Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche—2014 | Disemba 15
    • Jeremaya 31:15 kwuru, sị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘A na-anụ olu ákwá arịrị na ákwá dị ilu na Rema; Rechel na-akwara ụmụ ya ákwá. O kweghị ka a kasie ya obi n’ihi ụmụ ya, n’ihi na ha anọkwaghị.’ ”

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche—2014 | Disemba 15
    • Nke ọ bụla ọ sọrọ ya bụrụ, ihe Jeremaya kwuru gbasara ákwá Rehab kwaara ụmụ ya gosiri ihe ga-eme mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, ya bụ, mgbe Jizọs dị obere, Eze Herọd achọọ igbu ya. Eze Herọd nyere iwu ka e gbuo ụmụaka niile bụ́ ndị nwoke na Betlehem, malite ná ndị gbara afọ abụọ gbadaa. Betlehem dị n’ebe ndịda Jeruselem. N’ihi ya, ụmụaka ndị ahụ e gburu anọghịzi, ya bụ, ha nwụrụ. Chegodị otú obi dị ụmụ nwaanyị ndị ahụ e gburu ụmụ ha. E nwere ike ikwu na a nụrụ ákwá ha na Rema, nke dị nso n’ebe ugwu Jeruselem.​—⁠Mat. 2:​16-18.

      N’ihi ya, ma n’oge Jeremaya ma n’oge Jizọs nọ n’ụwa, otú o si bụrụ na Rechel na-akwara ụmụ ya ákwá bụ na ndị nne bụ́ ndị Juu ruru uju n’ihi ụmụ ha e gburu. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị nọ “n’ala ndị iro,” ya bụ, ndị nwụrụ anwụ, nwere ike ịlọta mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ.​—⁠Jere. 31:16; 1 Kọr. 15:⁠26.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya