-
Ekpere Ndị E Ji n’Aka na A Ga-azaỤlọ Nche—1991 | Septemba 15
-
-
ENWERE ekpere ndị o doro anya na a gaje ịza. E jikọtara isi ihe dị na ha n’ime otu ihe nlereanya nke Jisọs Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ sịrị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—Matiu 6:9-13.
-
-
Ekpere Ndị E Ji n’Aka na A Ga-azaỤlọ Nche—1991 | Septemba 15
-
-
“Ka Alaeze Gị Bịa”
Jịsọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kpee ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa.” E ji n’aka na a ga-aza ekpere ndị e kpere maka ọbịbịa nke Alaeze Chineke. Alaeze ahụ bụ ọchịchị eze Jehova dị ka e gosipụtara ya site n’ọchịchị Mesaịa dị n’eluigwe nke dị n’aka Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, ya na “ndị nsọ” ha na ya so. (Daniel 7:13, 14, 18, 22, 27; Aịsaịa 9:6, 7) Ọ dịwo ogologo oge Ndịàmà Jehova na-anwapụta site n’Akwụkwọ nsọ na e mere ka Jisọs nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze n’eluigwe n’afọ 1914. Ya mere, n’ihi gịnị ka onye ọ bụla kwesịrị iji kpee ekpere ka Alaeze ahụ “bịa”?
Ikpe ekpere maka ọbịbịa nke Alaeze ahụ pụtara n’ezie ịrịọ ka ọ bịa megide ndị nile na-eguzogide ọchịchị Chineke n’elu ala. N’oge na-adịghị anya ugbu a, “Alaeze [nke Chineke] . . . ga-etipịa alaeze [elu ala] ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Ihe omume nke a ga-enye aka n’iwepụ aha nsọ Jehova n’ụta.
“Ka E Mee Ihe Ị Na-achọ”
Jisọs gara n’ihu ịgwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha kpee ekpere, sị: “Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” Nke a bụ arịrịọ ka Jehova mee ihe kwekọrọ ná nzube ya maka elu ala. O yiri nkwupụta okwu onye ọbụ abụ ahụ, bụ: “Ihe nile nke tọrọ Jehova ụtọ, nke ahụ ka o meworo, n’eluigwe, na n’ụwa, na n’oké osimiri nile, na ogbu mmiri nile. Ọ bụ onye na-eme ka aluluu si ná nsọtụ ụwa kwụgoo; o meworo mmiri ozuzo àmụ̀mà; ọ bụ onye na-eme ka ifufe si n’ụlọ nkwakọba ya nile pụta. Onye tigburu ụmụ e buru ụzọ mụọ n’ala Ijipt, ma ọ̀ bụ mmadụ ma ọ̀ bụ anụ ụlọ. O zitere ihe ịrịba ama dị iche iche na ihe ebube dị iche iche n’etiti gị, Ijipt, n’ahụ Fero, na n’ahụ ndị ohu ya nile. Onye tigburu ọtụtụ mba, gbuokwa ndị eze dị ike.”—Abụ Ọma 135:6-10.
Ikpe ekpere ka e mee ihe Jehova na-achọ n’elu ala bụ arịrịọ ka o mezuo nzube ya n’ebe mbara ala nke a dị. Nke a gụnyere iwepụchasị ndị na-emegide ya ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna dị ka o wepụrụ ha n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta n’oge ochie. (Abụ Ọma 83:9-18; Mkpughe 19:19-21) E ji n’aka na a gaje ịza ekpere ndị e kpere ka e mee ihe Jehova na-achọ n’elu ala dum nakwa n’eluigwe na ala dum.
-