-
Imezu Amụma AịzayaJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Ọ bụ amụma a: “Lee! Ohu m nke m họọrọ, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị mkpụrụ obi m! M ga-eme ka mmụọ m dịkwasị ya, ọ ga-eme ka ihe bụ́ ikpe ziri ezi doo mba niile anya. Ọ gaghị ese okwu, ọ gaghịkwa etisi mkpu ike, ọ dịghịkwa onye ga-anụ olu ya n’okporo ámá. Ọ dịghị ahịhịa amị e chihịara echihịa ọ ga-egwepịa, ọ dịghịkwa owu oriọna na-achọ ịnyụ anyụ ọ ga-emenyụ, ruo mgbe ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi nwee mmeri. N’ezie, n’aha ya ka mba niile ga-enwe olileanya.”—Matiu 12:18-21; Aịzaya 42:1-4.
-
-
Imezu Amụma AịzayaJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Gịnị ka okwu ahụ bụ́ na “ọ gaghị ese okwu, ọ gaghịkwa etisi mkpu ike, ọ dịghịkwa onye ga-anụ olu ya n’okporo ámá” pụtara? Mgbe Jizọs gwọrọ ndị mmadụ, ọ naghị ekwe ka ha ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ mee “ka a mata ya.” (Mak 3:12) Ọ chọghị ka a na-akọ gbasara ya ka ebe a na-akpọsa ngwá ahịa, ọ chọghịkwa ka ndị mmadụ na-etinye ihe merenụ nnu na ose ma ha na-akọrọ ya ndị ọzọ.
-