Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
mwb17 Disemba p. 5
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ihe Ọhụrụ Ga Na-adịzi n’Ọmụmụ Ihe Etiti Izu Anyị
Malite n’ọnwa Jenụwarị afọ 2018, n’ọmụmụ ihe etiti izu anyị, a ga-enwe ihe ụfọdụ si ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ Bekee nke a na-amụ amụ (nwtsty), anyị ga-eji na-amụ ihe. Ihe ndị ahụ ga-abụ foto, vidio na ihe ndị ọzọ e ji kọwaa amaokwu Baịbụl ụfọdụ. Ọ bụrụgodị na ọ dịbeghị n’asụsụ unu, o doro anya na ihe ndị ahụ ga-abara unu ezigbo uru mgbe unu na-akwadebe ọmụmụ ihe. Anyị nwere olileanya na ihe ọhụrụ a ga-enye aka mee ka unu bịarukwuo nna anyị na-ahụ n’anya bụ́ Jehova nso.