-
Jehova Na-eji Ozi Gị Sitere ná Mkpụrụ Obi Dum Akpọrọ IheỤlọ Nche—1997 | Ọktoba 15
-
-
16. (a) Olee otú Jisọs si bịa hụ onyinye nwanyị dara ogbenye nke di ya nwụrụ? (b) Gịnị bụ ọnụ ahịa nke mkpụrụ ego nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ?
16 Ụbọchị ole na ole nke ahụ gasịrị, na Nisan 11, Jisọs nọrọ ụbọchị nile n’ụlọ nsọ ahụ, ebe a mara ikike ya aka, ọ zakwara ajụjụ na-enye nsogbu banyere ụtụ isi, mbilite n’ọnwụ, na okwu ndị ọzọ. Ọ katọrọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii maka, tinyere ihe ndị ọzọ, ‘iripịa ụlọ ndị inyom di ha nwụrụ.’ (Mak 12:40) Mgbe ahụ Jisọs ewere oche, eleghị anya n’Ogige Ndị Inyom, bụ́ ebe, dị ka ọdịnala ndị Juu si dị, e nwere igbe ụtụ 13. Ọ nọdụrụ ala ruo nwa oge, na-ekiri nke ọma ihe na-emenụ ka ndị mmadụ na-atụbanye onyinye ha. Ọtụtụ ndị ọgaranya bịara, ụfọdụ ikekwe na-enwe ọdịdị ezi omume onwe onye, ọbụna n’oké ngosi. (Tụlee Matiu 6:2.) Anya Jisọs legidere otu nwanyị. O nwere ike anya nkịtị agaghị ahụ ihe ọ bụla dị ịrịba ama banyere ya ma ọ bụ onyinye ya. Ma Jisọs, onye pụrụ ịmata obi ndị ọzọ, maara na ọ bụ “ogbenye, nke di ya nwụrụ.” Ọ makwaara kpọmkwem ókè onyinye ya hà—“ego nta abụọ, nke mere otu farthing.”b—Mak 12:41, 42.
-
-
Jehova Na-eji Ozi Gị Sitere ná Mkpụrụ Obi Dum Akpọrọ IheỤlọ Nche—1997 | Ọktoba 15
-
-
b Nke ọ bụla n’ime mkpụrụ ego ndị a bụ lepton, mkpụrụ ego ndị Juu kasị nta e ji eme ihe n’oge ahụ. Lepton abụọ na 1/64 nke ụgwọ ọrụ otu ụbọchị hà nhata. Dị ka Matiu 10:29 si kwuo, maka mkpụrụ ego otu assarion (nke ha ka lepton asatọ), mmadụ pụrụ ịzụta egwele abụọ, ndị so ná nnụnụ ndị kasị ọnụ ala ndị ogbenye ji emere nri. Ya mere nwanyị a di ya nwụrụ dara ogbenye n’ezie, n’ihi na o nwere nanị ọkara ego a chọrọ iji zụta otu egwele, nke na-ezutụghị maka otu nri.
-