Ihe A Ga-amụta Site ná Nnụnụ na Okooko Osisi
GỊNỊ na-echegbukarị ndị mmadụ taa karịa ihe ọ bụla ọzọ? Nye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ, ọ bụ inwe ego zuru ezu iji na-azụ ezinụlọ ha ma ọ bụ inwe ike meziwanye ọnọdụ ibi ndụ ha.
Ịkpata ego zuru ezu iji gboo mkpa bụkwa nchegbu bụ isi mgbe Jisọs Kraịst nọ n’elu ala. Ma ọ dọrọ aka ná ntị na nchegbu a kwesịrị ekwesị pụrụ ịghọ oké nchekasị nke na-akpapụ ihe ime mmụọ. Iji maa atụ ihe ọ na-ekwu, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha leruo nnụnụ na okooko osisi anya.
Ọ dị nnụnụ mkpa iri ihe kwa ụbọchị—ná nkezi karịa ka ọ dị anyị mkpa iri n’ihi ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ahụ ha ji arụ ọrụ. Ọzọkwa, ha apụghị ịkụ mkpụrụ, wee ihe ubi ma ọ bụ chekwaa ihe oriri maka ọdịnihu. Ma, dị ka Jisọs kwuru, “Nna [anyị] nke eluigwe na-azụ ha.” (Matiu 6:26) N’otu aka ahụ, Chineke na-eyikwasị “urodi nke ubi” uwe ndị kasị mma.—Matiu 6:28-30.
Jisọs na-emesi anyị obi ike na ọ bụrụ na anyị edebe mkpa ihe onwunwe n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị ma bute ihe ime mmụọ ụzọ, Chineke ga-ahụ na anyị nwekwara ihe oriri na uwe ndị dị mkpa. Ọ bụrụ na Jehova na-elekọta nnụnụ na okooko osisi, n’ezie ọ ga-elekọta ndị hụrụ ya n’anya ma ‘buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya.’ (Matiu 6:33) Ị̀ na-ebute ọdịmma nile nke Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ gị?