Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 7/12 p. 27
  • Ndụmọdụ Baịbụl Nyere Gbasara Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndụmọdụ Baịbụl Nyere Gbasara Anya
  • Teta!—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka “Anya Laara Anya” Pụtara?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Mee Ka Anya Gị Na-elegide Otu Ebe
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Na-egosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ—Site n’Ịdị Na-ele Onye Ị Na-agwa Okwu Anya n’Ihu
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Anya Gị Ọ̀ Na-elegide Otu Ebe?
    Ozi Alaeze Anyi—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2012
g 7/12 p. 27

Ndụmọdụ Baịbụl Nyere Gbasara Anya

● Anya anyị enweghị oyiri. Ọ na-akpakwa ezigbo ike. Otu akwụkwọ kwuru na e kee akwara niile na-ezigara ụbụrụ ozi ụzọ iri, anya anyị nwe anọ n’ime ha.

Jizọs Kraịst sị na anya bụ “Oriọna nke ahụ́.” Ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu. Mgbe ọ na-akọwa ihe okwu ya pụtara, ọ sịrị: “Ọ bụrụ na anya gị na-elegide otu ebe, ahụ́ gị dum ga-ejupụta n’ìhè; ma ọ bụrụ na anya gị dị njọ, ahụ́ gị dum ga-agba ọchịchịrị.” (Matiu 6:22, 23) Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ihe anyị letara n’anya na-eso ekpebi ihe anyị na-eche n’echiche, otú obi na-adị anyị, na ihe anyị na-eme. Ọ bụrụ na anyị na-eche ihe ndị dị mma, anyị ga na-akpa ezigbo àgwà. Ma, ọ bụrụ na anyị na-eche ihe ọjọọ, anyị agaghị na-akpa ezigbo àgwà.

Dị ka ihe atụ, legodị ihe Jizọs kwuru na Matiu 5:28, 29. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya. Ọ bụrụkwa na anya aka nri gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, ghụpụ ya tụfuo.” Gịnị ka Jizọs na-ekwu ebe a? Ihe ọ na-ekwu bụ na ọ bụrụ na anyị akpachaghị anya n’ihe ndị anyị na-ele, o nwere ike ime ka anyị chewe echiche ime ihe ọjọọ. Ọ bụrụzie na ohere ime ya adapụta, anyị nwere ike mee ya. Ị manụ na Chineke anaghị ele onye na-eme ihe ọjọọ anya ọma.—Jems 1:14, 15.

Ị̀ hụlanụ ihe mere anyị kwesịrị iji gbalịsie ike na-ejide onwe anyị, a sịgodị na o nwere ike isiri anyị ike otú ahụ ịghụpụ anya anyị tụfuo ga-esiri anyị? A sị ka e kwuwe, ihe ọ sọkwara anyị mee ugbu a, o nweghị ihe ga-enye anyị obi ụtọ karịa inweta ndụ ebighị ebi.

Ihe anyị letara n’anya nwekwara ike ime ka anyị nwee anyaukwu. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị zere “ọchịchọ nke anya.” Maka gịnị? Maka na “o sịghị n’ebe Nna anyị nọ, kama o si n’ụwa. Ụwa na-agabiga, ọchịchọ ya na-agabigakwa, ma onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:16, 17.

Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ pụtara na Chineke na-akpa ụmụ mmadụ ahụ́? Mbanụ. Ọ bụrụ na anyị ahapụ ime ihe o kwuru na Baịbụl, anyị ji aka anyị na-akpọ nsogbu òkù. Ị makwa na onye nsogbu zuru ahụ́ anaghị enwe obi ụtọ ná ndụ. (Ndị Galeshia 6:7, 8) Ma, ọ bụrụ na anyị egee Chineke ntị ma kpachara anya n’ihe anyị ji anya anyị ele, anyị ga-enwe obi ụtọ ná ndụ. Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya.” (Luk 11:28) Ihe ọzọ bụ na ndị na-eme ihe Chineke kwuru nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ma, ndị na-ele ihe ndị ga-eme ka ha chewe echiche ime ihe ọjọọ ma ọ bụkwanụ nwewere onye ọzọ anyaukwu agaghị enwe ma obi ụtọ ma ndụ ebighị ebi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya