Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 41 p. 102-p. 103 para. 5
  • Ikike Ònye Ka Jizọs Ji Na-arụ Ọrụ Ebube?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikike Ònye Ka Jizọs Ji Na-arụ Ọrụ Ebube?
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Na-akpatakarị Ihe Ise Okwu
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Jizọs Ekwuo Ihe Ga-eme Ka Mmadụ Nwee Obi Ụtọ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ọ Rụrụ Ọrụ Ebube, ma A Jụrụ Ya ma na Nazaret
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • “Ọ Dịbeghị Mgbe Mmadụ Ọzọ Kwuru Okwu Otú A”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 41 p. 102-p. 103 para. 5
Mgbe ìgwè mmadụ gbakọtara n’ụlọ ebe Jizọs nọ

ISI NKE 41

Ikike Ònye Ka Jizọs Ji Na-arụ Ọrụ Ebube?

MATIU 12:22-32 MAK 3:19-30 LUK 8:1-3

  • JIZỌS AMALITE IKWUSA OZI ỌMA NKE UGBORO ABỤỌ NA GALILI

  • JIZỌS ACHỤPỤ NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ MA DỌỌ AKA NÁ NTỊ BANYERE MMADỤ IME MMEHIE NA-ENWEGHỊ MGBAGHARA

Obere oge Jizọs kwuchara banyere mgbaghara mmehie n’ụlọ onye Farisii aha ya bụ Saịmọn, ọ malitere ịgagharị na Galili ọzọ na-ekwusa ozi ọma. Ihe a bụ afọ nke abụọ o kwusawara ozi ọma. Ọ bụghịkwa naanị ya so na-aga ekwusa ozi ọma a. Ndịozi iri na abụọ ya so ya. Ụfọdụ ụmụ nwaanyị ọ ‘chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ n’ahụ́ ha, gwọọkwa ha ọrịa ha dị iche iche’ sokwa ya. (Luk 8:2) Meri Magdalin, Suzana, na Joana, onye di ya na-arụrụ Eze Herọd Antipas ọrụ, so n’ụmụ nwaanyị ndị a.

Ka ndị mmadụ na-amatakwu gbasara Jizọs, ọgba aghara a na-enwe n’ihi ihe ndị ọ na-eme na-arịkwu elu. Ihe gosiri na ihe a bụ eziokwu bụ ihe mere mgbe Jizọs gwọrọ otu nwoke a kpọtaara ya. Mmụọ ọjọọ jibu nwoke ahụ. O kpukwara ìsì ma daa ogbi. Ma, ugbu a, mmụọ ọjọọ ji ya ahapụla ya, ọ hụwala ụzọ, malitekwa ikwu okwu. Ihe a juru ndị mmadụ anya, ha ana-ekwu, sị: “Ọ̀ bụ na onye a abụghị Nwa Devid?”—Matiu 12:23.

Ìgwè mmadụ ndị gbakọrọ n’ụlọ Jizọs nọ hiri nne nke na o nweghị otú ya na ndị na-eso ụzọ ya ga-esi rie nri. Ma, ọ bụghị ndị niile gbakọrọ ebe ahụ kwetara na Jizọs bụ “Nwa Devid” ahụ e kwere ná nkwa. E nwere ụfọdụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii sichadị ihe ha ka Jeruselem bịa. Ma, ha abịaghị ka ha mụta ihe n’ọnụ Jizọs ma ọ bụkwanụ kwado ya. Ha nọ na-agwa ndị mmadụ, sị: “O nwere Bielzebọb,” ya na “onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ” na-arụkọkwa ọrụ. (Mak 3:22) Mgbe ndị ikwu Jizọs nụrụ banyere ọgba aghara ihe a kpatara, ha bịara ka ha kpọrọ ya. Gịnị mere ha ji na-achọ ịkpọrọ ya?

Ka ọ dị ugbu a, ụmụnne Jizọs ekwetabeghị na ọ bụ Ọkpara Chineke. (Jọn 7:5) Jizọs a o yiri ka e kwo maka ya na-enwe ọgba aghara adịghị ka Jizọs ha ma mgbe ha na-etolite na Nazaret. Ha chere na o nwere ihe na-eme ya n’isi. Ha sịrị: “Isi emebiela ya.”—Mak 3:21.

Ma, gịnị bụ ihe merenụ n’eziokwu? Jizọs ka gwọchara otu nwoke mmụọ ọjọọ ji, onye hụwalara ụzọ ugbu a, na-ekwukwa okwu. Ọ dịghịkwa onye nwere ike ịgbagha ọrụ ebube a Jizọs rụrụ. Ọ bụ ya mere ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ji bo Jizọs ebubo iji katọọ ọrụ ọma a ọ na-arụ. Ha sịrị: “Ọ dịghị ihe ọzọ onye a ji achụpụ ndị mmụọ ọjọọ ma ọ́ bụghị ike Bielzebọb, onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ.”—Matiu 12:24.

Mgbe Jizọs na ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-arụrịta ụka; ụfọdụ ndị so ya na-eme njem ana-ele ya anya

Jizọs ma ihe ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nọ na-eche. Ọ bụ ya mere o ji gwa ha, sị: “Alaeze ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya na-atọgbọrọ n’efu, obodo ọ bụla ma ọ bụ ụlọ ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya agaghị eguzo. N’otu ụzọ ahụ, ọ bụrụ na Setan achụpụ Setan, o kewawo wee na-emegide onwe ya; oleezi otú alaeze ya ga-esi guzo?”—Matiu 12:25, 26.

Ihe a Jizọs kwuru bụ eziokwu na-enweghị mgbagha. Ndị Farisii ma na ụfọdụ ndị Juu na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ. (Ọrụ Ndịozi 19:13) N’ihi ya, Jizọs jụrụ ha, sị: “Ọ bụrụkwa na m ji ike Bielzebọb na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ̀ bụ ike onye ka ụmụ unu ji na-achụpụ ha?” Ihe ihe a pụtara bụ na ọ bụdị hanwa ka e kwesịrị ibo ebubo ahụ ha na-ebo Jizọs. Jizọs gwaziri ha ihe o bu n’obi ịgwa ha. Ọ sịrị: “Ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ Chineke ka m ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, alaeze Chineke akwaala unu n’ezie.”—Matiu 12:27, 28.

Jizọs meziri otu ihe atụ iji gosi na nchụpụ ya na-achụpụ mmụọ ọjọọ gosiri na ya nwere ike n’ebe Setan nọ. Ọ sịrị: “Olee otú mmadụ ọ bụla pụrụ isi wakpo ụlọ nwoke dị ike ma buru ngwongwo ya ndị a pụrụ ibupụ ebupụ, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ kee nwoke ahụ dị ike agbụ? Mgbe ahụ, ọ ga-ebukọrọ ihe dị n’ụlọ ya. Onye na-anọghị n’akụkụ m na-emegide m, onye na-esoghịkwa m na-ekpokọta ekpokọta na-ekposa ekposa.” (Matiu 12:29, 30) N’eziokwu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-emegide Jizọs, si otú ahụ na-egosi na ha bụ ndị ozi Setan. Ha na-achụfụsị ndị mmadụ n’ebe Jizọs nọ, bụ́ onye Jehova nyere ikike o ji na-arụ ọrụ.

Jizọs dọrọ ndị na-emegide ya, bụ́ ndị na-arụrụ Ekwensu ọrụ, aka ná ntị. Ọ sịrị ha: “A ga-agbaghara ụmụ mmadụ ihe niile, n’agbanyeghị mmehie niile ha mere na nkwulu niile ha kwuluru. Otú ọ dị, onye ọ bụla nke na-ekwulu mmụọ nsọ, a gaghị agbaghara ya ruo mgbe ebighị ebi, kama ọ bụ onye ikpe mmehie mara ruo mgbe ebighị ebi.” (Mak 3:28, 29) Chegodị ihe ihe a o kwuru ga-apụtara ndị na-ekwu na ọ bụ ikike Setan ka Jizọs ji na-arụ ihe o jikwanụ ike mmụọ nsọ Chineke na-arụ.

  • Olee ndị so Jizọs na nke ugbo abụọ ọ gagharịrị na Galili kwusaa ozi ọma?

  • Gịnị mere ndị ikwu Jizọs ji bịa ịkpọrọ ya?

  • Olee otú ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii si gbaa mbọ ịkatọ ọrụ ebube ndị Jizọs na-arụ, oleekwa otú Jizọs si gosi na ebubo ha boro ya abụghị eziokwu?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya