ISI NKE IRI
“E Dere, Sị”
“Taa ka ihe a e dere n’Akwụkwọ Nsọ . . . mezuru”
1-3. Gịnị ka Jizọs chọrọ ka ndị Nazaret ghọta, oleekwa ihe akaebe o gosiri ha?
MGBE Jizọs Kraịst ka malitere ozi ya amalite, ọ lọtara Nazaret, bụ́ obodo ya. O bu n’obi inyere ndị mmadụ aka ka ha ghọta otu ihe dị mkpa: Ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ e buru n’amụma n’oge dị anya gara aga! Olee ihe akaebe o gosiri ha?
2 O doro anya na ọtụtụ ga-atụ anya ka ọ rụọ ọrụ ebube. Ha anụwo akụkọ banyere ọrụ dị egwu ndị Jizọs rụrụ. Ma, o mereghị ha ụdị ihe ịrịba ama ahụ. Kama nke ahụ, ọ banyere n’ụlọ nzukọ, dị ka ọ na-emekarị. O wee guzo ọtọ ka ọ gụọ ihe. E wee nye ya akwụkwọ mpịakọta nke Aịzaya. Akwụkwọ mpịakọta a toro ogologo. Ma eleghị anya, a fụkọtara ya n’osisi abụọ. Jizọs wee jiri nlezianya si n’otu akụkụ na-emeghe akwụkwọ ahụ ma na-afụkọta ya n’osisi nke ọzọ ruo mgbe ọ chọtara ebe ọ na-achọ. Mgbe ahụ, ọ gụpụtara ihe dị ugbu a n’Aịzaya 61:1-3.—Luk 4:16-19.
3 N’ezie, ndị na-ege okwu ya maara ebe ahụ ọ gụrụ. Ọ bụ amụma e buru banyere Mesaya. Ndị niile nọ n’ụlọ nzukọ ahụ legidere Jizọs anya. Ebe niile dara jụụ. Jizọs wee malite ịkọwara ha, sị: “Taa ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ unu nụrụ ugbu a mezuru.” Ikekwe, ọ kọwara ya nke ọma. Okwu ọma ndị o kwuru tụrụ ndị na-ege okwu ya n’anya. Ma, o yiri ka ọtụtụ n’ime ha ka chọrọ ka o mee ihe ịrịba ama dị ebube. Kama ime nke ahụ, Jizọs ji obi ike were ihe atụ nke si n’Akwụkwọ Nsọ mee ka enweghị okwukwe ha pụta ìhè. N’oge na-adịghị anya, ndị Nazaret nwara igbu ya!—Luk 4:20-30.
4. Olee ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ n’ozi ya, gịnịkwa ka anyị ga-atụle n’Isi nke Iri a?
4 N’ebe a, Jizọs setịpụrụ ụkpụrụ ọ gbasoro mgbe niile n’ozi ya. Ọ dabeere kpamkpam n’Okwu Chineke nke e si n’ike mmụọ nsọ dee. N’ezie, ọrụ ebube ndị ọ rụrụ dị oké mkpa iji gosi na mmụọ Chineke dị n’ime ya. Ma, ọ dịghị ihe dị Jizọs mkpa karịa Akwụkwọ Nsọ. Ka anyị tụlee ihe nlereanya o setịpụrụ na nke a. Anyị ga-atụle otú Nna anyị ukwu si kwuo ihe e dere n’Okwu Chineke, otú o si gbachitere Okwu Chineke, na otú o si kọwaa Okwu Chineke.
O Kwuru Ihe E Dere n’Okwu Chineke
5. Gịnị ka Jizọs kpebisiri ike ime ka ndị na-ege okwu ya mata, oleekwa otú o si gosi na ihe ndị o kwuru bụ eziokwu?
5 Jizọs chọrọ ka ndị mmadụ mara ebe ozi ya si. Ọ sịrị: “Ihe m na-ezi abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m.” (Jọn 7:16) N’oge ọzọ, ọ sịrị: “Adịghịkwa m eme ihe ọ bụla n’uche nke aka m; kama m na-ekwu ihe ndị a dị nnọọ ka Nna m kụziiri m.” (Jọn 8:28) Ọ sịkwara: “Adịghị m ekwu ihe m na-agwa unu n’echiche nke onwe m; kama ọ bụ Nna m nke mụ na ya dị n’otu na-arụ ọrụ ya.” (Jọn 14:10) Otu ụzọ Jizọs si gosi na ihe ndị a o kwuru bụ eziokwu bụ site n’ikwu ugboro ugboro ihe dị n’Okwu Chineke e dere ede.
6, 7. (a) Olee otú Jizọs kwururu ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, gịnị mere o ji bụrụ na nke a adịghị ntakịrị? (b) Olee ihe dị iche n’otú Jizọs si zie ihe na otú ndị odeakwụkwọ si zie ihe?
6 Ọ bụrụ na anyị ejiri nlezianya mụọ ihe e dere banyere Jizọs, anyị ga-aghọta na o kwuru kpọmkwem ihe e dere n’ihe karịrị ọkara Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị e si n’ike mmụọ nsọ dee, ma ọ bụkwanụ kwuo isi ihe e dere na ha. Ma eleghị anya, nke a ebuchaghị gị ibu. Ị pụrụ ichewe ihe mere ọ na-ekwughị ihe dị n’akwụkwọ niile e si n’ike mmụọ nsọ dee ndị dị mgbe ahụ n’ime afọ atọ na ọkara o ziri ihe ma kwusaa ozi ọma n’ihu ọha. Ma, n’eziokwu, ọ ga-abụ na o mere otú ahụ. Cheta na ọ bụ naanị obere ihe n’ihe niile Jizọs kwuru na ihe niile o mere ka e dere ede. (Jọn 21:25) N’ezie, i nwere ike ịgụpụtacha okwu niile e dere ede Jizọs kwuru naanị n’ime awa ole na ole. Ugbu a, chegodị echiche otú ọ ga-adị ma a sị na ị na-ekwu okwu ga-ewe naanị awa ole na ole banyere Chineke na Alaeze ya. I wee na-agbalị n’ime oge a ka i kwuo ihe e dere n’ihe karịrị ọkara Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ọtụtụ mgbe, ọ dịghị akwụkwọ mpịakọta e dere ede dịnụ Jizọs ga-eji kwuo okwu. Mgbe ọ nọ na-ezi Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, ugboro ugboro, o kwuru kpọmkwem ọtụtụ ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Mgbe ụfọdụ kwa, o kwuru isi ihe e dere na ha. O bu ha niile n’isi!
7 Okwukwu Jizọs kwuru ihe e dere n’Okwu Chineke gosiri na ọ kwanyeere ya ùgwù nke ukwuu. Otú o si ezi ihe juru ndị na-ege okwu ya anya, “n’ihi na ọ nọ na-ezi ha ihe n’ebe ahụ dị ka onye nwere ikike, ọ bụghịkwa dị ka ndị odeakwụkwọ.” (Mak 1:22) Mgbe ndị odeakwụkwọ na-ezi ihe, ọ na-amasị ha ikwu ihe dị n’ihe a na-akpọ iwu a na-edeghị ede, na-ekwu ihe ndị rabaị oge ochie bụ́ ndị gụrụ akwụkwọ kwuru. O nwetụdịghị mgbe Jizọs kwuru na ihe ya na-ekwu si n’iwu a na-edeghị ede ma ọ bụ n’ihe onye rabaị kwuru. Kama nke ahụ, o weere Okwu Chineke dị ka o kwusịa o bie. Ugboro ugboro, o kwuru, sị: “E dere, sị.” O kwuru nke a ma ọ bụ okwu ndị yiri ya ọtụtụ ugboro mgbe ọ na-ezi ndị na-eso ụzọ ya ihe nakwa mgbe ọ na-agbazi echiche ha na-ezighị ezi.
8, 9. (a) Olee otú Jizọs si gosi na Okwu Chineke bụ o kwusịa o bie mgbe o mere ka ụlọ nsọ dị ọcha? (b) Olee otú o si bụrụ na ndị ndú okpukpe ndị nọ n’ụlọ nsọ akwanyereghị Okwu Chineke ùgwù ma ọlị?
8 Mgbe Jizọs mere ka ụlọ nsọ dị na Jeruselem dị ọcha, ọ sịrị: “E dere, sị, ‘A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere,’ ma unu na-eme ya ọgba nke ndị na-apụnara mmadụ ihe.” (Matiu 21:12, 13; Aịzaya 56:7; Jeremaya 7:11) N’ụbọchị bọtara ụbọchị ahụ, ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube n’ebe ahụ. Obi tọrọ ụmụntakịrị ụtọ. Ha wee malite ito ya. Ma, ndị ndú okpukpe ji iwe jụọ Jizọs ma ọ̀ nụrụ ihe ụmụaka ahụ na-ekwu. Ọ zara, sị: “Ee. Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị ihe e dere, sị, ‘I mewo ka otuto si n’ọnụ ụmụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara pụta’?” (Matiu 21:16; Abụ Ọma 8:2) Jizọs chọrọ ka ndị ikom ahụ mara na Okwu Chineke kwadoro ihe ahụ na-eme n’ebe ahụ.
9 E mesịa, ndị ndú okpukpe ahụ zukọtara wee gakwuru Jizọs, jụọ ya, sị: “Olee ikike i ji eme ihe ndị a?” (Matiu 21:23) Jizọs mere ka Ebe ikike ya si doo anya nke ọma. Ọ bụghị echiche ọhụrụ ka o wepụtara, ọ bụghịkwa ozizi ọhụrụ ka ọ na-ezi. Ihe ọ na-eme bụ naanị ịkọwa ihe Okwu Nna ya nke e si n’ike mmụọ nsọ dee kwuru. Ya mere, n’ezie, ndị nchụàjà ahụ na ndị odeakwụkwọ ahụ akwanyereghị Jehova na Okwu ya ùgwù ma ọlị. Nkatọ ahụ Jizọs katọrọ ha mgbe o kpughere ihe ọjọọ ndị ha bu n’obi kwesịrị ha.—Matiu 21:23-46.
10. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jizọs n’ụzọ anyị si eji Okwu Chineke eme ihe, oleekwa ihe inyeaka anyị nwere bụ́ ndị na-adịghị n’oge Jizọs?
10 Dị ka Jizọs, ezi Ndị Kraịst taa na-adabere n’Okwu Chineke n’ozi ha. A maara Ndịàmà Jehova n’ụwa dum na ha na-eji ịnụ ọkụ n’obi agwa ndị ọzọ ihe Baịbụl kwuru. Ọtụtụ ugboro, akwụkwọ ndị anyị na-ebipụta na-ekwu kpọmkwem ihe e dere na Baịbụl, na-ekwukwa isi ihe e dere na ya. Anyị na-emekwa otú ahụ n’ozi anyị. Anyị na-agbalị ịgụ Akwụkwọ Nsọ mgbe ọ bụla anyị na-agwa ndị mmadụ okwu. (2 Timoti 3:16) Obi na-atọ anyị ụtọ nke ukwuu mgbe mmadụ kwere ka anyị gụọ Baịbụl, kwere ka anyị kwuo otú o si baa uru, kọwaakwa ihe Okwu Chineke pụtara. Ikike Jizọs nwere icheta ihe zuru okè. Ma, nke anyị nwere ezughị okè. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị nwere ọtụtụ ihe inyeaka ndị na-adịghị n’oge Jizọs. A na-ebipụtakwu Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ. Anyị nwekwara ọtụtụ ihe e ji amụ Baịbụl ndị na-enyere anyị aka ịchọta amaokwu ọ bụla anyị na-achọ. Ka anyị kpebisie ike iji ohere ọ bụla anyị nwere na-ekwu ihe e dere na Baịbụl, na-agwakwa ndị mmadụ banyere ya!
Ọ Gbachiteere Okwu Chineke
11. Gịnị mere Jizọs ji gbachitere Okwu Chineke ugboro ugboro?
11 Jizọs hụrụ na a na-alụso Okwu Chineke ọgụ mgbe niile. Ma, o jughị ya anya ma ọlị. Jizọs gwara Nna ya n’ekpere, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Jizọs maara nke ọma na Setan, “onye na-achị ụwa,” bụ “onye ụgha, bụrụkwa nna ụgha.” (Jọn 8:44; 14:30) Mgbe Jizọs jụrụ ọnwụnwa ndị Setan nwara ya, o kwuru ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ ugboro atọ. Setan kwuru ihe e dere n’otu amaokwu dị n’Abụ Ọma, mara ụma rọgharịa ya. Jizọs gbachiteere Okwu Chineke wee kụghasịa ihe Setan kwuru.—Matiu 4:6, 7.
12-14. (a) Olee otú ndị ndú okpukpe si gosi na ha adịghị akwanyere Iwu Mozis ùgwù? (b) Olee otú Jizọs si gbachitere Okwu Chineke?
12 Ọtụtụ ugboro, Jizọs gbachiteere Akwụkwọ Nsọ ka a ghara ịrọgharị ya, kọwahie ya, ma ghagide ya ụgha. Ndị nkụzi okpukpe n’oge ya ghagidere Okwu Chineke ụgha. Ha na-ekwusi ike ka a na-edebe irighiri ihe dị n’Iwu Mozis, ma ọ dịghị ezigbo ihe ha kwuru banyere idebe ụkpụrụ ndị iwu ndị ahụ dabeere na ha. Ya mere, ha kwadoro ofufe elu ọnụ, nke lekwasịrị anya n’ihe ndị a na-ahụ anya kama ilekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa—dị ka ikpe ziri ezi, ebere, na ikwesị ntụkwasị obi. (Matiu 23:23) Olee otú Jizọs si gbachitere Iwu Chineke?
13 Mgbe Jizọs nọ na-ezi Ozizi Elu Ugwu ya, n’oge ọ na-ekwu ihe e dere n’Iwu Mozis, o kwuru ugboro ugboro, sị, “Unu nụrụ na a sịrị.” Mgbe ahụ, ọ na-asị, “Ma ana m asị unu.” Ya kwusịa nke ahụ, ọ na-akọwa ụkpụrụ nke dị mkpa karịa idebe Iwu ahụ elu elu. Ihe ahụ Jizọs kwuru ọ̀ bụ ịrụ Iwu ahụ ụka? Ee, e. Ihe o kwuru bụ ịgbachitere ya. Dị ka ihe atụ, ndị mmadụ maara iwu ahụ bụ́ “Egbula ọchụ.” Ma, Jizọs gwara ha na ọ bụrụ na mmadụ akpọọ mmadụ ibe ya asị, o mebiela isi ihe mere e ji nye iwu ahụ. Otú ahụkwa, onye kwere ka ọ gụọ ya agụụ ka ya na nwunye onye ọzọ ma ọ bụ di onye ọzọ nwee mmekọahụ emebiela ụkpụrụ bụ́ isi mere Chineke ji nye iwu ka a ghara ịkwa iko.—Matiu 5:17, 18, 21, 22, 27-39.
14 N’ikpeazụ, Jizọs sịrị: “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya ma kpọọ onye iro gị asị.’ Otú ọ dị, ana m asị unu: Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu.” (Matiu 5:43, 44) Iwu ahụ bụ́ “kpọọ ndị iro unu asị” ò si n’Okwu Chineke? Ee, e. Ọ bụ ndị ndú okpukpe si n’echiche onwe ha kụzie ya. Ha ji echiche mmadụ gwagbuo Iwu zuru okè nke Chineke. N’atụghị egwu, Jizọs gbachiteere Okwu Chineke ka ọdịnala ụmụ mmadụ ghara imebi ya.—Mak 7:9-13.
15. Olee otú Jizọs si gbachitere Iwu Chineke mgbe a nwara ime ka o yie iwu tara akpụ, nke siri ike ndebe?
15 Ndị ndú okpukpe ahụ lụsokwara Iwu Chineke ọgụ site n’ime ka o yie iwu tara akpụ, nke siri ike ndebe. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs ghọọrọ ụyọkọ ọka wit n’oge ha na-agafe n’ubi, ụfọdụ ndị Farisii kwuru na ha na-emebi Ụbọchị Izu Ike. Jizọs ji otu ihe atụ nke si n’Akwụkwọ Nsọ gbachitere Okwu Chineke wee gosi na echiche ha ezighị ezi. O kwuru ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. O kwuru banyere naanị otu ebe e weere achịcha a na-eche n’ihu Chineke pụọ n’ụlọ nsọ, ya bụ, mgbe Devid na ndị ikom ya agụụ ji riri ya. Jizọs gwara ndị Farisii ahụ na ha aghọtaghị ebere Jehova na ọmịiko ya.—Mak 2:23-27.
16. Gịnị ka ndị ndú okpukpe mere iwu Mozis nyere banyere ịgba alụkwaghịm, gịnịkwa ka Jizọs gwara ha?
16 Ndị ndú okpukpe chepụtakwara ihe ndị ha ga-akụnye aka mee ka Iwu Chineke ghara ịdị irè. Dị ka ihe atụ, Iwu ahụ kwuru na nwoke nwere ike ịgba nwunye ya alụkwaghịm ma ọ bụrụ na “ọ chọpụtawo ihe na-ekwesịghị ekwesị” n’ebe ọ nọ. O doro anya na nke a bụ oké nsogbu nke buteere ezinụlọ onye ahụ ihere. (Diuterọnọmi 24:1) Ma, n’oge Jizọs nọ n’ụwa, ndị ndú okpukpe na-akụnye aka na nke a wee na-ekwe ka ndị ikom gbaa nwunye ha alụkwaghịm n’ihi ụdị ihe ọ bụla—ọbụna ma ọ bụrụ na nri abalị nwunye ha na-esiri ha rere ọkụ!a Jizọs gosiri na ha kọwahiere okwu Mozis si n’ike mmụọ nsọ kwuo. N’ihi ya, o weghachiri ụkpụrụ mbụ Jehova setịpụrụ maka alụmdi na nwunye, ya bụ, na otu nwoke ga-alụ otu nwaanyị nakwa na ọ bụ naanị mmekọahụ rụrụ arụ pụrụ ime ka ha gbaa alụkwaghịm.—Matiu 19:3-12.
17. Olee otú Ndị Kraịst taa pụrụ isi ṅomie Jizọs n’ịgbachitere Okwu Chineke?
17 N’otu aka ahụ, ọ na-emetụkwa ndị na-eso ụzọ Kraịst taa n’obi ịgbachitere Akwụkwọ Nsọ n’ọgụ a na-alụso ya. Mgbe ndị ndú okpukpe gosiri na ụkpụrụ omume ndị dị n’Okwu Chineke emeela ochie, ihe ha na-eme n’ezie bụ ịlụso Baịbụl ọgụ. A na-alụsokwa Baịbụl ọgụ mgbe okpukpe dị iche iche na-ezi ozizi ụgha ma na-asị na ha bụ ozizi Baịbụl. Anyị na-agụ ya n’ihe ùgwù ịgbachitere Okwu Chineke nke dị ọcha ma bụrụ eziokwu—dị ka ihe atụ, igosi na Chineke abụghị chi Atọ n’Ime Otu. (Diuterọnọmi 4:39) Ma, anyị na-eji olu ọma, ezi ịdị nwayọọ na nkwanye ùgwù dị ukwuu agbachitere Okwu Chineke.—1 Pita 3:15.
Ọ Kọwara Okwu Chineke
18, 19. Olee ihe atụ ndị na-egosi na Jizọs nwere ikike dị ebube ịkọwa Okwu Chineke?
18 Jizọs dị ndụ n’eluigwe mgbe e dere Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ọ ghaghị ịbụ na obi tọrọ ya ụtọ inwe ohere ịbịa n’ụwa wee soro kọwaa Okwu Chineke. Dị ka ihe atụ, chegodị echiche banyere ụbọchị ahụ a na-apụghị ichefu echefu mgbe Jizọs bilitesịrị n’ọnwụ, mgbe ọ bịakwutere mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya n’ụzọ e si aga Emeọs. Tupu ha amata onye ọ bụ, ha kọọrọ ya otú o si ewute ha na otú ha si nọrọ ná mgbagwoju anya n’ihi ọnwụ Nna ha ukwu nke ha hụrụ n’anya. Gịnị ka o mere? “Ọ kọwaara ha ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ dum banyere onwe ya, malite n’ihe Mozis dere ruo n’Akwụkwọ Ndị Amụma niile.” Olee otú nke a si metụ ha n’ahụ́? Ha mesịrị gwa ibe ha, sị: “Ọ̀ bụ na obi ekporoghị anyị ọkụ mgbe ọ nọ na-agwa anyị okwu n’okporo ụzọ, mgbe ọ nọ na-akọwara anyị Akwụkwọ Nsọ nke ọma?”—Luk 24:15-32.
19 Mgbe e mesịrị n’otu ụbọchị ahụ, Jizọs na ndịozi ya na ndị ọzọ nọkọrọ. Rịba ama ihe o meere ha: “O mepere obi ha nke ọma ka ha ghọta ihe Akwụkwọ Nsọ pụtara.” (Luk 24:45) O doro anya na nnọkọ obi ụtọ ahụ chetaara ha ọtụtụ ugboro Jizọs meere ha ihe yiri nke ahụ—tinyere onye ọ bụla nke chọrọ ige ntị. Ugboro ugboro, ọ na-ekwu ihe e dere n’amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị a ma ama, kọwaa ha n’ụzọ na-akụnye ihe ọhụrụ n’obi ndị na-ege okwu ya—ha na-enweta nghọta dị ọhụrụ nke miri emi n’Okwu Chineke.
20, 21. Olee otú Jizọs si kọwaa ihe Jehova gwara Mozis n’akụkụ osisi ahụ na-enwu ọkụ?
20 Otu mgbe, Jizọs na ìgwè ndị Sadusii nọ na-ekwu okwu. Ndị Sadusii bụ ndị òtù okpukpe Juu, ndị ha na ndị nchụàjà ndị Juu na-emekọchi ihe anya. Ha ekweghị ná mbilite n’ọnwụ. Jizọs sịrị ha: “Banyere mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ọ̀ bụ na unu agụghị ihe Chineke gwara unu, sị, ‘Abụ m Chineke Ebreham na Chineke Aịzik na Chineke Jekọb’? Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama nke ndị dị ndụ.” (Matiu 22:31, 32) Ha maara akụkụ Akwụkwọ Nsọ a nke ọma. Ọ bụ nwoke ndị Sadusii na-akwanyere ùgwù nke ukwuu dere ya, ya bụ, Mozis. Ma, ị̀ ghọtara otú nkọwa ahụ si bụrụ nke na-eru n’obi?
21 Ọ bụ Mozis na Jehova kparịtara ụka ahụ n’akụkụ osisi ahụ na-enwu ọkụ, n’ihe dị ka n’afọ 1514 T.O.A. (Ọpụpụ 3:2, 6) N’oge ahụ, o ruola narị afọ atọ na iri abụọ na itoolu Ebreham nwụrụ, ruo narị afọ abụọ na iri abụọ na anọ Aịzik nwụrụ, ruokwa otu narị afọ na iri itoolu na asaa Jekọb nwụrụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova sịrị: “Abụ m” Chineke ha. Ndị Sadusii ahụ maara na Jehova adịghị ka chi ndị ọgọ mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ, nke na-achị ala mmụọ a na-akọ n’akụkọ ifo. Ee e. Ọ bụ Chineke “nke ndị dị ndụ,” dị ka Jizọs kwuru. Gịnị ka nke ahụ pụtara? Ihe ikpeazụ Jizọs kwuru na-eru n’obi, ọ sịrị: “N’ebe ọ nọ, ha niile dị ndụ.” (Luk 20:38) Jehova na-echeta ndị ohu ya ọ hụrụ n’anya nwụrụ anwụ. Ikike icheta ihe nke Chineke enweghị ókè. Ọ pụghịkwa ichefu ihe. Nzube Jehova nwere ime ka ndị ahụ si n’ọnwụ bilie bụ ihe e ji n’aka nke na a pụrụ ikwu na ha dị ndụ. (Ndị Rom 4:16, 17) Ọ̀ bụ na otú a e si kọwaa Okwu Chineke amagbughị onwe ya? Ka asịkwa ihe mere ‘o ji ju ìgwè mmadụ ahụ anya’!—Matiu 22:33.
22, 23. (a) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jizọs n’ịkọwa Okwu Chineke? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’Isi nke Iri na Otu?
22 Ndị Kraịst taa nwere ihe ùgwù nke iṅomi Jizọs n’otú o si kọwaa Okwu Chineke. N’ezie, ikike echiche anyị ezughị okè. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ mgbe, anyị na-enwe ike ịgụrụ ndị mmadụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke ha mabu ama, kọwakwaara ha ihe ụfọdụ ha na-echetụbeghị echiche banyere ya. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ na ọtụtụ ugboro ha agụwo “Ka e doo aha gị nsọ” na “Ka alaeze gị bịa” ná ndụ ha niile, ma, o nweghị mgbe ha matara aha Chineke ma ọ bụ ihe Alaeze ya bụ. (Matiu 6:9, 10) Lee ihe ùgwù magburu onwe ya anyị nwere mgbe mmadụ kwere ka anyị kọwaara ya eziokwu Baịbụl ndị a n’ụzọ doro anya ma dị mfe nghọta!
23 Ikwu ihe e dere n’Okwu Chineke, ịgbachitere ya, na ịkọwa ya bụ ụzọ bụ́ isi anyị pụrụ isi ṅomie otú Jizọs si gwa ndị mmadụ eziokwu ahụ. Ka anyị tụlezie ụzọ ụfọdụ dị irè Jizọs si mee ka eziokwu Baịbụl ruo n’obi ndị gere okwu ya.
a Ọkọ akụkọ ihe mere eme na narị afọ mbụ bụ́ Josephus, onye Farisii nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, mesịrị kwuo na a pụrụ ịgba alụkwaghịm “n’ihi ụdị ihe ọ bụla (ndị ikom na-ekwu na ụdị ihe ndị ahụ ga-eme ka a gbaa alụkwaghịm juru eju).”