Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbv isiokwu 1
  • Mak 1:15—“Alaeze Chineke Abịala Nso”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mak 1:15—“Alaeze Chineke Abịala Nso”
  • Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mak 1:15 Pụtara
  • Mgbe E Kwuru Ihe Dị na Mak 1:15
  • Ihe Jizọs Kụziri Banyere Alaeze Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Alaeze Chineke Na-achị
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Ihe Alaeze Chineke Pụrụ Ịpụta nye Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Alaeze Chineke Ọ̀ Bụ Ihe Dị Mmadụ n’Obi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
ijwbv isiokwu 1

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Mak 1:15—“Alaeze Chineke Abịala Nso”

“Oge a kara aka eruola, Alaeze Chineke eruokwala nso. Chegharịanụ, kwerekwanụ n’ozi ọma.”​—Mak 1:​15, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

“Oge ezuola, alaeze Chineke abịala nso. Chegharịa ma kwerenụ n’oziọma.”​—Mak 1:​15, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

Ihe Mak 1:15 Pụtara

Jizọs Kraịst kwuru na Alaeze Chinekea “abịala nso” ma ọ bụ ‘eruola nso’ maka na yanwa, bụ́ Eze ga-achị n’Alaeze ahụ, nọ ebe ahụ mgbe ahụ.

Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na Alaeze ahụ amalitela ịchị. N’eziokwu, Jizọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya mata na Alaeze ahụ ka ga-abịa n’ọdịnihu. (Ọrụ Ndịozi 1:​6, 7) Ma, Jizọs bịara kpọmkwem n’oge a kara aka, ya bụ, n’afọ Baịbụl buru amụma na Eze Alaeze ahụ ga-abịa.b N’ihi ya, mgbe Jizọs sịrị: “Oge a kara aka eruola,” ihe ọ na-ekwu bụ na oge ọ ga-amalite izi ndị mmadụ ozi ọma gbasara Alaeze ahụ eruola.​—Luk 4:​16-21, 43.

Ọ bụrụ na ndị mmadụ chọrọ ka ozi ọma Alaeze ahụ baara ha uru, ha kwesịrị ichegharị. Ihe ọ pụtara bụ na mmehie ndị ha mere n’oge gara aga kwesịrị iwute ha. Ha kwesịkwara ịna-ebi ndụ otú Chineke chọrọ. Ndị chegharịrị ná mmehie ha gosiri na ha nwere okwukwe n’ozi ọma gbasara Alaeze Chineke nke ga-achị n’ọdịnihu.

Mgbe E Kwuru Ihe Dị na Mak 1:15

Jizọs kwuru ihe dị n’amaokwu a mgbe ọ malitere ozi ọma ya na Galili. E kwuru ihe yiri ya na Matiu 4:17. N’ebe ahụ, a sịrị na “malite n’oge ahụ,” Jizọs kwusawara ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụ Alaeze Chineke bụ isiokwu ozi ọma Jizọs ziri. N’eziokwu, e kwuru gbasara Alaeze ahụ ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu narị ugboro n’akwụkwọ anọ ndị a na-akpọ Ozi Ọma.c Ọ bụkwa Jizọs kwuru ọtụtụ n’ime ha. Na Baịbụl, Jizọs kwuru gbasara Alaeze Chineke karịa ka o kwuru gbasara ihe ndị ọzọ.

Gụọ Mak isi 1 na ihe ndị e dere n’ala ala peeji nakwa ihe ndị e dere n’etiti peeji ya.

a Alaeze Chineke bụ ọchịchị Chineke hiwere n’eluigwe iji mezuo nzube ya maka ụwa. (Daniel 2:44; Matiu 6:10) Ị chọọ ịhụ ebe a kọwakwuru Alaeze a, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Alaeze Chineke?”

b Jizọs ga-abụ eze iji mezuo otu n’ime amụma ndị e buru gbasara Mezaya. Mezaya ahụ bụ onye pụrụ iche na-anọchite anya Chineke. Ị chọọ ịhụ amụma ndị e buru na Baịbụl gosiri na ọ bụ Jizọs bụ Mezaya ahụ, gụọ isiokwu bụ́ “Amụma Ndị E Buru Gbasara Mesaya Hà Na-egosi n’Eziokwu na Ọ Bụ Jizọs Bụ Mesaya?”

c Akwụkwọ anọ ndị a na-akpọ Ozi Ọma bụ akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, nke a na-akpọkarị Agba Ọhụrụ. Ọ bụ na ha anọ ka e dere gbasara otú Jizọs si bie ndụ na otú o si jee ozi n’ụwa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya