Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Bụrụnụ Ndị Na-eme Okwu Ahụ, Ọ Bụghị Ndị Na-anụ Nani Ọnụnụ
    Ụlọ Nche—1990 | Ọktoba 1
    • 3. Ndụmọdụ dị aṅaa banyere ikpe ikpe ka Jisọs gara n’ihu inye n’Ozizi Elu Ugwu ahụ?

      3 Ka Jisọs gara n’ihu n’Ozizi Elu Ugwu ya, e nwere ọtụtụ okwu ndị ọzọ ndị Kraịst na-aghaghị ịgbalị ịgbaso. Nke a bụ otu nke yiri ka ọ dị mfe ma ọ katọrọ otu n’ime àgwà ndị kasị sie ike iwepụ: “Unu ekpela ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe. N’ihi na ikpe unu ji kpee ka a ga-eji kpee unu: ọ bụkwa ihe unu ji tụọ ihe ka a ga-eji tụọrọ unu. Ma gịnị mere i ji lee irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna gị, ma ị tụgharịghị uche ná ntụhie nke dị n’anya nke gị? Ma ọ bụ ị̀ ga-esi aṅaa sị nwanna gị, Kwee ka m tụpụ irighiri ahịhịa ahụ n’anya gị: ma lee, ntụhie ahụ dị n’anya nke gị? Ọnye ihu abụọ, buru ụzọ tụpụ ntụhie ahụ n’anya nke gị; mgbe ahụ ka ị ga-elegide anya ịtụpụ irighiri ahịhịa ahụ n’anya nwanna gị.”—Matiu 7:1-5.

  • Bụrụnụ Ndị Na-eme Okwu Ahụ, Ọ Bụghị Ndị Na-anụ Nani Ọnụnụ
    Ụlọ Nche—1990 | Ọktoba 1
    • 5. N’ihi gịnị ka ọ na-eji adị mfe karị ịhụ ntụpọ nke ndị ọzọ karịa nke anyị onwe anyị?

      5 N’ime narị afọ mbụ O.A., n’ihi omenala a kụziri n’okwu ọnụ, ndị Farisii na-ekpekarị ndị ọzọ ikpe n’ụzọ dị ike. Nke ọ bụla n’ime ndị na-ege Jisọs ntị, bụ́ onye na-eme otú ahụ kwesịrị ịkwụsị ya. Ọ na-adị mfe nke ukwuu karị ịhụ irighiri ahịhịa dị n’anya ndị ọzọ karịa otú ọ na-adị ịhụ ntụhie dị n’anya nke anyị—ọ na-abụkwa ihe na-akwalite echiche anyị nwere banyere onwe anyị nke ukwuu. Dị ka otu nwoke kwuru, “Ọ na-amasị m ịkatọ ndị ọzọ n’ihi na ọ na-eme ka m nwee nnọọ mmetụta dị mma!”Ịdị na-enyochagharị ndị ọzọ mgbe nile pụrụ ime ka anyị nwee mmetụta nke ịbụ ndị nwere omume ọma nke a pụrụ iji n’ihi ya lefuru adịghị ike nke anyị anya, bụ́ ndị anyị na-achọ ikpuchi. Ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa ime mgbazi, e kwesịrị ime nke a ná mmụọ nke dị nwayọọ. Onye na-eme mgbazi ahụ kwesịrị ịnọ mgbe nile buru adịghị ike ndị nke ya n’uche mgbe nile.—Ndị Galetia 6:1.

  • Bụrụnụ Ndị Na-eme Okwu Ahụ, Ọ Bụghị Ndị Na-anụ Nani Ọnụnụ
    Ụlọ Nche—1990 | Ọktoba 1
    • 6. N’ihe ndabere dị aṅaa ka anyị kwesịrị ikpe ikpe ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa, enyemaka dị aṅaa ka anyị kwesịkwara ịchọ ka anyị wee ghara ịbụ ndị na-akatọkarị ndị ọzọ?

      6 Jisọs abịaghị ikpe ụwa ikpe, kama ọ bịara ịzọpụta ya. Ikpe ọ bụla o kpere abụghị nke aka ya, kama ha dabeere n’okwu Chineke nyeworo ya ikwu. (Jọn 12:47-50) Ikpe ọ bụla anyị na-ekpe kwesịkwara ịbụ n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu Jehova. Anyị aghaghị ịbịanyụ ihe ahụ dị n’ime mmadụ nke bụ ịchọ ikpe ndị ọzọ ikpe. N’ime nke a, anyị kwesịrị ịnọgide na-ekpe ekpere maka enyemaka Jehova: “[Na-arịọnụ, NW], a ga-enyekwa unu; [na-achọnụ, NW], unu ga-achọtakwa; [na-akụnụ aka, NW], a ga-emeghekwara unu: n’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọ na-arịọta; onye na-achọkwa na-achọta; onye na-akụkwa ka a ga-emeghere.” (Matiu 7:7, 8) Ọbụna Jisọs sịrị: “Mụ onwe m apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe m: dị ka m na-anụ m na-ekpe: ikpe m zikwara ezi; n’ihi na [adịghị m achọ] ihe mụ onwe m na-achọ, kama ihe onye zitere m na-achọ.”—Jọn 5:30.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya