Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 149
  • Gịnị Ka “Anya Laara Anya” Pụtara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka “Anya Laara Anya” Pụtara?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl zara
  • Gịnị mere e ji nye iwu “anya laara anya”?
  • Iwu “anya laara anya” ọ̀ gbasara Ndị Kraịst?
  • Ihe na-abụghị eziokwu a na-ekwu gbasara iwu “anya laara anya”
  • Ndụmọdụ Baịbụl Nyere Gbasara Anya
    Teta!—2012
  • Mee Ka Anya Gị Na-elegide Otu Ebe
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Gịnị Ka Ịtụgharị Ntì nke Ọzọ Pụtara?
    Teta!—2010
  • Na-egosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ—Site n’Ịdị Na-ele Onye Ị Na-agwa Okwu Anya n’Ihu
    Ozi Alaeze Anyi—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 149
Anya mmadụ

Gịnị Ka “Anya Laara Anya” Pụtara?

Ihe Baịbụl zara

“Anya laara anya” so n’Iwu Chineke gwara Mozis ka o nye ndị Izrel n’oge gboo. Jizọs kwughachikwara ya mgbe ọ nọ n’elu ugwu na-akụzi ihe. (Matiu 5:​38, Bible Nsọ nke Union Version; Ọpụpụ 21:​24, 25; Diuterọnọmi 19:21) Ihe ọ pụtara bụ na a tawa onye mere ihe ọjọọ ahụhụ, e kwesịrị ịta ya ahụhụ ya na ihe o mere hà otu.a

Iwu a bụ gbasara onye ma ụma merụọ onye ọzọ ahụ́. E nwere ihe Iwu Mozis kwuru gbasara onye mere otú ahụ. Ọ sịrị: “Ịgbaji ọkpụkpụ ga-alara ịgbaji ọkpụkpụ, anya alaara anya, ezé alaara ezé; ụdị nkwarụ o mere ka onye ahụ nwee ka a ga-eme ka o nwee.”​​—⁠Levitikọs 24:⁠20.

  • Gịnị mere e ji nye iwu “anya laara anya”?

  • Iwu “anya laara anya” ọ̀ gbasara Ndị Kraịst?

  • Ihe na-abụghị eziokwu a na-ekwu gbasara iwu “anya laara anya”

  • Jizọs mere ka a mara nke bụ́ eziokwu

Gịnị mere e ji nye iwu “anya laara anya”?

E nyeghị iwu “anya laara anya” ka onye ọ bụla nwee ike ịna-emegwara ihe e mere ya. Kama, e nyere ya iji nyere ndị a họpụtara ka ha na-ekpe ikpe aka ịta onye mehierenụ ahụhụ kwesịịrị ya. Ha agaghị ata ya ahụhụ ka ndị obi fere azụ, ha agaghịkwanụ emefere ya ebere ókè.

Iwu a na-emekwa ka onye bu n’obi imerụ ndị ọzọ ahụ́ ma ọ bụ onye na-akpa nkata ime otú ahụ gbanwee obi ya. Iwu Mozis kwuru, sị, “Ndị fọdụrụ [ya bụ, ndị hụrụ ka a na-ata mmadụ ahụhụ kwesịịrị ya otú Chineke chọrọ] ga-anụkwa ya wee tụọ egwu, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla ha ga-eme ụdị ihe ọjọọ a n’etiti unu.”​​—⁠Diuterọnọmi 19:⁠20.

Iwu “anya laara anya” ọ̀ gbasara Ndị Kraịst?

Mba, iwu a abụghị maka Ndị Kraịst. O so n’Iwu Mozis ndị àjà Jizọs chụrụ kagburu.​​—⁠Ndị Rom 10:⁠4.

Mana, iwu a mere ka anyị ghọta otú Chineke si eche echiche. Otu ihe o mere ka anyị ghọta bụ na Chineke ji ikpe ziri ezi kpọrọ ihe. (Abụ Ọma 89:14) O mekwara ka anyị ghọta otú Chineke si ekpe ikpe ziri ezi, ya bụ, na e kwesịrị ịta onye mere ihe ọjọọ ahụhụ ruo “n’ókè kwesịrị ekwesị.”​​—⁠Jeremaya 30:⁠11.

Ihe na-abụghị eziokwu a na-ekwu gbasara iwu “anya laara anya”

Ihe na-abụghị eziokwu a na-ekwu: Obi fere onye tiri iwu “anya laara anya” azụ.

Nke bụ́ eziokwu: Iwu a akwadoghị ka ndị a họpụtara ikpe ikpe jiri aka ike na obi ọjọọ na-ekpe ikpe. Kama, e mee ihe otú iwu ahụ kwuru, ọ pụtara na tupu ndị a họpụtara ikpe ikpe ekpebie ihe a ga-eme, ha ga-ebu ụzọ leruo ihe niile merenụ anya, chọpụtakwa otú onye ahụ mejọrọ ihe kpacharuru anya mee ihe ahụ. (Ọpụpụ 21:​28-​30; Ọnụ Ọgụgụ 35:​22-​25) Ihe a niile na-egosi na iwu “anya laara anya” nyere aka hụ na a tafeghị mmadụ ahụhụ ókè ma ọ bụkwanụ mefeere ya ebere ókè.

Ihe na-abụghị eziokwu a na-ekwu: Iwu “anya laara anya” nyere onye ọ bụla ikike imegwara ihe e mere ya.

Nke bụ́ eziokwu: E nwere Iwu Mozis nke kwuru, sị: “Abọla ọbọ, eburula ụmụ ndị gị iwe n’obi.” (Levitikọs 19:18) Iwu Mozis anaghị agba ndị mmadụ ume imegwara ihe e mere ha. Kama, ọ na-agba ha ume ka ha tụkwasị Chineke obi, nabatakwa ndokwa o mere ka e nwee ndị ikpe ga na-edoziri ha okwu.​​—⁠Diuterọnọmi 32:⁠35.

Jizọs mere ka a mara nke bụ́ eziokwu

Jizọs ma na ụfọdụ ndị na-akọwahie ihe iwu “anya laara anya” pụtara. O mere ka nke bụ́ eziokwu doo anya. O kwuru, sị: “Unu nụrụ na a sịrị: ‘Anya laara anya, ezé laakwara ezé.’ Otú ọ dị, ana m asị unu: Emegwarala onye bụ́ ajọ mmadụ ihe o mere gị; kama onye ọ bụla nke mara gị ụra na ntì aka nri, tụgharịkwaara ya nke ọzọ.”​​—⁠Matiu 5:​38, 39.

Ị̀ hụrụ na Jizọs sịrị “unu nụrụ na a sịrị”? Ọ ga-abụ na ihe ọ na-ekwu bụ ihe ụfọdụ ndị isi okpukpe ndị Juu na-akụzi, ya bụ, na i mee m mụ emegwara dị mma. Otu nwoke aha ya bụ Adam Clarke, onye bụ́ ọkà mmụta Baịbụl, sịrị: “Ọ ga-abụ na ndị Juu mere ka iwu a [bụ́ anya laara anya] . . . bụrụ ihe ndị mmadụ ga na-agbakwasị ụkwụ eme i mee m mụ emegwara. Ọ ga-abụkwa ya mere obi ji efe ndị mmadụ azụ ka ha na-emegwara ndị mere ha ihe.” Ndị isi okpukpe ndị ahụ nọ na-ekwu ihe gosiri na mmadụ imegwara ihe e mere ya magburu onwe ya. Ha si otú ahụ mee ka ihe Chineke bu n’obi nye Iwu ahụ ghara ido anya.​​—⁠Mak 7:​13.

Mana, Jizọs kwusiri ike na ịhụnanya bụ isi sekpụ ntị n’Iwu niile Chineke nyere. Ọ sịrị: “‘Hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya . . . ’ Ọ bụ ya bụ iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ. Nke abụọ, nke dị ka ya, bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’ Ọ bụ n’iwu abụọ a ka Iwu ahụ dum na akwụkwọ Ndị Amụma dabeere.” (Matiu 22:​37-​40) Jizọs kụziri na ọ bụ ịhụnanya, ọ bụghị i mee m mụ emegwara, ka a ga-eji ama ezigbo ndị na-eso ụzọ ya.​​—⁠Jọn 13:​34, 35.

a Ihe a na-akpọ iwu a mgbe ụfọdụ na Latịn bụ lex talionis. Obodo ndị ọzọ n’oge gboo tikwara ụdị iwu a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya