Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 8/15 p. 25-28
  • Irite Uru Site ‘n’Ọka nke Eluigwe’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Irite Uru Site ‘n’Ọka nke Eluigwe’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mmụta Dịịrị Israel Na-abara Ndị Kraịst Uru
  • Mee Ka Ekele Gị Maka Ndokwa Chineke Sie Ike
  • “Manna” nke Na-enye Ndụ Ebighị Ebi
  • Ihe “Manna ahụ nke E Zobeworo” Pụtara
  • Ụdị Ihe Oriri Ọhụrụ
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ị̀ Tatụla Achịcha ahụ Na-enye Ndụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 8/15 p. 25-28

Irite Uru Site ‘n’Ọka nke Eluigwe’

N’OGE na-adịghị anya mgbe a gbapụtasịrị ụmụ Israel n’Ijipt n’ụzọ ọrụ ebube, ha gosipụtara ajọ enweghị okwukwe n’ebe Onye Mgbapụta ha, bụ́ Jehova, nọ. N’ihi ya, Jehova mere ka ha wagharịa n’ọzara Saịnaị ruo afọ 40. N’oge ahụ nile, ụmụ Israel na “ọtụtụ ndị gwara ọgwa” nke ndị mba ọzọ bụ́ ndị sonyeere ha, ‘rijuru nri ma ṅụjuo ihe ọṅụṅụ afọ.’ (Ọpụpụ 12:37, 38) Abụ Ọma 78:23-25 na-agwa anyị otú nke a si kwe omume: “O [Jehova] wee nye mbara igwe nile n’elu iwu, megheekwa ọnụ ụzọ nile nke eluigwe; O wee mee ka manna zokwasị ha dị ka mmiri, ka ha rie, ọ bụkwa ọka nke eluigwe ka O nyere ha. Nri nke ndị dị ike ka mmadụ riri: O ziteere ha ihe ha ga-eriju afọ.”

Dị ka onye so rie manna ahụ, Mosis kọwara nri a pụrụ iche. O dere na n’ụtụtụ, mgbe ‘igirigi nke dịkwasịrị n’ala rịgosịrị, e nwere n’elu ọzara imurimu ihe nke e kpere ekpe, imurimu ihe dị ka hoar frost nke dị n’elu ala. Ụmụ Israel wee hụ ya, sịrịta onwe ha, Gịnị ka ọ bụ?’ ma ọ bụ n’ikwu ya n’ụzọ nkịtị n’asụsụ Hibru, “man huʼ?” Ma eleghị anya ọ bụ n’okwu a ka e si nweta okwu ahụ bụ́ “manna,” bụ́ aha ụmụ Israel nyere nri ahụ. Mosis sịrị: “Ihe ahụ dị ka mkpụrụ coriander, ọ dị ọcha; i detụ ya ire ọ dị ka achịcha wafer e ji mmanụ aṅụ mee.”—Ọpụpụ 16:13-15, 31, nkọwa ala ala peji nke NW.

Manna abụghị nri na-apụtara onwe ya, dị ka ụfọdụ na-arụ n’ụka. Ọ bụ ike karịrị ike mmadụ wetara ya. Dị ka ihe atụ, a kpaghị ókè ebe na oge ndị a ga-enwe ya. Ọ bụrụ na e debe ya ya abọọ chi, ọ na-agba ikpuru ma malite isi ísì; ma, okpukpu abụọ nke ezinụlọ ọ bụla na-achịkọta n’ụbọchị bu ụzọ tupu Ụbọchị Izu Ike adịghị emebi ma ọ bọọ chi, n’ihi ya a pụrụ iri ya n’Ụbọchị Izu Ike—ụbọchị manna na-adịghị ada. N’ezie, manna ahụ bụ ihe e nyere n’ụzọ ọrụ ebube.—Ọpụpụ 16:19-30.

Nhota e hotara “ndị dị ike,” ma ọ bụ “ndị mmụọ ozi,” n’Abụ Ọma nke 78 na-enye echiche na Jehova pụrụ ijiwo ndị mmụọ ozi mee ihe iji nye manna ahụ. (Abụ Ọma 78:25, nkọwa ala ala peji nke NW) Otú o sina dị, ndị ahụ nwere ihe mere ha ga-eji kelee Chineke maka obiọma ya. Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ n’ime ha gosipụtara omume enweghị ekele nye Onye ahụ gbapụtara ha n’ohu n’Ijipt. Anyị onwe anyị kwa pụrụ iwere ihe ndị Jehova na-enye dị ka ihe dị nta ma ọ bụ ọbụna ghọọ ndị na-enweghị ekele ma ọ bụrụ na anyị atụgharịghị uche n’ezi ịhụnanya ya. Ya mere anyị pụrụ inwe ekele na Jehova tinyere ihe ndekọ banyere mgbapụta Israel na ihe omume ndị sochiri ya maka “izi anyị ihe.”—Ndị Rom 15:4.

Ihe Mmụta Dịịrị Israel Na-abara Ndị Kraịst Uru

Mgbe Jehova nyere manna ahụ, o bu ihe karịrị nanị igbo mkpa anụ ahụ nke ihe dị ka nde ụmụ Israel atọ n’uche. Ọ chọrọ ‘iweda ha n’ala ma nwaa ha’ iji nụchaa ma dọọ ha aka ná ntị maka abamuru nke ha. (Deuterọnọmi 8:16; Aịsaịa 48:17) Ọ bụrụ na ha anabata nnụcha na ịdọ aka ná ntị ahụ, Jehova ga-enwe obi ụtọ ‘n’ime ha mma n’ikpeazụ ha’ site n’inye ha udo, ọganihu, na obi ụtọ n’Ala Nkwa ahụ.

Otu ihe bara uru ọ dị ha mkpa ịmụta bụ na “ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ ihe nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta ka mmadụ ga-eji dị ndụ.” (Deuterọnọmi 8:3) A sị na Chineke enyeghị manna ahụ, agụụ gaara agụgbu ndị ahụ—eziokwu nke ha kwetara n’egbughị oge. (Ọpụpụ 16:3, 4) E chetaara ụmụ Israel nwere ekele banyere ndabere ha na-adabere na Jehova kpam kpam, ha wee sikwa otú ahụ bụrụ ndị e wedara n’ala. N’oge ha ga-aba n’Ala Nkwa ahụ nke nwere ihe onwunwe n’ụba, o yikarịghị ka hà ga-echefu Jehova na ndabere ha na-adabere na Ya.

Dị ka ụmụ Israel, ndị Kraịst aghaghị ịnọgide na-eburu n’uche ndabere ha na-adabere na Chineke maka ihe ndị dị mkpa ná ndụ—n’ụzọ anụ ahụ nakwa n’ụzọ ime mmụọ. (Matiu 5:3; 6:31-33) Ná nzaghachi nye otu n’ime ọnwụnwa Ekwensu, Jisọs Kraịst hotara okwu Mosis a na-achọta na Deuterọnọmi 8:3, na-asị: “E dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.” (Matiu 4:4) Ee, ezi ndị na-efe Chineke na-enweta ọzụzụ site n’ịgụ ihe ndị si n’ọnụ Jehova pụta bụ́ nke a na-achọta n’Okwu ya. Tụkwasị na nke a, okwukwe ha na-esikwu ike mgbe ha nwetara mmetụta ndị bara uru nke okwu ndị a ná ndụ ha ka ha na-eso Chineke na-eje ije ma na-ebute ọdịmma Alaeze ya ụzọ.

Ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụrụ ịtụfu ekele ha nwere maka ihe ndị ghọrọ ihe a na-eme mgbe dum ná ndụ—ọ bụrụgodị na ihe ndị a bụ ngosipụta nke echiche ịhụnanya nke Jehova. Dị ka ihe atụ, manna ahụ e ji ike karịrị ike mmadụ nye juru ụmụ Israel anya, meekwa ha obi ụtọ ná mmalite, ma ka oge na-aga, ọtụtụ n’ime ha mere mkpesa. “Ike agwụsịwokwa mkpụrụ obi anyị n’achịcha nke a dị mfe,” ka ha kpesara n’ụzọ mkparị—ihe na-egosi na ha amalitewala ‘iwezụga onwe ha n’ebe Chineke dị ndụ nọ.’ (Ọnụ Ọgụgụ 11:6; 21:5; Ndị Hibru 3:12) Ya mere, ihe atụ ha bụ “ihe ịdụ anyị ọdụ, ndị ọgwụgwụ oge ndị a ruteworo.”—1 Ndị Kọrint 10:11.

Olee otú anyị pụrụ isi gee ntị n’ihe atụ a na-adọ aka ná ntị? Otu ụzọ bụ site n’ekweghị ka ozizi Bible ma ọ bụ ihe ndị anyị na-enweta site n’aka òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche ghọọ ihe nkịtị, ma ọ bụ ihe ndị na-abaghị n’ihe nye anyị. (Matiu 24:45) Ozugbo anyị malitere iwere onyinye Jehova dị ka ihe dị nta ma ọ bụ ghọọ ndị na-enweghị mmasị na ha, mmekọrịta anyị na ya ga-amalite ịjụ oyi.

N’inwe ezi ihe kpatara ya, Jehova adịghị awụkwasị anyị ihe ọhụrụ ndị na-akpali akpali mgbe nile. Kama nke ahụ, ọ na-eji nwayọọ nwayọọ, n’ụzọ na-agawanye n’ihu na-amụkwasịkwu ìhè n’Okwu ya. (Ilu 4:18) Nke a na-enye ndị ya ohere ịnabata ma tinye ihe ndị ha na-amụta n’ọrụ. Jisọs gbasoro ihe nlereanya nke Nna ya mgbe ọ na-ezi ndị na-eso ụzọ ya nke oge mbụ ihe. Ọ kọwaara ha Okwu Chineke “dị ka ha pụrụ ịnụ ya,” ma ọ bụ “ịghọta,” dị ka ụfọdụ nsụgharị si tinye ya.—Mak 4:33; tụlee Jọn 16:12.

Mee Ka Ekele Gị Maka Ndokwa Chineke Sie Ike

Jisọs jikwa okwu nkwughachi mee ihe. N’ezie, uche mmadụ pụrụ ịghọta isi ihe ụfọdụ ozugbo—dị ka ihe atụ, otu ụkpụrụ Bible—ma ịkụbanye ya n’obi na ime ka ọ bụrụ akụkụ nke “mmadụ ọhụrụ” nke onye Kraịst pụrụ iwetụkwu oge, karịsịa ma ọ bụrụ na ụzọ na omume ụwa e nwere ochie gbanyesiri mkpọrọgwụ ike. (Ndị Efesọs 4:22-24) N’ezie, otú ahụ ka ọ dị n’ebe ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ mgbe a bịara n’ihe banyere imeri nganga na ịzụlite ịdị umeala n’obi. Jisọs aghaghị ịkụziri ha ịdị umeala n’obi ọtụtụ oge, na nke ọ bụla, na-egosi otu isi ihe ahụ site n’ụzọ dị iche ka o wee nwee mmetụta miri emi n’ebe ha nọ, bụ́ nke o mesịrị nwee.—Matiu 18:1-4; 23:11, 12; Luk 14:7-11; Jọn 13:5, 12-17.

N’oge a, nzukọ ndị Kraịst na mbipụta dị iche iche nke Watch Tower na-agbaso ihe nlereanya Jisọs nke iji nkwughachi okwu ndị a kwadebere nke ọma eme ihe. N’ihi ya, ka anyị nwee ekele maka nke a dị ka ngosipụta nke echiche ịhụnanya Chineke n’ebe anyị nọ ma ghara ịbụ ndị ihe anyị na-enweta gwụrụ ike, dị ka manna gwụrụ ụmụ Israel ike. N’ezie, ka anyị ji ndidi na-anara ihe ncheta ndị Jehova na-enye mgbe nile, anyị ga-ahụ mkpụrụ ọma ná ndụ anyị. (2 Pita 3:1) Omume ekele dị otú ahụ na-egosi n’ezie na anyị na-ewere obi nakwa uche anyị ‘na-aghọta’ Okwu Chineke. (Matiu 13:15, 19, 23) Na nke a, anyị nwere ihe nlereanya ọma n’ebe ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid nọ, bụ́ onye, ọ bụ ezie na o nweghị ụdị nri ime mmụọ dịgasị iche ndị anyị na-enweta taa, kọwara iwu Jehova dị ka nke ‘dị ụtọ karịa mmanụ aṅụ, bụ́ nke si n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ na-atasị’!—Abụ Ọma 19:10.

“Manna” nke Na-enye Ndụ Ebighị Ebi

“Mụ onwe m bụ nri nke na-enye ndụ,” ka Jisọs gwara ndị Juu. “Nna unu hà riri manna ahụ n’ọhịa, ha wee nwụọ. . . . Mụ onwe m bụ nri dị ndụ nke siri n’eluigwe rịdata: ọ bụrụ na mmadụ erie ụfọdụ n’ime nri a, ọ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi . . . Nri nke Mụ onwe m ga-enyekwa bụ anụ ahụ m, n’ihi ndụ nke ụwa.” (Jọn 6:48-51) Nri ma ọ bụ manna nkịtị enyeghị, ọ pụghịkwa inye ndụ ebighị ebi. Ma ndị na-egosi okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs ga-emecha nwee ngọzi nke ndụ ebighị ebi.—Matiu 20:28.

Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị ga-erite uru site n’ihe mgbapụta Jisọs ga-enwe ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. “Oké ìgwè mmadụ” n’ime ndị a—nke “ọtụtụ ndị gwara ọgwa” nke ndị mba ọzọ bụ́ ndị sonyeere ụmụ Israel n’Ọpụpụ ha site n’Ijipt sere onyinyo ha—ga-alanarị ‘oké mkpagbu’ ahụ na-abịanụ, bụ́ nke ga-ewepụ ajọ omume nile n’ụwa. (Mkpughe 7:9, 10, 14; Ọpụpụ 12:38) Ndị ahụ ụmụ Israel n’onwe ha sere onyinyo ha ga-enwe ọbụna ụgwọ ọrụ ka ukwuu. Pọl onyeozi kọwara ndị a, bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha dị 144,000, dị ka ndị na-emejupụta Israel ime mmụọ nke Chineke. Ụgwọ ọrụ ha ga-enweta ma ha nwụọ bụ mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ nke eluigwe. (Ndị Galetia 6:16; Ndị Hibru 3:1; Mkpughe 14:1) Jisọs ga-enye ha ụdị manna pụrụ iche n’ebe ahụ.

Ihe “Manna ahụ nke E Zobeworo” Pụtara

“Onye na-emeri emeri, ya ka M ga-enye ụfọdụ n’ime manna ahụ nke e zobeworo,” ka Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie gwara Israel ime mmụọ. (Mkpughe 2:17) Manna ihe atụ a e zobeworo na-eme ka e cheta manna ahụ Chineke nyere Mosis iwu ka o tinye n’ime ite ọlaedo nke dị n’ime igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ. E debere Igbe ahụ n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke ụlọikwuu ahụ. Ọ dị n’ebe ahụ n’ebe anya na-apụghị ịhụ ya, e zoro ya ezo dị ka a pụrụ isi kwuo ya. N’ịbụ nke e debere dị ka ihe ncheta, manna ihe atụ a emebighị ka ọ dị n’ime Igbe ahụ, n’ihi ya ọ ga-abụ ihe nnọchianya kwesịrị ekwesị nke nri na-adịghị emebi emebi. (Ọpụpụ 16:32; Ndị Hibru 9:3, 4, 23, 24) N’inye 144,000 ahụ manna ahụ nke e zobeworo, Jisọs na-emesi ha obi ike na ha ga-enweta anwụghị anwụ na ereghị ure dị ka ụmụ Chineke.—Jọn 6:51; 1 Ndị Kọrint 15:54.

“N’ebe Ị [Jehova] nọ ka isi iyi ndụ dị,” ka ọbụ abụ ahụ kwuru. (Abụ Ọma 36:9) Lee ka onyinye e nyere manna ahụ—ma n’ụzọ nkịtị ma n’ụzọ ime mmụọ—si emesi eziokwu ahụ bụ́ isi ike! Manna ahụ Chineke nyere Israel oge ochie, manna ihe atụ ahụ o nyere n’ụdị nke anụ ahụ Jisọs bụ́ nke e nyere n’ihi anyị, na manna ihe atụ ahụ nke e zobeworo bụ́ nke ọ na-enye 144,000 ahụ site n’aka Jisọs, na-echetara anyị nile banyere ndabere anyị na-adabere n’ebe Chineke nọ kpam kpam maka ndụ. (Abụ Ọma 39:5, 7) Ka anyị jiri obi umeala, ụzọ ziri ezi, na ụzọ chiri anya na-aghọta ndabere nke a. N’aka nke ya, Jehova ‘ga-eme anyị mma n’ikpeazụ anyị.’—Deuterọnọmi 8:16.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Iji nweta ndụ ebighị ebi, mmadụ nile na-adabere ná “nri dị ndụ nke siri n’eluigwe rịdata”

[Foto dị na peeji nke 28]

Ịga nzukọ nile nke ndị Kraịst na-egosipụta ekele anyị maka ihe ncheta Jehova

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya