụ sịga ma ọ bụ na-aṅụ ọgwụ ike, ị ga-aghọta na ịkwụsị ya adịghị mfe. Gịnị ga-enyere gị aka? Chebara aka ọjọọ ọ na-akpa gị echiche. Gụọnụ Matiu 22:37-39. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ụdị aka ọjọọ ịkpọ ụtaba ma ọ bụ ịṅụ sịga ma ọ bụ ịṅụ ọgwụ ike nwere ike ịkpa . . .
adịm ná mma mmadụ na Jehova.
ezinụlọ mmadụ na ndị ọzọ nọ ya nso.
Mee atụmatụ otú ị ga-esi kwụsị àgwà ọjọọ ị na-akpa.a Kpọnyenụ VIDIO a.
Gụọnụ Ndị Filipaị 4:13. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú ikpechi ekpere anya, ịgụ Baịbụl mgbe niile, na ịgachi ọmụmụ ihe anya ga-esi nyere mmadụ aka ịkwụsị àgwà ọjọọ riri ya ahụ́?
5. Na-agba mbọ ka ị ghara ịna-eche ihe na-adịghị mma ma ọ bụ na-akpa àgwà ọjọọ
Gụọnụ Ndị Kọlọsi 3:5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú anyị si mara na ile ndị gba ọtọ, iji ekwentị ezigara mmadụ ozi iberiibe, na mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ adịghị Jehova mma?
Ì chere na anyị ga-akwụsịli ịkpa àgwà dị iche iche Jehova chọrọ ka anyị ghara ịna-akpa? Maka gịnị?
Chọpụta ihe mmadụ nwere ike ime ka ọ kwụsị ịna-eche ihe na-adịghị mma. Kpọnyenụ VIDIO a.
O nwere ihe atụ Jizọs mere iji gosi na e nwere ihe anyị kwesịrị ịna-eme ka anyị ghara ime ihe ọjọọ. Gụọnụ Matiu 5:29, 30. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Ọ bụ eziokwu na Jizọs anaghị ekwu na anyị kwesịrị imerụ onwe anyị ahụ́, ma ihe o kwuru gosiri na e nwere ihe anyị kwesịrị ime. Olee ụfọdụ ihe mmadụ nwere ike ime ga-enyere ya aka ka ọ kwụsị ịna-eche ihe na-adịghị mma?b
Ọ bụrụ na ị na-agba mbọ ka ị kwụsị ịna-eche ihe na-adịghị mma, Jehova na-ahụ mbọ ị na-agba. Gụọnụ Abụ Ọma 103:13, 14. Unu gụcha ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Ọ bụrụ na e nwere àgwà ọjọọ ị na-agba mbọ ka ị kwụsị ịkpa, olee otú amaokwu ndị a si agba gị ume ka ị ghara ịkwụsị mbọ a ị na-agba?
Otu ugboro i mere ihe ahụ ọzọ apụtaghị na ị gaghị akwụsịli ime ya
I nwere ike ịna-eche, sị ‘Ebe ọ bụ na m mere ihe a ọzọ, ịgbawa mbọ ka m kwụsị ya abaghịzi uru.’ Ma chegodị ihe a: Ọ bụrụ na onye na-agba ọsọ azọhie ụkwụ ma daa, ọ pụtaghị na e nweghịzi ihe ọ ga-agbata n’ọsọ ahụ ma ọ bụkwanụ na ọ ga-agazi malite n’isi. Ọ bụ otú ahụ ka ime ihe ị na-agba mbọ ka ị kwụsị ime na-apụtaghị na ị gaghị akwụsịli ime ihe ahụ. Ọ pụtaghịkwa na mbọ niile ị gbara efuola ọhịa. Imejọ ihe na ịgba mbọ na-agakọ. Onye ọ bụla na-agba mbọ ka ọ kwụsị ime ihe na-adịghị mma ga-enwerịrị mgbe ọ ga-eme ihe ahụ na-adịghị mma. N’ihi ya, adala mbà. Jehova ga-enyere gị aka ka ị kwụsị ime ihe ahụ na-adịghị mma.
-
-
Olee Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Mmanya Na-aba n’Anya?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
6. Ihe ga-enyere mmadụ aka ịkwụsị ịṅụ oké mmanya
Chọpụta ihe nyeere otu nwoke aka ịkwụsị ịṅụ oké mmanya. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Na vidio a anyị lere, olee otú Dmitry si akpa àgwà ma ọ ṅụọ mmanya?
Ịkwụsị ịṅụ mmanya ọ̀ dịịrị ya mfe?
Olee otú o sizi mechaa kwụsị ịṅụ oké mmanya?
Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 6:10, 11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú ịṅụ oké mmanya dịruru njọ?
Gịnị na-egosi na onye na-aṅụ oké mmanya nwere ike ịgbanwe?
Gụọnụ Matiu 5:30. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Mmadụ igbupụ aka ya Jizọs ji maa atụ ebe a na-egosi na anyị ga-agbasi mbọ ike hapụ ihe ụfọdụ anyị na-eme ka anyị wee mee ihe Jehova chọrọ. Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ịkwụsị ịṅụ oké mmanya na-esiri gị ike?a
Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 15:33. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na gị na ndị na-aṅụ oké mmanya na-akpa?
-