Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 7/15 p. 30
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Gịnị Ga-abụkwa Ihe Ịrịba Ama nke Ọnụnọ Gị?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • “Gwa Anyị, Olee Mgbe Ihe Ndị A Ga-abụ?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ala Ọma Jijiji, Amụma Bible, Na Gị Onwe Gị
    Teta!—2002
  • “Ọgwụgwụ Ụwa” Ọ̀ Dị Nso?
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 7/15 p. 30

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Aghọtara m na a na-eji okwu Grik bụ́ “toʹte” (mgbe ahụ) akọwa ihe na-esochi. N’ihi ya gịnị mere Matiu 24:9 ji na-agụ, sị: “Mgbe ahụ [“toʹte”] ka ha ga-arara unu nye ná mkpagbu,” ebe ihe ndekọ yiri ya nke dị na Luk 21:12 na-asị: “Ma mgbe ihe ndị a nile aka-emeghị, ha ga-atụkwasị unu aka ha, sogbuokwa unu”?

O ziri ezi na a pụrụ iji toʹte kọwaa ihe na-esonụ, ihe na-esote n’usoro, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ma ọ dịghị mkpa ka anyị ghọta na nke a bụ nanị ụzọ Bible si eji okwu ahụ eme ihe.

Akwụkwọ bụ́ A Greek-English Lexicon of the New Testament and Other Early Christian Literature, nke Bauer, Arndt, na Gingrich dere, na-egosi na a na-eji okwu ahụ bụ́ toʹte eme ihe n’echiche abụọ bụ isi n’ime Akwụkwọ Nsọ.

Otu bụ “n’oge ahụ.” Nke a pụrụ ịbụ “mgbe ahụ gara aga.” Otu ihe atụ e nyere bụ Matiu 2:17: “Mgbe ahụ ka e mezuru okwu e kwuru site n’ọnụ Jeremaịa onye amụma.” Nke a adịghị ezo aka n’ihe dị n’usoro kama ọ na-egosi otu oge kpọmkwem gara aga, n’oge ahụ. N’otu aka ahụ, a pụrụ iji toʹte mee ihe “banyere ọdị[nihu] mgbe ahụ.” A na-achọta otu ihe atụ ná 1 Ndị Kọrint 13:12: “N’ihi na ugbu a anyị ji enyo hụ ihe, n’ime ilu; ma mgbe ahụ anyị ga-ahụ ihu na ihu: ugbu a m maara ná mkpirikpi; ma mgbe ahụ m ga-amazu dị ka a mazukwaara m.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’ebe a Pọl ji toʹte mee ihe n’echiche nke ‘n’oge ahụ dị n’ihu.’

Dị ka akwụkwọ ọkọwa okwu a si kwuo, ojiji nke ọzọ e ji toʹte mee ihe bụ “iji kọwaa ihe ga-esochi ka oge na-aga.” Akwụkwọ ọkọwa okwu a na-enye ọtụtụ ihe atụ ndị a na-achọta n’ihe ndekọ atọ nke azịza Jisọs nyere n’ajụjụ nke ndị ozi ahụ banyere ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya.a Dị ka ihe atụ nke ojiji e ji toʹte mee ihe “iji kọwaa ihe ga-esochi ka oge na-aga,” akwụkwọ ọkọwa okwu ahụ zoro aka na Matiu 24:10, 14, 16, 30; Mak 13:14, 21; na Luk 21:20, 27. Ịtụle ihe ndị gbara okwu ahụ gburugburu na-egosi ihe mere a ga-eji nwee nghọta ziri ezi nke ihe na-esote ka oge na-aga. Nke a na-enyekwa aka n’ịghọta amụma Jisọs nke nwere mpụta nke ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.

Otú ọ dị, ọ dịghị mkpa ka anyị kwubie na ebe ọ bụla toʹte pụtara n’ihe ndekọ ndị a aghaghị ịkọwa ihe ga-esochi ka oge na-aga. Dị ka ihe atụ, na Matiu 24:7, 8, anyị na-agụ na Jisọs buru amụma na mba ga-ebili imegide mba nakwa na a ga-enwe ụkọ nri na ala ọma jijiji. Amaokwu nke 9 gara n’ihu na-asị: “Mgbe ahụ ka ha ga-arara unu nye ná mkpagbu, ha ga-egbukwa unu: mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ọ̀ ga-abụ ihe ezi uche dị na ya ịghọta na agha, ụkọ nri, na ala ọma jijiji ahụ e buru n’amụma aghaghị imezucha, na ikekwe kwụsị, tupu mkpagbu ahụ enwee ike ịmalite?

Ezi uche adịghị na nke ahụ, ihe anyị maara banyere mmezu nke narị afọ mbụ adịghịkwa akwado ya. Ihe ndekọ dị n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi na-ekpughe na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ndị òtù nke ọgbakọ ọhụrụ nke ndị Kraịst malitesịrị ime nkwusa, ha nwetara mmegide siri ike. (Ọrụ 4:5-21; 5:17-40) Anyị apụghị ikwu n’ezie na agha, ụnwụ nri, na ala ọma jijiji ahụ ndị Jisọs kwuru banyere ha mere tupu mkpagbu oge mbụ ahụ. N’ụzọ megidere ya, mmegide ahụ bịara “tupu” ọtụtụ n’ime ihe ndị ọzọ ahụ e buru n’amụma, bụ́ nke kwekọrọ n’otú Luk si kwuo ya: ‘Ma mgbe ihe ndị a nile aka-emeghị, ha ga-atụkwasị unu aka ha, sogbuokwa unu.’ (Luk 21:12) Nke ahụ ga-enye echiche bụ́ na na Matiu 24:9, e ji toʹte mee ihe n’echiche nke “n’oge ahụ.” N’oge a ga na-enwe agha, ụnwụ nri, na ala ọma jijiji, ma ọ bụ n’oge ahụ, a ga-akpagbu ndị na-eso ụzọ Jisọs.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a E depụtara ihe ndekọ ndị a yiri ibe ha ndị dị na Matiu, Mak, na Luk na kọlụm na kọlụm na peji nke 14 na 15 nke Ụlọ Nche nke February 15, 1994. E depụtara ebe ndị a sụgharịrị toʹte, “mgbe ahụ,” ná mkpụrụ okwu gbara okpotokpo.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya