-
E Mee Jizọs BaptizimJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Ma, e nwere ihe ọzọ mere mgbe a na-eme Jizọs baptizim. ‘Eluigwe megheere ya.’ Olee ihe nke a pụtara? Ọ ga-abụ na nke a pụtara na mgbe a na-eme Jizọs baptizim, o chetara ndụ o biri n’eluigwe tupu ya aghọọ mmadụ. Jizọs chetakwara mgbe ọ bụ mmụọ n’eluigwe nakwa ihe ndị Chineke kụziiri ya n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa.
-
-
Mụta Ihe n’Ihe Jizọs Mere Mgbe A Nwara Ya ỌnwụnwaJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Ozugbo Jọn mechara Jizọs baptizim, mmụọ nsọ Chineke duuru Jizọs gaa n’ala ịkpa dị na Judia. O nwere ọtụtụ ihe ọ ga-echebara echiche. Mgbe e mere Jizọs baptizim, “eluigwe meghere.” (Matiu 3:16) Ọ bụ ya mere o ji nwee ike icheta ihe ndị ọ mụtara na ihe ndị o mere mgbe ọ nọ n’eluigwe. N’eziokwu, Jizọs nwere ọtụtụ ihe ọ ga-atụgharị n’uche.
-