Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 52 p. 128-p. 129 para. 7
  • Jizọs Ejiri Ogbe Achịcha Ole na Ole na Azụ̀ Nyejuo Ọtụtụ Puku Mmadụ Afọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Ejiri Ogbe Achịcha Ole na Ole na Azụ̀ Nyejuo Ọtụtụ Puku Mmadụ Afọ
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jisọs Esite n’Ọrụ Ebube Zụọ Ọtụtụ Puku Mmadụ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Jizọs Nyere Ọtụtụ Puku Mmadụ Nri
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Jizọs Enye Ọtụtụ Mmadụ Nri
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ọ Mụbara Achịcha, Kwuokwa Ka E Lezie Anya Maka Ihe Iko Achịcha
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 52 p. 128-p. 129 para. 7
Ebe Jizọs na-anyawa ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ ma nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha keere ha ndị mmadụ

ISI NKE 52

Jizọs Ejiri Ogbe Achịcha Ole na Ole na Azụ̀ Nyejuo Ọtụtụ Puku Mmadụ Afọ

MATIU 14:13-21 MAK 6:30-44 LUK 9:10-17 JỌN 6:1-13

  • JIZỌS ENYE PUKU NDỊ IKOM ISE NRI

Obi tọrọ ndịozi iri na abụọ Jizọs ezigbo ụtọ n’ihi ozi ọma ha kwusara na Galili niile. Ha kọkwaara Jizọs “ihe niile ha mere nakwa ihe ha kụziri.” Ezigbo ike gwụchara ha. Ma, ha enweghịdị ohere ha ga-eji rie nri n’ihi na ọtụtụ ndị mmadụ chọ ha na-abịa. N’ihi ya, Jizọs sịrị ha: “Bịanụ ka anyị gaa zurutụ ike n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị.”—Mak 6:30, 31.

Ha banyere n’ụgbọ mmiri ma gafere Betseida gawa n’ebe dịpụrụ adịpụ nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan. Ọ ga-abụ na ha banyere ụgbọ mmiri a n’ebe dị nso na Kapaniọm. Ọtụtụ ndị mmadụ hụrụ ka ha na-apụ, ndị ọzọ anụkwa na ha na-apụ. Ha niile ji ụkwụ si n’akụkụ mmiri chụrụ ha gawa. Tupu ụgbọ mmiri Jizọs hà eruo ebe ahụ, ìgwè mmadụ ahụ anọrọla anọrọ na-eche ha.

Ka Jizọs si n’ụgbọ ahụ pụta, ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ ma nwee ọmịiko n’ebe ha nọ n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Ọ maliteziri “izi ha ọtụtụ ihe” banyere Alaeze Chineke. (Mak 6:34) Ọ gwọkwara “ndị nwere mkpa ọgwụgwọ.” (Luk 9:11) Ka oge na-aga, ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “Ebe a bụ ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị, chi ejimiekwala; sị ìgwè mmadụ a lawa, ka ha gaa n’obodo nta dị iche iche zụrụ ihe ha ga-eri.”—Matiu 14:15.

Jizọs zara ha, sị: “Ọ dịghị mkpa ka ha laa; Nyenụ ha ihe ka ha rie.” (Matiu 14:16) Ọ bụ eziokwu na Jizọs ma ihe ọ chọrọ ime, ọ jụrụ Filip ajụjụ iji mara ihe ọ ga-ekwu. Ọ jụrụ ya, sị: “Olee ebe anyị ga-azụta achịcha ka ndị a rie?” Ihe mere o ji bụrụ Filip ka ọ jụrụ ajụjụ a bụ n’ihi na ọ bụ onye Betseida, bụ́ obodo dị nso ebe ahụ. Ma, ịzụta achịcha abụghị ebe okwu biri. Ụmụ nwoke nọ ebe ahụ ruru puku ise. A gụkọta ma ụmụ nwaanyị ma ụmụntakịrị, ha ga-eru ihe dị ka puku mmadụ iri. N’ihi ya, Filip zara ya, sị: “Achịcha e ji narị mkpụrụ ego dinarịọs abụọ [otu dinarịọs bụ ego ọrụ ụbọchị] zụọ agaghị ezu ime ka onye ọ bụla n’ime ha nweta ntakịrị.”—Jọn 6:5-7.

Ebe Jizọs na-agwa nwatakịrị nwoke nwere ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ okwu

Andru kwukwara, sị: “Lee otu nwa okoro nta nke bu ogbe achịcha ọka bali ise na ntakịrị azụ̀ abụọ. Ma olee ihe ihe ndị a ga-abụrụ ọtụtụ mmadụ há otú a.” Ọ ga-abụ na Andru kwuru ihe a iji gosi na ọ gaghị ekwe omume inye ìgwè mmadụ niile ahụ nri.—Jọn 6:9.

Ihe a na-eme n’oge opupu ihe ubi, mgbe ọ fọrọ obere ka e mee Ememme Ngabiga nke afọ 32. N’ihi ya, ahịhịa ndụ juru ebe ahụ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gwa ndị mmadụ ka ha nọrọ ala n’ahịhịa n’ìgwè iri ise iri ise, nakwa n’ìgwè otu narị otu narị. O weere ogbe achịcha ise ahụ na azụ̀ abụọ ahụ ma kpee ekpere. Ọ nyawara ogbe achịcha ndị ahụ, keriekwa azụ̀ ndị ahụ. Jizọs weere ha nye ndị na-eso ụzọ ya, ka ha kesaara ìgwè mmadụ ahụ. Ọ dị ịtụnanya na ìgwè mmadụ ahụ rigidere nri ruo mgbe afọ juru onye ọ bụla.

Mgbe ha richara, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Tụtụkọtanụ ihe ha rifọrọ, ka ihe ọ bụla ghara ịla n’iyi.” (Jọn 6:12) Mgbe ha tụtụkọtara ihe e rifọrọ erifọ, o juru nkata iri na abụọ.

  • Gịnị mere Jizọs ji chọọ ka ya na ndịozi ya gaa ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị?

  • Olee ebe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya gara, gịnịkwa mere mgbe ha ruru ebe ahụ?

  • Gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs gwara ya ka o mee, ma olee ihe Jizọs meere ìgwè mmadụ ahụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya