Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 3/15 p. 24-25
  • O Nwetara Ọchịchọ Obi Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • O Nwetara Ọchịchọ Obi Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Amụma Nile nke Mesaịa Na-enye Olileanya
  • Ma E Nwebeghị Mesaịa!
  • Nwoke Na-atụ Egwu Chineke
  • Okwu Amụma Ndị Simeon Kwuru
  • Ihe Simeon Gwara Meri
  • Simeon Ejiri Amụma Dị Iche Iche nke Mesaịa Mee Ihe
  • Nwa nke Nkwa ahụ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Nwa ahụ E Kwere ná Nkwa
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ụzọ Ị Pụrụ Isi Bịaruo Chineke Nso
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • O Chere ‘Ihe Ihe Ndị Ahụ Pụtara’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 3/15 p. 24-25

O Nwetara Ọchịchọ Obi Ya

Ọ̀ BỤ ọchịchọ obi gị ịhụ ka Alaeze Mesaịa ahụ weghaara ịchịisi n’elu ụwa dum? Ọ bụrụ otú ahụ, ị na-achọsi ike, na-ekpekwa ekpere maka ngọzi elu ala bụ́ ndị e kwere nkwa ha n’okpuru Alaeze eluigwe ahụ. Mgbe ahụ, nwee ndidi, n’ihi na “osisi nke na-enye ndụ ka ihe a na-achọsi ike bụ, mgbe ọ bịaruworo.”​—⁠Ilu 13:12; Jemes 5:​7, 8.

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ gara aga, otu nwoke bụ́ “onye ezi omume na onye na-atụ egwu Chineke” nke aha ya bụ Simeon biri na Jerusalem. O nwere okwukwe n’amụma ndị metụtara Mesaịa, o jikwa ndidi “na-eche nkasi obi nke Israel.”​—⁠Luk 2:25.

Amụma Nile nke Mesaịa Na-enye Olileanya

Ọ bụ Jehova kpatara amụma Mesaịa mbụ​—⁠nke nyere ihe a kpọrọ mmadụ na-eme mmehie, na-anwụkwa anwụ, olileanya. Chineke buru amụma ọbịbịa nke Mkpụrụ “nwanyị,” ma ọ bụ nzukọ eluigwe na ala ya.​—⁠Jenesis 3:15.

E gosipụtara Onye ahụ ịbụ mkpụrụ Abraham, Jekọb bukwara amụma ọbịbịa ya. (Jenesis 22:17, 18; 49:10) E toro ịdị ebube nke Alaeze Mesaịa ahụ otuto n’abụ ọma ndị ahụ. (Abụ Ọma 72:​1-⁠20) Aịsaịa buru amụma na nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ga-amụ Mkpụrụ ahụ, Maịka bukwara amụma na ọmụmụ ya ga-abụ na Betlehem. (Aịsaịa 7:14; Maịka 5:2) Ndị a bụ nanị ole na ole n’ime ọtụtụ amụma ndị metụtara Mesaịa.

Ma E Nwebeghị Mesaịa!

Cheghachi echiche azụ, ka e werekwa ya na narị afọ mbụ O.A. na-eru nso. Amụma mbụ Chineke banyere Mesaịa adịwo 4,000 afọ ugbu a. Ndị Juu enwewo ahụmahụ nke mbibi nke ụlọ nsọ Jehova, ntọgbọrọ n’efu nke ala nna ha, ndọrọ laa n’agha na Babilọn nke were 70 afọ, na 500 afọ ọzọ nke ịnọ n’okpuru ndị ọchịchị bụ́ ndị Jentaịl. Ma e nwebeghị Mesaịa!

Lee aha agụụ ndị Juu na-atụ egwu Chineke nwere maka ọbịbịa Mesaịa ahụ! Site na ya ọtụtụ ngọzi ga-erugara ha, rugakwara mba nile.

Nwoke Na-atụ Egwu Chineke

N’etiti ndị Juu na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị nọ n’agụụ, na-ekpekwa ekpere maka ọbịbịa Mesaịa ahụ, e nwere Simeon, onye na-ekwesị ntụkwasị obi nke meworo agadi, bụ́ onye na-ejere Jehova ozi ma biri n’isi obodo Judia. Ihe pụrụ iche emewo Simeon.

Chineke atụkwasịwo Simeon mmụọ nsọ ya, jirikwa otu mkpughe nyeghachi ya ụgwọ ọrụ. Simeon agaghị anwụ ruo mgbe ọ hụworo Onye nke ga-abụ Mesaịa ahụ. Ma ọtụtụ ụbọchị na ọnwa nọ na-agafe. Simeon na-aka nká, o sikwaara ya ike ịtụ anya ịdịkwu ndụ ruo ogologo oge. À ga-emezu nkwa Chineke kwere ya?

Otu ụbọchị (na 2 T.O.A.), otu di na nwunye ọhụrụ ku otu nwa ọhụrụ si Betlehem bịa n’ụlọ nsọ ahụ. Mmụọ nsọ kpugheere Simeon na nke a bụ ụbọchị a nọworo ogologo oge na-eche. Ọ gara n’ụlọ nsọ ahụ, ebe ọ ga-ahụ Onye ahụ nke ndị amụma deworo banyere ya. Ka ọ na-aga ọsọ ọsọ ruo otú ahụ ya kaworo nká ga-ekwe ya, ọ hụrụ Josef, Meri, na nwa ahụ.

Lee aha oké ọṅụ Simeon ji kuru nwa ahụ bụ́ Jisọs! Onye a ga-abụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa​—⁠“Kraịst nke Onyenwe anyị.” N’afọ ndụ agadi ahụ, Simeon apụghị ile anya ịhụ ka Jisọs rụzuru ọrụ Ya nke elu ala. Ma, ọ bụ ihe dị ebube ịhụ ya dị ka nwa ọhụrụ. Amụma nile nke Mesaịa na-amalite imezu. Lee ka Simeon si nwee obi ụtọ! Ugbu a afọ ga-eju ya idina n’ụra n’ọnwụ ruo mbilite n’ọnwụ ahụ.​—⁠Luk 2:​25-⁠28.

Okwu Amụma Ndị Simeon Kwuru

Ka Simeon weliri olu ya n’ito Jehova, anyị nụrụ ka ọ na-asị: “Onyenwe m, ugbu a ka Ị na-ahapụ ohu Gị ka ọ laa n’udo, dị ka okwu Gị si dị; n’ihi na anya m ahụwo nzọpụta Gị, nke I doziri n’ihu ndị nile; ìhè a ga-ekpughere mba nile ọzọ, na ebube ndị Gị, bụ́ Israel.” Nna kuchiri Jisọs, bụ́ Josef, na nne Ya, Meri, nọgidere na-enwe ijuanya banyere okwu ndị a.​—⁠Luk 2:​29-⁠33.

Ọnọdụ ihu Simeon na-egbukepụ egbukepụ ka ọ na-agọzi Josef na Meri, ọ ghaghị ịbụ na ọ na-arịọ ngọzi Jehova n’isi ha n’imezu ibu ọrụ ndị ha nwere n’ihe banyere nwa ahụ. Mgbe ahụ ihu agadi nwoke ahụ tachiri. Ka ọ na-agwa nanị Meri okwu, o kwukwasịrị: “Lee, e dowo Nwa nke a ka Ọ bụrụ ọdịda na mbili nke ọtụtụ mmadụ n’Israel; ka Ọ bụrụkwa ihe ịrịba ama a na-ekwu okwu megide; ma mmà agha ga-adụwakwa mkpụrụ obi gị onwe gị; ka e wee kpughee echiche nke si n’ọtụtụ obi pụta.”​—⁠Luk 2:​34, 35.

Ihe Simeon Gwara Meri

Cheedị echiche otú ọ dị Meri. Gịnị ka Simeon bu n’uche? Ụfọdụ ga-anakwere Kraịst wee bụrụ ndị e buliri elu site n’ọnọdụ ha nke ndị dawororịị ada. Otú ọ dị, ndị ọzọ ga-ajụ ya, kpọbie ụkwụ n’ebe ọ nọ, wee daa. Dị ka e buru n’amụma, Jisọs ga-aghọ nkume ịkpọbi ụkwụ nye ọtụtụ ndị Juu. (Aịsaịa 8:14; 28:16) Okwu ndị Simeon kwuru apụtaghị na ndị Israel n’otu n’otu ga-ebu ụzọ daa n’ekweghị ekwe ma mesịa bilie n’ikwere site n’ịnakwere Jisọs. Kama nke ahụ, mmeghachi omume n’ebe ọ nọ ga-adịgasị iche n’ebe ndị dị iche iche nọ, na-ekpughe echiche nke obi ọtụtụ ndị ma na-eduga n’ikpe Chineke n’ebe ha nọ maka ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. Nye ndị na-ekweghị ekwe, ọ ga-abụ ihe ịrịba ama, ma ọ bụ ihe ịsọ oyi. Site n’itinye okwukwe n’ebe ọ nọ, a ga-ebuli ndị ọzọ elu site n’ịbụ ndị nwụrụ anwụ ná njehie na mmehie ka ha nwee nguzo ezi omume n’ebe Chineke nọ. Ihe ndị mmadụ ga-eme n’ihe banyere Mesaịa ahụ ga-egosi ihe dị ha n’obi.

Gịnị banyere okwu Simeon ndị bụ́: “Mmà agha ga-adụwakwa mkpụrụ obi gị onwe gị”? E nweghị ihe ọ bụla n’Akwụkwọ Nsọ nke na-egosi na e ji mmà agha dụwaa Meri obi n’ezie. Ma, ọjụjụ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ jụrụ Jisọs ga-ewetara ya obi mgbu. Leekwa ka o si bụụrụ Meri ihe mgbu ịhụ ka a kpọgidere Jisọs n’elu osisi! Nke a bụ dị ka a ga-asị na e ji mma agha dụwaa ya obi.

Simeon Ejiri Amụma Dị Iche Iche nke Mesaịa Mee Ihe

Mmụọ Chineke akwaliwo Simeon iji amụma dị iche iche nke Mesaịa mee ihe banyere Jisọs. Simeon pụrụ ịhapụ ndụ a n’udo, ma ọ bụ n’ahụ ịdị jụụ, ‘n’ihi na anya ya ahụwo nzọpụta Chineke nke O doziworo n’ihu ndị nile; ìhè a ga-ekpughere mba nile ọzọ, na ebube ndị Ya, bụ́ Israel.’ (Luk 2:​30-⁠32) Lee nnọọ ka nke a si kwekọọ n’okwu amụma ndị Aịsaịa kwuru!

Onye amụma ahụ buru amụma, sị: “A ga-ekpughekwa ebube Jehova, anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, ga-ahụkọkwa ya n’otu: n’ihi na ọnụ Jehova ekwuwo.” “Enyewokwa m [Jehova] gị ka ị [Mesaịa ahụ] bụrụ ìhè nke mba nile, ịbụ nzọpụta m ruo nsọtụ ụwa.” (Aịsaịa 40:5; 42:6; 49:6; 52:10) Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na eziokwu ndị a na-ahụ anya anwapụtawo eri mgbe na Mesaịa ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, bụ ezigbo ìhè nke mba nile, Onye ga-ewepụ ihe mkpuchi nke ikpu ìsì ime mmụọ ma wetara ndị mmadụ nzọpụta.

Okwu Chineke ekwughị ihe ọ bụla ọzọ banyere Simeon mere agadi. Ọ ghaghị ịbụ na ọ nwụrụ tupu Kraịst emeghee ụzọ maka ndụ eluigwe. Mgbe ahụ, n’oge na-adịghị anya, a ga-akpọlite Simeon bịa ná ndụ elu ụwa. Lee aha ọṅụ ọ pụrụ inwe​—⁠tinyere gị onwe gị⁠—​n’ụwa ọhụrụ ahụ n’okpuru Alaeze Mesaịa nke Chineke!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya