Mgbe ‘Ifufe Na-efegide Anyị’
N’ịkọwa ahụmahụ ahụ mere eme n’ezie nke ndị na-eso ụzọ Jisọs nwere ka ha na-adọga iji ụgbọ mmiri gafee Osimiri Galili, onye so dee Oziọma ahụ bụ́ Mak na-ekwu na ha “na-adọgbu onwe ha n’ọnyịnya ụgbọ ha, n’ihi na ifufe na-efegide ha.” Mgbe Jisọs ka nọ n’ikperé mmiri, ọ hụrụ ọnọdụ ha ma jiri ụzọ ọrụ ebube jee ije n’elu osimiri ahụ iji jekwuru ha. Mgbe ọ rịgokwuuru ha n’ụgbọ, ifufe ahụ febiri.—Mak 6:48-51.
Otu onye ahụ so dee Bible kọrọ na tupu mgbe ahụ, “ajọ ifufe [fere].” Mgbe nke ahụ mere, Jisọs “baara ifufe mba . . . , ifufe wee febie, oké ndajụ wee dị.”—Mak 4:37-39.
Ọ bụ ezie na anyị onwe anyị taa enweghị ihe ùgwù nke ịhụ ọrụ ebube ndị dị otú ahụ, anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site na ha. Dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè bụ́ ndị na-ebi n’oge ndị dị ize ndụ, anyị abụghị ndị ifufe nke ahụhụ na-adịghị efesa. (2 Timoti 3:1-5) N’ezie, mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị anyị ka ahụhụ e jikọtara ya na ule onwe onye ọ̀ dị ukwuu dị ka oké ifufe. Ma e nwere ihe ngwọta! Jisọs na-akpọ òkù, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.”—Matiu 11:28.
Mgbe o yiri ka ‘ifufe ọ̀ na-efegide anyị,’ anyị pụrụ inwe “oké ndajụ” nke obi. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịtụkwasị obi ná nkwa na-adịghị agha agha nke Jehova Chineke.—Tụlee Aịsaịa 55:9-11; Ndị Filipaị 4:5-7.