Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Nna nke Na-enweghị Onye Dị Ka Ya
    Ụlọ Nche—2008 | Jenụwarị 1
    • N’ihe dị ka n’October 29 O.A., Jizọs gara n’Osimiri Jọdan ka e mee ya baptizim. Baịbụl kọrọ ihe merenụ, sị: “Mgbe e mesịrị Jizọs baptizim, o si na mmiri ahụ bilie ozugbo; ma, lee! eluigwe meghere, o wee hụ ka mmụọ Chineke na-efedata dị ka nduru wee bekwasị ya. Lee! Otu olu sikwa n’eluigwe kwuo, sị: ‘Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.’”a (Matiu 3:16, 17) Ọ bụ Jehova kwuru okwu ahụ na-eru n’ahụ́, nke na-eme ka anyị mara ụdị Nna ọ bụ. O nwere ụzọ ihe atọ ị ga-ahụ Jehova gwara Ọkpara ya n’ebe a.

      Nke mbụ bụ na mgbe Jehova sịrị “onye a bụ Ọkpara m,” ihe o kwuru bụ, ‘Obi dị m ụtọ na m bụ Nna gị.’ Nna nke nwere nghọta na-eme ka ụmụ ya mara na ya ji ha kpọrọ ihe nakwa na ha dị mkpa. E kwesịrị ime ka obi sie ụmụaka ike na ha bara uru n’ezinụlọ. Chee echiche otú obi si tọọ Jizọs ụtọ ịhụ na Nna ya gosiri na ya ji ya kpọrọ ihe, ọbụna mgbe ọ bụ dimkpa!

      Nke abụọ bụ na mgbe Jehova kpọrọ Ọkpara ya “onye m hụrụ n’anya,” o gosiri n’ihu ọha na ọ hụrụ Jizọs n’anya. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, Ọ gwara Ọkpara ya, sị, ‘Ahụrụ m gị n’anya.’ Ezigbo nna na-agwa ụmụ ya na ya hụrụ ha n’anya nke ukwuu. Ikwu okwu dị otú a na ime ihe na-egosi na ị hụrụ ha n’anya, na-enyere ụmụaka aka ime nke ọma. N’ezie, o metụrụ Jizọs n’obi nke ukwuu mgbe ọ nụrụ ka Nna ya kwuru na ya hụrụ ya n’anya.

      Nke atọ bụ na mgbe Jehova kpọrọ Ọkpara ya “onye ihe ya masịrị m,” o gosiri na ihe ya dị ya mma. O yiri ka à ga-asị na Jehova sịrị, ‘Nwa m, ihe i mere dị m ụtọ.’ Nna nke hụrụ ụmụ ya n’anya na-achọ ohere ndị ọ ga-eji na-agwa ha na ihe ọma ha na-eme ma ọ bụ ihe ọma ha na-ekwu masịrị ya. Obi na-esi ụmụaka ike, na-erukwa ha ala, ma ọ bụrụ na ndị mụrụ ha na-egosi ha na ihe ha masịrị ha. N’ezie, Jizọs nwere obi ike mgbe ọ nụrụ ka Nna ya kwuru na ihe ya masịrị ya!

  • Nna nke Na-enweghị Onye Dị Ka Ya
    Ụlọ Nche—2008 | Jenụwarị 1
    • a N’ebe e dere ihe yiri nke a n’Oziọma Luk, Jehova gwara Nwa ya, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; ihe gị masịrị m.”—Luk 3:22.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya