ISI NKE 56
Nye Aka Mee Ka Ọgbakọ Dịrị n’Otu
Mgbe ọ bụla anyị na ụmụnna anyị nọ, obi na-adị anyị otú ọ dị Eze Devid. O dere, sị: “Ọ bụ ihe dị mma, bụrụkwa ihe na-eme obi ụtọ ma ụmụnne bikọta ọnụ ma dịrị n’otu.” (Abụ Ọma 133:1) Anyị agaraghị adị n’otu ma a sị na anyị anaghị agba mbọ ya. Onye ọ bụla n’ime anyị so na-eme ka anyị dịrị n’otu.
1. Olee ihe pụrụ iche gbasara ndị ohu Chineke?
Ọ bụrụ na ị gaa ọmụmụ ihe anyị n’ala ọzọ, o nwere ike ị gaghị anụ asụsụ e ji amụ ihe ebe ahụ. Ma, o doro anya na ahụ́ ga-eru gị ala. Maka gịnị? Ọ bụ maka na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ebe ahụ ka e jikwa amụ Baịbụl n’ebe ndị ọzọ. Anyị na-agbakwa mbọ ka anyị hụ ibe anyị n’anya. N’agbanyeghị ebe anyị bi, anyị niile ‘na-akpọ aha Jehova ma jiri otu obi na-efe ya ofufe.’—Zefanaya 3:9.
2. Gịnị ka i nwere ike ime ka ọgbakọ unu dịrị n’otu?
Baịbụl kwuru, sị: “Jirikwanụ obi unu niile hụ ibe unu n’anya.” (1 Pita 1:22) Olee otú ị ga-esi na-eme ihe amaokwu a kwuru? Kama ịna-ahụta ihe ndị ọzọ na-anaghị emeta, lekwasị anya n’ebe ndị ha na-eme nke ọma. Kama imete naanị ndị ihe gị na-amasị enyi, chọọ otú ị ga-esi matakwuo ụmụnna dị iche iche. Ọ bụrụ na e nwere ndị anyị kpọrọ asị, anyị nwere ike ịgba mbọ kwụsị ịkpọ ha asị.—Gụọ 1 Pita 2:17.a
3. Gịnị ka ị ga-eme ma gị na nwanna nwee nghọtahie?
Ọ bụ eziokwu na anyị dị n’otu, ma anyị ezughị okè. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike mee ndị ọzọ ihe ha na-atụghị anya ya ma ọ bụdị mee ihe ga-ewute ha. Ọ bụ ya mere Okwu Chineke ji gwa anyị ka anyị ‘na-agbaghara ibe anyị.’ O kwukwara, sị: “Jehova gbaghaara unu kpamkpam, unu kwesịkwara ịna-emere ibe unu otú ahụ.” (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:13.) Anyị enweghị ike ịgụta ugboro ole anyị na-emehie Jehova, ma, ọ na-agbaghara anyị. N’ihi ya, ọ chọrọ ka anyị na-agbaghara ụmụnna anyị. Ọ bụrụ na ị chọpụta na o nwere onye i mejọrọ, gakwuru ya ka unu kpezie.—Gụọ Matiu 5:23, 24.b
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta ihe ndị i nwere ike ime ka udo dịrị n’ọgbakọ unu, unu adịrịkwa n’otu.
Gịnị ka ị ga-eme ka gị na ụmụnna gị dịrị ná mma?
4. Kwụsị ịkpa ókè
Anyị nwere ike na-agbara onye na-adịghị otú anyị dị ọsọ. Ma, anyị kwesịrị ịhụ ụmụnna anyị niile n’anya. Gịnị ga-enyere anyị aka? Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 10:34, 35. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Jehova na-anabata ụdị mmadụ niile ka ha bụrụ Ndịàmà ya. Olee otú ị ga-esi na-eme ka ya ma e nwee ndị na-adịghị otú ị dị?
Olee ụdị ókè a na-akpakarị n’ógbè unu? Gịnị mere ị ga-eji zere ya?
Gụọnụ 2 Ndị Kọrịnt 6:11-13. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú i chere i nwere ike isi hụkwuo ụmụnna dị iche iche n’anya?
5. Gbaghara ndị ọzọ kpamkpam, gị na ha kpeziekwa
N’agbanyeghị na o nweghị ihe ọjọọ Jehova mere anyị nke anyị ga-agbaghara ya, ọ na-agbaghara anyị mmehie anyị kpamkpam. Gụọnụ Abụ Ọma 86:5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Ike ọ̀ na-agwụ Jehova ịgbaghara anyị?
Gịnị mere obi ji dị gị ụtọ maka otú o si agbaghara anyị?
Olee ihe ndị nwere ike ime ka anyị na ndị ọzọ ghara ịna-adị n’otu?
Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jehova ma mee ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu na-aga? Gụọnụ Ilu 19:11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Ọ bụrụ na mmadụ akpasuo gị iwe ma ọ bụ mejọọ gị, gịnị ka i nwere ike ime ka ihe ghara ịka njọ?
Anyị na-emejọ ndị ọzọ mgbe ụfọdụ. Ọ dị otú ahụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Na vidio a anyị lere, gịnị ka otu nwanna nwaanyị mere ka ya na nwanna nwaanyị ọzọ dịrị ná mma?
6. Lekwasị anya n’ebe ụmụnna gị na-eme nke ọma
Ọ bụrụ na anyị abịarukwuo ụmụnna anyị nso, anyị ga-abịa mara ebe ndị ha na-eme nke ọma na ebe ndị ha na-anaghị eme nke ọma. Olee otú anyị nwere ike isi lekwasị anya n’ebe ndị ha na-eme nke ọma? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị nwere ike inyere gị aka ịna-ahụ àgwà ọma ndị ụmụnna gị na-akpa?
Jehova na-elekwasị anya n’ebe ndị anyị na-eme nke ọma. Gụọnụ 2 Ihe E Mere 16:9a. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú obi dị gị ugbu a ị matara na Jehova na-elekwasị anya n’àgwà ọma gị?
Ọ bụrụgodị na ihe kawasịrị mgbaaka e ji dayamọnd mee, ọ ka bara ezigbo uru. Otú ahụ ka Jehova ji ụmụnna anyị kpọrọ ihe n’agbanyeghị na ha ezughị okè
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na onye mejọrọ ha ga-arịọrịrị ha mgbaghara tupu ha agbaghara ya.
Olee ihe mere i ji kwesị ịgbaghara ndị ọzọ n’egbughị oge?
NCHỊKỌTA
Ị ga-eso na-eme ka ọgbakọ unu dịrị n’otu ma ọ bụrụ na ị na-agbaghara ndị mejọrọ gị ma hụ ụmụnna gị niile n’anya.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Olee ihe ga-enyere gị aka ịkwụsị ịkpa ókè?
Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na gị na nwanna gị enwee nghọtahie?
Gịnị mere i kwesịrị iji na-agbaghara ndị ọzọ otú Jehova si agbaghara anyị?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta otú otu n’ime ihe atụ ndị Jizọs mere nwere ike isi mee ka anyị ghara ịna-ekpe ndị ọzọ ikpe.
Ànyị kwesịrị ịrịọ mmadụ mgbaghara ma ọ bụrụ na anyị chere na anyị emejọghị ya?
“Ịrịọ Mgbaghara—Ụzọ Dị Irè E Si Eme Udo” (Ụlọ Nche, Nọvemba 1, 2002)
Chọpụta ihe nyeere ụfọdụ ndị aka ha akwụsị ile ndị ọzọ anya n’ihu.
Chọpụta ihe ị ga-eme ka gị na nwanna gị na ya nwere nghọtahie nwee ike ikpezi tupu nghọtahie ahụ emee ka ọgbakọ unu ghara ịdị n’otu.
a Gụọ Ihe nke 6 E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A ka ị hụ otú ịhụnanya si eme ka Ndị Kraịst ghara ibunye ndị ọzọ ọrịa.
b Gụọ Ihe nke 7 E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A ka ị chọpụta ihe a ga-eme n’okwu gbasara ego ma ọ bụ okwu ụlọikpe nwere ike ilebara anya.