Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 8/1 p. 12-17
  • Mee Ka Ọganihu Gị Pụta Ìhè

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee Ka Ọganihu Gị Pụta Ìhè
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịdị n’Otu n’Okwukwe na n’Ihe Ọmụma
  • Na-egosipụta “Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ”
  • Na-enwe Ọganihu Ka E Wee Nye Chineke Otuto
  • Mee Ka Ọganihu Gị Pụta Ìhè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ndị Na-eto Eto, Meenụ Ka Ọganihu Unu Pụta Ìhè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Mee Ka Ịga n’Ihu Gị Pụta Ìhè
    Ozi Alaeze Anyi—1995
  • Nọgide Na-enwe Ọganihu
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 8/1 p. 12-17

Mee Ka Ọga nihu Gị Pụta Ìhè

“Na-ejisi ike n’ihe ndị a; na-anọsi ike n’ime ha; ka ịga n’ihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ nile nọ.”—1 TIMOTI 4:15.

1. Olee otú ị pụrụ isi mata mgbe mkpụrụ osisi chara acha ma kwesị ọrịra?

WERE anya nke uche gị lee mkpụrụ osisi kasị amasị gị—pọpọ, ube, mango, ma ọ bụ mkpụrụ osisi ọzọ. Ị̀ pụrụ ịmata mgbe ọ chara acha, ma kwesị ọrịra? N’ezie, ị ga-amata. Ísì ya, ụcha ya, na ọdịdị ya, ha nile na-agwa gị na ị na-aga ịracha ihe na-atọ nnọọ ụtọ. Ozugbo ị rabiritụụrụ ya, mkpu pụrụ ịpụ gị n’ọnụ. Nke a bụ une! Nke a atọka! Ọ na-atọ gị ụtọ nke ukwuu ma na-eme gị obi ụtọ.

2. Olee otú e si eme ka ntozu okè pụta ìhè, mmetụta dịkwa aṅaa ka ọ na-enwe ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya?

2 Ihe atụ a dị mfe ma dị ụtọ nwere ihe ndị yiri ya n’akụkụ ndị ọzọ nke ndụ. Dị ka ihe atụ, dị ka ọ na-adị n’ọchịcha nke mkpụrụ osisi, ntozu okè ime mmụọ na-apụtakwa ìhè n’ụzọ dịgasị iche iche. Anyị na-amata na mmadụ etozuwo okè mgbe anyị na-ahụ na o nwere nghọta, amamihe, na ihe ndị ọzọ. (Job 32:7-9) N’ezie, ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ iso ndị na-egosipụta àgwà ndị dị otú ahụ n’ihe ndị ha na-eme, na-akpakọrịta ma na-arụkọ ọrụ.—Ilu 13:20.

3. Gịnị ka nkọwa Jisọs nyere banyere ndị biri ndụ n’oge ya na-ekpughe banyere ntozu okè?

3 N’aka nke ọzọ, mmadụ pụrụ ịbụ onye toruworo ogo mmadụ, ma otú o si ekwu okwu na otú o si eme omume pụrụ igosi na o tozubeghị okè n’ụzọ mmetụta uche na n’ụzọ ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, mgbe Jisọs Kraịst na-ekwu banyere ndị nnupụisi nke oge ya, ọ sịrị: “Jọn bịara n’erighị ihe oriri n’aṅụghịkwa ihe ọṅụṅụ, ha wee sị, O nwere mmụọ ọjọọ. Nwa nke mmadụ bịara na-eri ihe oriri na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ha wee sị, Lee, onye ori nke ukwu, na onye oké ọṅụ mmanya.” Ọ bụ ezie na ndị ahụ etoruwo ogo mmadụ, Jisọs kwuru na ha kpara àgwà ka “ụmụntakịrị”—ha etozughị okè. Ya mere, ọ gbakwụnyere, sị: “A gụkwara amamihe n’onye ezi omume site n’ọrụ ya nile.”—Matiu 11:16-19.

4. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka e si eme ka ọganihu na ntozu okè pụta ìhè?

4 Site n’okwu Jisọs, anyị pụrụ ịhụ na ihe na-egosipụta ma mmadụ o nwere ezi amamihe—ihe e ji amata onye tozuru okè—bụ ihe ọ na-arụ na ihe ọ na-arụpụta. Banyere nke a, rịba ama ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere Timoti. Mgbe Pọl depụtasịrị ihe Timoti kwesịrị ịgbaso, ọ sịrị: “Na-ejisi ike n’ihe ndị a; na-anọsi ike n’ime ha; ka ịga n’ihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ nile nọ.” (1 Timoti 4:15) Ee, ọganihu onye Kraịst na-enwe iru ntozu okè ‘na-apụta ìhè,’ ma ọ bụ na-abụ nke a na-aghọta nke ọma. Ntozu okè ndị Kraịst, dị ka ìhè na-egbukepụ egbukepụ, abụghị àgwà dị n’ime ma ọ bụ nke zoro ezo. (Matiu 5:14-16) N’ihi ya, anyị ga-atụle ụzọ abụọ bụ́ isi a pụrụ isi mee ka ọganihu na ntozu okè pụta ìhè: (1) ito eto n’ihe ọmụma, nghọta, na amamihe; (2) igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ.

Ịdị n’Otu n’Okwukwe na n’Ihe Ọmụma

5. Olee otú a pụrụ isi kọwaa ntozu okè?

5 Ọtụtụ akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwa ntozu okè dị ka ọnọdụ nke itoju etoju, nke ịbụ onye tozuru ogo mmadụ, nakwa ịbụ onye tozuru etozu ma ọ bụ onye toruworo ihe a chọrọ. Mkpụrụ osisi, dị ka a kpọtụrụ uche n’elu, tozuru etozu, ma ọ bụ chaa achaa mgbe o tochara ihe nile o kwesịrị ito, ọdịdị ya, ụcha ya, ísì ya, na ụtọ ya eruokwa ime ka ọ bụrụ ihe na-agụ agụụ. N’ihi ya, ntozu okè na ịma mma, izu ezu, ọbụna izu okè, pụtara otu ihe.—Aịsaịa 18:5; Matiu 5:45-48; Jemes 1:4.

6, 7. (a) Gịnị na-egosi na Jehova nwere mmasị miri emi n’ime ka ndị nile na-efe ya ofufe na-enwe ọganihu ruo ntozu okè ime mmụọ? (b) Gịnị ka ya na ntozu okè ime mmụọ nwere njikọ chiri anya?

6 Jehova Chineke nwere mmasị dị ukwuu n’ime ka ndị nile na-efe ya ofufe na-enwe ọganihu ruo ntozu okè ime mmụọ. Iji mezuo nke ahụ, o mewo ndokwa ndị magburu onwe ha n’ọgbakọ ndị Kraịst. Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst nọ n’Efesọs akwụkwọ, sị: “Ya onwe ya nyekwara ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ozi; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-ezisa ozi ọma; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-azụ atụrụ Chineke na ndị ozizi; ime ka ndị nsọ zuo okè ịrụ ọrụ nke ije ozi, iwuli ahụ nke Kraịst elu dị ka ụlọ: ruo mgbe anyị nile ga-eru ịdị n’otu [n’okwukwe ahụ na n’ezi ihe ọmụma, NW] nke Ọkpara Chineke, ruo ịbụ nwoke tozuru okè, ruo ọ̀tụ̀tụ̀ nke ogologo nke ozuzu nke Kraịst: ka anyị wee ghara ịbụ ụmụ ọhụrụ ọzọ, ndị ifufe nile ọ bụla nke ozizi na-efegharị na-ebugharịkwa, n’ime ịtụ ntụ nke mmadụ, n’ime aghụghọ, nke ha ji ezupụta nduhie.”—Ndị Efesọs 4:11-14.

7 N’amaokwu ndị a, Pọl kọwara na ihe ndị so mee ka Chineke mee ndokwa ndị dị otú ahụ bara ụba n’ọgbakọ bụ ka mmadụ nile wee ‘ruo ịdị n’otu n’okwukwe na n’ezi ihe ọmụma,’ ghọọ “nwoke tozuru okè,” ma nwee ‘ọ̀tụ̀tụ̀ nke ogologo nke Kraịst.’ Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka anyị na-agaghị abụ ndị echiche na ozizi ụgha na-ebugharị dị ka ndị bụ́ ụmụ ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ. Ya mere, anyị hụrụ njikọ chiri anya dị n’etiti inwe ọganihu ruo n’ịbụ onye Kraịst tozuru okè na iru “ịdị n’otu n’okwukwe ahụ na n’ezi ihe ọmụma nke Ọkpara Chineke.” E nwere ọtụtụ isi ihe ndị dị na ndụmọdụ Pọl bụ́ ndị anyị ga-eme nke ọma iburu n’uche.

8. Gịnị ka iru “ịdị n’otu” n’okwukwe ahụ na n’ezi ihe ọmụma chọrọ?

8 Nke mbụ, ebe ọ bụ na a ga-anọgide ‘na-adị n’otu,’ onye Kraịst tozuru okè aghaghị isoro ndị kwere ekwe ibe ya na-adị n’otu, sorokwa ha na-enwe nkwekọrịta zuru ezu mgbe a bịara n’ihe banyere okwukwe na ihe ọmụma. Ọ dịghị akwado echiche nke onwe ya ma ọ bụ na-esi ọnwụ ka e were echiche ya, ma ọ bụkwanụ na-enwe echiche nke ya mgbe a bịara n’ịghọta Bible. Kama nke ahụ, o nwere obi ike zuru ezu n’eziokwu ahụ dị ka Jehova si ekpughe ya site n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, na “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” Site n’irichi nri ime mmụọ ndị a na-enye “n’oge ha” anya—site ná mbipụta ndị Kraịst, nzukọ, na mgbakọ dị iche iche—anyị pụrụ ijide n’aka na anyị na-anọgide na-eso ndị Kraịst ibe anyị ‘adị n’otu’ n’okwukwe na n’ihe ọmụma.—Matiu 24:45.

9. Kọwaa ihe okwu ahụ bụ́ “okwukwe ahụ” pụtara dị ka Pọl si jiri ya mee ihe n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs.

9 Nke abụọ, okwu ahụ bụ́ “okwukwe ahụ,” na-ezo aka, ọ bụghị n’ihe onye Kraịst nke ọ bụla kwenyere, kama na nkwenkwe anyị nile n’ozuzu ya, “obodobo na ogologo na ịdị elu na omimi” ya. (Ndị Efesọs 3:18; 4:5; Ndị Kọlọsi 1:23; 2:7) N’ezie, olee otú onye Kraịst na ndị kwere ekwe ibe ya ga-esi dị n’otu ma ọ bụrụ na ọ bụ akụkụ ụfọdụ nke “okwukwe ahụ” ka o kweere na ya ma ọ bụ nakwere? Nke a pụtara na anyị agaghị enwe afọ ojuju nanị n’ịmara ozizi ndị bụ́ isi nke Bible ma ọ bụ n’inwe nanị ihe ọmụma na-edochaghị anya ma ọ bụ nke dị nta banyere eziokwu ahụ. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị inwe mmasị n’iji ndokwa nile nke Jehova na-eme site ná nzukọ ya na-eme ihe iji gwubamie n’Okwu ya. Anyị aghaghị ịgbalịsi ike inweta ezi ihe ọmụma na nghọta zuru ezu nke uche na nzube Chineke ruo ókè o kwere mee. Nke a na-agụnye iwepụta oge iji gụọ ma mụọ Bible na mbipụta ndị dabeere na Bible, ikpegara Chineke ekpere maka enyemaka na nduzi ya, ịgachi nzukọ ndị Kraịst anya, na ikere òkè zuru ezu n’ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ.—Ilu 2:1-5.

10. Gịnị ka okwu ndị bụ́ “ruo mgbe anyị nile ga-eru,” dị ka e si jiri ya mee ihe ná Ndị Efesọs 4:13, pụtara?

10 Nke atọ, Pọl ji okwu bụ́ “ruo mgbe anyị nile ga-eru” malite ịkọwa ihe mgbaru ọsọ ahụ nwere akụkụ atọ. Banyere okwu ahụ bụ́ “anyị nile,” otu akwụkwọ ntụaka Bible na-ekwu na ọ pụtara “ọ bụghị anyị nile, n’otu otu, ma ọ bụ n’iche n’iche, kama anyị nile n’ozuzu.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị itinye mgbalị dị ukwuu n’isonyere òtù ụmụnna dum na-achụso ihe mgbaru ọsọ nke ịbụ onye Kraịst tozuru okè. Akwụkwọ bụ́ The Interpreter’s Bible na-ekwu, sị: “Mmadụ adịghị eruzu ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ site n’ịnọpụrụ onwe ya iche, dị nnọọ ka otu akụkụ ahụ na-apụghị itozu etozu ọ gwụla ma ahụ nile ọ nọgidere na-eto nke ọma.” Pọl chetaara ndị Kraịst bụ́ ndị Efesọs na ọ bụ ha na “ndị nsọ nile” kwesịrị iso na-agbalị ịghọtazu akụkụ nile nke okwukwe ahụ.—Ndị Efesọs 3:18.

11. (a) Gịnị ka inwe ọganihu ime mmụọ na-apụtaghị? (b) Gịnị ka ọ dị anyị mkpa ime iji na-enwe ọganihu?

11 Site n’okwu Pọl, o doro anya na inwe ọganihu ime mmụọ apụtaghị nanị iji ihe ọmụma na-emeju uche anyị na ịbụ ndị oké mmụta. Ọ bụghị onye na-egosikarị ndị ọzọ na ya ma ihe bụ onye Kraịst tozuru okè. Kama nke ahụ, Bible na-asị: “Okporo ụzọ ndị ezi omume dị ka ìhè na-enwu enwu, nke na-amụ aga n’ihu n’ihu ruo mgbe chi bọchara.” (Ilu 4:18) Ee, ọ bụ “okporo ụzọ” ahụ, ọ bụghị onye ahụ, “na-amụ na-aga n’ihu n’ihu.” Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme mgbalị iji nọgide na-eso nghọta na-asawanye mbara nke Okwu Chineke bụ́ nke Jehova na-enye ndị ya, anyị ga na-enwe ọganihu ime mmụọ. N’ọnọdụ a, ịnọgidesi ike pụtara ịnọ na-aga n’ihu, nke ahụ bụkwa ihe anyị nile pụrụ ime.—Abụ Ọma 97:11; 119:105.

Na-egosipụta “Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ”

12. N’ihi gịnị ka igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ ji dị mkpa n’ọchịchọ anyị na-achọ inwe ọganihu ime mmụọ?

12 Ọ bụ ezie na iru “ịdị n’otu n’okwukwe ahụ na n’ezi ihe ọmụma” dị mkpa, ọ dịkwa mkpa ka anyị na-egosipụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke n’akụkụ nile nke ndụ anyị. N’ihi gịnị? Nke a bụ n’ihi na, dị ka anyị hụworo, ntozu okè abụghị ihe dị n’ime ma ọ bụ ihe zoro ezo, kama e ji àgwà ndị a pụrụ ịhụ nke ọma bụ́ ndị pụrụ ịbara ndị ọzọ uru ma wulie ha elu, amata ya. N’ezie, ọchịchọ anyị na-achọ inwe ọganihu ime mmụọ abụghị nanị ịgbalị iyi ndị nwere àgwà dị mma. Kama nke ahụ, ka anyị na-eto n’ụzọ ime mmụọ, na-agbaso nduzi nke mmụọ Chineke, a ga-enwe mgbanwe dị egwu n’àgwà na n’omume anyị. “Na-ejegharịnụ site na Mmụọ Nsọ, unu agaghị emezukwa agụụ nke anụ ahụ ma ọlị,” ka Pọl onyeozi kwuru.—Ndị Galetia 5:16.

13. Mgbanwe dị aṅaa na-egosipụta ọganihu n’ụzọ doro anya?

13 Pọl gara n’ihu idepụta “ọrụ nile nke anụ ahụ,” bụ́ ndị dị ọtụtụ ma ‘pụta ìhè.’ Tupu mmadụ abịa ghọta ihe Chineke na-achọ, ọ na-ebibu ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụzọ nke ụwa, o nwekwara ike ịdị na-emebu ụfọdụ n’ime omume ndị Pọl kpọtụrụ uche, ndị bụ́: “Ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ ịkwa iko, ikpere arụsị, ịgwọ nsi, ibu iro, esemokwu, ekworo, ọnụma, ịkpa iche iche, nkewa, ịrọ òtù, ịkpọasị, ịṅụbiga mmanya ókè, ite egwú, na ihe yiri ihe ndị a.” (Ndị Galetia 5:19-21) Ma ka onye ahụ na-enwe ọganihu ime mmụọ, ọ na-eji nwayọọ nwayọọ na-ewepụsị “ọrụ nile nke anụ ahụ” a a na-achọghị ma were “mkpụrụ nke mmụọ nsọ” na-edochi ha. Mgbanwe a a na-ahụ anya na-egosi n’ụzọ doro anya na onye ahụ na-enwe ọganihu ruo n’ịbụ onye Kraịst tozuru okè.—Ndị Galetia 5:22.

14. Kọwaa okwu abụọ ahụ bụ́ “ọrụ nile nke anụ ahụ” na “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.”

14 Anyị kwesịrị ịrịba okwu abụọ ahụ bụ́ “ọrụ nile nke anụ ahụ” na “mkpụrụ nke mmụọ nsọ,” ama. “Ọrụ” bụ ihe na-esi n’ihe mmadụ na-eme apụta. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ihe ndị Pọl depụtara dị ka ọrụ nke anụ ahụ bụ ihe si n’ihe mmadụ kpachaara anya mee pụta ma ọ bụkwanụ ihe si n’ihe o mere n’ihi ezughị okè mmadụ pụta. (Ndị Rom 1:24, 28; 7:21-25) N’aka nke ọzọ, okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ nke mmụọ nsọ” na-egosi na àgwà ndị ahụ e depụtara abụghị ndị na-esi ná mgbalị ndị e mere n’ihe a sị na ha bụ ịzụlite àgwà ma ọ bụ ime ka omume ka mma, apụta, kama ha bụ ihe ndị si n’ọrụ mmụọ nsọ Chineke na-arụ n’ime mmadụ apụta. Dị nnọọ ka osisi ga-amị mkpụrụ mgbe e lekọtara ya nke ọma, otú ahụ ka mmadụ ga-esi na-egosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ mgbe mmụọ nsọ na-arụ ọrụ ná ndụ ya n’enweghị ihe mgbochi.—Abụ Ọma 1:1-3.

15. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ilebara akụkụ nile nke “mkpụrụ nke mmụọ nsọ” anya?

15 Isi ihe ọzọ a ga-atụle bụ ojiji Pọl ji okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ” mee ihe iji jikọtachaa àgwà nile a na-achọsi ike bụ́ ndị ọ kpọtụrụ aha. Mmụọ nsọ adịghị amịpụta mkpụrụ dịgasị iche iche ka anyị họrọ nke kasị amasị anyị. Àgwà nile ahụ Pọl depụtara—ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè—dịcha mkpa, ha nile na-emekwa ka o kwe omume ịbụ mmadụ ọhụrụ dị ka onye Kraịst. (Ndị Efesọs 4:24; Ndị Kọlọsi 3:10) N’ihi ya, ọ bụ ezie na anyị pụrụ ịchọpụta na anyị ka egosipụta ụfọdụ n’ime àgwà ndị a ná ndụ anyị n’ihi ụdị mmadụ anyị bụ nakwa n’ihi omume anyị bu pụta ụwa, ọ dị mkpa ka anyị lebara akụkụ nile Pọl kpọtụrụ uche anya. Site n’ime otú ahụ, anyị pụrụ igosipụta àgwà yiri nke Kraịst n’ụzọ zuru ezu karị ná ndụ anyị.—1 Pita 2:12, 21.

16. Gịnị bụ ebumnobi anyị n’ọchịchọ anyị na-achọ ịbụ ndị Kraịst tozuru okè, oleekwa otú anyị pụrụ isi mezuo ya?

16 Ihe dị mkpa anyị pụrụ ịmụta n’okwu Pọl bụ na, n’ịchọsi ike ịbụ onye Kraịst tozuru okè, ebumnobi anyị abụghị inweta ihe ọmụma dị ukwuu na oké mmụta, ọ bụghịkwa ịzụlite àgwà ọma. Ọ bụ ka mmụọ Chineke na-arụ ọrụ ná ndụ anyị n’enweghị ihe mgbochi. Ruo ókè echiche na omume anyị na-ekwekọ ná nduzi nke mmụọ Chineke, ọ bụ ókè ahụ ka anyị ga-etozuru okè n’ụzọ ime mmụọ. Olee otú anyị pụrụ isi mezuo ebumnobi a? Anyị aghaghị ikwe ka mmụọ Chineke na-enwe mmetụta n’obi na n’uche anyị. Nke a na-agụnye anyị ịgachi nzukọ ndị Kraịst anya na ikerechi òkè anya na ha. Anyị kwesịkwara ịdị na-amụchi Okwu Chineke anya ma na-atụgharị uche na ya mgbe nile, na-ekwe ka ụkpụrụ ya na-eduzi anyị ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ nakwa ná nhọrọ na mkpebi ndị anyị na-eme. Mgbe ahụ, ọganihu anyị ga-apụta ìhè nke ọma n’ezie.

Na-enwe Ọganihu Ka E Wee Nye Chineke Otuto

17. Olee otú inwe ọganihu na inye Nna anyị nke eluigwe otuto si nwee njikọ?

17 N’ikpeazụ, anyị ime ka ọganihu anyị pụta ìhè abụghị anyị ka ọ na-ewetara otuto na nsọpụrụ, kama ọ bụ Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, bụ́ onye na-eme ka o kwe anyị omume itozu okè n’ụzọ ime mmụọ. N’abalị ahụ tupu e gbuo Jisọs, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “N’ime nke a ka a na-enye Nna m otuto, ka unu na-amị mkpụrụ hie nne; unu ga-abụkwa ndị na-eso ụzọ m.” (Jọn 15:8) Ma site ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ ma site ná mkpụrụ Alaeze nke ozi ha na-amịpụta, ndị ahụ na-eso ụzọ na-ewetara Jehova otuto.—Ọrụ 11:4, 18; 13:48.

18. (a) Owuwe ihe ubi dị aṅaa na-enye ọṅụ na-ewere ọnọdụ taa? (b) Ihe ịma aka dị aṅaa ka owuwe ihe ubi a na-eweta?

18 Taa, ngọzi Jehova na-adịkwasị ndị ya ka ha na-ekere òkè n’ọrụ owuwe ihe ubi ime mmụọ zuru ụwa ọnụ. Ruo ọtụtụ afọ ugbu a, ihe dị ka ndị ọhụrụ 300,000 ararawo onwe ha nye Jehova kwa afọ ma gosipụta nraranye ha site na baptism ime mmiri. Nke a na-enye anyị obi ụtọ, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ọ na-eme ka obi Jehova ṅụrịa. (Ilu 27:11) Otú ọ dị, ka nke a wee nọgide bụrụ ihe na-ewetara Jehova ọṅụ na otuto, ọ dị ndị ọhụrụ dị otú ahụ mkpa ịdị ‘na-ejegharị n’ime Kraịst, bụrụ ndị gbagideworo mkpọrọgwụ n’ime Ya, ndị a na-ewulikwa elu dị ka ụlọ n’ime Ya, ndị a na-ewerekwa okwukwe ha mee ka ha guzosie ike.’ (Ndị Kọlọsi 2:6, 7) Nke a na-eche ihe ịma aka nwere akụkụ abụọ n’ihu ndị Chineke. N’otu akụkụ, ọ bụrụ na ị bụ onye e mere baptism ọhụrụ, ị̀ ga-anakwere ihe ịma aka nke ịdị na-agbalịsi ike ka “ịga n’ihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ nile nọ”? N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ị nọwo n’eziokwu ahụ ruo oge ụfọdụ, ị̀ ga-anakwere ihe ịma aka nke iburu ibu ọrụ nke ịhụ maka ọdịmma ime mmụọ nke ndị ọhụrụ? N’ọnọdụ nke ọ bụla, o doro anya na ọ dị mkpa ịnọgide na-aga n’ihu ruo ntozu okè.—Ndị Filipaị 3:16; Ndị Hibru 6:1.

19. Ihe ùgwù na ngọzi ndị dị aṅaa pụrụ ịbụ nke gị ma ọ bụrụ na ị na-eme ka ọganihu gị pụta ìhè?

19 Ngọzi ndị dị ebube na-echere ndị nile na-arụsi ọrụ ike iji na-eme ka ọganihu ha pụta ìhè. Cheta okwu na-agba ume Pọl kwuru mgbe ọ dụsịrị Timoti ọdụ ka ọ na-enwe ọganihu, ọ sịrị: “Rịba onwe gị na ozizi gị ama. Na-anọgide n’ihe ndị a; n’ihi na n’ime nke a ị ga-azọpụta onwe gị zọpụtakwa ndị na-anụ olu gị.” (1 Timoti 4:16) Site n’iji ịdị uchu na-eme ka ọganihu gị pụta ìhè, gị onwe gị pụkwara ikere òkè n’ihe ùgwù nke ito aha Chineke na inweta ngọzi ya.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka a pụrụ isi na-eme ka ntozu okè ime mmụọ pụta ìhè?

• Ihe ọmụma na nghọta dị aṅaa na-egosipụta ntozu okè?

• Olee otú igosipụta “mkpụrụ nke mmụọ nsọ” si egosi inwe ọganihu ime mmụọ?

• Ihe ịma aka dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịnakwere ka anyị na-aga n’ihu iru ntozu okè?

[Foto dị na peeji nke 13]

A na-amata ihe chara acha, ma ọ bụ onye tozuru okè, nke ọma

[Foto dị na peeji nke 15]

Anyị na-enwe ọganihu ime mmụọ site n’ịnọgide na-eso eziokwu e kpughere ekpughe

[Foto dị na peeji nke 17]

Ekpere na-enyere anyị aka ịdị na-egosipụta “mkpụrụ nke mmụọ nsọ”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya