Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 45 p. 114-p. 115 para. 3
  • Jizọs Egosi na Ya Ka Ndị Mmụọ Ọjọọ Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Egosi na Ya Ka Ndị Mmụọ Ọjọọ Ike
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Na-eso Ụzọ nke A Na-atụghị Anya Ya
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ike Jizọs Nwere n’Ebe Ndị Mmụọ Ọjọọ Nọ
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Ikike Ònye Ka Jizọs Ji Na-arụ Ọrụ Ebube?
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ihe I Kwesịrị Ịma Gbasara Ndị Mmụọ Ozi na Ndị Mmụọ Ọjọọ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 45 p. 114-p. 115 para. 3
Ebe otu nwoke ọtụtụ mmụọ ọjọọ ji na-abịakwute Jizọs

ISI NKE 45

Jizọs Egosi na Ya Ka Ndị Mmụọ Ọjọọ Ike

MATIU 8:28-34 MAK 5:1-20 LUK 8:26-39

  • JIZỌS ACHỤPỤ NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ HA ABANYE N’IME ÌGWÈ ÉZÌ

Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs pụtara n’elu ala, ka ha nwechara nsogbu ahụ ha nwere n’Oké Osimiri Galili, ha hụrụ ihe juru ha anya. Ụmụ nwoke abụọ ndị mmụọ ọjọọ ji, bụ́ ndị na-eme ihe ike, ndị anya na-achakwa ọkụ, si n’ebe a na-eli ozu dị nso n’ebe ahụ na-agbaga ebe Jizọs nọ. Otu n’ime ha kacha gbapụ iche n’ihi na ọ bụ ya kacha dịrị egwu n’anya, karakwa akpa ike. Ọ ga-abụ na ihe mere o ji akpa ike karịa nke ọzọ bụ n’ihi na ndị mmụọ ọjọọ ejiela yanwa ogologo oge karịa onye nke ọzọ.

O teela nwoke a gba ọtọ na-akpagharị. Ma n’ehihie ma n’abalị, ọ ‘na-eti mkpu n’ebe a na-eli ozu nakwa n’ugwu, jirikwa nkume na-ebekasị onwe ya ahụ́.’ (Mak 5:5) Otú o si akpa ajọ ike mere ụjọ anaghị ekwe ndị mmadụ si ụzọ ebe ọ nọ gafee. Ụfọdụ ndị ekeela ya agbụ, ma ọ dọbisịrị agbụ ígwè e kere ya, gbajiekwa ịgà a tụrụ ya n’ụkwụ. O nweghị onye na-ejituli ya.

Mgbe nwoke ahụ bịarutere ebe Jizọs nọ ma daa n’akụkụ ụkwụ ya, ndị mmụọ ọjọọ ahụ ji ya mere ka o tie mkpu, sị: “Jizọs, Ọkpara nke Chineke Onye Kasị Elu, gịnị jikọrọ mụ na gị? Jiri Chineke ṅụọrọ m iyi na ị gaghị emekpa m ahụ́.” Jizọs gosiri na ya ka ndị mmụọ ọjọọ ike. O nyere mmụọ ọjọọ ahụ iwu, sị: “Gị mmụọ na-adịghị ọcha, si n’ime nwoke a pụta.”—Mak 5:7, 8.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị mmụọ ọjọọ ji nwoke ahụ dị ọtụtụ. Mgbe Jizọs jụrụ ya, “Gịnị bụ aha gị?” ihe ọ zara ya bụ: “Aha m bụ Ụsụụ, n’ihi na anyị dị ọtụtụ.” (Mak 5:9) Na Rom, ụsụụ ndị agha bụ ndị agha dị ọtụtụ puku. N’ihi ya, ihe ọ pụtara bụ na ndị mmụọ ọjọọ ji nwoke a karịrị akarị. Ahụhụ nwoke a na-ata na-atọkwa ha ụtọ. Ha rịọrọ Jizọs “ka ọ ghara inye ha iwu ka ha pụọ baa n’ime abis.” O doro anya na ha ghọtara ihe a ga-emecha mee ha na onyeisi ha, bụ́ Setan.—Luk 8:31.

Mgbe ìgwè ézì ji ọsọ na-amabanye n’oké osimiri

E nwere ihe dị ka puku ézì abụọ na-ata nri n’ebe dị nso ebe ahụ. N’Iwu Mozis, ézì bụ anụ rụrụ arụ nke ndị Juu na-ekwesịdịghị inwe. Ndị mmụọ ọjọọ ahụ sịrị Jizọs: “Ziga anyị n’ime ìgwè ézì ndị a, ka anyị banye n’ime ha.” (Mak 5:12) Jizọs gwara ha gawa, ha banyekwara n’ime ìgwè ézì ndị ahụ. Puku ézì abụọ ahụ kwooro maba n’osimiri dị ná mkpọda ebe ahụ, mmiri agbagbuo ha.

Mgbe ndị chị ézì ndị ahụ hụrụ ihe merenụ, ha gbaara gawa n’ime obodo ka ha kọọrọ ndị mmadụ ihe merenụ. Ndị mmadụ gbapụtara ka ha hụ ihe merenụ. Mgbe ha bịarutere, ha hụrụ na ahụ́ adịla nwoke ahụ a chụpụrụ mmụọ ọjọọ n’ahụ́ ya mma. Isi adịkwala ya mma. O yizi uwe ma nọrọ ọdụ n’akụkụ ụkwụ Jizọs.

Ebe Jizọs na-agwa otu nwoke mmụọ ọjọọ jibu ka ọ laa gaa kọọrọ ndị ikwu na ibe ya ihe Chineke meere ya

Ụjọ jidere ndị hụrụ nwoke a na ndị nụrụ banyere ihe a n’ihi na ha amaghị ihe ọzọ Jizọs nwere ike ime. Ha gwara Jizọs ka o si n’obodo ha pụọ. Ka Jizọs na-abanye n’ụgbọ ka ọ pụwa, nwoke ahụ ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ n’ahụ́ ya rịọrọ ya ka ya soro ya. Ma, Jizọs gwara ya, sị: “Lakwuru ndị ikwu gị, kọọkwara ha ihe niile Jehova meere gị nakwa ebere o meere gị.”—Mak 5:19.

Jizọs na-agwakarị ndị ọ gwọrọ ọrịa ka ha ghara ịgwa ndị ọzọ banyere ya n’ihi na ọ chọghị ka akụkọ e tinyere nnu na ose a ga na-akọ gbasara ya mee ka ndị mmadụ ghara ịma nke bụ́ eziokwu. Ọ chọrọ ka ndị mmadụ mata onye ọ bụ n’eziokwu. Mana, na nke nwoke a mmụọ ọjọọ jibu, ihe mere ya bụ ihe ama a na-ahụ anya gosiri ụdị ikike Jizọs nwere. O nwekwara ike ịkọrọ ndị ọzọ banyere Jizọs, bụ́ ndị Jizọs nwere ike ọ gaghị enwe ohere ịga n’onwe ya zie ha ozi ọma. Ihe a mere nwoke a ga-emekwa ka ndị mmadụ ghara inwe ohere gewe akụkọ ụgha ọ bụla e nwere ike ịkọ banyere ézì ndị ahụ dabara ná mmiri. Nwoke ahụ pụwaziri na-aga na Dikapọlis niile na-akọ ihe Jizọs meere ya.

  • Gịnị mere otu n’ime mmadụ abụọ ahụ mmụọ ọjọọ ji ji dị egwu n’anya karịa onye nke ọzọ?

  • Gịnị ka ndị mmụọ ọjọọ ma ga-eme ha n’ọdịnihu?

  • Olee ihe ndị mere Jizọs ji gwa onye ahụ ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ n’ahụ́ ya ka ọ gwa ndị ọzọ banyere ihe Jizọs mere?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya