Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 12/15 p. 4-7
  • Ọmụmụ Jizọs Otú Ọ Ga-esi Weta Udo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọmụmụ Jizọs Otú Ọ Ga-esi Weta Udo
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Eze E Buru n’Amụma
  • “Ozi Ọma Banyere Oké Ọṅụ”
  • À Na-egosipụta Àgwà Ndị Kraịst n’Oge Nile n’Afọ?
  • “Onye A Bụ Ọkpara M”
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Jehova Mere Ka Ọ Nara Amara nke Ukwuu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • “Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • “Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 12/15 p. 4-7

Ọmụmụ Jizọs Otú Ọ Ga-esi Weta Udo

MKPỌSA ahụ bụ́ ‘udo ga-adị n’etiti ndị a nwapụtaworo’ abụghị nanị amụma e buru banyere ọmụmụ Jizọs. E wezụga ọkwa ahụ ndị mmụọ ozi ahụ maara ndị ọzụzụ atụrụ ahụ nọ ná mgbagwoju anya, ndị mmụọ ozi ndị ọzọ sitere n’eluigwe eburula ụzọ zie Meri na di ya, bụ́ Josef, ozi ndị sitere n’aka Chineke banyere nwa ahụ a mụrụ ọhụrụ bụ́ Jizọs. Ịtụle ozi ndị a ga-enyere anyị aka ịghọtakwu akụkọ banyere ọmụmụ Jizọs na ịghọta ihe nkwa ahụ ndị mmụọ ozi ahụ kwere na udo ga-adị n’etiti ndị a nwapụtaworo pụtara.

Tupu a mụọ Jizọs, ọbụnadị tupu Meri adịrị ime, otu mmụọ ozi Bible kpọrọ Gebriel bịakwutere Meri. Mmụọ ozi ahụ kelere ya, sị: “Ndeewo, onye a na-egosi ihu ọma dị ukwuu, Jehova nọnyeere gị.” Dị ka ị pụrụ ịtụ anya ya, okwu a nyere nnọọ Meri nsogbu n’obi, ma eleghịkwa anya, ụjọ tụtụrụ ya. Oleekwanụ ihe ụdị ekele ahụ pụtara?

Gebriel kọwaara ya, sị: “Lee! ị ga-atụrụ ime n’akpa nwa gị ma mụọ nwa nwoke, ị ga-akpọkwa aha ya Jizọs. Onye a ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kasị Elu; Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nke Devid bụ́ nna ya, ọ ga-achịkwa ụlọ Jekọb dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi, alaeze ya agaghịkwa enwe ọgwụgwụ.” Meri nwere obi abụọ otú nke a ga-esi mee, ebe ọ bụ na ya na nwoke enwetụbeghị mmekọahụ. Gebriel gwara ya na ọ bụ n’ike mmụọ nsọ Chineke ka ọ ga-atụrụ ime nwa ahụ. Nwa a agaghị abụ nwa nkịtị.—Luk 1:28-35.

Eze E Buru n’Amụma

Okwu ndị ahụ Gebriel kwuru aghaghị ịbụ ihe nyeere Meri aka ịghọta na nwa ahụ ọ ga-amụ bụ onye e buru amụma dị iche iche banyere ya n’oge ochie. Àmà ahụ a gbaara Meri na Jehova ga-enye nwa ya nwoke “ocheeze nke Devid bụ́ nna ya” ga-eme ka Meri—nakwa onye Juu ọ bụla maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma—chee echiche banyere nkwa Chineke kwere Eze Devid nke Izrel.

Jehova si n’ọnụ onye amụma bụ́ Netan gwa Devid, sị: “Ụlọ gị na alaeze gị ga-ekwesị ntụkwasị obi n’ihu gị ruo mgbe ebighị ebi: a ga-eme ka ocheeze gị bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.” (2 Samuel 7:4, 16) Jehova kwuru banyere Devid, sị: “M ga-emekwa ka mkpụrụ ya dịruo mgbe ebighị ebi, meekwa ka ocheeze ya dị ka ụbọchị nile nke eluigwe. Mkpụrụ ya ga-adịru mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịkwa ka anyanwụ n’ihu m.” (Abụ Ọma 89:20, 29, 35, 36) N’ihi ya, ọ bụghị ihe mere ná ndaba na Meri na Josef sicha n’ezinụlọ Devid.

Ọ bụghị nanị amụma ndị ahụ bụ amụma ndị e buru n’Akwụkwọ Nsọ Hibru banyere nwa ga-esite n’ezinụlọ Devid nke ga-abụ eze. Ọ ghaghịkwa ịbụ na Meri maara ihe dị n’amụma Aịzaịa, nke bụ́: “A mụworo anyị otu nwa, otu nwa nwoke ka e nyeworo anyị; ịbụ onyeisi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya: a ga-akpọkwa aha ya Onye ebube, Onye ndụmọdụ, Chineke Nke bụ́ Dike, Nna Nke bụ́ Nna mgbe nile ebighị ebi, Onyeisi Udo. Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ, n’elu ocheeze Devid, na n’elu alaeze ya, ime ka o guzosie ike, na ịkwagide ya n’ikpe ziri ezi na n’ezi omume, site n’ugbu a wee ruo mgbe ebighị ebi. Ekworo Jehova nke ụsụụ nile nke ndị agha ga-eme nke a.”—Aịsaịa 9:6, 7.

N’ihi ya, ọkwa ahụ Gebriel maara Meri abụghị nanị na a gaje ịmụ otu nwata nwoke n’ụzọ ọrụ ebube. Nwa ya nwoke ga-abụ eze ga-anọchi Eze Devid—onye ga-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi n’Alaeze Chineke guzobere. Amụma ndị Gebriel buru banyere ihe ndị Jizọs gaje ime n’ọdịnihu baara anyị nile ezigbo uru.

Mgbe Josef chọpụtara na nwanyị ọ chọrọ ịlụ dị ime, o kpebiri ịhapụ ya. Ọ maara na nwa ahụ abụghị nke ya n’ihi na ya na nwanyị ahụ ọ chọrọ ịlụ enwetụbeghị mmekọahụ. Ị pụrụ ịhụ ihe mere ọ na-aghaghị iji siere Josef ike ikweta ihe Meri gwara ya banyere ime ahụ ọ dị. Akwụkwọ Matiu na-akọ, sị: “Mmụọ ozi Jehova pụtara wee bịakwute ya ná nrọ, na-asị: ‘Josef, nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri nwunye gị laa, n’ihi na ihe ahụ e meworo ka ọ dị ime ya bụ site na mmụọ nsọ. Ọ ga-amụ nwa nwoke, ị ghaghịkwa ịkpọ aha ya Jizọs, n’ihi na ọ ga-azọpụta ndị ya ná mmehie ha.’”—Matiu 1:20, 21.

Bible ekwughị ókè Josef ghọtaruru otú nwa ahụ ga-esi “azọpụta ndị ya ná mmehie ha.” Ma, ozi a e ziri Josef zuru ime ka o kweta na nwanyị ahụ dị ime akwaghị iko. O mere ihe mmụọ ozi ahụ gwara ya ma kpọrọ Meri laa n’ụlọ ya, bụ́ ihe a na-eme n’oge ahụ nke ya na agbamakwụkwọ bụ otu ihe.

N’ihi ihe ndị e dere n’ebe ndị ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ, anyị nwere ike ịghọta ihe ihe ahụ mmụọ ozi ahụ kwuru pụtara. Obere oge ka e kesịrị mmadụ, otu mmụọ ozi nke nupụrụ isi mara ọbụbụeze Jehova aka. Akwụkwọ Nsọ Hibru gosiri na otu n’ime ihe ndị onye nnupụisi a kwuru bụ na otú Chineke si achị ezighị ezi nakwa na ọ dịghị mmadụ ga-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova ma ọ bụrụ na e lee ya ule. (Jenesis 3:2-5; Job 1:6-12) Adam ekwesịghị ntụkwasị obi. N’ihi mmehie o mere, mmadụ nile ketara mmehie, ihe sịkwanụ ná mmehie ahụ pụta bụ ọnwụ. (Ndị Rom 5:12; 6:23) Otú ọ dị, a mụrụ Jizọs dị ka onye na-enweghị mmehie n’ihi na ọ bụghị mmadụ tụwara nne ya ime ya. Site n’iji obi ya nile nye ndụ ya zuru okè dị ka ihe mgbapụta nke kwekọrọ n’ihe Adam tụfuru, Jizọs ruru eru ịzọpụta ụmụ mmadụ ná mmehie ha na ime ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.—1 Timoti 2:3-6; Taịtọs 3:6, 7; 1 Jọn 2:25.

Mgbe Jizọs na-eje ozi ya n’elu ala, o gosiri otú ihe ga-adị mgbe e wepụrụ ihe ndị mmehie kpatara. Ọ gwọrọ ndị nwere ụdị nkwarụ nile, ọbụna kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Matiu 4:23; Jọn 11:1-44) Ọrụ ebube ndị ahụ gosiri ihe ndị ọ ga-eme n’ọdịnihu. Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [m] wee pụta.”—Jọn 5:28, 29.

Nkwa ahụ nke mbilite n’ọnwụ a ga-enwe n’ọdịnihu na-egosi ihe mere ọmụmụ—na ọbụna karịsịa ọnwụ—Jizọs ji baara anyị ezigbo uru. Jọn 3:17 kwuru na Chineke zitere Ọkpara ya n’ụwa “ka e wee zọpụta ụwa site na ya.” Ozi a magburu onwe ya na-echetara anyị ọkwa ahụ a maara ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-eche atụrụ ha nche n’abalị ahụ a mụrụ Jizọs.

“Ozi Ọma Banyere Oké Ọṅụ”

Ọkwa ahụ ndị mmụọ ozi ahụ mara na a gaje ịmụ “onye nzọpụta, onye bụ́ Kraịst Onyenwe anyị” bụụrụ nnọọ ụmụ mmadụ “ozi ọma banyere oké ọṅụ.” (Luk 2:10, 11) Nwa a gaje ịbụ Mezaịa, Onye Amụma ukwu na Onye Ọchịchị nke ndị Chineke nọ na-atụ anya ya kemgbe. (Deuterọnọmi 18:18; Maịka 5:2) Ndụ ya na ọnwụ ya n’elu ụwa ga-enye nnọọ aka n’igosi na ọ bụ nanị Jehova ka o ruuru ịchị eluigwe na ala, bụ́ ihe mere ndị mmụọ ozi ahụ ji kwuo, sị: “Ka otuto dịrị Chineke n’ebe kasị elu.”—Luk 2:14.

Jizọs, onye Bible kpọrọ “Adam ikpeazụ,” gosiri na mmadụ ga-enwe ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova ọbụna mgbe e lere ya ule tara nnọọ akpụ. (1 Ndị Kọrint 15:45) O si otú ahụ gosi na Setan bụ ajọ onye ụgha. Nke a mere ka ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi nọ n’eluigwe ṅụrịa ọṅụ.

Ma ka anyị jụọkwa ajụjụ ahụ bụ́, “Ànyị ji n’aka na ọkwa ahụ ndị mmụọ ozi mara n’abalị ahụ a mụrụ Jizọs ga-emezu?” Azịza ya bụ nnọọ ee! A ga-enwe udo ma ọ bụrụ na nzube Chineke maka ụwa, nke gụnyere ime ka ụwa bụrụghachi paradaịs, ga-emezu. Mgbe e mezuru nke a n’ụwa nile, mmadụ nile ga na-ahụ ibe ha n’anya ma na-ekwesị ntụkwasị obi. N’ihi ya, mmezu nke nzube Jehova pụtakwara na a ga-ebibi ndị nile na-eguzogide ọbụbụeze ya. Nke a abụghị ozi ọma nye ndị so Setan na-ekwu nnọọ na ụkpụrụ Jehova adịghị mma. Ọ ga-apụtara ha mbibi.—Abụ Ọma 37:11; Ilu 2:21, 22.

Biko buru n’uche na ndị mmụọ ozi ahụ agwaghị ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na udo na nnwapụta ga-adịrị mmadụ nile. Kama nke ahụ, ha mara ọkwa na ‘udo ga-adị n’etiti ndị a nwapụtaworo.’ Nke ahụ pụtara na udo ga-adị n’etiti ndị ihe ha dị Chineke ezi mma, bụ́ ndị ọ nwapụtaworo. Ndị gosipụtara ezi okwukwe na Jehova na-aghọ ụmụazụ Jizọs na-ekwesị ntụkwasị obi na ndị na-eṅomi ya. Ndị ikom na ndị inyom dị otú ahụ na-adị njikere imesapụrụ ndị ọzọ aka na inwe obiọma n’ebe ha nọ, ọ bụghị nanị ụbọchị ole na ole n’afọ ka ha ji eme nke a, kama ụbọchị nile.

À Na-egosipụta Àgwà Ndị Kraịst n’Oge Nile n’Afọ?

Ike nke ozi ọma ahụ Jizọs kwusara emetụtawo ndụ nke imerime mmadụ. Ọtụtụ amalitela ịgbaso ụkpụrụ Ndị Kraịst n’akụkụ nile nke ndụ ha. Ndị na-echebu banyere onwe ha nanị amalitela ịjụ ihe Jizọs gaara eme ma ọ nọrọ n’ọnọdụ ha nọ na ya. Ụfọdụ ndị tinyeburu isi n’inweta ihe onwunwe na ihe ụtọ abịala ghọta mkpa ihe ndị metụtara ofufe Jehova dị na mkpa ọ dị ịgwa ndị agbata obi ha banyere ha. Ndị na-eme nke a na-agbalị ịdị na-emesapụ aka ma na-enwe obiọma n’oge nile n’afọ. Ọ́ bụghị ihe ị ga-atụ anya ka ezi Ndị Kraịst na-eme?

Ya bụrụ na mmadụ nile obi ha dị ọcha echebara ihe ozi ahụ ndị mmụọ ozi ziri banyere udo pụtara echiche ma mee ihe kwekọrọ na ha, ụwa agakwaghị nnọọ adị otú ọ dị ugbu a.

Amụma ndị e buru banyere ọmụmụ Jizọs na-emesi ndị Chineke nwapụtara obi ike na ha pụrụ inwe ezi udo ruo mgbe ebighị ebi. Nke ahụ ọ́ bụghị ihe ị chọrọ? Anyị pụrụ ijide n’aka na amụma ahụ dị ebube ndị mmụọ ozi buru mgbe a mụrụ Jizọs ga-emezurịrị. Kama udo ịbụ okwu efu a na-ekwu n’oge Krismas, ọ ga-emesị nnọọ dịruo mgbe ebighị ebi.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Mmadụ pụrụ igosipụta àgwà Ndị Kraịst n’oge nile n’afọ, ọ bụkwa otú ahụ ka o kwesịrị ịdị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya