Isi nke Iri na Otu
“Nọgidenụ Buru Ụzọ Na-achọ Alaeze Ahụ”
1. (a) N’ihi gịnị ka Jizọs ji gbaa ndị na-ege ya ntị ume ibu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ? (b) Ajụjụ dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
N’OTU okwu o kwuru na Galili n’ihe karịrị afọ 1,900 gara aga, Jizọs gbara ndị na-ege ya ntị ume, sị: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume [Chineke].” Ma, n’ihi gịnị ka o ji dị oké ngwa otú a? Ọ̀ bụ na oge Kraịst ga-anata ike Alaeze abụghị ọtụtụ narị afọ n’ihu? Ee, ọ bụ, ma Alaeze Mezaịa ahụ gaje ịbụ ụzọ Jehova ga-esi gosi oruru o ruuru ya ịchị achị ma mezuo nzube ya dị ebube maka ụwa. Onye ọ bụla nke ghọtara n’ezie mkpa ihe ndị ahụ dị ga-ebute Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ ya. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ eziokwu na narị afọ mbụ, lee ka o si bụrụ eziokwu taa karị, ugbu a e meworo ka Kraịst nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze! Ajụjụ bụzi, Ụzọ m si adị ndụ ọ̀ na-egosi na m bu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke?—Matiu 6:33.
2. Gịnị ka ndị mmadụ n’ozuzu ha na-achụsosi ike?
2 Taa, ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa, n’ezie, bu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ. Ha na-egosi na ha na-akwado ịchịisi Alaeze ahụ site n’ime ka ndụ ha hiwe isi n’ime uche Jehova, ebe ha rarawooro onwe ha nye ya. N’aka nke ọzọ, ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ n’ihe a kpọrọ mmadụ nwere mmasị n’ịchọ ihe nke ụwa. Ndị mmadụ na-achụso ego na ihe onwunwe nakwa ihe ụtọ ndị ego pụrụ ịzụta. Ma ọ bụ ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ iji hụ na ọrụ ha na-aga n’ihu. Ụzọ ndụ ha na-egosi na uche ha dum dị n’ebe onwe ha nọ, n’ebe ihe onwunwe, na ihe ụtọ dị. Ha na-edebe Chineke n’ọnọdụ nke abụọ, ma ọ bụrụdị na ha kwere na ya.—Matiu 6:31, 32.
3. (a) Ụdị akụ̀ dị aṅaa ka Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ịchọ, n’ihi gịnịkwa? (b) Gịnị mere ọ na-ejighị dị mkpa inwe nchegbu gabigara ókè banyere ihe onwunwe?
3 Otú ọ dị, Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ a: “Kwụsịnụ ịkpakọbara onwe unu akụ̀ n’elu ala,” ebe ọ na-adịghị nke ọ bụla n’ime ihe onwunwe ndị dị otú ahụ ga-adịru mgbe ebighị ebi. “Kama nke ahụ,” ka ọ sịrị, “na-akpakọbaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe” site n’ijere Jehova ozi. Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha mee ka anya ha “na-elegide otu ebe” site n’ime ka uche ha na ume ha dịrị n’ime uche Chineke. Ọ sịrị ha: “Unu apụghị ịbụ ohu Chineke na nke Akụ̀ na Ụba.” Ma olee banyere mkpa anụ ahụ́—ihe oriri, uwe, na ebe obibi? “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu,” ka Jizọs dụrụ n’ọdụ. Ọ dọọrọ uche ha gaa n’ebe ụmụ nnụnụ nọ—Chineke na-enye ha ihe oriri. Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ịmụta ihe site n’okooko osisi—Chineke na-eyikwasị ha uwe. Ọ̀ bụ na ụmụ mmadụ nwere ọgụgụ isi, bụ́ ndị na-ejere Jehova ozi adịghị oké ọnụ ahịa karịa nke ọ bụla n’ime ihe ndị a? “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya,” ka Jizọs kwuru, “a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile [dị mkpa].” (Matiu 6:19-34) Omume gị ọ̀ na-egosi na i kwenyere nke ahụ?
Ekwela Ka A Kpagbuo Eziokwu Alaeze Ahụ
4. Ọ bụrụ na mmadụ ejiri ihe onwunwe kpọrọ ihe gabiga ókè, gịnị ka ọ pụrụ ịrụpụta?
4 Mmadụ inwe nchegbu banyere inwe ihe ga-ezuru ya igbo mkpa anụ ahụ́ ya na nke ezinụlọ ya kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na mmadụ na-enwe nchegbu gabigara ókè banyere ihe onwunwe, ọ pụrụ ịrụpụta ihe ndị dị oké njọ. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịdị na-ekwu na ya kwere n’Alaeze ahụ, ọ bụrụ na ọ na-ebute ihe ndị ọzọ ụzọ n’ime obi ya, a ga-akpagbu eziokwu Alaeze ahụ. (Matiu 13:18-22) Dị ka ihe atụ, n’otu oge, otu nwa okorobịa bụ́ onye ọchịchị bara ọgaranya jụrụ Jizọs, sị: “Gịnị ka m na-aghaghị ime iji keta ndụ ebighị ebi?” O biri ndụ dị ọcha, mesookwa ndị ọzọ ihe n’ụzọ dị mma, ma ọ hụrụ ihe onwunwe ya n’anya gabiga ókè. Ọ gaghị ahapụli ha iji ghọọ onye na-eso ụzọ Kraịst. Ya mere o kwere ka ohere nke gaara eduga na ya iso Kraịst nọrọ n’Alaeze eluigwe funahụ ya. Jizọs sịrị n’oge ahụ: “Lee otú ọ ga-esi siere ndị nwere ego ike ịba n’alaeze Chineke!”—Mak 10:17-23.
5. (a) N’ihe ndị dị aṅaa ka Pọl gbara Timoti ume ka o nwee afọ ojuju, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee otú Setan si eji “ịhụ ego n’anya” eme ihe dị ka ọnyà na-akpata mbibi?
5 Ọtụtụ afọ ka e mesịrị, Pọl onyeozi degaara Timoti akwụkwọ, bụ́ onye nọ mgbe ahụ n’Efesọs, obodo azụmahịa nke bara ọgaranya. Pọl chetaara ya, sị: “Ọ dịghị ihe anyị webataworo n’ime ụwa, ọ dịghịkwa ihe anyị pụrụ iburu pụọ na ya. Ya mere, ebe anyị nwere ihe oriri na ihe mgbokwasị, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.” Mmadụ ịrụ ọrụ iji nweta “ihe oriri na ihe mgbokwasị” maka onwe ya na ezinụlọ ya bụ ihe kwesịrị ekwesị. Ma Pọl dọrọ aka ná ntị, sị: “Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ amaghị ihe nke na-emerụkwa ahụ́, bụ́ ndị na-akwakpu mmadụ ná mbibi na ịla n’iyi.” Setan dị aghụghọ. Ná mmalite, ọ pụrụ isi n’ụzọ ndị dị nta rata mmadụ. Nrụgide nke buru ibu karị pụrụ isochi nke a, ma eleghị anya ohere nke ịbụ onye e buliri n’ọkwá ma ọ bụ ọrụ ka mma nke a na-akwụ ụgwọ ka ukwuu na ya ma bụrụ nke na-achọ ka e tinyere ya oge e debeburu maka ihe ime mmụọ. Ọ gwụla ma anyị nọ na nche, “ịhụ ego n’anya” pụrụ ịkpagbu ihe ndị ka nnọọ mkpa ndị metụtara Alaeze ahụ. Pọl si otú a kwuo ya: “Sitekwa n’ịchụso ịhụnanya nke a e duhiewo ụfọdụ pụọ n’okwukwe, ha ejiriwokwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha aghara aghara.”—1 Timoti 6:7-10.
6. (a) Iji zere ịbụ ndị ịhụ ihe onwunwe n’anya matara n’ọnyà, gịnị ka anyị na-aghaghị ime? (b) Obi ike dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe n’agbanyeghị ọnọdụ akụ́ na ụba nke ụwa taa?
6 N’ihi ezi ịhụnanya o nwere n’ebe nwanna ya nwoke bụ́ Onye Kraịst nọ, Pọl gbara Timoti ume, sị: “Gbanahụ ihe ndị a” nakwa “lụọ ezi ọgụ nke okwukwe.” (1 Timoti 6:11, 12) A chọrọ mgbalị siri ike ma ọ bụrụ na anyị ga-ezere ịbụ ndị ụzọ ndụ nke ịchụso ihe onwunwe nke ụwa gbara anyị gburugburu dọọrọ. Ma ọ bụrụ na anyị adọgbuo onwe anyị n’ọrụ n’ụzọ kwekọrọ n’okwukwe anyị nwere, ọ dịghị mgbe Jehova ga-agbahapụ anyị. N’agbanyeghị ihe ịda ọnụ na enweghị ọrụ zuru ebe nile, ọ ga-ahụ na anyị na-enweta ihe ndị dị anyị mkpa n’ezie. Pọl dere, sị: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a. N’ihi na [Chineke ekwuwo], sị: ‘M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.’ Ka anyị wee jupụta n’obi ike ma kwuo, sị: ‘Jehova bụ onye inyeaka m; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?’” (Ndị Hibru 13:5, 6) Eze Devid dekwara, sị: “Nwata ka m bụworo, aghọwokwa m okenye; ma ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya, ahụghịkwa m mkpụrụ ya ka ha na-arịọ nri.”—Abụ Ọma 37:25.
Ndị Na-eso Ụzọ nke Oge Mbụ Setịpụrụ Ihe Nlereanya
7. Ntụziaka dịgasị aṅaa banyere ime nkwusa ka Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, n’ihi gịnịkwa ka ntụziaka ndị a ji kwesị ekwesị?
7 Mgbe Jizọs nyesịrị ndịozi ya ọzụzụ kwesịrị ekwesị, o zipụrụ ha n’Izrel ịga kwusaa ozi ọma ma kpọsaa, sị: “Alaeze nke eluigwe eruwo nso.” Lee ozi na-enye obi ụtọ ọ bụ! Jizọs Kraịst, bụ́ Eze Mezaịa ahụ, nọ n’etiti ha. Ebe ọ bụ na ndịozi ahụ tinyere onwe ha dum n’ozi Chineke, Jizọs gbara ha ume ka ha nwee obi ike na Chineke ga-elekọta ha. Ya mere, ọ sịrị: “Unu ewerela ihe ọ bụla maka njem a, unu ejila mkpara ma ọ bụ obere akpa, ma ọ bụ achịcha ma ọ bụ ego ọlaọcha; unu achịkwala uwe ime abụọ. Kama n’ebe ọ bụla unu banyere n’ebe obibi, nọrọnụ n’ebe ahụ, sikwanụ n’ebe ahụ pụọ.” (Matiu 10:5-10; Luk 9:1-6) Jehova ga-ahụ na ndị Izrel ibe ha, bụ́ ndị na-elekarị ndị ha na-amabughị ọbịa, gboro mkpa ha.
8. (a) Ntakịrị oge tupu ya anwụọ, gịnị mere Jizọs ji nye ntụziaka ọhụrụ banyere ime nkwusa? (b) Gịnị ka ga-abụ ihe mbụ ná ndụ nke ndị na-eso ụzọ Jizọs?
8 Ka e mesịrị, kpọmkwem tupu ya anwụọ, Jizọs mere ka ndịozi ya mata eziokwu ahụ bụ́ na n’ọdịnihu, ha ga-arụ ọrụ n’ọnọdụ ndị dị iche. N’ihi mmegide ndị isi ga-emegide ọrụ ha, e nwere ike a gaghị na-elecha ha ọbịa n’Izrel. Ọzọkwa, n’oge na-adịghị anya ha ga-eji ozi Alaeze ahụ gaa ná mba ndị Jentaịl. Ugbu a ha gaje iwere “obere akpa ego” nakwa “obere akpa nri.” Ka o sina dị, ha gaje ịnọgide buru ụzọ na-achọ Alaeze Jehova na ezi omume ya, na-enwe obi ike na Chineke ga-agọzi mgbalị ha na-eme inweta ihe oriri na uwe ndị dị ha mkpa.—Luk 22:35-37.
9. Olee otú Pọl si bute Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ ya ka ọ nọ na-ahụ maka mkpa anụ ahụ́ ndị nke ya, oleekwa ndụmọdụ o nyere n’okwu a?
9 Pọl onyeozi bụ otu ezi ihe atụ nke onye jiri ndụmọdụ Jizọs mee ihe. Pọl mere ka ozi ahụ bụrụ ihe mbụ ná ndụ ya. (Ọrụ 20:24, 25) Mgbe ọ gara n’otu ógbè ịga mee nkwusa, o gboro mkpa anụ ahụ́ nke ya, ọbụna rụọ ọrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu. Ọ tụghị anya ka ndị ọzọ lekọta ya. (Ọrụ 18:1-4; 1 Ndị Tesalonaịka 2:9) N’agbanyeghị nke ahụ, o ji obi ekele nakwere omume ile ọbịa nakwa onyinye dị iche iche mgbe ndị ọzọ si otú a gosipụta ịhụnanya ha. (Ọrụ 16:15, 34; Ndị Filipaị 4:15-17) Pọl gbara Ndị Kraịst ume ka ha ghara ileghara ibu ọrụ ha n’ezinụlọ anya iji mee nkwusa, kama nke ahụ ka ha hazie ibu ọrụ ha dị iche iche. Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha na-arụ ọrụ, ka ha hụ ezinụlọ ha n’anya, na ka ha soro ndị ọzọ na-ekerịta ihe. (Ndị Efesọs 4:28; 2 Ndị Tesalonaịka 3:7-12) Ọ gbara ha ume ịtụkwasị obi na Chineke, ọ bụghị n’ihe onwunwe, nakwa ka ha jiri ndụ ha na-eme ihe n’ụzọ ga-egosi na ha ghọtara n’ezie ihe ndị ka mkpa. N’ikwekọ n’ihe ndị Jizọs kụziri, nke ahụ pụtara ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume ya.—Ndị Filipaị 1:9-11.
Bute Alaeze ahụ Ụzọ ná Ndụ Gị
10. Gịnị ka ibu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ pụtara?
10 Ruo n’ókè hà aṅaa ka anyị onwe anyị na-eso ndị ọzọ ekerịta ozi ọma Alaeze ahụ? Nke ahụ na-adabere, ruo n’ókè ụfọdụ, n’ọnọdụ anyị nakwa n’otú ekele anyị nwere ha. Buru n’uche na Jizọs asịghị, ‘Chọọnụ Alaeze ahụ mgbe unu na-enwekwaghị ihe ọzọ unu ga-eme.’ N’ihi na ọ maara mkpa Alaeze ahụ dị, o kwupụtara uche Nna ya, na-asị: “Nọgidenụ na-achọ alaeze ya.” (Luk 12:31) Ọ bụ ezie na ọ dị ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị mkpa ịrụ ọrụ iji gboo mkpa ndị nke anyị nakwa ndị nke ezinụlọ anyị, ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe, anyị ga-edebe ọrụ Alaeze ahụ Chineke nyeworo anyị ịrụ n’ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị. N’otu oge ahụ, anyị ga na-elekọta ibu ọrụ ndị anyị nwere n’ezinụlọ anyị.—1 Timoti 5:8.
11. (a) Olee otú Jizọs si gosi na ọ bụghị mmadụ nile ga-enwe ike ime ihe n’ụzọ ha nhata n’ịgbasa ozi Alaeze ahụ? (b) Olee ihe ndị na-enwe mmetụta n’ihe mmadụ ga-enwe ike ịrụzu?
11 Ụfọdụ n’ime anyị pụrụ inwe ike itinye oge n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ karịa ndị ọzọ. Ma n’ilu ya banyere ụdị ala dị iche iche, Jizọs gosiri na ndị nile obi ha yiri ala nke dị mma ga-amị mkpụrụ. Ruo n’ókè hà aṅaa? Ọnọdụ ndị mmadụ n’otu n’otu dịgasị iche iche. Afọ ndụ, ahụ́ ike, na ibu ọrụ ezinụlọ na-enwecha mmetụta na ya. Ma mgbe e ji ya kpọrọ ihe n’ezie, a pụrụ ịrụzu ihe dị ukwuu.—Matiu 13:23.
12. Olee ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ dị mma a na-agba ndị na-eto eto ume karịsịa ka ha chebara echiche?
12 Ọ dị mma inwe ihe mgbaru ọsọ ndị ga-enyere anyị aka ịmụba òkè anyị na-ekere n’ozi Alaeze ahụ. Ndị na-eto eto kwesịrị ichesi echiche ike banyere ihe nlereanya bụ́ ịgba nke onye na-eto eto bụ́ Onye Kraịst na-anụ ọkụ n’obi bụ́ Timoti setịpụrụ. (Ndị Filipaị 2:19-22) Olee ihe pụrụ ịdị mma karịa ha ịbanye n’ozi oge nile mgbe ha gụsịrị akwụkwọ? Ndị toruworo ogo mmadụ pụkwara irite uru site n’isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị dị mma.
13. (a) Ònye ga-ekpebi ihe anyị nwere ike ime n’onwe anyị n’ozi Alaeze? (b) Ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ n’ezie, gịnị ka anyị ga-egosipụta?
13 Kama ịkatọ ndị anyị pụrụ iche na ha pụrụ imekwu ihe, okwukwe kwesịrị ịkwali anyị ịrụ ọrụ iji meziwanye ihe n’onwe anyị ka anyị wee nwee ike ijere Chineke ozi ruo n’ókè zuru ezu dị ka ọnọdụ nke anyị nyere anyị ohere ya. (Ndị Rom 14:10-12; Ndị Galeshia 6:4, 5) Dị ka e gosiri n’ihe banyere Job, Setan na-arụ ụka na anyị nwere mmasị karịsịa n’ihe onwunwe anyị, ntụsara ahụ́ anyị, na ọdịmma onwe anyị nakwa na isi ihe anyị bu n’obi na-ejere Chineke ozi bụ ọdịmma onwe anyị nanị. Ma ọ bụrụ na anyị bu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ n’ezie, anyị na-ekere òkè n’igosi na Ekwensu bụ ezigbo onye ụgha n’ezie. Anyị na-enye ihe àmà na ihe mbụ ná ndụ anyị bụ ijere Chineke ozi. Anyị na-esi otú a egosipụta, ma n’okwu ma n’omume, ịhụnanya miri emi anyị nwere n’ebe Jehova nọ, nkwado anyị ji iguzosi ike n’ihe na-akwado ọbụbụeze ya, nakwa ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị mmadụ ibe anyị nọ.—Job 1:9-11; 2:4, 5; Ilu 27:11.
14. (a) Gịnị mere inwe usoro ihe omume maka ozi ubi ji baa uru? (b) Ruo n’ókè hà aṅaa ka ọtụtụ Ndịàmà na-ekere òkè n’ozi ubi?
14 Inwe usoro ihe omume pụrụ inyere anyị aka ịrụzu ihe anyị na-agaraghị enwe ike ịrụzu. Jehova n’onwe ya nwere “mgbe a kara aka” ọ ga-emezu nzube ya. (Ọpụpụ 9:5; Mak 1:15) Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ọ dị mma ikere òkè n’ozi ubi n’otu oge a kara aka ma ọ bụ karị kwa izu. Ọtụtụ narị puku Ndịàmà Jehova n’ụwa nile edebanyewo aha ha dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka, na-etinye ihe dị ka awa abụọ n’ụbọchị n’ikwusa ozi ọma ahụ. Ọtụtụ narị puku ndị ọzọ na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile, na-eji ihe dị ka awa abụọ na ọkara kwa ụbọchị ekwusa ozi Alaeze ahụ. Ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na ndị ozi ala ọzọ na-etinye ọbụna oge ka ukwuu n’ozi Alaeze. Anyị pụkwara ịchọ ohere iji soro onye ọ bụla ga-ege ntị kerịta olileanya Alaeze ahụ site n’ịgba àmà mberede. (Jọn 4:7-15) Ọchịchọ anyị kwesịrị ịbụ ikere òkè zuru ezu n’ọrụ ahụ dị ka ọnọdụ anyị nyere anyị ohere ya, n’ihi na Jizọs buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Matiu 24:14; Ndị Efesọs 5:15-17.
15. N’ihe banyere ozi anyị, gịnị mere i ji na-eche na ndụmọdụ ahụ dị ná 1 Ndị Kọrint 15:58 bịara n’ezi oge?
15 N’ịdị n’otu, n’akụkụ nile nke ụwa, n’agbanyeghị mba ha bi na ya, Ndịàmà Jehova na-ekere òkè n’ihe ùgwù a nke ije ozi. Ha ji ndụmọdụ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke dị n’ime Bible eme ihe n’onwe ha, nke na-asị: “Bụrụnụ ndị na-eguzosi ike, ndị a na-apụghị ịkwapụ akwapụ, ndị nwere ọtụtụ ihe mgbe nile ime n’ọrụ Onyenwe anyị, ebe unu maara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị n’efu n’ihe metụtara Onyenwe anyị.”—1 Ndị Kọrint 15:58.
Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu
• Mgbe Jizọs sịrị ka a nọgide “buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ,” gịnị ka ọ na-egosi na e kwesịrị idebe n’ọnọdụ nke abụọ?
• Gịnị kwesịrị ịbụ echiche anyị n’ihe banyere igbo mkpa anụ ahụ́ nke anyị na nke ezinụlọ anyị? Enyemaka dị aṅaa ka Chineke ga-enye anyị?
• N’akụkụ dịgasị aṅaa nke ozi Alaeze ka anyị pụrụ ikere òkè na ha?
[Foto dị na peeji nke 107]
N’ala nile, Ndịàmà Jehova taa na-ekwusa ozi ọma ahụ tupu ọgwụgwụ ahụ eruo