-
Nnwogha Kraịst Gosiri Otú Ebube Ya Ga-adị n’ỌdịnihuJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Ka Jizọs nọ na-akụziri ndị mmadụ ihe na Sesaria Filipaị, nke dị ihe dị ka kilomita iri abụọ na ise ma e si ya gawa Ugwu Hemọn, o nwere otu ihe o kwuru gbara ndịozi ya gharịị. Ọ sịrị: “N’ezie, ana m asị unu na e nwere ụfọdụ n’ime ndị guzo n’ebe a bụ́ ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị ruo mgbe ha bu ụzọ hụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’alaeze ya.”—Matiu 16:28.
Ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na-eche ihe ihe ahụ Jizọs kwuru pụtara. Mgbe ihe dị ka otu izu gachara, Jizọs kpọọrọ mmadụ atọ n’ime ndịozi ya, ya bụ, Pita, Jems, na Jọn gbagoo n’otu ugwu dị ezigbo elu. O nwere ike ịbụ na chi ejiela mgbe ahụ n’ihi na ndịozi ya atọ a nọ na-ero ụra. Ka Jizọs nọ na-ekpe ekpere, o nwoghara n’ihu ha. Ndịozi ya a hụrụ ka ihu ya na-acha ka anyanwụ, hụkwa ka uwe ya na-enwu gbaa dị ka ìhè.
-
-
Nnwogha Kraịst Gosiri Otú Ebube Ya Ga-adị n’ỌdịnihuJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
O doro anya na ọhụụ a mere ka obi sikwuo Jizọs na ndịozi ya ike. Ha hụpeere ebube nke Alaeze Kraịst. Ndị na-eso ụzọ ya si otú ahụ hụ “Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’alaeze ya,” otú ahụ Jizọs kwere ha nkwa na ha ga-ahụ ya. (Matiu 16:28) Mgbe ahụ ha nọ n’ugwu ahụ, ndịozi Jizọs “ji anya ha hụ ịdị ebube ya.” Jizọs egosighị ndị Farisii ihe ịrịba ama na-egosi na ọ bụ ya ka Chineke ga-ahọpụta ka ọ bụrụ Eze n’agbanyeghị na ha nọ na-achọ ka o gosi ha ya. Ma, e mere ka ụfọdụ ndịozi Jizọs hụ mgbe Jizọs nwoghara nke mere ka obi sikwuo ha ike na ọ bụ Jizọs ka e buru n’amụma na ọ bụ ya ga-achị n’Alaeze Mesaya ahụ. Ọ bụ ya mere Pita ji mechaa dee, sị: “E mewo ka okwu amụma ahụ bụrụ ihe anyị ji n’aka karị.”—2 Pita 1:16-19.
-