Bụrụnụ Ndị Na-eme Okwu Ahụ, Ọ Bụghị Ndị Na-anụ Nani Ọnụnụ
“Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, Onyenwe anyi, Onyenwe anyị, ga-aba n’alaeze eluigwe; kama ọ bụ onye na-eme ihe Nna m nke bi n’eluigwe na-achọ.”—MATIU 7:21.
1. Gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs kwesịrị ịnọgide na-eme?
NỌGIDENỤ na-arịọ. Nọgidenụ na-achọ. Nọgidenụ na-akụ aka. Nọgidenụ n’ikpe ekpere mgbe nile, n’ịmụ ihe, na n’ime okwu Jisọs ndị ahụ e dekọrọ n’Ozizi Elu Ugwu ahụ. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ha bụ nnú nke ụwa, na-enwe ozi na-echebe echebe nke e jiri nnú mee ka ọ dị ụtọ, bụ nke ha na-agaghị ekwe ka ọ ghọọ ihe dị ṅara ṅara, na-akwụsị inwe ụtọ na ike nchebe ya. Ha bụ ìhè nke ụwa, na-egosipụta ìhè nke sitere n’ebe Kraịst Jisọs na Jehova Chineke nọ, ọ bụghị nanị site n’ihe ha na-ekwu, kamakwa site n’ihe ha na-eme. Ọrụ ọma ha na-enwu enwu dị ka okwu ha ndị na-enye ìhè—na-ekwukwa okwu dara ụda ọbụna karị n’ime ụwa nke ihu abụọ yiri nke ndị Farisii nke ma ndị ndú okpukpe ma ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, maraworo ahụ, bụ ndị na-ekwu ọtụtụ okwu ma na-eme ihe dị nta.—Matiu 5:13-16.
2. Ndumọdụ dị aṅaa ka Jemes nyere, ma ọnọdụ ntụsara ahu dị aṅaa ka ụfọdụ ndị na-ewere n’ụzọ na-ezighị ezi?
2 Jemes nyere ndụmọdụ, sị: “Ghọọnụ ndị na-eme okwu ahụ, unu abụkwala ndị na-anụ nanị, ndị na-arafu onwe unu.” (Jemes 1:22) Ọtụtụ ndị na-arafu onwe ha site n’ozizi nke bụ na ‘a zọpụtahaala mmadụ a zọpụtachaala ya,’ dị ka à ga-asị na ha nweziri ike izuru ike ugbu a ma chere ihe e chere na ọ bụ nkwụghachi ụgwọ nke eluigwe. Ọ bụ ozizi ụgha na olileanya na-enweghị isi. Jisọs sịrị, “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.” (Matiu 24:13) Iji nweta ndụ ebighị ebi, ị ghaghị ‘igosi onwe gị onye kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ.’—Mkpughe 2:10; Ndị Hibru 6:4-6; 10:26, 27.
3. Ndụmọdụ dị aṅaa banyere ikpe ikpe ka Jisọs gara n’ihu inye n’Ozizi Elu Ugwu ahụ?
3 Ka Jisọs gara n’ihu n’Ozizi Elu Ugwu ya, e nwere ọtụtụ okwu ndị ọzọ ndị Kraịst na-aghaghị ịgbalị ịgbaso. Nke a bụ otu nke yiri ka ọ dị mfe ma ọ katọrọ otu n’ime àgwà ndị kasị sie ike iwepụ: “Unu ekpela ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe. N’ihi na ikpe unu ji kpee ka a ga-eji kpee unu: ọ bụkwa ihe unu ji tụọ ihe ka a ga-eji tụọrọ unu. Ma gịnị mere i ji lee irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna gị, ma ị tụgharịghị uche ná ntụhie nke dị n’anya nke gị? Ma ọ bụ ị̀ ga-esi aṅaa sị nwanna gị, Kwee ka m tụpụ irighiri ahịhịa ahụ n’anya gị: ma lee, ntụhie ahụ dị n’anya nke gị? Ọnye ihu abụọ, buru ụzọ tụpụ ntụhie ahụ n’anya nke gị; mgbe ahụ ka ị ga-elegide anya ịtụpụ irighiri ahịhịa ahụ n’anya nwanna gị.”—Matiu 7:1-5.
4. Ndụmọdụ dị aṅaa ka ihe ndekọ Luk tụkwasịrị na ya, gịnịkwa ka itinye ya n’ọrụ na-arụpụta?
4 N’ihe ndekọ Luk nke Ozizi Elu Ugwu ahụ, Jisọs gwara ndị na-ege ya ntị ka ha ghara ịdị na-achọpụtagharị mmejọ n’aka ndị ọzọ. Kama nke ahụ, ka ha ‘na-ahapụ,’ ya bụ, na-agbaghara amaghị eme nke mmadụ ibe ha. Nke a ga-eme ka ndị ọzọ meghachikwara ha otú ahụ, dị ka Jisọs kwuru, sị: “Na-enyenụ, a ga-enyekwa unu; ọ̀tụ̀tụ̀ ọma, nke a bịadaworo ala, yọkọta, nke na-ejubigakwa ókè, ka ha ga-enye n’obi unu. N’ihi na ihe unu ji tụọ ihe ka a ga-eji tụọkwara unu ọzọ.”—Luk 6:37, 38.
5. N’ihi gịnị ka ọ na-eji adị mfe karị ịhụ ntụpọ nke ndị ọzọ karịa nke anyị onwe anyị?
5 N’ime narị afọ mbụ O.A., n’ihi omenala a kụziri n’okwu ọnụ, ndị Farisii na-ekpekarị ndị ọzọ ikpe n’ụzọ dị ike. Nke ọ bụla n’ime ndị na-ege Jisọs ntị, bụ́ onye na-eme otú ahụ kwesịrị ịkwụsị ya. Ọ na-adị mfe nke ukwuu karị ịhụ irighiri ahịhịa dị n’anya ndị ọzọ karịa otú ọ na-adị ịhụ ntụhie dị n’anya nke anyị—ọ na-abụkwa ihe na-akwalite echiche anyị nwere banyere onwe anyị nke ukwuu. Dị ka otu nwoke kwuru, “Ọ na-amasị m ịkatọ ndị ọzọ n’ihi na ọ na-eme ka m nwee nnọọ mmetụta dị mma!”Ịdị na-enyochagharị ndị ọzọ mgbe nile pụrụ ime ka anyị nwee mmetụta nke ịbụ ndị nwere omume ọma nke a pụrụ iji n’ihi ya lefuru adịghị ike nke anyị anya, bụ́ ndị anyị na-achọ ikpuchi. Ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa ime mgbazi, e kwesịrị ime nke a ná mmụọ nke dị nwayọọ. Onye na-eme mgbazi ahụ kwesịrị ịnọ mgbe nile buru adịghị ike ndị nke ya n’uche mgbe nile.—Ndị Galetia 6:1.
Tupu I Kpee Ikpe, Nwaa Ịghọta Ihe
6. N’ihe ndabere dị aṅaa ka anyị kwesịrị ikpe ikpe ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa, enyemaka dị aṅaa ka anyị kwesịkwara ịchọ ka anyị wee ghara ịbụ ndị na-akatọkarị ndị ọzọ?
6 Jisọs abịaghị ikpe ụwa ikpe, kama ọ bịara ịzọpụta ya. Ikpe ọ bụla o kpere abụghị nke aka ya, kama ha dabeere n’okwu Chineke nyeworo ya ikwu. (Jọn 12:47-50) Ikpe ọ bụla anyị na-ekpe kwesịkwara ịbụ n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu Jehova. Anyị aghaghị ịbịanyụ ihe ahụ dị n’ime mmadụ nke bụ ịchọ ikpe ndị ọzọ ikpe. N’ime nke a, anyị kwesịrị ịnọgide na-ekpe ekpere maka enyemaka Jehova: “[Na-arịọnụ, NW], a ga-enyekwa unu; [na-achọnụ, NW], unu ga-achọtakwa; [na-akụnụ aka, NW], a ga-emeghekwara unu: n’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọ na-arịọta; onye na-achọkwa na-achọta; onye na-akụkwa ka a ga-emeghere.” (Matiu 7:7, 8) Ọbụna Jisọs sịrị: “Mụ onwe m apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe m: dị ka m na-anụ m na-ekpe: ikpe m zikwara ezi; n’ihi na [adịghị m achọ] ihe mụ onwe m na-achọ, kama ihe onye zitere m na-achọ.”—Jọn 5:30.
7. Àgwà dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịzụlite, bụ́ nke ga-enyere anyị aka n’itinye Ụkpụrụ Ọma ahụ n’ọrụ?
7 Anyị kwesịrị ịzụlite àgwà, ọ bụghị nke ikpe ndị ọzọ ikpe, kama nke ịgbalị ịghọta ha site n’itinye onwe anyị n’ọnọdụ ha—ọ bụghị ihe dị mfe omume, kama ọ bụ ihe dị mkpa ime ka anyị wee mee ihe kwekọrọ n’Ụkpụrụ Ọma ahụ, nke Jisọs gara n’ihu ikwupụta: “Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a, unu onwe unu: n’ihi na nke a bụ Iwu na Ndị Amụma Chineke.” (Matiu 7:12) Ya mere, ndị na-eso ụzọ Jisọs aghaghị ịbụ ndị nwere mmetụta, na-achọpụta ọnọdụ echiche, mmetụta, na nke ime mmụọ nke ndị ọzọ. Ha aghaghị ịchọpụta ma ghọta mkpa nke ndị ọzọ, nweekwa mmasị onwe onye n’inyere ha aka. (Ndị Filipaị 2:2-4) Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, Pọl dere, sị: “N’ihi na e debezuwo iwu nile n’otu okwu, bụ nke a; Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”—Ndị Galetia 5:14.
8. Ụzọ abụọ dị aṅaa ka Jisọs kwuru okwu banyere ha, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ji ahọrọ otu n’ime ha?
8 Ihe ọzọ Jisọs kwuru bụ, “Sinụ n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.” (Matiu 7:13, 14) Ọtụtụ ndị n’oge ahụ họọrọ ụzọ ahụ nke na-eduba ná mbibi, ọtụtụ ndị ka na-emekwa otú ahụ. Ụzọ ahụ dị obosara na-enye ndị mmadụ ohere iche echiche otú ha si chọọ, na-adị ndụ otú masịrị ha: ọ dịghị ụkpụrụ nduzi dịnụ, ọ dịghị ibu ọrụ dịnụ, nanị ụzọ ndụ nke ntụsara ahụ, ihe nile na-aga nnọọ were were. Ọ dịghị agbamume ọ bụla bụ “jisienụ ike isi n’ọnụ ụzọ dị warara baa” dịịrị ha!—Luk 13:24.
9. Gịnị ka ọ na-achọ iji jee ije n’ụzọ ahụ dị warara, oleekwa ịdọ aka ná ntị Jisọs nyere ndị ahụ na-eje ije na ya?
9 Ma ọ bụ ụzọ ahụ dị warara na-emeghe baa n’ụzọ nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi. Ọ bụ ụzọ nke chọrọ njide onwe onye. Ọ pụrụ ịchọ inye ọzụzụ nke ga-enyocha nzube obi gị nile, nwaakwa izi ezi nke nraranye gị. Mgbe mkpagbu bilitere, ụzọ ahụ na-adịwanye njọ, na-achọkwa ntachi obi. Jisọs na-adọ ndị na-aga ije n’okporo ụzọ nke a aka ná ntị, sị: “Na-ezenụ ndị amụma ụgha, ndị na-abịakwute unu n’ihe oyiyi atụrụ, ma n’ime ha bụ agụ na-apụnara atụrụ.” (Matiu 7:15) Nkọwa nke a kwekọrọ nnọọ n’ụzọ zuru okè n’ebe ndị Farisii ahụ nọ. (Matiu 23: 27, 28) Ha ‘dokwasịrị onwe ha n’oche Mosis,’ na-ekwu na ha na-ekwuchitere Chineke ebe ha na-agbaso omenala nke ụmụ mmadụ.—Matiu 23:2.
Otú Ndị Farisii Si ‘Emechi Ụzọ Alaeze ahụ’
10. N’ụzọ dị aṅaa kpọmkwem ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii si na-achọ ‘imechi ụzọ alaeze ahụ n’ihu mmadụ’?
10 Ọzọkwa, ndị ndú okpukpe ndị Juu ahụ chọrọ igbochi ndị ahụ na-achọ ịbanye site n’ọnụ ụzọ ahụ dị warara. “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ; n’ihi na unu na-emechi ụzọ alaeze eluigwe n’ihu mmadụ: n’ihi na unu onwe unu abataghị, unu adịghị ekwekwa ndị na-abata ka ha bata.” (Matiu 23:13) Usoro ime ihe nke ndị Farisii dị nnọọ dị ka Jisọs dọrọ aka ná ntị. Ha ‘ga-atụfu aha [ndị na-eso ụzọ ya] dị ka ajọ ihe, n’ihi Nwa nke mmadụ.’ (Luk 6:22) N’ihi na nwoke ahụ a mụrụ dị ka onye ìsì nke Jisọs gwọrọ kwere na Jisọs bụ Mesaịa ahụ, ha chụpụrụ ya n’ụlọ nzukọ. Ndị mụrụ ya agaghị aza ajụjụ ọ bụla n’ihi na ha tụrụ egwu na a ga-achụpụ ha site n’ụlọ nzukọ ahụ. N’ihi otu ihe ahụ, ndị ọzọ ndị kweere na Jisọs bụ Mesaịa ahụ lara azụ n’ịnakwere nke a n’ihu ọha.—Jọn 9:22, 34; 12:42; 16:2.
11. Mkpụrụ dịgasị aṅaa e ji amara ha ka ndị ụkọchukwu Krisendọm na-amịpụta?
11 Jisọs kwuru, sị, “Unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha. . . . Ezi osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ ọma; ma osisi na-abaghị n’ihe na-amị ajọ mkpụrụ.” (Matiu 7:16-20) Otu ụkpụrụ ahụ dịkwa irè taa. Ọtụtụ n’ime ndị ụkọchukwu Krisendọm na-ekwu otu ihe ma na-eme ihe ọzọ. Ọ bụ ezie na ha na-ekwu na ha na-akụzi Bible, ha na-akwado ozizi nkwulu ndị dị ka Atọ n’Ime Otu na ọkụ ala mmụọ. Ndị ọzọ na-agọpụ àjà mgbapụta ahụ, na-akụzi evolushọn kama ịkụzi okike, na-ekwusakwa ọkà mmụta akparamagwa ọgbara ọhụrụ iji mee ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ ná ntị. Dị ka ndị Farisii, ọtụtụ n’ime ndị ụkọchukwu nke oge a bụ ndị na-ahụ ego n’anya, na-anakọrọsị ìgwè ndị na-eso ha ọtụtụ nde naira. (Luk 16:14) Ha nile na-eticha mkpu “Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,” ma ihe Jisọs ga-azaghachi ha bụ: “Ọ dịghị mgbe ọ bụla m maara unu: si n’ebe m nọ pụọ, unu ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.”—Matiu 7:21-23.
12. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị na-ejebu ije n’okporo ụzọ ahụ dị warara jiworo kwụsị ime otú ahụ, gịnịkwa na-esi na ya apụta?
12 Taa, ụfọdụ ndị na-ejebu ije n’okporo ụzọ ahụ dị warara adịghị emekwa otú ahụ. Ha na-ekwu na ha hụrụ Jehova n’anya, ma ha adịghị erube isi n’iwu ya nke ime nkwusa. Ha na-ekwu na ha hụrụ Jisọs n’anya, ma ha adịghị azụ atụrụ ya. (Matiu 24:14; 28:19, 20; Jọn 21: 15-17; 1 Jọn 5:3) Ọ masịghị ha ka e jikọta ha na ndị ahụ na-eje ije na nzọụkwụ Jisọs. Ha lere ụzọ ahụ dị mkpagide anya dị ka ihe dịbigara mkpagide ókè. Ike gwụrụ ha ime ihe ọma, ha wee “[si] n’etiti anyị pụọ, ma ha abụghị ndị nke anyị; n’ihi na a sị na ha bụ ndị nke anyị, ha ga-anọgideworị n’etiti anyị.” (1 Jọn 2:19) Ha banyeghachiri n’ọchịchịrị, “[leekwa] ka ọchịchịrị ahụ si dị oké ibu!” (Matiu 6:23) Ha lefuuru arịrịọ Jọn anya, nke bụ: “Ụmụ ntakịrị m, ka anyị ghara ịhụ n’anya n’okwu, ma ọ bụ n’ire; kama ka anyị na-ahụ n’anya n’ọrụ na n’eziokwu.”—1 Jọn 3:18.
13, 14. Ihe atụ dị aṅaa ka Jisọs mere banyere itinye okwu ya n’ọrụ ná ndụ anyị, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka o ji kwesị nnọọ ekwesị nye ndị ahụ nọ na Palestine?
13 Jisọs ji otu ihe atụ pụtara ìhè mechie Ozizi Elu Ugwu ya: “Onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a, na-emekwa ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nwere uche, onye wuru ụlọ ya n’elu oké nkume: mmiri wee zoo, osimiri ruokwa, ifufe feekwa, wee makwasị ụlọ ahụ; ma ọ daghị: n’ihi na a tọrọ ntọala ya n’elu oké nkume ahụ.”—Matiu 7:24, 25.
14 Na Palestine, oké mmiri ozuzo pụrụ ime ka idei mmiri jiri ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ dị ukwuu na-asọdata na ndagwurugwu ndị ahụ kpọrọ nkụ n’ụzọ pụrụ ibibi ihe. Ka ụlọ wee guzoo, ọ dị mkpa ka ntọala ya dịrị na nkume siri ike. Ihe ndekọ Luk kọrọ na nwoke ahụ “gwuru gwumiekwa, wee tọọ ntọala n’elu oké nkume.” (Luk 6:48) Ọ bụ ọrụ siri ike, ma ọ bara uru mgbe oké ifufe bịara. Ya mere, iwukwasị àgwà ndị Kraịst n’elu okwu Jisọs ga-eweta nkwụghachi ụgwọ mgbe iju mmiri nke ihe isi ike bịara.
15. Gịnị ka ọ ga-arụpụtara ndị ahụ na-agbaso omenala nke ụmụ mmadụ kama irube isi n’okwu Jisọs?
15 E wuru ụlọ nke ọzọ n’elu ájá: “Ma onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a, ma ọ dịghị eme ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nke bụ onye nzuzu, onye wuru ụlọ ya n’elu ájá: mmiri wee zoo, osimiri ruokwa, ifufe feekwa, wee tikwasị ụlọ ahụ; o wee daa: ọdịda ya dịkwa ukwuu.” Otú ahụ ka ọ ga-adịrị ndị ahụ na-asị “Onyenwe anyị, Onyenwe anyị” ma ha adịghị eme ihe Ji-sọs kwuru.—Matiu 7:26, 27.
‘Ọ Bụghị Dị Ka Ndị Odeakwụkwọ Ha’
16. Mmetụta dị anaa ka Ozizi Elu Ugwu ahu nwere n’ahụ ndị nụrụ ya?
16 Mmetụta dị aṅaa ka Ozizi Elu Ugwu ahụ nwere? “O ruo, mgbe Jisọs kwubiri okwu ndị a, ibubo ozizi ya nwụrụ ìgwè mmadụ nile n’ahụ: n’ihi na ọ na-ezi ha ihe dị ka ò nwere ike ọ bụghịkwa dị ka ndị odeakwụkwọ ha.” (Matiu 7:28, 29) Ha nwere mmetụta dị omimi site n’ịnụ okwu n’ọnụ onye na-ekwu okwu site n’ụdị ike nke ha na-ahụtụbeghị mbụ.
17. Gịnị ka ndị odeakwụkwọ na-eme iji kwadoo ozizi ihe ha, gịnịkwa ka ha kwuru banyere ndị ọkà ihe ọmụma nwụworo anwụ, bụ́ ndị a na-ehota okwu ha?
17 Ọ dịghị onye odeakwụkwọ ọ bụla nke ji ike nke aka ya kwuo okwu mgbe ọ bụla, dị ka ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme nke a na-egosi: “Ndị odeakwụkwọ na-esi n’omenala enweta ihe e ji akwado ozizi ha, sitekwa ná ndị nna ha: ọ dịghịkwa ozizi nke onye odeakwụkwọ ọ bụla nke nwere ikike ma ọ bụ abamuru ọ bụla, e wezụgakwa ma [ò hotara sị] . . . Ndị Rabbin nwere omenala, ma ọ bụ . . . Ndị amamihe na-asị; ma ọ bụ isi iyi omenala ọzọ dị otú ahụ. Hillel Onye Ukwu ahụ ziri ihe n’eziokwu, ebe ọ bụkwa na omenala ahụ metụtara otu ihe kpọmkwem; ‘Ma, ọ bụ ezie na o kwuru okwu banyere ihe ahụ ruo ogologo ụbọchị dum, . . . ha anakwereghị ozizi ya, ruo mgbe o mesịrị kwuo, sị, Otú ahụ ka m nụrụ n’ọnụ Shemaịa na Abtalion [ihe a ma ama tupu Hillel].’” (A Commentary on the New Testament From the Talmud and Hebraica, nke John Lightfoot dere) Ọbụna na ndị Farisii na-azọrọ ihe banyere ndị ọkà amamihe ndị nwụworo eri ogologo oge, sị: “Egbugbere ọnụ nke ndị ezi omume, mgbe mmadụ hotara ozizi nke iwu n’aha ha—egbugbere ọnụ ha na-eso ya emegharị n’ime ili.”—Torah—From Scroll to Symbol in Formative Judaism.
18. (a) Ọdịiche dị aṅaa dị n’etiti ozizi nke ndị odeakwụkwọ na nke Jisọs? (b) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ozizi ihe nke Jisọs ji bụrụ ihe pụrụ iche?
18 Ndị odeakwụkwọ ahụ hotara okwu ndị mmadụ ndị nwụworo anwụ dị ka ihe mgbado ụkwụ ha; Jisọs kwuru okwu site n’ikike nke sitere n’aka Chineke ahụ dị ndụ. (Jọn 12: 49, 50; 14:10) Ndị rabaị na-adọpụta mmiri gbara ụka site n’olulu mmiri ndị e mechiworo emechi; Jisọs na-ewepụta isi iyi nke mmiri dị ọhụrụ, nke na-emejụ akpịrị ịkpọ nkụ dị omimi. O kpere ekpere, tụgharịakwa uche ogologo abalị nile, mgbe o kwukwara okwu, o metụrụ aka n’ebe dị omimi n’ime ndị mmadụ, bụ́ nke ha na-amaghị na ọ dịbu n’ebe ahụ. O kwuru okwu site n’ike nke ha pụrụ inwe mmetụta ya, bụ́ ikike nke ọbụna ndị odeakwụkwọ, ndị Farisii, na ndị Sadusii mesịrị tụọ egwu ịma aka. (Matiu 22:46; Mak 12:34; Luk 20:40) Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ọzọ mmadụ ọzọ kwuru okwu otú a! Ná mmechi nke ozizi ihe ahụ, ibubo nwụrụ ìgwè mmadụ ahụ n’ahụ!
19. Olee otú ụzọ izi ihe ụfọdụ nke Ndịàmà Jehova n’oge a si yie ndị Jisọs ji mee ihe n’Ozizi Elu Ugwu ahụ?
19 Gịnị banyere taa? Dị ka ndị na-eje ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ, Ndịàmà Jehova na-eji usoro ime ihe yiri ndị ahụ na-eme ihe. Onyenwe ụlọ na-agwa gị, sị: “Chọọchị m na-ekwu na a ga-esure ụwa n’ọkụ.” Ị na-azaghachi, sị: “Bible King James nke gị kwuru n’Eklisiastis 1:4, sị: ‘Ụwa na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.’” Ọ na-abụrụ onye ahụ ihe ịtụnanya. “Amaghịdị m na nke ahụ dị n’ime Bible m!” Onye ọzọ na-asị: “Anọwo m na-anụ mgbe nile na ndị mmehie ga-ere ọkụ n’ime ọkụ ala mmụọ.” “Ma, Bible nke gị kwuru ná Ndị Rom 6:23, sị: ‘Ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ.’” Ma ọ bụ, n’ihe banyere Atọ n’Ime Otu: “Onye okwuchukwu m sịrị na Jisọs na Nna ya hà nhata.” “Ma, na Jọn 14:28, Bible nke gị hotara ihe Jisọs kwuru, sị: ‘Nna m ka mụ onwe m ukwuu.’” Onye ọzọ na-agwa gị, sị: “Anụwo m ka a na-ekwu na Alaeze Chineke dị n’ime obi gị.” Nzaghachi gị: “Na Daniel 2:44, Bible nke gị na-asị: ‘N’ụbọchị eze ndị a ka Chineke nke eluigwe ga-eguzobe otu alaeze, nke a na-agaghị ebibi ebibi ma ọlị . . . Ọ ga-etipịasị ma ripịakwa alaeze ndị a nile, ọ ga-eguzokwa ruo mgbe ebighị ebi.’ Olee otú nke ahụ ga-esi dịrị n’ime obi gị?”
20. (a) Ọdịiche dị aṅaa ka e nwere n’etiti ụzọ izi ihe nke Ndịàmà Jehova na nke ndị ụkọchukwu Krisendọm? (b) Gịnị ka ọ bụ oge ya ugbu a?
20 Jisọs ji ike nke sitere n’aka Chineke kwuo okwu. Ndịàmà Jehova na-ekwu okwu site n’ike nke Okwu Chineke. Ndị ụkọchukwu Krisendọm na-ekwupụta omenala okpukpe ndị e ji ozizi e nyere ha n’aka idebe site na Babilọn na Ijipt metọọ. Mgbe ndị nwere obi eziokwu nụrụ ka e meriri nkwenkwe ha ndị a site na Bible, ọ na-eju ha anya, ha wee tie mkpu, sị: ‘Amabughị m na ihe a dị n’ime Bible m!’ Ma ọ dị ya. Ugbu a bụ oge ka ndị nile maara mkpa ime mmụọ ha ṅaa ntị n’ihe Jisọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ahụ wee si otú a wukwasị n’elu ntọala nke bụ oké nkume.
Ajụjụ Ntụleghachi
◻ Kama ịdị na-ekpe ikpe, gịnị ka anyị kwesịrị ịgbalị ime, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
◻ N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị taa na-eji ahọrọ ụzọ ahụ dị obosara?
◻ N’ihi gịnị ka ụzọ izi ihe nke Jisọs ji dị nnọọ iche na nke ndị odeakwụkwọ ahụ?
◻ Mmetụta dị aṅaa ka Ozizi Elu Ugwu ahụ nwere n’ebe ndị nụrụ ya nọ?