Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lff isi 21
  • Olee Otú E Si Na-ekwusa Ozi Ọma?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú E Si Na-ekwusa Ozi Ọma?
  • Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MỤTAKWUO IHE
  • NCHỊKỌTA
  • IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
  • “Na-ezisa Ozi Ọma nke Ezi Ihe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • “Gaanụ Mee Ndị Mba Niile Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ M”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Ekwusa Ozi Ọma Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • “Kwusaa Okwu Chineke”
    Bụkuo Jehova Abụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
lff isi 21
Isi nke 21. Ebe otu nwoke na Ndịàmà Jehova abụọ na-ekwurịta okwu n’okporo ụzọ n’akụkụ ihe a na-akwagharị akwagharị e ji ekwusa ozi ọma.

ISI NKE 21

Olee Otú E Si Na-ekwusa Ozi Ọma?

Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi

N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eji Alaeze ya wepụ nsogbu niile na-echi anyị ọnụ n’ala. Mmadụ niile kwesịrị ịnụ ozi ọma a na-eme obi ụtọ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa kwusaara mmadụ niile ozi ọma a. (Matiu 28:​19, 20) Olee otú Ndịàmà Jehova si eme ihe a Jizọs kwuru?

1. Olee otú ihe e kwuru na Matiu 24:14 si na-emezu taa?

Jizọs buru amụma, sị: ‘A ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa.’ (Matiu 24:14) Obi dị Ndịàmà Jehova ụtọ na ha na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma. Anyị na-ekwusa ozi ọma a n’ụwa niile n’ihe karịrị otu puku asụsụ. E kwesịrị ịgbasi mbọ ike n’ọrụ a na-abụghị obere ọrụ. E kwesịkwara ịhazi ya nke ọma. E nweghị otú anyị ga-esi rụọ ya ma ọ bụrụ na Jehova anaghị enyere anyị aka.

2. Olee mbọ ndị anyị na-agba ka anyị nwee ike izi ndị mmadụ ozi ọma?

Anyị na-aga ebe ọ bụla anyị ga-ahụ ndị mmadụ zie ha ozi ọma. Anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma “n’ụlọ n’ụlọ” otú ahụ Ndị Kraịst oge mbụ mere. (Ọrụ Ndịozi 5:​42) Otú a a haziri ahazi anyị si ezi ozi ọma na-eme ka anyị nwee ike izi ọtụtụ nde mmadụ ozi ọma n’afọ ọ bụla. Ebe ọ bụ na ndị mmadụ anaghị anọ n’ụlọ mgbe niile, anyị na-aga n’ebe ha na-anọkarị zie ha ozi ọma. Anyị na-achọ oge ọ bụla dabara adaba anyị ga-eji gwa ndị mmadụ gbasara Jehova na ihe ndị ọ chọrọ ime.

3. Ònye kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma?

Onye ọ bụla bụ́ ezigbo Onye Kraịst kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma. Anyị ejighị ikwusa ozi ọma egwu egwu. Anyị na-ekwusa ozi ọma a ruo otú ọnọdụ anyị kwere anyị, n’ihi na anyị ma na o nwere ike ịzọ ndị mmadụ ndụ. (Gụọ 1 Timoti 4:​16.) A naghị akwụ anyị ụgwọ maka ozi ọma a anyị na-ekwusa, n’ihi na Baịbụl sịrị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Matiu 10:​7, 8) Ọ bụghị mmadụ niile na-ege ntị ma anyị ziwe ha ozi ọma. Ma, anyị anaghị akwụsị ikwusa ozi ọma n’ihi na anyị ma na o so n’otú anyị si efe Jehova, ọ na-emekwa ya obi ụtọ.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụtakwuo mbọ dị iche iche Ndịàmà Jehova na-agba ka ha nwee ike ikwusara ndị mmadụ ozi ọma n’ụwa niile. Chọpụtakwa otú Jehova si enyere anyị aka.

A. Ebe Ndịàmà Jehova abụọ na-ezi otu nwoke ozi ọma n’elu ugwu bụ́ ahịhịa ahịhịa na Kosta Rika. B. Ebe Ndịàmà Jehova anọ na-ezi ndị na-akụ azụ̀ ozi ọma n’otu ebe ugbo mmiri na-akwụsị n’Amerịka. CH. Ebe Ndịàmà Jehova abụọ na-ezi otu nwoke ozi ọma n’otu ime ime obodo na Bene. D. Ebe otu Onyeàmà Jehova na-ezi otu nwaanyị nọ n’ụgbọ epeepe na-ere ahịa ozi ọma na Taịland. E. Ebe Ndịàmà Jehova abụọ na-ezi otu nwaanyị ozi ọma n’ihu otu nnukwu okwute na Yap. F. Ebe Ndịàmà Jehova abụọ nọ n’okporo ụzọ bụ́ snoo snoo nke dị n’akụkụ mmiri na-ezi otu nwaanyị ozi ọma na Swidin.

Ebe dị iche iche a na-ekwusa ozi ọma n’ụwa: (A) Kosta Rika, (B) Amerịka, (CH) Bene, (D) Taịland, (E) Yap, (F) Swidin

4. Anyị na-agbasi mbọ ike ka anyị zie mmadụ niile ozi ọma

Ndịàmà Jehova na-agba mbọ pụrụ iche ka ha zie ndị mmadụ ozi ọma n’agbanyeghị ebe ha nọ. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

VIDIO: Ikwusa Ozi Ọma “n’Ebe Kasị Anya n’Ụwa” (7:​33)

  • Gịnị masịrị gị n’ụdị mbọ Ndịàmà Jehova na-agba ka ha zie ndị mmadụ ozi ọma?

Gụọnụ Matiu 22:39 na Ndị Rom 10:​13-​15. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú ozi ọma anyị na-ekwusa si egosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya?

  • Olee otú i chere obi na-adị Jehova ma ọ hụ ndị na-ekwusa ozi ọma? ​—Leruonụ anya n’amaokwu nke 15.

5. Anyị na Chineke na-arụkọ ọrụ

E nwere ọtụtụ akụkọ na-egosi na ọ bụ Jehova na-eduzi ozi ọma a anyị na-ekwusa. Dị ka ihe atụ, na Niu Ziland, mgbe otu nwanna nwoke aha ya bụ Paul nọ na-ekwusa ozi ọma n’otu ehihie, ọ hụrụ otu nwaanyị. Mgbe nwaanyị ahụ nọ na-ekpe ekpere n’ụtụtụ ụbọchị ahụ, ọ kpọrọ Chineke aha ya bụ́ Jehova ma rịọ ya ka o mee ka mmadụ bịa zie ya ozi ọma. Paul kwuru, sị: “Awa atọ o kpechara ekpere a, m bịara n’ụlọ ya.”

Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 3:9. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú ihe ndị mere eme, dị ka nke a mere na Niu Ziland, si egosi na ọ bụ Jehova na-eduzi ozi ọma a anyị na-ekwusa?

Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 1:8. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere o ji bụrụ na o nweghị ebe anyị ji azụ aga n’ozi ọma anyị na-ekwusa ma ọ bụrụ na Jehova anaghị enyere anyị aka?

Ị̀ ma ihe a?

Anyị gaa ọmụmụ ihe n’etiti izu ọ bụla, a na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma. Ọ bụru na e nwetụla mgbe ị bịara ọmụmụ ihe anyị a, olee ihe i chere gbasara otú e si akụziri anyị ikwusa ozi ọma?

Ebe Ndịàmà Jehova abụọ na-egosi ndị bịara ọmụmụ ihe otú e nwere ike isi zie ozi ọma.

6. Anyị na-erube isi n’iwu Chineke nyere anyị ka anyị na-ekwusa ozi ọma

N’oge Ndị Kraịst oge mbụ, ndị mmadụ nọ na-anwa ka ndị na-eso ụzọ Jizọs kwụsị ikwusa ozi ọma. Ndị Kraịst oge mbụ a gbasiri mbọ ike ka ha ghara ịkwụsị ikwusa ozi ọma. Ha gbalịrị “iji ihe iwu kwuru kwado izisa ozi ọma.” (Ndị Filipaị 1:7) Ndịàmà Jehova na-emekwa otú ahụ n’oge a.a

Kpọnyenụ VIDIO a.

VIDIO: Iji Ihe Iwu Kwuru Agbachitere Ozi Ọma (2:​28)

Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 5:​27-​42. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere na anyị agaghị akwụsị ikwusa ozi ọma?​—Leruonụ anya n’amaokwu nke 29, 38, na 39.

MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe mere Ndịàmà Jehova ji aga n’ụlọ n’ụlọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma.

  • Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?

NCHỊKỌTA

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa ebe niile n’ụwa kwusaa ozi ọma. Jehova na-enyere anyị aka n’ozi ọma anyị na-ekwusa.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee otú e si ekwusa ozi ọma n’ụwa niile?

  • Olee otú ozi ọma anyị na-ekwusa si egosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya?

  • Ì chere na ozi ọma anyị na-ekwusa na-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta otú Ndịàmà Jehova si ekwusa ozi ọma n’obodo ndị mepere emepe.

Ụzọ Pụrụ Iche E Si Ezi Ozi Ọma n’Ebe Ndị Na-ekwo Ekwo na Paris (5:11)

Olee otú Ndịàmà Jehova sirila nyere ndị gbara ọsọ ndụ aka?

Otú E Si Kụziere Ndị Gbara Ọsọ Ndụ Eziokwu Baịbụl (5:59)

Jiri anya gị hụ ụdị obi ụtọ mmadụ na-enwe ma ọ na-ekwusa ozi ọma mgbe niile.

Obi Dị M Ụtọ na M Ji Ozi Jehova Mere Ọrụ (6:29)

Chọpụta okwu ndị gbara ọkpụrụkpụ anyị meriri n’ụlọikpe, ndị nyere aka mee ka a na-ekwusakwu ozi ọma.

“Okwu Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke Wepụrụ n’Ụlọikpe” (Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!, isi nke 13)

a Ọ bụ Jehova gwara anyị ka anyị na-ekwusa ozi ọma, n’ihi ya, Ndịàmà Jehova anaghị eche ka ndị ọchịchị nye ha ikike tupu ha ekwusawara ndị mmadụ ozi ọma.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya