Tụọ Egwu Jehova, Bụ́ Onye Na-Anụ Ekpere
“Gị onye na-anụ ekpere, gị ka anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, ga-abịakwute.”—ABỤ ỌMA 65:2.
1. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụọ anya na Jehova ga-enwe ihe ọ chọrọ n’aka ndị ahụ na-achọ ịbịakwute ya n’ekpere?
JEHOVA CHINEKE bụ ‘Eze nke mgbe nile ebighị ebi.’ ọ bụkwa “onye na-anụ ekpere,” bụ́ onye “anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, ga-abịakwute.” (Mkpughe 15:3; Abụ Ọma 65:2) Ma olee otú ha kwesịrị isi bịakwute ya? Ndị eze bụ mmadụ na-enye iwu n’ihe ndị dị ka uwe na omume nke ndị e kwere ka ha bịa n’ihu ha. Ya mere n’ezie, anyị kwesịrị ịtụ anya na Eze Mgbe Nile Ebighị Ebi ga-enwe ihe ndị a na-aghaghị imezu site n’aka onye ọ bụla nke nwere ọchịchọ iji arịrịọ na ekele bịakwute ya?—Ndị Filipaị 4:6, 7.
2. Ajụjụ ndị dị aṅaa na-ebilite n’isiokwu banyere ekpere?
2 Gịnị ka Eze Mgbe Nile Ebighị Ebi chọrọ n’aka ndị ahụ na-abịakwute ya n’ekpere? Ònye pụrụ ikpe ekpere ma bụrụ onye a nụrụ ekpere ya. Ihe dịkwa aṅaa ka ha pụrụ ikpe n’ekpere?
Ịbịakwute Eze Mgbe Nile Ebighị Ebi
3. Ihe atụ ndị dị aṅaa ka ị pụrụ inye banyere ekpere nke ndị ohu Chineke n’oge gboo, hà bịakwutekwara ya site n’aka onye ogbugbo?
3 Tupu ọ ghọọ onye mmehie, o doro anya na Adam, bụ́ “nwa Chineke,” sooro Eze mgbe nile ebighị ebi kwurịta okwu. (Luk 3:38; Jenesis 1: 26-28) Mgbe nwa Adam bụ́ Ebel nyere Chineke ‘atụrụ na ewu ya ndị e buru ụzọ mụọ,’ ihe ịrụ ụka adịghị ya na okwu arịrịọ na otuto sochiri àjà nke a. (Jenesis 4:2-4) Noa, Abraham, Aịsak, na Jekọb wuru ebe ịchụàjà ma bịakwute Jehova n’ekpere site n’àjà ha. (Jenesis 8:18-22; 12:7, 8; 13:3, 4, 18; 22:9-14; 26: 23-25; 33:18-20; 35:1, 3, 7) Ekpere nke Solomon, Ezra, na ndị ọbụ abụ bụ́ ndị natara ike mmụọ nsọ Chineke gosikwara na ndị Israel bịakwutere Chineke n’enweghị onye ogbugbo.—1 Ndị Eze 12:22-24; Ezra 9:5, 6; Abụ Ọma 6:1, 2; 43:1; 55:1; 61:1; 72:1; 80:1; 143:1.
4. (a) Ụzọ ọhụrụ dị aṅaa e si abịakwute Chineke n’ekpere ka e guzobere na narị afọ mbụ? (b) N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị karịsịa ikpe ekpere n’aha Jisọs?
4 E guzobere ụzọ ọhụrụ e si abịakwute Chineke n’ekpere na narị afọ mbụ nke Oge Anyị. Ọ bụ site n’Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, bụ́ onye nwere ịhụnanya pụrụ iche maka ihe a kpọrọ mmadụ. N’ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ, Jisọs ji ọṅụ jee ozi dị ka “onyeọkà,” na-enwe mmasị n’ihe ndị metụtara agbụrụ mmadụ. (Ilu 8:30, 31) Dị ka mmadụ n’elu ala, Jisọs ji ịhụnanya nyere ụmụ mmadụ na-ezughị okè aka n’ụzọ ime mmụọ, gwọọ ndị ọrịa, ọbụna kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. (Matiu 9:35-38; Luk 8:1-3, 49-56) Dị ka nke kasị ihe nile, Jisọs ‘nyere ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nye mmadụ niie.’ (Matiu 20:28) Mgbe ahụ, lee otú o si kwesị ekwesị na ndị ahụ na-eji àjà mgbapụta ahụ na-eme ihe kwesịrị ịbịakwute Chineke site n’aka onye nke a bụ́ onye hụrụ ihe a kpọrọ mmadụ n’anya hie nne! Ugbu a nke a bụ nanị ụzọ e nwere isi bịakwute Eze Mgbe Nile Ebighị Ebi, n’ihi na Jisọs n’onwe ya kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna m, ma ọ bụghị site na m” na, “Ọ bụrụ na unu ga-arịọ Nna m ihe ọ bụla, ọ ga-enye unu ya n’aha m.” (Jọn 14:6; 16:23) Ịrịọ ihe n’aha Jisọs pụtara ịmata ya dị ka ụzọ e si abịakwute Onye ahụ na-anụ ekpere.
5. Omume dị aṅaa ka Chineke nwere n’ebe ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ dị, olee otú nke a si emetụta ekpere?
5 Karịsịa anyị kwesịrị inwe ekele maka ịhụnanya Jehova gosipụtara site n’ime ka e nwee ihe mgbapụta ahụ. Jisọs kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa [nke ihe a kpọrọ mmadụ] n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ịdị omimi nke ịhụnanya Chineke bụ nke e gosipụtara nke ọma n’okwu onye ọbụ abụ ndị a: “Dị ka ịdị elu nke eluigwe si dị n’elu ụwa, otú a ka ebere ya dị ike n’ahụ ndị na-atụ egwu ya. Dị ka ihu anyanwụ si dị anya n’ọdịda anyanwụ, otú a ka o meworo ka njehie nile anyị dị anya n’ebe anyị nọ. Dị ka nna si enwe ebere n’ahụ ụmụ ya, otú a ka Jehova nweworo obi ebere n’ahụ ndị na-atụ egwu ya. N’ihi na ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:11-14) Lee aha ihe na-akpali obi ọ bụ ịmara na ekpere Ndịàmà nke Jehova raara onwe ha nye na-arịgokwuru Nna na-ahụ n’anya otú a site n’aka Ọkpara ya!
Ihe Ùgwù A Kpaara Ókè
6. Site n’omume dị aṅaa ka a na-aghaghị iji bịakwute Chineke n’ekpere?
6 Ndị eze bụ mmadụ anaghị ekwe ka onye ọ bụla bata n’ime obíeze n’ebughị ụzọ mee ka a mara. Ịbụ onye eze ṅara ntị n’ihe ọ na-ekwu bụ ihe ùgwù a kpaara ókè. Otú ahụ ka ọ dị ekpere na-agakwuru Eze nke mgbe nile ebighị ebi. Otú ọ dị, ndị na-abịakwute ya site n’aka Jisọs Kraịst, na-enwe nghọta ziri ezi nke oké ịdị ebube Chineke pụrụ ịtụ anya na a ga-anụ ekpere ha. Eze Mgbe Nile Ebighị Ebi ahụ aghaghị ịbụ onye a na-abịakwute site n’omume nsọpụrụ, na ofufe. Ndị ahụ na-achọkwa ka a nụ ekpere ha aghaghị igosipụta “egwu Jehova.” --Ilu 1:7.
7. Gịnị bụ “egwu Jehova”?
7 Gịnị bụ “egwu Jehova”? Ọ bụ inwe nsọpụrụ miri emi maka Chineke, tinyere egwu ziri ezi nke ime ihe na-adịghị atọ ya ụtọ. Nsọpụrụ nke a na-esite n’obi ekele miri emi maka obi ebere ịhụnanya ya na ịdị mma ya. (Abụ Ọma 106:1) Ọ gụnyere ịmata ya dị ka Eze nke mgbe nile ebighị ebi, bụ́ onye nwere ikike na ike iweta ahụhụ, tinyere ọnwụ, nye onye ọ bụla na-enupụrụ ya isi. Mmadụ ndị na-egosipụta egwu Jehova pụrụ ikpegara ya ekpere na-enwe olileanya nke ịbụ ndị a nụrụ ekpere ha.
8. N’ihi gịnị ka Chineke ji aṅa ntị n’ekpere nke ndị ahụ na-atụ egwu ya?
8 Dị ka ọ na-adịkarị, Chineke adịghị aza ekpere nke ndị ajọ omume, ndị na-adịghị ekwesị ntụkwasị obi, na ndị na-eme ezi omume nke onwe ha. (Ilu 15:29; Aịsaịa 1:15; Luk 18:9-14) Ma a na-anụ ekpere ndị ahụ na-atụ egwu Jehova n’ihi na ha ekwekọwo n’ụkpụrụ ezi omume ya nile. Ma, ha emewo ihe karịrị nke ahụ. Ndị na-atụ egwu Jehova ararawo onwe ha nye Chineke n’ekpere ma gosipụta nke a site n’ime baptism ime mmiri. Ha si otú a nwee ihe ùgwù a na-akparaghị ókè nke ikpe ekpere.
9, 10. Ndị na-emebeghị baptism hà pụrụ ikpe ekpere n’olileanya nke ịbụ ndị a nụrụ ekpere ha?
9 Iji bụrụ onye Chineke na-anụ ekpere ya, mmadụ aghaghị ikpe ekpere na-egosipụta inwe mmetụta nke kwekọrọ n’uche Chineke. Ee, ọ ghaghị inwe obi ziri ezi, ma a chọrọ ihe karịrị nke ahụ n’aka ya. Pọl onyeozi dere, sị: “A sị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ́ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ: n’ihi na onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na ọ dị, na ọ na-egosikwa onwe ya onye na-enyeghachi ndị na-achọ ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ya mere mgbe ahụ, à pụrụ ịgba ndị na-emebeghị baptism ume ikpe ekpere na-enwe olileanya nke ịbụ ndị a nụrụ ekpere ha?
10 N’ịghọta na ekpere bụ ihe ùgwù a kpaara ókè, Eze Solomọn rịọrọ Jehova ka ọ nụ ekpere nke nanị ndị ala ọzọ bụ́ ndị kpere ekpere site n’iche ụlọ nsọ Chineke dị na Jerusalem ihu. (1 Ndị Eze 8:41-43) Mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị, onye Jentaịl ala ọzọ ahụ bụ Kọniliọs “na-ekpekwara Chineke ekpere mgbe nile” dị ka onye na-asọpụrụ Chineke. Mgbe o nwetara ezi ihe ọmụma, Kọniliọs raara onwe ya nye Chineke, bụ́ onye nyere ya mmụọ nsọ. Mgbe nke a gasịrị, Kọnilịọs na ndị Jentaịl ndị ọzọ mere baptism. (Ọrụ 10:1-44) Dị ka Kọniliọs, a pụrụ ịgba onye ọ bụla na-enwe ọganihu ruo ime nraranye ume taa ka ọ na-ekpe ekpere. Ma onye ọ bụla nke obi ya na-ezighị ezi banyere ịmụ Akwụkwọ nsọ, nke na-amaghị ihe Chineke chọrọ ya n’aka maka ikpe ekpere, nke na-amalitebeghịkwa igosipụta omume nke ime ihe na-atọ Chineke ụtọ apụghị ịbụ onye na-atụ egwu Jehova, onye nwere okwukwe, ma ọ bụ onye na-achọsi ya ike. Onye dị otú ahụ anọghị n’ọnọdụ nke ikpe ekpere Chineke na-anakwere.
11. Gịnị meworo ụfọdụ ndị na-enwe ọganihu ruo ime nraranye, gịnịkwa ka ha kwesịrị ịjụ onwe ha?
11 Ụfọdụ ndị na-enwebu ọganihu ruo ime nraranye nwere ike iyi ka ha na-ala azụ n’ọdịnihu. Ọ bụrụ na ha enweghị ịhụnanya zuru ezu maka Chineke n’ime obi ha ime nraranye a na-akparaghị ókè nye ya, ha kwesịrị ịjụ onwe ha ma hà ka nwekwara ihe ùgwù ahụ dị ebube nke ikpe ekpere. O doro anya na ha enweghị, n’ihi na ndị ahụ na-abịakwute Chineke aghaghị ịbụ ndị na-achọsi ya ike, na-achọsikwa ezi omume na ịdị ume ala n’obi ike. (Zefanaịa 2:3) Onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova n’ezie bụ onye kwere ekwe nke raara onwe ya nye Chineke ma gosipụta ya site n’ime baptism. (Ọrụ 8:13; 18:8) Ọ bụkwa nanị ndị kwere ekwe mere baptism nwere ihe ùgwù a na-akparaghị ókè nke ịbịakwute Eze Mgbe Nile Ebighị Ebi n’ekpere.
“Ikpekwa Ekpere n’Ime Mmụọ Nsọ”
12. Olee mgbe a pụrụ ikwu na mmadụ ‘na-ekpe ekpere n’ime mmụọ nsọ’?
12 Mgbe mmadụ rarasịrị onwe ya nye Chineke ma gosipụta ya site n’ime baptism, ọ nọ n’ọnọdụ ‘ikpe ekpere n’ime mmụọ nsọ.’ Banyere nke a, Jud dere, sị: “Ma unu onwe unu, ndị m hụrụ n’anya, na-ewuli onwe unu elu dị ka ụlọ n’elu okwukwe dịkarịsịrị nsọ, n’ikpekwa ekpere n’ime mmụọ nsọ, debe onwe unu n’ịhụnanya Chineke, na-eche ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ruo ndụ ebighị ebi.” (Jud 20, 21) Mmadụ na-ekpe ekpere n’ime mmụọ nsọ mgbe ọ na-ekpe ekpere n’okpuru ike mmụọ nke Chineke, ma ọ bụ ike ọrụ, na-ekwekọkwa n’ihe ndị e kwuru n’Okwu Ya. Akwụkwọ nsọ, bụ́ nke e dere n’okpuru ike mmụọ nsọ Jehova na-egosi anyị otú e si ekpe ekpere na ihe a ga-arịọ n’ekpere. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ iji obi ike kpee ekpere ka Chineke nye anyị mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13) Mgbe anyị na-ekpe ekpere n’ime mmụọ nsọ, ekpere anyị na-ekpughe ọnọdụ obi nke Jehova na-ahụ n’anya.
13. Ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere n’ime mmụọ nsọ, gịnị ka anyị ga-ezere, ndụmọdụ dịkwa aṅaa nke Jisọs ka anyị ga-etinye n’ọrụ?
13 Mgbe anyị na-ekpe ekpere n’ime mmụọ nsọ, ekpere anyị adịghị ejupụta n’okwu ndị na-ada oké ụda. Ha adịghị ejupụta n’usoro okwu ndị e buru n’isi a na-ekwughachi mgbe mgbe. Ee e, ha ejupụtaghị n’okwu nsọ ndị na-enweghị oké ihe ha pụtara, okwu otuto ndị na-esiteghị n’obi eziokwu. Ekpere ndị dị otú ahụ jupụtara na Krisendọm nakwa n’akụkụ ndị ọzọ nke Babịlọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Ma ezi ndị Kraịst na-aṅa ntị na ndụmọdụ Jịsọs: “Mgbe unu na-ekpe ekpere unu ekwesịghị ịdị ka ndị ihu abụọ; n’ihi na ha na-enwe mmasị iguzo n’ụlọ nzukọ unu nakwa ná nkuku ámá unu, ka ndị mmadụ wee hụ ha . . . Ma mgbe unu na-ekpe ekpere unu ekwula okwu nkwukwasị efu dị ka ndị ọgọ mmụọ na-eme; n’ihi na ha [n’ụzọ na-ezighị ezi] chere na a na-anụ ihe ha na-ekwu site n’ịdị ọtụtụ nke ihe ha kwuru. Ya mere unu adịla ka ha.”—Matiu 6:5-8, Byington.
14. Okwu ndị dị aṅaa nke ezi uche dị na ha ka ụfọdụ kwuworo banyere ekpere?
14 Tinyere Jisọs na ndị so dee Bible, ndị ọzọ ekwuwo okwu ezi uche dị na ha banyere ikpe ekpere. Dị ka ihe atụ, onye England na-ede akwụkwọ bụ́ John Bunyan (1628-1688) kwuru, sị: “Ekpere bụ nkwupụta sị n’ala ala obi, nke ziri ezi, nke ezi uche dị na ya, nke na-egosipụta ịhụnanya nye Chineke site n’aka Kraịst, n’ike na enyemaka nke Mmụọ nsọ, maka ihe ndị ahụ Chineke kwere ná nkwa.” Onyeozi okpukpe Puritan bụ́ Thomas Brooks (1608-1680) kwuru, sị: “Chineke na-ele anya ọ bụghị n’ịdị were were nke okwu ekpere gị, otú ịma mma ya pụrụ ịsị dị; ma ọ bụ n’ịdị n’usoro nke ekpere gị, otú ha pụrụ isi too ogologo; ma ọ bụ n’ọnụ ọgụgụ nke ekpere gị, ole ha pụrụ ịdị; ọ bụghị n’ezi echiche nke ekpere gị, otú ha pụrụ isi maa mma; ma ọ bụ ezi obi e ji kpee ha ka ọ na-ele anya.” N’okwu ndị a, a pụrụ ịtụkwasị okwu Bunyan kwuru, sị: “N’ekpere ọ ka mma inwe obi nke okwu na-adịghị karịa okwu ndị na-esiteghị n’ala ala obi.” Ma ọ bụrụ na obi anyị ziri ezi, anyị na-emekwa ihe Chineke chọrọ anyị n’aka, olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na Eze mgbe nile ebighị ebi ga-anụ ekpere anyị?
Alala Azụ Ma Ọlị
15. N’ikwu eziokwu, gịnị ka Jisọs kwuru na Luk 11:5-8?
15 Jehova Chineke adịghị akpọchi ntị n’ekpere nke ndị ohu ya raara onwe ha nye ya. E mere ka nke a pụta ìhè n’okwu Jisọs ndị na-akpali obi mgbe ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ maka ndụmọdụ banyere ikpe ekpere. Ná mkpirikpi o kwuru, sị: “Ònye n’ime unu ga-enwe enyi, ga-ejekwukwa ya n’etiti abalị, sị ya, Enyi m, binye m ógbè achịcha atọ; n’ihi na otu enyi m esiwo n’ije bịakwute m, ma enweghị m ihe ọ bụla m ga-edote n’ihu ya; ma onye ahụ ga-esi n’ime ụlọ zaa, sị, Esogbula m: emechiwo ụzọ ugbu a, mụ na ụmụntakịrị m na-edinakwa n’ihe ndina anyị; apụghị m ibili nye gị? Asị m unu, Ọ bụrụkwa na ọ ga-ebili inye ya n’ihi na ọ bụ enyi ya, ma n’ihi arịrịọ ya na-enweghị ihere ọ ga-ebili nye ya ka ihe dị ya mkpa hà.” (Luk 11:1, 5-8) Gịnị bụ isi ihe dị n’ihe atụ nke a?
16. N’ihe banyere ekpere, gịnị ka Jisọs chọrọ ka anyị mee?
16 Ihe Jisọs bu n’uche n’ezie abụghị na Jehova adịghị njikere inyere anyị aka. Kama nke ahụ, Kraịst chọrọ ka anyị tụkwasị Chineke obi kpam kpam ma hụ ya n’anya n’ụzọ zuru ezu iji na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị. Otú a, Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Mụ onwe m sịkwa unu, Nọgidenụ na-arịọ, a ga-enyekwa unu; nọgidenụ na-achọ, unu ga-achọtakwa; nọgidenụ na-akụ, a ga-emeghekwara unu. N’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọ na-arịọta; onye na-achọkwa na-achọta; onye na-akụkwa ka a ga-emeghere.” (Luk 11:9,10, NW) Ya mere n’ezie, anyị kwesịrị ịnọgide na-ekpe ekpere mgbe anyị na-anata mkpagbu, na-enwe obi ilu banyere adịghị ike onwe onye ndị gbara mkpọrọgwụ dị omimi, ma ọ bụ ọnwụnwa ndị ọzọ. Jehova dị njikere mgbe nile inyere ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi aka. Ọ dịghị mgbe ọ na-agwa anyị, sị: “Kwụsịnụ inye m nsogbu.”
17, 18. (a) Olee otú Jisọs si gbaa anyị ume ka anyị rịọ maka mmụọ nsọ, ọ̀ bụkwa gịnị na-eme ka okwu ya dịkwuo ike? (h) Olee otú Jisọs si jiri mmeso nke onye bụ nne ma ọ bụ nna n’elu ala tụnyere nke Chineke?
17 Ọ bụrụ na anyị ga-eso Chineke nwee mmekọrịta chiri anya, mmụọ nsọ ya, ma ọ bụ ike ọrụ ya, dị anyị mkpa. Otú a, Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Ma ònye n’etiti unu, bụ́ nna, ka nwa ya ga-arịọ ógbè achịcha, o nye ya nkume? Ma ọ bụ azụ, o nye ya agwọ n’ọnọdụ azụ? Ma ọ bụ a sị na ọ ga-arịọ àkwá ọkụkọ, ọ̀ ga-enye ya akpị? Ya mere, ọ bụrụ na unu onwe unu, ọ bụ ezie na unu jọrọ njọ, ma unu na-amata inye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu nke eluigwe ga-esi aṅaa ghara iwere karị mmụọ nsọ nke ukwuu nye ndị na-arịọ ya?” (Luk 11:11-13) Matiu 7:9-11 na-ekwu okwu banyere inye nkume n’ọnọdụ achịcha. Ịdị ike nke okwu Jisọs na-ebuwanye ibu ma ọ bụrụ na anyị amata na ógbè achịcha a na-enwe n’ala Bible ndị oge ochie na-aha ka nkume dị mbadamba, dịkwa okirikiri. Agwọ ụfọdụ na-adị ka azụ, e nwekwara obere akpị ọcha na-adịtụ ka àkwá. Ma ọ bụrụ na a rịọ ya maka ógbè achịcha, azụ, ma ọ bụ àkwá, ụdị nna dị aṅaa ga-enye nwa ya nkume, agwọ, ma ọ bụ akpị?
18 Ọzọ Jisọs ji mmeso nke onye bụ nne ma ọ bụ nna n’elu ala tụnyere omume nke Chineke n’ebe ndị so n’ezinụlọ Ya nke ndị na-efe ofufe nọ. Ọ bụrụ na anyị, ọ bụ ezie na anyị dị nnọọ njọ n’ihi mmehie e ketara n’ọmụmụ, na-enye ụmụ anyị ezi onyinye, lee otú anyị kwesịrị isi tụọ anya ihe karịrị nke ahụ site n’aka Nna anyị nke eluigwe inye ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi onyinye ọma nke mmụọ nsọ ya, bụ́ ndị na-arịọ maka ya n’obi umeala!
19. (a) Gịnị ka okwu Jisọs ndị e dekọrọ na Luk 11:11-13 na Matiu 7:9-11 na-egosipụta? (b) Ọ bụrụ na mmụọ nsọ na-edu anyị, olee otú anyị pụrụ isi lee ọnwụnwa anyị anya?
19 Okwu ndị Jisọs kwuru na-egosipụta na anyị kwesịrị ịrịọ Chineke maka mmụọ nsọ Ya karị. Ọ bụrụ na ọ na-edu anyị, anyị agaghị ‘atamu ntamu banyere ihe anyị nwere ná ndụ’ ma na-ele ọnwụnwa na nkụda aka anya dị ka ndị na-emerụ anyị ahụ n’ezie. (Jud 16) N’eziokwu, “mmadụ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ,” ọtụtụ ndị abụwokwa ndị na-adịghị ndụ iji anya ha hụ ọgwụgwụ nke nsogbu ma ọ bụ ihe mgbu ha nile. (Job 14:1) Ma ka anyị ghara ile ọnwụnwa anyị nile anya dị ka nkume, agwọ, ma ọ bụ akpị ndị Onye ahụ na-anụ ekpere nyeworo anyị. Ọ bụ isi iyi nke ịhụnanya, ọ dịghị ejikwa ajọ ihe na-anwa onye ọ bụla. Kama nke ahụ, ọ na-enye anyị “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè.” N’ikpeazụ, ọ ga-eme ka ihe nile dịrị ndị hụrụ ya n’anya ma na-atụ egwu ya mma. (Jemes 1: 12-17; 1 Jọn 4:8) Ndị ahụ jeworo ije n’eziokwu ruo ọtụtụ afọ maara site n’ahụmahụ ha nweworo na ụfọdụ n’ime ọnwụnwa ha ndị kasị sie ike abụwo nke, sie n’ekpere na okwukwe, mesịrị baara ha uru ma mụbaa mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke ná ndụ ha. (3 Jọn 4) N’ezie, olee ụzọ ka mma anyị pụrụ isi mụta ịdabere n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ, ma bụrụ ndị e nyeere aka ịzụlite mkpụrụ mmụọ nsọ nke ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, na imeru ihe n’ókè?—Ndị Galetia 5:22, 23.
20. Okwu Jisọs ndị e dekọrọ na Luk 11:5-13 kwesịrị inwe mmetụta dị aṅaa n’ebe anyị nọ?
20 Okwu Jisọs ndị e dekọrọ na Luk 11:5-13 si otú a na-enye anyị obi ike a gọziri agọzi banyere ịhụnanya na nlekọta obi ebere nke Jehova. Nke a kwesịrị imejupụta obi anyị site n’ekele na ịhụnanya miri emi. O kwesịrị imesi okwukwe anyị ike ma mụbaa ọchịchọ anyị ịga mgbe mgbe n’ebe mgbakwasị ụkwụ nke Eze Mgbe Nile Ebighị Ebi ma nọgide n’ihu ịhụnanya ya. Ọzọkwa okwu ndị Jisọs kwuru na-eme ka anyị jide n’aka na anyị agaghị abụ ndị na-arịọtaghị ihe ọ bụla. Nna anyị nke eluigwe na-enwe obi ụtọ mgbe anyị na-ahapụrụ ya ibu arọ anyị. (Abụ Ọma 55:22; 121:1-3) Mgbe anyị, dịkwa ka ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị mere nraranye, na-arịọ maka mmụọ nsọ ya, ọ na-enye anyị ya n’enweghị aka ntachi. Nke a bụ Chineke anyị na-ahụ n’anya, anyị pụkwara inwe okwukwe zuru ezu na ọ bụ Onye na-anụ ekpere anyị.
Ị Na-echeta?
◻ Site n’aka ònye ka anyị na-aghaghị ịbịakwute Chineke n’ekpere, n’ihi gịnịkwa?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka ekpere si bụrụ ihe ùgwù a kpaara ókè?
◻ Gịnị ka ọ pụtara ‘ikpe ekpere n’ime mmụọ nsọ?
◻ Olee otú ị pụrụ isi jiri Akwụkwọ nsọ gosipụta na a na-anụ ekpere Ndịàmà nke Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi mere baptism?
[Foto dị na peeji nke 14]
Dị ka ndị nna bụ mmadụ na-enye ụmụ ha onyinye ọma, Jehova na-enye ndị ahụ na-arịọ ya mmụọ nsọ ya