Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 2/1 p. 32
  • “Urodi nke Ubi”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Urodi nke Ubi”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 2/1 p. 32

“Urodi nke Ubi”

ENWEGHỊ ọrụ. Ọnụ ahịa na-arị elu. Ịda ogbenye. Ndakpọ akụ na ụba. Okwu ndị a na-apụta ọtụtụ mgbe n’ụzọ na-aba ụba n’akwụkwọ akụkọ dị iche iche. Ha na-egosipụtakwa ihe isi ike nke ọtụtụ nde mmadụ na-eche ihu ka ha na-agbalị inye ezinụlọ ha nri na igbokwasị ha uwe oyiyi na ịchọrọ ha ebe ha ga-ebi.

Ọ na-emetụta ndị kwere ekwe na ndị na-ekweghị ekwe. Ma ahapụghị ndị kwere ekwe nanị ha n’iche nsogbu ndị ahụ ihu. Jisọs, mgbe ọ na-agwa ndị ahụ dị umeala n’obi na narị afọ ise mbụ okwu sịrị: “Leenụ anụ ufe nke eluigwe, na ha adịghị agha mkpụrụ, ha adịghị ewekwa ihe ubi, ha adịghị ekpokọtakwa ihe baa n’ọba; ma Nna unu nke eluigwe na-azụ ha. Unu onwe unu àbụghị ihe oké ọnụ ahịa karịa ha?”​—⁠Matthew 6:26.

Jisọs kwukwara, sị: “Rịbanụ urodi nke ubi ama, otú ha na-eto eto; ha adọgbughị onwe ha n’ọrụ, ha atụghịkwa ogho: ma asị m unu, na ọbụna Solomọn n’ebube ya nile, egbokwasịghị ya ákwà dị ka otu n’ime ndị a. Ma ọ bụrụ na Chineke eyikwasị ahịhịa nke ubi uwe otú a . . . ọ̀ gaghị eyikwasị karị unu uwe nke ukwuu?”​—⁠Matiu 6:​28-⁠30.

Nke a ọ̀ pụtara na ọ dịghị mkpa ka onye Kraịst rụọ ọrụ iji nweta ihe e ji ebi ndụ? Ọ dịghị ma ọlị! Onye Kraịst na-arụsi ọrụ ike ruo otú ọ dị mkpa iji kwụọ ụgwọ dị iche iche o ji. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọghị ịrụ ọrụ, ya gharakwa iri ihe.” (2 Ndị Tesalọnaịka 3:10) Otú o sina dị, onye Kraịst maara nlekọta ịhụnanya nke Chineke, nweekwa okwukwe na Nna ya nke eluigwe na-elekọta ya anya. Otú a, nchegbu nke ndụ adịghị eme ka ọ ghara iguzosi ike. Ọbụna n’oge ihe isi ike, ọ na-etinye ihe mbụ​—⁠ihe ime mmụọ⁠—​n’ọnọdụ mbụ. O kwere n’okwu ndị ahụ nke Jisọs: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze ya, na ezi omume ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.”​—⁠Matiu 6:33.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya