-
Ndị Na-agụ Kpakpando Abịa Leta JizọsJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
E nwere ụmụ nwoke si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ bịa. Ha bụ ndị na-agụ kpakpando. Ha na-ekwu na ha na-eji ebe kpakpando dị ama ihe na-eme ná ndụ ndị mmadụ. (Aịzaya 47:13) Mgbe ha ka nọ n’obodo ha n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ, ha hụrụ otu “kpakpando.” Ha sooro ya gaa ọtụtụ kilomita. Kpakpando ahụ edurughị ha gaa Betlehem, kama o duuru ha gaa Jeruselem.
Mgbe ndị ahụ na-agụ kpakpando rutere Jeruselem, ha jụrụ ndị mmadụ sị: “Olee ebe onye ahụ a mụrụ ịbụ eze ndị Juu nọ? N’ihi na anyị hụrụ kpakpando ya mgbe anyị nọ n’ebe ọwụwa anyanwụ, anyị bịara ịkpọrọ ya isiala.”—Matiu 2:1, 2.
-
-
Ndị Na-agụ Kpakpando Abịa Leta JizọsJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Ònye ka i chere na ọ bụ ya mere ka “kpakpando” ahụ pụta? Cheta na kpakpando ahụ edurughị ha gaa ozugbo n’ebe Jizọs nọ na Betlehem. Kama, o bu ụzọ duru ha gaa na nke Eze Herọd, onye chọrọ igbu Jizọs. Herọd gakwaara egbu Jizọs ma a sị na Chineke abịaghị gwa ndị ahụ na-agụ kpakpando ná nrọ ka ha ghara ịlaghachi gaa gwa Herọd ebe Jizọs nọ. O doro anya na ọ bụ onye iro Chineke, bụ́ Setan, chọrọ igbu Jizọs. O mekwara ka “kpakpando” ahụ pụta ka o nwee ike imezu ihe ọ chọrọ.
-