Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 9/1 p. 25-29
  • Nkwurịta Okwu n’Ije Ozi Ndị Kraịst

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkwurịta Okwu n’Ije Ozi Ndị Kraịst
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nkwurịta Okwu n’Ekwughị Okwu Ọnụ
  • Ịtụgharị Uche Dị Mkpa n’Inwe Nkwurịta Okwu
  • Àgwà Ndị A Chọrọ Maka Nkwurịta Okwu Dị Ìrè
  • Ịhụnanya—Ihe Enyemaka n’Inwe Nkwurịta Okwu
  • Nkwurịta Okwu n’Ime Ezinụlọ na n’Ime Ọgbakọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Jehova na Kraịst Ndị Na-enweghị Atụ ná Nkwurịta Okwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Bụrụ Onye Na-ekwurịta Okwu!
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Gị na Chineke Ùnu Na-ekwurịta Okwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 9/1 p. 25-29

Nkwurịta Okwu n’Ije Ozi Ndị Kraịst

“Ya mere, gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—MATIU 28:19, “New World Translation of the Holy Scriptures.”

1. Ọrụ dị aṅaa nke Jisọs nyere na-egosi mkpa ọ dị inwe nkwurịta okwu?

ỌRỤ Jisọs nyere, nke e hotara n’elu, na-eche n’ihu anyị, ihe ịma aka nke isoro ndị mmadụ kwurịta okwu n’ozi anyị mgbe anyị na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-aga nletaghachi, ma na-ekere òkè n’akụkụ ndị ọzọ nke nkwusa Alaeze ahụ. Ihe ọzọ a gụnyekwara n’ọrụ ahụ bụ ibu ọrụ nke ime ka a mara eziokwu banyere Jehova Chineke, Jisọs Kraịst, na Alaeze Mesaịa ahụ nke Jisọs na-achị achị na ya ugbu a.—Matiu 25:31-33.

2. Iji dị ìrè n’inwe nkwurịta okwu, gịnị dị anyị mkpa?

2 Olee otú anyị pụrụ isi na-enwe nkwurịta okwu n’ụzọ dị ìrè? Nke mbụ, anyị aghaghị ikwere n’ozi anyị na-agwa ndị ọzọ. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, anyị aghaghị inwe okwukwe siri ike na Jehova bụ nanị otu ezi Chineke dịnụ, na Bible bụ n’ezie, Okwu Chineke, nakwa na Alaeze Chineke bụ nanị olileanya dịnụ maka ihe a kpọrọ mmadụ. N’ụzọ dị otú ahụ, ihe anyị na-akụzi ga-abụ ihe sitere n’obi anyị, anyị ga na-agbasokwa ndụmọdụ Pọl nyere Timoti, sị: “Na-anụ ọkụ n’obi iche onwe gị n’ihu mmadụ dị ka onye Chineke nwapụtaworo, onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime ya, onye na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahu.”—2 Timoti 2:15.

Nkwurịta Okwu n’Ekwughị Okwu Ọnụ

3-5. (a) Olee otú anyị pụrụ isi nwee nkwurịta okwu n’ekwughị okwu ọ bụla? (b) Ahụmahụ ndị dị aṅaa na-egosipụta nke a?

3 Mgbe mgbe nkwurịta okwu na-agụnyekarị ikwupụta okwu. Ma, n’ezie, anyị na-agwa ndị mmadụ okwu ọbụna tupu anyị ekwuo okwu. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ụdịdị anyị na ụzọ anyị si eji ejiji ma na-edozi onwe anyị. Ọtụtụ afọ gara aga, otu onye ozi ala ọzọ gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead sooro otu ụgbọ mmiri na-eme njem na-aga ebe o ketara ozi ala ọzọ. Mgbe ụbọchị ole na ole nke ha ịnọ n’ime mmiri gasịrị, otu onye ọ na-amaghị jụrụ ya ihe mere o ji dị iche nke ukwuu n’ebe ndị ọzọ nọ n’ime ụgbọ ahụ nọ. Onye ozi ala ọzọ ahụ na-ezipụ ozi dị ịrịba ama—na ya nwere ụkpụrụ ndị dị iche ma kwesị ka a bịakwute ya—nanị n’ihi ejiji na omume ya. Nke a mere ka onye ozi ala ọzọ ahụ nwee ezi ohere iji gbaa àmà.

4 Ọzọkwa, otu nwanna nwanyị onye guzo n’akụkụ okporo ámá na-enye ndị mmadụ na-agafe agafe akwụkwọ ọgụgụ ndị e ji amụ Bible gosiri otu nwanyị bịara ya nso ihu ọchị nke onye bụ enyi. Nwanyị a malitere ịgbada n’ebe a na-abanye ụgbọ okporo ígwè. Mgbe ahụ ọ gbanwere obi ya, gaghachi azụ n’ebe nwanna nwanyị ahụ nọ, ma rịọ ka e duziere ya ọmụmụ Bible ebe obibi. Gịnị kpaliri mmasị ya? Ọ bụ ezie na e nyeghị ya akwụkwọ ọgụgụ e ji amụ Bible, ma Onyeàmà ahụ na-eje ozi n’okporo ámá gosiri ya ihu ọchị nke onye bụ enyi.

5 Ihe atụ nke atọ bụ: Otu ìgwè nke Ndịàmà ka na-eto eto riri nri n’otu ụlọ oriri na ọṅụṅụ, ọ bụkwaara ha ihe ịtụnanya mgbe otu onye ha na-amaghị bịakwutere ha na table ha nọ ma kwụọ ụgwọ nri ha nile riri. N’ihi gịnị ka o ji mee nke ahụ? Omume ha kpaliri mmasị ya. N’ekwughị okwu ọ bụla gwa onye ahụ ha na-amaghị, ndị Kraịst ndị a na-eto eto ezipụwo ozi na ha bụ ndị na-atụ egwu Chineke. N’ụzọ doro anya, site n’ụdịdị anyị, otú e si ahụ anyị anya, na ụdịdị enyi, anyị na-ezipụ ozi ọbụna tupu anyị ekwuo okwu.—Tụlee 1 Pita 3:1, 2.

Ịtụgharị Uche Dị Mkpa n’Inwe Nkwurịta Okwu

6. Nye ihe atụ otú ịtụgharịta uche si baa uru n’inwe nkwurịta okwu.

6 Iji jiri ọnụ kwupụta okwu gwa ndị mmadụ banyere ozi ọma ahụ, anyị aghaghị ịdị njikere, ọ bụghị ikwu okwu iji manye ha ikwenye n’ihe anyị kwere, kama isoro ha tụgharịa uche. Anyị na-agụ mgbe mgbe na Pọl sooro ndị ahụ ọ gbalịrị izi ozi ọma tụgharịa uche. (Ọrụ 17:2, 17; 18:19) Olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya ya? Ọnọdụ ụwa ndị na-adịwanye njọ pụrụ ime ka ụfọdụ rụọ ụka banyere ịdị adị nke Chineke onye pụrụ ime ihe nile ma na-ahụ n’anya onye na-elekọta agbụrụ mmadụ. Ma anyị pụrụ isoro ha tụgharịkọọ uche na Chineke nwere oge maka ihe ọ bụla. (Eklisiastis 3:1-8) Otú a, Ndị Galetia 4:4 na-asị na mgbe oge Chineke ruru, o zitere Ọkpara ya n’ụwa. Nke a bụ ọtụtụ puku afọ mgbe o kwesịrị nkwa ime nke a. N’ụzọ yiri nke ahụ, mgbe oge ya rukwara, ọ ga-eweta ịta ahụhụ na ajọ omume ná njedebe. Ọzọkwa, Okwu Chineke na-egosi na Chineke nwere ezi ihe ndị mere o ji kwere ka ajọ omume nọgide ruo ogologo oge otú a. (Tụlee Ọpụpụ 9:16.) Ịtụgharị uche n’akụkụ ndị dị otú a, na iji ihe atụ na ihe àmà siri ike ndị sitere n’Akwụkwọ nsọ kwadoo echiche dị otú ahụ ga-enyere ndị nwere obi eziokwu aka ịmata na ịba ụba nke mmebi iwu apụghị ịbụ ihe a pụrụ iji gosi na Jehova adịghị adị ma ọ bụ na ọ chọghị ịma.—Ndị Rom 9:14-18.

7, 8. Olee otú ịtụgharịta uche pụrụ isi nyere anyị aka ikwunyere onye okpukpe Orthodox nke ndị Juu okwu?

7 Ka e were ya na mgbe ị na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, onye nwe ụlọ asị gị: “Abụ m onye Juu. Enweghị m mmasị.” Olee otú ị pụrụ isi gaa n’ihu? Otu nwanna nwoke kọrọ na ya nwere ihe ịga nke ọma n’iche ya ihu n’ụzọ dị otú a: ‘Eji m n’aka na ị ga-ekwenyere m na Mosis so n’otu n’ime ndị amụma kachasị Chineke jiworo mee ihe. Ị̀ makwaara na o kwuru dị ka e dekọrọ ya na Deuterọnọmi 31:29, sị: “Amawo m na mgbe ọnwụ m gasịrị unu . . . [ga-ewezụga] onwe unu n’ụzọ ahụ nke m nyeworo unu n’iwu; ihe ọjọọ ga-adakwasịkwa unu na mgbe ikpeazụ nke ụbọchị ndị a”? Mosis bụ ezi onye amụma, ya mere okwu ndị o kwuru mezuru. Ọ̀ pụrụ ịbụ na ha mezuru mgbe Chineke ziteere ndị Juu Mesaịa ahụ, na ọ bụkwa ya mere ndị Juu na-ejighị nabata ya? Nke ahụ pụrụ ịbụworị ihe mere. Ugbu a, ọ bụrụ na ọ bụ ezie na ha emewo ihe na-ezighị ezi, nke ahụ ọ̀ bụ ihe mere mụ na gị ga-eji mee otu ihe ahụ na-ezighị ezi?’

8 Chetakwa na ndị Juu ahụjuwo anya nke ukwuu n’aka Krisendọm, karịsịa na narị afọ nke a. Ya mere ọ pụrụ ịmasị gị ịgwa onye nwe ụlọ na anyị ekereghị òkè ọ bụla na nke ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịmasị gị ikwu, sị: ‘Ị̀ maara na mgbe Hitler nọ n’ọkwá, Ndịàmà Jehova guzogidere ọjụjụ ọ jụrụ mmekọrịta ndị Juu? Ha jụkwara “Ito Hitler” na ije ozi n’òtù agha ya.’a

9, 10. Olee otú a pụrụ isi jiri ịtụgharịta uche nyere onye kwere n’ọkụ ala mmụọ aka?

9 Iji gbalịa ikwunyere onye kwere n’ọkụ ala mmụọ okwu, ị pụrụ ikwu na ọ bụrụ na mmadụ ga-ata ahụhụ mgbe ebighị ebi n’ime hell, ọ ghaghị ịbụ na o nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. Onye kwere n’ọkụ ala mmụọ ga-ekwenye ozugbo. Mgbe ahụ ị pụrụ ikwu banyere ihe ndekọ nke okike Adam na Iv ma jiri obi ọma jụọ ma ọ dị otú o si chọpụta n’ihe ndekọ ahụ ebe ọ bụla e kwuru banyere mkpụrụ obi dị otú a nke na-adịghị anwụ anwụ. N’ịga n’ihu ná ntụgharị uche gị, ị pụrụ ịdọrọ uche ya mgbe ahụ gaa na Jenesis 2:7, ebe Bible na-agwa anyị na Adam ghọrọ mkpụrụ obi. Mgbe Adam mehiere a mara ya ikpe ọnwụ. Ọ bụkwa ihe dị ịrịba ama bụ́ ihe Chineke kwuru na mmehie Adam ga-akpata: “N’ọsụsọ ihu gị ka ị ga-eri nri, ruo mgbe ị ga-alata n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.” (Jenesis 3:19) N’ihi nke a, Adam, bụ́ mkpụrụ obi laghachiri n’ájá.

10 Ị pụkwara ịdọrọ uche gaa n’eziokwu ahụ bụ na ọ dịghị ebe ọ bụla n’ihe ndekọ Jenesis Chineke kwuru okwu banyere ịta ahụhụ ebighị ebi n’ọkụ ala mmụọ. Mgbe Chineke dọrọ Adam aka ná ntị ka ọ ghara iri mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu, o kwuru, sị: “N’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:17) Ọ dịghị ebe ọ bụla a kpọtụrụ ọkụ ala mmụọ aha! Ọ bụrụ na ihe ga-esi ná mmehie Adam pụta agaghị abụ ọnwụ, ‘ịlata n’ájá’ n’ezie, kama ahụhụ ebighị ebi, n’ihi ikpe ziri ezi, ọ̀ bụ na Chineke ekwesịghị ịkọwaworị nke a n’ụzọ doro anya? N’ihi nke a, iji nlezi anya na obi ọma nwee ntụgharị uche pụrụ inyere onye nwere obi eziokwu aka ịhụ enweghị nkwekọ ndị dị na nkwenkwe ya. Ka anyị ghara ilefuru anya mgbe ọ bụla, uru nke iji ntụgharị uche mee ihe ka anyị na-esoro ndị ọzọ na-ekerịta eziokwu nke Okwu Chineke.—Tụlee 2 Timoti 2:24-26; 1 Jọn 4:8, 16.

Àgwà Ndị A Chọrọ Maka Nkwurịta Okwu Dị Ìrè

11-13. Àgwà ndị dị aṅaa nke ndị Kraịst pụrụ inyere anyị aka inwe nkwurịta okwu n’ụzọ dị ìrè?

11 Ugbu a, olee àgwà ndị dị anyị mkpa ịzụlite iji kwuo eziokwu Alaeze ahụ n’ụzọ kasị dị ìrè? Gịnị ka ka ihe nlereanya Jisọs na-agwa anyị? Na Matiu 11:28-30, anyị na-agụ okwu ya, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” N’ebe ahụ anyị na-ahụ otu n’ime ihe ndị bụ isi Jisọs ji nwee ihe ịga nke ọma n’ikwurịta okwu. Ọ dị umeala n’obi ma bụrụ onye wedara onwe ya ala n’obi. Ndị nwere ezi obi hụrụ ya dị ka onye na-enye ezumike. Pọl onyeozi guzobekwara ezi ihe nlereanya, n’ihi na dị ka ọ gwara ndị okenye si Efesọs, site n’ụbọchị mbụ ọ bịakwutere ha, ọ nọ na-abụrụ Onyenwe anyị ohu “n’obi dị umeala nile.”—Ọrụ 20:19.

12 Site na anyị igosipụta mgbe nile na anyị matara otú ikike anyị hà n’ezie nakwa ịdị umeala n’obi, ndị ọzọ ga-ahụkwa na anyị bụ ndị na-enye ezumike, ọ ga-adịkwara anyị mfe karị isoro ha kwurịta okwu. Omume ọzọ ọ bụla yiri ka ọ ga-eweta ihe mgbochi n’etiti anyị na ndị ahụ anyị na-agbalị isoro nwee nkwurịta okwu. N’ezie, “n’ebe ndị dị umeala n’obi nọ ka amamihe dị.”—Ilu 11:2.

13 Iji wee nyefee ihe ọmụma n’ụzọ dị ìrè, ọ dịkwa anyị mkpa inwe ndidi ma dị akọ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Pọl onyeozi ji akọ mee ihe mgbe ọ gbaara ndị ọkà ihe ọmụma zukọrọ n’ihu ya n’Ugwu Mars àmà. O chere ozi ọma ahụ n’ihu ha n’ụzọ ha pụrụ ịghọta. (Ọrụ 17:18, 22-31) Ọ bụrụ na anyị achọọ inwe ihe ịga nke ọma n’isoro ndị na-ege anyị ntị kwurịta okwu, anyị aghaghị ịgbaso ndụmọdụ ahụ Pọl onyeozi nyere ndị Kọlọsi mgbe ọ sịrị: “Ka mkparịta ụka unu dị n’amara mgbe nile, ọ bụghịkwa nke na-adịghị akpali mmasị; mụọnụ ụzọ kasị mma iji soro onye ọ bụla unu zutere kwurịta okwu.” (Ndị Kọlọsi 4:6, The New English Bible) Okwu anyị kwesịrị ịdị ụtọ mgbe nile. Okwu dị otú ahụ ga-emepe uche nke ndị na-ege anyị ntị, ebe okwu ndị ezi ikpe na-adịghị na ha ga-eme ka ha ghara ịnabata ihe anyị na-ekwu.

14. Olee otú iji ahụ iru ala na mkparịta ụka bịakwute ndị mmadụ pụrụ isi nyere anyị aka isoro ndị ọzọ kwurịta okwu?

14 Anyị chọrọ ịdị ka ndị ahụ ruru ala mgbe nile. Nke a na-enyere ndị na-ege anyị ntị aka ịtụsara ahụ. Ịbụ onye ahụ ruru ala pụtara enweghị oké ọchịchọ nke ikwu okwu nile nanị gị. Kama nke ahụ, site n’iji omume dị nwayọọ na ajụjụ enyi, anyị na-enye ndị na-ege anyị ntị ohere ikwupụta ihe ha bu n’obi. Karịsịa mgbe anyị na-agba àmà mberede, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịgba onye nke ọzọ ume ka o kwuo okwu. Dị ka ihe atụ, otu ụbọchị, otu Onyeàmà nọdụrụ n’oche n’akụkụ onye ụkọchukwu Roman Katọlik n’ụgbọ elu. Ruo ihe karịrị otu hour, Onyeàmà ahụ nọgidere jiri akọ na-ajụ onye ụkọchukwu ahụ ajụjụ, onye ụkọchukwu ahụ, ka ọ na-azakwa ajụjụ keere òkè kasị ukwuu n’ikwu okwu. Ma tupu oge onye ọ bụla ji jewara nke ya, onye ụkọchukwu ahụ anarawo ọtụtụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Ụdị dị otú a nke iji ndidi mee ihe na-enyere anyị aka igosipụta àgwà ọzọ dị mkpa, ya bụ, ichebara ndị ọzọ echiche.

15, 16. Olee otú ichebara ndị ọzọ echiche pụrụ isi nyere anyị aka inwe nkwurịta okwu?

15 Ichebara ndị ọzọ echiche pụtara itinye onwe anyị n’ọnọdụ ndị ọzọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Pọl onyeozi ghọtara n’ụzọ zuru ezu mkpa ọ dị ichebara ndị ọzọ echiche dị ka a pụrụ ịhụ site n’ihe o degaara ndị Kọrint: “Ọ bụ ezie na enweere m onwe m n’ebe mmadụ nile nọ, ma emere m onwe m ka m bụrụ ohu mmadụ nile, ka m wee rite ọtụtụ mmadụ n’uru karị. N’ebe ndị Juu nọ m wee dị ka onye Juu, ka m wee rite ndị Juu n’uru; n’ebe ndị nọ n’okpuru iwu dị m wee dị ka onye nọ n’okpuru iwu, ọ bụghị na mụ onwe m nọ n’okpuru iwu, ka m wee rite ndị nọ n’okpuru iwu n’uru; n’ebe ndị na-enweghị iwu nọ m wee dị ka onye na-enweghị iwu, ọ bụghị na enweghị m iwu n’ebe Chineke nọ, kama anọ m n’okpuru iwu n’ebe Kraịst nọ, ka m wee rite ndị na-enweghị iwu n’uru. N’ebe ndị na-adịghị ike nọ m ghọrọ onye na-adịghị ike, ka m wee rite ndị na-adịghị ike n’uru: aghọwo m ihe nile n’ebe mmadụ nile nọ, ka m wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ.”—1 Ndị Kọrint 9:19-22.

16 Iji ṅomie Pọl onyeozi n’akụkụ nke a, ọ dị anyị mkpa ịdị akọ, inwe nghọta ịhụta ihe na-aganụ. Ichebara ndị ọzọ echiche ga-enyere anyị aka ịgwa ndị na-ege anyị ntị okwu eziokwu ahụ dị ka ụzọ ha si eche echiche na mmetụta ha si dị. Akwụkwọ ahụ bụ Reasoning From the Scriptures na-enye enyemaka dị ukwuu n’akụkụ nke a. Nwee ya mgbe nile n’ozi ubi.

Ịhụnanya—Ihe Enyemaka n’Inwe Nkwurịta Okwu

17. N’àgwà nile nke ndị Kraịst, olee nke kachasị baa uru n’ikwu okwu eziokwu ahụ n’ụzọ dị ìrè, oleekwa otú e si gosi nke a?

17 Mmadụ ịmara otú ọ hà n’ezie, ịdị umeala n’obi, ndidi, na ichebara ndị ọzọ echiche dị mkpa iji nwee nkwurịta okwu dị ìrè n’inyefe ihe ọmụma. Ma karịsịa, ịhụnanya na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị ga-enyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma n’irute obi ndị ọzọ. Jisọs nwere ọmịiko n’ebe ndị mmadụ nọ n’ihi na “a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” Ọ bụ ịhụnanya kpaliri Jisọs ikwu, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.” (Matiu 9:36; 11:28) Ọ bụ n’ihi na anyị hụrụ ha n’anya mekwara anyị onwe anyị ji achọ ime ka ndị mmadụ zuru ike ma nyere ha aka ịgafeta n’ụzọ nke ndụ ahụ. Ozi anyị bụ nke ịhụnanya, ya mere ka anyị nọgide na-ekwu ya n’ụzọ ịhụnanya. Ịhụnanya nke a na-egosipụta onwe ya site n’ihu ọchị nke enyi, site n’obi ọma na inwe ụdịdị kwesịrị nsọpụrụ, site n’inwe ihu ọchị na mmetụta na-ekpo ọkụ.

18. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Pọl, dị ka o ṅomiri Onyenwe anyị?

18 N’akụkụ nke a, Pọl onyeozi bụ ezi onye na-eṅomi Onyenwe ya, bụ́ Jisọs Kraịst. N’ihi gịnị ka o ji nwee ihe ịga nke ọma n’iguzobe ọgbakọ dị iche iche? Ọ̀ bụ n’ihi ịnụ ọkụ n’obi ya? Ee. Kama ọ bụkwa n’ihi ịhụnanya o gosipụtara. Rịba ama okwu ya ndị na-egosi mmetụta ịhụnanya bụ́ nke ọ gwara ọgbakọ ọhụrụ ahụ dị na Tesalonaịka, sị: “Anyị ghọrọ ndị dị nwayọọ n’etiti unu, dị ka mgbe nwanyị nke na-azụ nwa na-elezi ụmụ nke aka ya anya nke ọma: otú a, ebe unu dị anyị n’obi nke ukwuu, ọ dịrị anyị ezi mma ime ka unu keta, ọ bụghị nanị ozi ọma nke Chineke, kama ọ bụkwa mkpụrụ obi nke aka anyị, n’ihi na e mere ka unu bụrụ ndị anyị hụrụ n’anya.” Iṅomi Pọl ga-enyere anyị aka ná mgbalị anyị ikwurịta okwu.—1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8.

19. N’ihi gịnị ka anyị na-ejighị kwesị ikwere ka enweghị mmasị nke e nwere n’ókèala anyị mee ka anyị daa mbà ná mmụọ?

19 Ọ bụrụ na anyị emewo ihe nile anyị pụrụ ime iji nwee nkwurịta okwu ma ọ dịghị ezi ihe si na ya pụta dị ka ọchịchọ anyị si dị, ànyị kwesịrị ịda mbà ná mmụọ? Ọ dịghị ma ọlị. Ndị Mmụta Bible (dị ka a na-akpọbu Ndịàmà Jehova) na-ekwubu na iji nabata eziokwu ahụ, ọ dị ndị mmadụ mkpa inwe àgwà atọ ahụ. Ọ dị ha mkpa ime ihe n’eziokwu, ịdị umeala n’obi, na inwe agụụ ime mmụọ. Anyị apụghị ile anya ka ndị mmadụ na-enweghị ezi obi, ndị na-adịghị eme ihe n’eziokwu, zaghachi n’ụzọ dị mma nye eziokwu ahụ; anyị agaghịkwa ele anya ka ndị fụliri onwe ha elu ma ọ bụ ndị dị mpako gee ntị n’ozi ọma ahụ. Ọzọ, ọ bụrụgodi na mmadụ nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke obi eziokwu na ịdị umeala n’obi, o yikarịghị ka ọ ga-anabata eziokwu ahụ ma ọ bụrụ na agụụ ime mmụọ adịghị agụ ya.

20. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo mgbe nile na mgbalị anyị abụghị na nkịtị?

20 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ ndị ị ga-ezute n’ókèala unu agaghị enwe otu ma ọ bụ karịa n’ime àgwà atọ ndị a. Onye amụma bụ Jeremaịa nwere otu ụdị ahụmahụ ahụ. (Jeremaịa 1:17-19; tụlee Matiu 5:3.) Ma, mgbalị anyị abụghị n’efu ma ọlị. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị na-akpọsa aha na Alaeze Jehova. Site n’ime nkwusa na site n’ọnụnọ anyị nọ n’ebe ahụ, anyị na-adọ ndị mmebi iwu aka ná ntị. (Ezikiel 33:33) Echefukwala na site ná mgbalị anyị iji gwa ndị ọzọ eziokwu ahụ, anyị onwe anyị na-erite uru. (1 Timoti 4:16) Anyị na-eme ka okwukwe anyị sie ike, meekwa ka olileanya Alaeze anyị na-egbuke egbuke. Ọzọkwa, anyị na-ejigide nguzosi ike anyị n’ezi ihe ma si otú a na-ekere òkè n’ime ka aha Jehova Chineke dị nsọ, na-eme ka obi ya ṅụrịa.—Ilu 27:11.

21. Gịnị ka a pụrụ ikwu ná nchịkọta?

21 Iji chịkọta ihe nile: Nkwurịta okwu bụ ụzọ dị ìrè isi nyefee ihe ọmụma. Nkà nke inwe nkwurịta okwu dị oké mkpa, ọ na-emebikwa ihe dị ukwuu mgbe e nwere ndakpọ ná nkwurịta okwu. Anyị ahụwo na Jehova Chineke na Jisọs Kraịst bụ ndị na-enweghị atụ n’inwe nkwurịta okwu, nakwa na Jisọs Kraịst guzobere ụzọ nke a ga-esi nwee nkwurịta okwu n’oge anyị. Anyị arịbawokwa ama na site n’ụzọ anyị si eji ejiji nakwa ụzọ anyị si eme omume, anyị na-ekwu okwu, na-ezipụrụ ndị ọzọ ozi. Anyị amụtawo na ịtụgharịta uche na-arụ ọrụ dị mkpa ná mgbalị anyị ịgwa ndị ọzọ okwu, nakwa ka anyị wee nwee nkwurịta okwu n’ụzọ dị ìrè, ọ dị anyị mkpa ịmara otú ikike anyị hà n’ezie na ịdị umeala n’obi, igosipụta àgwà nke ichebara ndị ọzọ echiche, inwe ndidi, na, karịsịa, bụrụ ndị a kpaliri site n’obi nke jupụtara n’ịhụnanya. Ọ bụrụ na anyị azụlite àgwà ndị a ma gbasoo ihe nlereanya Bible, anyị ga-abụ ndị nwere ihe ịga nke ọma dị ka ndị Kraịst na-enwe nkwurịta okwu.—Ndị Rom 12:8-11.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a  Maka inwetakwu aro banyere ụzọ a pụrụ isi kwunyere ndị Juu kwere ekwe na ndị ọzọ okwu, lee Reasoning From the Scriptures, peji 21-24.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ N’ụzọ dị aṅaa ka nkwurịta okwu si amalite tupu e kwupụta okwu?

◻ Gịnị bụ ihe atụ ụfọdụ nke inwe nkwurịta okwu site n’ịtụgharịta uche n’ụzọ dị ìrè?

◻ Àgwà ndị dị aṅaa nyeere Jisọs Kraịst na Pọl aka inwe nkwurịta okwu n’ụzọ dị ìrè?

◻ N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị dị mkpa anyị ịda mbà ná mmụọ ma ọ bụrụ na nzaghachi a na-enwe dị nta?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya