Ihe A Hụrụ n’Ala Nkwa ahụ
Nazaret—Obodo Nke Onye Amụma Ahụ
“ÌGWÈ mmadụ ahụ wee na-asị, Nwoke a bụ onye amụma ahụ, Jisọs, nke si na Nazaret nke Galili bịa!” Ee, ọbụna n’oge ije ozi Jisọs, nhota nkịtị e hotara ya na-eme ka e cheta obodo Nazaret ahụ a ma ama ugbu a. Otú a, ndị ahụ na-abịa ijide ya adịghi asi na ha na-achọ Jisọs kama na ha na-acho “Jisos onye Nazaret.”—Matiu 21:11; 26:71; Jon 18: 3-5; Orụ 26:9.
Ihe osise ahụ dị n’elu na-egosi ihe i ga-ahụ ma ọ bụrụ na i gaa Nazaret n’oge a. O buru ibu karja otú ọ hà mgbe otu mmụọ ozi bịara “obodo nke Galili, a na-akpọ aha ya Nazaret” jgwa Meri na ọ ga-amụ Ọkpara Chineke. (Luk 1:26-33) Laa azụ n’oge ahụ, Nazaret dị nnọọ ka obodo nta ahụ e gosipụtara na peji na-esonụ, ụlọ ndị a rụrụ n’usoro jupụtara n’ebe ugwu. Ma eleghi anya Josef na Meri biri n’otu ụlọ yiri ndị a. Ma tupu Meri amụọ nwa ya, ha aghaghị ịga ebe ndịda ruo Betlehem, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a mụrụ Jisọs. Ha mesịri gbaga Ijipt iji chebe nwa ahụ pụọ n’atụmatụ nile nke Herọd igbu ya. Mgbe nke ahụ gasịrị, “ha wee laghachi na Galili, ruo obodo nke aka ha, bụ́ Nazaret.”—Luk 2:4, 39; Matiu 2:13-23.
Jisọs si otú a tolite, ọ bụghị n’obodo a na-ebi ndụ okomoko na ya bụ Jerusalem ma ọ bụ Tiberias, kama n’ebe dị nwayọọ. Nazaret dị na ndagwurugwu ebe ugwu dị iche iche dị n’Ebe Ndịda Galili gbara gburugburu, ebe ihe opupu, mkpụrụ vine, osisi olive, na osisi fig jupụtara. O nwere oge oyi na-adị mma n’ahụ, ma oge udu mmiri ya adịghi oké ike dị ka ọ dị n’Ebe Ugwu Galili.
Josef na-elekọta mkpa nwunye ya, ụmụ ya ndị nwoke, na ụmụ ya ndị nwanyi site n’irụ ọrụ dị ka onye ọkwankà, ma eleghị anya na-enwe otu ụlọ ọrụ dị ka nke a dị na Nazaret oge ugbu a. O nwere ike ịrụworị ógwè osisi e ji ewu elu ụlọ na ibó ọnụ ụzọ ndị e ji osisi mee maka ụlọ ndị dị n’obodo ahụ, ma ọ bụ table, oche, na ihe ndị ọzọ e ji osisi arụpụta. Anyị maara na Jisọs kiriri ma mụtakwa ihe, n’ihi na e mesiri kpọọkwa ya “onyeọkà ahụ.” (Mak 6:3; Matiu 13:55) 0 doro anya na ọrụ ịkọ ugbo a na-arụ na Nazaret dubakwara n’inwe ọrụ ndị ọzọ. Ma eleghi anya Jisọs pịri otu yoke yiri nke ahụ a na-ahụ n’ubu anụmahụ ndị a. Ka ọ dị mgbe ahụ, Josef nwere ike ijiworj ngwa ọrụ ya mee ihe imepụta ihe e ji akọ ihe ma ọ bụ ihe e ji azọcha ọka nke a ga-eji yoke ahụ na-adọkpụ. —2 Samuel 24:22; Aịsaịa 44:13.
Dị ka nwatakjri, ma eleghi anya Jisọs kpagharịrị n’ebe ndị ahụ gbara Nazaret gburugburu, dị ka ịga “Kena nke Galili,” nke dị maịlụ asatọ [13 kilomita] n’ebe ugwu, bụ́ ebe o mesiri rụọ ọrụ ebube mbụ ya. (Jọn 2:1-12) N’ịga ihe dị ka maịlụ isii [10 kilomita] n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ na-eche ihu n’ebe Ndagwurugwu nke Jezreel nakwa n’ebe Ugwu nke More, Jisọs ga-erute obodo Nain, bụ́ nke a na-ahụ na peji 17.a (Ndị Ikpe 6:33; 7:1) Cheta na n’oge ngagharị mbụ o ji kwusaa ozi ọma, Jisọs zutere ndị na-eje ili ozu n’ebe dịdebere Nain. N’ịbụ onye nwere ọmiiko, ọ kpọlitere otu nwa nwoke nke nwanyị dị ya nwụrụ.—Luk 7: 11-16.
Nazaret adịchighi n’okporo ụzọ ukwu ọ bụla dị n’ala ahụ, ma a pụrụ isi n’okporo ụzọ ndị ahụ gaa na ya. Ị pụrụ ịhụta nke a site na map ihu akwụkwọ nke 1990 Calendar of Jehovah’s Witnesses, bụ́ nke nwekwara ihe osise sara mbara banyere Nazaret n’oge a. Ụzọ ahụ si ebe ọwụwa anyanwụ gaa n’ebe ọdịda anyanwụ nke sitere na Ndagwurugwu nke Jezreel jikọtara ọdụ ụgbọ mmiri nke Acre, ma ọ bụ Ptolemais, na Osirhiri nke Galili nakwa Ndagwurugwu Jọdan. Uzọ gabigara nke ahụ bụ otu ụzọ sitere n’ebe ndịda Damaskọs ma na-agbada site Sameria ruo Jerusalem.
Nazaret nwere ụlọ nzukọ nke ya, ná mmalite ije ozi ya, Jisọs gara n’ebe ahụ “dị ka ọ na-eme mgbe dum.” Ọ gụpụtara Aisaia 61:1, 2, na-asi na ọ bụ ya ka a na-ekwu maka ya. Olee otú ụmụ amaala ndị ahụ ga-esi meghachi omume, ụfọdụ n’ime ha bụ ndị hụworo ka ọ na-eto, bụrụkwa ndị nwere ike ọbụna ịkwụwo ya ụgwọ maka ọrụ ịkwa nkà ọ rụụrụ ha? Iwe biara ha, ha nwakwara ịtụpụ ya site n’elu oké nkume, ma Jisọs gbapụrụ. (Luk 4:16-30) N’ụzọ doro anya, okwu banyere ihe o mesiri mee na Nain nakwa n’ebe ọzọ rutere Nazaret, n’ihi na mgbe ọ lọghachitere ma kuzie ihe n’ụlọ nzukọ obodo ahụ, ọ dịghị onye kwuru okwu igbu ya. Ma, “ọ rụghịkwa ọtụtụ ọrụ dị ike n’ebe ahụ,” n’ihi na ndị maara ya na Nazaret enweghị okwukwe n’ebe ọ nọ dị ka onye amụma.—Matiu 13:53-58.
Mak dekọrọ mmeghachi omume Jisọs: “Onye amụma abụghị onye a dịghị asọpụrụ, ma ọ bụghị n’ala nke aka ya, na n’etiti ikwu ya, na n’ụlọ ya.” Lee ka o si bụrụ ihe mwute na nke a bụ eziokwu banyere ọtụtụ ndị na Nazaret. Ma, anyi pụrụ iche echiche banyere obodo ahụ dị ka obodo nke Onye Amụmna ahụ bụ́ onye anyị họọrọ inye nsọpụrụ.—Mak 6:4.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Nazaret bu #2 na map ahụ dị n’ihu 1990 Calendar of Jehovah’s Witnesses. Ugwu nke More bụ nke a na-ahụ kpọmkwem n’okpuru #3.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 16]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Foto dị na peeji nke 17]
[Foto dị na peeji nke 17]
[Foto dị na peeji nke 17]