Mmụọ nke Ụwa—Ọ̀ Na-eme Gị Nsí?
NA September 12, 1990, otu mgbawa mere n’ụlọ mmepụta ihe dị na Kazakstan. A gbapụrụ ụzarị na-egbu egbu nke dị ize ndụ n’ikuku, na-eyi ahụ ike nke mmadụ 120,000 bi n’ógbè ahụ egwu, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha pụrụ n’okporo ámá n’ime mkpesa megide nsí ahụ na-egbu egbu.
Ma ka e nwetakwuru ihe ọmụma, ha chọpụtara na ha anọworị na-ebi na gburugburu jupụtara ná nsí eri ọtụtụ iri afọ. Eri ọtụtụ afọ, e kpofuwo tọn 100,000 nke nsí atọm na mbara ebe na-enweghị nchebe. Ọ bụ ezie na ihe ize ndụ ahụ dị ha nso, o nweghị onye ji ya kpọrọ ihe. N’ihi gịnị?
Kwa ụbọchị, n’ámá egwuregwu dị n’ebe ahụ, ndị na-elekọta ya na-amapanye otu ihe na-agụkọ ọ̀tụ̀tụ̀ nke ụzarị ọkụ, bụ́ nke nyere echiche na o nweghị ihe ize ndụ dị ma ọlị. Ngụkọ ya ziri ezi, ma ha gosiri nanị ụzarị ọkụ gamma. Ụzarị ọkụ alpha, bụ́ nke a na-atụghị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, pụkwara ịdị na-egbu egbu n’otu aka ahụ. Ọtụtụ ndị nne na nna malitere ịghọta ihe mere ụmụ ha ji arịa oké ọrịa.
N’ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ, mmetọ a na-adịghị ahụ anya pụkwara ime anyị nsí. Dịkwa ka ndị ahụ nwere ihe ndabara ọjọọ na Kazakstan, ihe ka ọtụtụ amaghị banyere ihe ize ndụ a nke na-eyi ndụ egwu. Bible na-akọwa mmetọ nke a dị ka “mmụọ nke ụwa,” nke onye na-akwalite ya na-abụghị onye ọzọ ma e wezụga Setan Ekwensu. (1 Ndị Kọrint 2:12) Onye Iro Chineke ji obi ọjọọ na-eji mmụọ nke a—ma ọ bụ àgwà zuru ebe nile—eme ihe ibibi nsọpụrụ Chineke anyị.
Olee otú mmụọ nke ụwa pụrụ isi mịkọrọ ume ime mmụọ anyị? Site n’ịkpalite agụụ ihe ọjọọ na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke dị n’ime anyị. (Ndị Efesọs 2:1-3; 1 Jọn 2:16) Iji maa atụ, anyị ga-atụle akụkụ atọ dị iche iche nke ụwa pụrụ iji nwayọọ nwayọọ mee ọnọdụ ime mmụọ anyị nsí.
Ibu Ụzọ Achọ Alaeze Ahụ
Jisọs gbara ndị Kraịst ume ‘ibu ụzọ chọọ Alaeze ahụ na ezi omume Chineke.’ (Matiu 6:33) N’aka nke ọzọ, mmụọ nke ụwa pụrụ iduga anyị n’iwere mmasị na ntụsara ahụ anyị dị ka ihe dị oké mkpa. Ihe ize ndụ mbụ dị, ọ bụghị n’ịhapụ ọdịmma ime mmụọ anyị kpam kpam, kama n’idebe ha n’ọnọdụ nke abụọ. Anyị pụrụ ilefuru ihe ize ndụ ahụ anya—dị ka ndị mmadụ na Kazakstan mere—n’ihi echiche nke ịnọ ná nchebe ụgha. Ọtụtụ afọ nke ozi ikwesị ntụkwasị obi anyị na mmasị anyị nwere n’ebe ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ anyị nọ pụrụ ịraba anyị n’iche na ọ dịghị mgbe anyị pụrụ ịhapụ ụzọ nke eziokwu ahụ. Eleghị anya, ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ Efesọs chere otú ahụ.
N’ihe dị ka afọ 96 O.A., Jisọs nyere ha ndụmọdụ na-esonụ: “Enwere m nke a imegide gị, na ị hapụrụ ịhụnanya ahụ i nwere na mbụ.” (Mkpughe 2:4) Ndị Kraịst a jeworo ozi ogologo oge ediwo ọtụtụ ihe isi ike. (Mkpughe 2:2, 3) Ha abụrụwo ndị ndị okenye kwesịrị ntụkwasị obi, gụnyere Pọl onyeozi, ziri ihe. (Ọrụ 20:17-21, 27) Otú ọ dị, ka ọtụtụ afọ na-agafe, ịhụnanya ha n’ebe Jehova nọ adalatawo, ha enweghịkwa ihe na-akwali ha n’ụzọ ime mmụọ.—Mkpughe 2:5.
O yikarịrị ka azụmahịa na ihe ịga nke ọma dị n’obodo ahụ o metụtara ụfọdụ ndị Efesọs. N’ụzọ dị mwute, usoro nchụso ihe onwunwe nke ọha mmadụ taa eburuwo ụfọdụ ndị Kraịst pụọ n’otu aka ahụ. Nchụso siri ike nke ụzọ ndụ ntụsara ahụ ga-adọpụrịrị anyị n’ebe ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ dị.—Tụlee Matiu 6:24.
N’ịdọ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ a, Jisọs sịrị: “Oriọna nke ahụ bụ anya: ya mere ọ bụrụ na anya gị elee otu ebe, ahụ gị dum ga-ejupụta n’ìhè. Ma ọ bụrụ na anya gị jọrọ njọ, ahụ gị dum ga-ejupụta n’ọchịchịrị.” (Matiu 6:22, 23) Anya ‘na-ele otu ebe’ bụ anya lekwasịrị ihe n’ụzọ ime mmụọ, anya lekwasịrị n’Alaeze Chineke. N’aka nke ọzọ, anya “jọrọ njọ” ma ọ bụ nke “anyaụfụ” adịghị elepụ anya n’ihu, ọ na-enwe ike ilekwasị na nanị agụụ anụ ahụ e nwere mgbe ahụ. Ọ pụghị ịghọta nzube ime mmụọ na ụgwọ ọrụ ndị dị n’ihu.
Jisọs kwuru n’amaokwu bu ụzọ, sị: “Ebe akụ̀ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.” (Matiu 6:21) Olee otú anyị pụrụ isi mara ma obi anyị ọ dịkwasị n’ihe ime mmụọ ka ọ bụ n’ihe onwunwe? Ma eleghị anya ihe nduzi kasị mma bụ mkparịta ụka anyị, ebe ọ bụ na ‘ọnụ na-ekwu okwu site n’ihe obi nwebigara ókè.’ (Luk 6:45) Ọ bụrụ na anyị ahụta na anyị na-ekwu okwu mgbe nile banyere ihe onwunwe ma ọ bụ ihe a na-arụzu n’ụwa, ọ pụtara ìhè na e kewara obi anyị ekewa nakwa na ịhụ ụzọ ime mmụọ anyị nwere nsogbu.
Carmen, otu nwanna nwanyị onye Spain, gbasoro nsogbu a mgba.a “A zụlitere m n’eziokwu,” ka Carmen na-akọwa, “ma mgbe m dị afọ 18, ehiwere m ụlọ akwụkwọ ọta akara nke m. Afọ atọ n’ihu, enwere m mmadụ anọ m were n’ọrụ, achụmnta ego ahụ na-aga nke ọma, m na-enwetakwa nnukwu ego. Ma, eleghị anya ihe kasị nye m afọ ojuju bụ na m nweere onwe m n’ụzọ ego, ihe na-agakwara m ‘nke ọma.’ N’ikwu eziokwu, obi m dị n’achụmnta ego m—ọ bụ ihe m kasị hụ n’anya.
“Echere m na m ka pụrụ ịbụ Onyeàmà n’agbanyeghị na m na-etinye ihe ka ukwuu n’oge m n’ihe metụtara achụmnta ego. N’aka nke ọzọ, anọgidekwara m na-eche na apụrụ m imekwu ihe iji jeere Jehova ozi. Ihe mesịrị kpalie m ibute ọdịmma Alaeze ahụ ụzọ bụ ihe nlereanya nke ndị enyi m abụọ bụ́ ndị ọsụ ụzọ. Otu n’ime ha, bụ́ Juliana, nọ n’ọgbakọ m. Ọ manyeghị m ịsụ ụzọ, ma mkparịta ụka ya na ọṅụ o doro anya na ọ na-enweta n’ozi ya nyeere m aka ịtụleghachi ihe ime mmụọ nke m.
“Ka oge ụfọdụ gasịrị, mgbe m nọ ezumike na United States, m nọrọ na nke Gloria, bụ́ nwanna nwanyị na-asụ ụzọ. Di ya nwụrụ n’oge na-adịbeghị anya, ọ na-elekọtakwa nwa ya nwanyị dị afọ ise na nne ya na-arịa ọrịa cancer. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ sụrụ ụzọ. Ihe nlereanya ya na mmasị sitere n’obi o nwere maka ozi ahụ metụrụ m n’obi. Ụbọchị anọ dị mkpirikpi m nọrọ n’ụlọ ya mere ka m kpebisie ike inye Jehova ihe kasị mma m nwere. Na mbụ aghọrọ m onye ọsụ ụzọ oge nile, ka afọ ole na ole gasịkwara, a kpọrọ mụ na di m òkù ije ozi na Betel. Ahapụrụ m achụmnta ego m—ihe mgbochi nye ọganihu ime mmụọ m—ma ugbu a echere m na ndụ m dị mma n’anya Jehova, bụ́ ihe kasị mkpa n’ezie.”—Luk 14:33.
Ịmụta ‘ịnwa ihe ha na ibe ha dị iche,’ dị ka Carmen mere, ga-enyere gị aka ime mkpebi dị mma metụta ọrụ, agụmakwụkwọ, ụlọ, na ụzọ ndụ anyị. (Ndị Filipaị 1:10) Ma ànyị na-anwakwa ihe ha na ibe ha dị iche ma a bịa ná ntụrụndụ? Nke a bụ akụkụ ọzọ mmụọ nke ụwa na-akpa ike dị ukwuu.
Debe Ntụsara Ahụ n’Ọnọdụ Kwesịrị Ya
Mmụọ nke ụwa na-eji aghụghọ eji ọchịchọ ebumpụta ụwa ndị mmadụ nwere maka izu ike na ntụsara ahụ eme ihe. Ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ enwechaghị olileanya maka ọdịnihu, ọ bụ ihe kwere nghọta na ha kwesịrị ịchọ iji ntụrụndụ na ntụsara ahụ mejuo oge dị ugbu a. (Tụlee Aịsaịa 22:13; 1 Ndị Kọrint 15:32.) Ànyị na-achọpụta na anyị na-ewere ntụsara ahụ dị ka ihe ka mkpa? Nke ahụ pụrụ ịbụ ihe àmà na ụzọ ụwa si eche echiche na-akpụzi ụzọ anyị si ele ihe anya.
Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Onye ihe kọrọ ka onye na-ahụ ọṅụ [“ntụrụndụ,” Lamsa] n’anya ga-abụ.” (Ilu 21:17) Ikpori ndụ adịghị njọ, ma ịhụ ya n’anya, ma ọ bụ idebe ya n’ọnọdụ dị oké mkpa, ga-eduga n’ịnọ n’ụkọ n’ụzọ ime mmụọ. Agụụ anyị maka ihe ime mmụọ aghaghị ibelata, anyị ga-enwekwa oge dị ntakịrị maka ikwusa ozi ọma ahụ.
N’ihi nke a, Okwu Chineke na-adụ anyị ọdụ ‘ịbụ ndị a kwadebere n’uche maka ọrụ, na-enwe njide onwe onye zuru okè.’ (1 Pita 1:13, The New English Bible) Njide onwe onye dị mkpa iji gbubilata oge ntụsara ahụ anyị ruo n’ókè ezi uche dị na ya. Ịkwadebe maka ọrụ pụtara ịdị njikere maka ọrụ ihe ime mmụọ, ma ọ̀ bụ ọmụmụ ihe, nzukọ, ma ọ bụ ozi ubi.
Gịnị banyere mkpa nke izu ike? Ànyị kwesịrị inwe obi amamikpe mgbe anyị wepụtara oge iji tụsara ahụ? Ọ dịghị ma ọlị. Izu ike dị mkpa, karịsịa n’ụwa nke a jupụtara ná nrụgide. Ka o sina dị, dị ka ndị Kraịst raara onwe ha nye anyị agaghị ekwe ka ndụ anyị dabere ná ntụsara ahụ. Ntụsara ahụ gabigara ókè pụrụ ịraba anyị n’ime ihe ndị dị nnọọ nta bara uru. Ọ pụrụ ibelata echiche anyị nke ịdị ngwa, ọbụna na o nwere ike ịkpata ime ihe na-atọ nanị onwe onye ụtọ. Mgbe ahụ, olee otú anyị pụrụ isi nwee echiche guzoziri eguzozi banyere izu ike?
Bible na-atụ aro inwe ntakịrị ezumike kama ịdọgbu onwe onye n’ọrụ gabiga ókè—karịsịa ma ọ bụrụ na ọrụ ego ahụ adịghị mkpa. (Eklisiastis 4:6) Ọ bụ ezie na izu ike na-enyere ahụ anyị aka inwetaghachi ume, isi iyi nke ume ime mmụọ anyị bụ ike ọrụ Chineke. (Aịsaịa 40:29-31) Anyị na-anata mmụọ nsọ a n’ihe banyere ọrụ ndị Kraịst anyị. Ọmụmụ ihe onwe onye na-azụ obi anyị ma na-akpali ọchịchọ ndị ziri ezi. Ịga nzukọ na-azụlite ekele anyị maka Onye Okike anyị. Ikere òkè n’ozi ndị Kraịst anyị na-azụlite mmetụta maka ndị ọzọ. (1 Ndị Kọrint 9:22, 23) Dị ka Pọl ji ezi obi kọwaa, “mmadụ elu ahụ na-aka nká ma na-adọwa adọwa, ma kwa ụbọchị mmadụ ime ahụ na-anata ume ọhụrụ.”—2 Ndị Kọrint 4:16, Phillips.
Ileana, nne nke ụmụ isii nakwa nwunye nke di na-ekweghị ekwe, na-eji ọrụ n’aka mgbe nile. O nwere ọtụtụ ibu ọrụ n’ebe ezinụlọ na ọtụtụ ndị ikwu ya ndị ọzọ nọ, nke pụtara na ọ na-eyi ka ọ na-agbagharị n’ebe nile. Ka o sina dị, o setịpụrụ ihe nlereanya dị ịrịba ama n’ime nkwusa na ịkwadebe maka nzukọ. Olee otú ọ pụrụ isi lekọta nnukwu ọrụ dị otú ahụ?
“Nzukọ na ozi ubi nyeere m aka n’ezie ịnagide ibu ọrụ m ndị ọzọ,” ka Ileana na-akọwa. “Dị ka ihe atụ, mgbe m mesịrị nkwusa, ana m enwe ọtụtụ ihe iche banyere ha mgbe m na-arụ ọrụ m n’ụlọ. Mgbe mgbe ana m agụ abụ ka m na-arụ ya. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na agaghị m otu nzukọ ma ọ bụ mee ihe dị nta n’ozi ubi, ọrụ dị n’ụlọ na-esiri m ike.”
Lee ka o siri dị iche n’ebe iwere ntụsara ahụ dị ka ihe dị oké mkpa dị!
Ịma Mma Ime Mmụọ Na-atọ Jehova Ụtọ
Anyị na-ebi n’ụwa nke ọdịdị elu ahụ na-awị ara n’ụzọ na-arị elu. Ndị mmadụ na-emefu nnukwu ego n’ihe ndị ha ji eme ka ọdịdị ha ka mma ma na-ebelata mmetụta nke ịka nká. Ndị a na-agụnye ịkwụnye agịrị isi na iteji ya, itinye ihe n’ime ara, na ịwa ahụ e ji achọ mma. Ọtụtụ nde na-aga n’ebe mbelata oké ibu ya na klas ebe a na-akụzi mmega ahụ, ma ọ bụ ha na-azụrụ vidio na-akụzi usoro mmega ahụ na nke erimeri. Ụwa ga-eme ka anyị kwere na ihe na-eduga n’obi ụtọ bụ ọdịdị elu ahụ anyị, na “ọdịdị” ahụ anyị bụ ihe nile.
Na United States, otu nnyocha nke magazin bụ́ Newsweek hotara chọpụtara na 90 pasent nke ndị ọcha America nọ n’afọ iri na ụma “enweghị afọ ojuju n’otú ahụ ha dị.” Ọchịchọ siri ike maka ọdịdị ahụ mara mma pụrụ imetụta ọnọdụ ime mmụọ anyị. Dora bụ Onyeàmà Jehova na-eto eto nke ọdịdị elu ahụ ya na-eme ihere n’ihi na o buru ibu gabigatụ ókè. “M gaa ahịa, ọ na-esi ike ịhụ uwe ndị dị mma ga-aba m,” ka ọ na-akọwa. “O yiri ka e mere uwe ndị mara mma maka nanị ndị nọ n’afọ iri na ụma dị gịrịgịrị. Nke ka njọ, ndị mmadụ na-ekwu okwu mweda n’ala banyere ibu m, bụ́ nke na-akpasu m iwe nke ukwuu, karịsịa mgbe ọ bụ ụmụnna nwoke na nwanyị ime mmụọ m kwuru ha.
“N’ihi ya, amalitere m ichegbu onwe m karị banyere ọdịdị m, ruo n’ókè nke na ihe ime mmụọ malitere iwere ọnọdụ nke abụọ ná ndụ m. O yiri nnọọ ka obi ụtọ m dabeere n’otú úkwù m hà. Ọtụtụ afọ agafewo, ugbu a kwa etozuwo m okè dị ka nwanyị na dị ka onye Kraịst, m na-ahụ ihe n’ụzọ dị iche. Ọ bụ ezie na ana m eleru ọdịdị m anya, amatara m na ọ bụ mma ime mmụọ kasị mkpa, nke ahụ bụkwa ihe na-enye m afọ ojuju kasị ukwuu. Ozugbo m ghọtara nke ahụ, enwere m ike ido ọdịmma Alaeze ahụ n’ọnọdụ kwesịrị ha.”
Sera bụ nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi nke oge gboo bụ onye nwere echiche a guzoziri eguzozi. Ọ bụ ezie na Bible na-ekwu banyere mma elu ahụ ya mgbe ọ gafeworo afọ 60, ọ na-adọrọ uche karịsịa gaa n’ebe ezi àgwà ya dị—mmadụ zoro ezo nke obi. (Jenesis 12:11; 1 Pita 3:4-6) O gosiri mmụọ ịdị nwayọọ na mmụọ nke ịdị nro, o jikwa nrubeisi doo onwe ya n’okpuru di ya. Sera echegbughị onwe ya gabiga ókè banyere otú ndị ọzọ si ele ya anya. Ọ bụ ezie na a zụlitere ya n’ebe e nwere akụ̀ na ụba, o ji ọchịchọ obi biri n’ụlọ ntu ruo ihe karịrị afọ 60. O ji ịdị umeala na achọghị ọdịmma onwe onye nanị kwadoo di ya; ọ bụ nwanyị okwukwe. Nke ahụ bụ ihe mere ya nwanyị mara mma n’ezie.—Ilu 31:30; Ndị Hibru 11:11.
Dị ka ndị Kraịst, anyị nwere mmasị n’imeziwanye mma ime mmụọ anyị, mma nke, ọ bụrụ na a na-azụ ya n’ụzọ chiri anya, ga-eto eto ma dịgide. (Ndị Kọlọsi 1:9, 10) Anyị pụrụ ilekọta ọdịdị ime mmụọ anyị n’ụzọ abụọ bụ isi.
Anyị na-ama mma n’anya Jehova karị ka anyị na-ekere òkè n’ozi anyị nke na-azọpụta ndụ. (Aịsaịa 52:7; 2 Ndị Kọrint 3:18–4:2) Ọzọkwa, ka anyị na-amụta igosipụta àgwà ndị Kraịst, ịma mma anyị na-emiwanye emi. Ohere ndị anyị nwere imeziwanye mma ime mmụọ anyị bara ụba: “Ka ihe mmadụ ibe unu na-atọrịta unu ụtọ nke ukwuu; n’akụkụ nsọpụrụ unu, na-acharanụ ibe unu ụzọ . . . N’akụkụ mmụọ unu, na-adịnụ ọkụ . . . Na-agbasonụ ọrụ ile ndị ọbịa anya nke ọma. . . . Na-esonụ ndị na-aṅụrị n’ịṅụrị ọṅụ; na-esonụ ndị na-akwa ákwá n’ịkwa ákwá. . . . Unu enyeghachila onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ. . . . Unu na mmadụ nile na-adị n’udo.” (Ndị Rom 12:10-18) Ịzụlite àgwà ndị dị otú ahụ ga-adọta anyị nso n’ebe ma Chineke ma mmadụ ibe anyị nọ, ọ pụrụ ibelata ọdịdị dị njọ nke àgwà mmehie anyị ketara eketa.—Ndị Galetia 5:22, 23; 2 Pita 1:5-8.
Anyị Pụrụ Ịlụso Mmụọ nke Ụwa Ọgụ!
N’ọtụtụ ụzọ aghụghọ dị iche iche, mmụọ na-emerụ emerụ nke ụwa a pụrụ ime nguzosi ike n’ezi ihe anyị ghara isi ike. Ọ pụrụ ime ka anyị ghara inwe afọ ojuju n’ihe anyị nwere ma na-achọsi ike ibute mkpa na ọdịmma anyị ụzọ kama nke Chineke. Ma ọ bụ ọ pụrụ iduga anyị n’iche echiche mmadụ kama nke Chineke, na-ewere ntụsara ahụ ma ọ bụ ọdịdị elu ahụ dị ka ihe dị oké mkpa.—Tụlee Matiu 16:21-23.
Setan kpebisiri ike ibibi ọdịdị ime mmụọ anyị, mmụọ nke ụwa bụkwa otu n’ime ngwá ọgụ ya bụ isi. Cheta na Ekwensu pụrụ ịgbanwe ụzọ o si eme ihe site na nke ọdụm na-agbọ ụja gaa na nke agwọ dị aghụghọ. (Jenesis 3:1; 1 Pita 5:8) Mgbe ụfọdụ, ụwa na-emeri onye Kraịst site ná mkpagbu dị ilu, ma mgbe mgbe ọ na-eji nwayọọ nwayọọ emerụ ya. Pọl nwere nchegbu karị banyere ihe ize ndụ ikpeazụ a: “Ana m atụ egwu, ma ò nwere ụzọ ọ bụla a ga-emebi uche unu ka unu pụọ n’afọ ofufo na ịdị ọcha nke dị n’ebe Kraịst nọ, dị ka agwọ ahụ weere aghụghọ ya ghọgbuo Iv.”—2 Ndị Kọrint 11:3.
Iji chebe onwe anyị pụọ n’aghụghọ nke agwọ ahụ, ọ dị anyị mkpa ịmata atụmatụ aghụghọ nke “sitere n’ụwa” ma jụsie ya ike. (1 Jọn 2:16) A gaghị aghọgbu anyị ma ọlị n’ikwere na ụzọ ụwa si eche echiche adịghị emerụ ahụ. Ikuku na-egbu egbu nke usoro ihe Setan eruwo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ndị na-atụ egwu.—Ndị Efesọs 2:2.
Ozugbo a hụtara echiche ụwa, anyị pụrụ ịlụso ya ọgụ site n’iji ozizi dị ọcha nke Jehova mejuo uche na obi anyị. Dị ka Eze Devid, ka anyị kwuo, sị: “Jehova, mee ka m mara ụzọ Gị nile; zi m okporo ụzọ Gị nile. Mee m ka m zọọ ije n’eziokwu Gị, Gị zikwa m ihe; n’ihi na Gị onwe gị bụ Chineke nke nzọpụta m.”—Abụ Ọma 25:4, 5.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E jiriwo aha nnọchianya mee ihe.
[Foto dị na peeji nke 26]
Ịchụso ụzọ ndụ nke ntụsara ahụ pụrụ iwezụga anyị n’ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ