-
Tụkwasị Jehova Obi Gị Nile n’Oge NsogbuỤlọ Nche—2003 | Septemba 1
-
-
7, 8. (a) Olee otú Jizọs si mee ka a mara na ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere ọchịchọ nke ichegbubiga onwe ha ókè banyere ihe onwunwe? (Leekwa ihe odide ala ala peeji.) (b) Ndụmọdụ dị aṅaa amamihe dị na ya ka Jizọs nyere banyere otú e si ezere mmadụ ịbụ onye na-echegbubiga onwe ya ókè?
7 N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jizọs dụrụ ọdụ, sị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ banyere ahụ́ unu maka ihe unu ga-eyi.”b (Matiu 6:25) Jizọs maara na dị ka o kwesịrị, ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-echegbu onwe ha banyere inweta ihe ndị bụ́ isi dị ha mkpa. Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi ‘kwụsị ichegbu onwe anyị’ banyere ihe ndị dị otú ahụ? “Nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ,” ka Jizọs kwuru. N’agbanyeghị nsogbu ọ bụla anyị na-ezute, anyị aghaghị ịnọgide na-ebute ofufe Jehova ụzọ ná ndụ anyị. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, mgbe ahụ Nna anyị nke eluigwe ‘ga-atụkwasịrị anyị’ ihe nile na-akpa anyị kwa ụbọchị. Site n’otu ụzọ ma ọ bụ ụzọ ọzọ, ọ ga-eme ka o kwe anyị omume ịnọgide na-enweta ihe ndị dị anyị mkpa.—Matiu 6:33.
-
-
Tụkwasị Jehova Obi Gị Nile n’Oge NsogbuỤlọ Nche—2003 | Septemba 1
-
-
b A kọwara nchegbu a na-ekwu maka ya n’ebe a dị ka “nchegbu na-abịa n’ihi ụjọ, bụ́ nke na-eme ka mmadụ ghara inwe ọṅụ ná ndụ.” Ụfọdụ nsụgharị na-asị “unu echegbula onwe unu.” Ma nsụgharị dị otú ahụ na-enye echiche na anyị ekwesịghị ịmalite ichegbu onwe anyị. Otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu, sị: “Ọdịdị okwu ngwaa Grik ahụ bụ iwu nọ n’ụdị okwu bụ́ nke na-egosi ihe ndị na-eme ugbu a, na-enye iwu ka a kwụsị ime ihe a maliteworo ime.”
-