Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 4/15 p. 28
  • Ị̀ Na-echeta?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-echeta?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ̀ bụ Jizọs bụ Maịkel Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ònye Bụ Maịkel Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ònye Bụ Maịkel Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi?
    Teta!—2002
  • Ònye Bụ Maịkel Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 4/15 p. 28

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ chọpụtawo mbipụta ndị na-adịghị anya gara aga nke Ụlọ Nche dị ka ndị baara gị ezi uru? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị mere na i jighị ihe ndị a sonụ nwalee ikike ncheta ihe gị?

◻ Eziokwu dịgasị aṅaa na-emegide ido ebe ahụ a sị na ọ bụ ebe a nọrọ mụọ Jisọs nsọ?

Bible akpọtụghị kpọmkwem ebe a nọrọ mụọ Jisọs aha. Ihe ndekọ Oziọma nke Matiu na Luk kọrọ nanị isi ihe ndị dị mkpa. (Matiu 2:1, 5; Luk 2:4-7) Ịgụ Jọn 7:40-42 na-egosi na ndị mmadụ n’ozuzu ha amaghị ebe a nọrọ mụọ ya, ụfọdụ na-eche na a mụrụ ya na Galili. Ọzọkwa, n’oge ndụ elu ala nke Jisọs n’onwe ya, ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ kọsara ihe banyere ọmụmụ ya.—12/15, peji 5.

◻ Olee ụzọ onye Kraịst pụrụ isi nọgide na-enwe ọṅụ mgbe ọ na-anagide ọnwụnwa dị iche iche nke ọrịa anụ ahụ, obi ịda mbà, na ihe isi ike nke akụ na ụba?

Okwu Chineke na-enye nkasi obi na nduzi dị mkpa. Site n’ịgụ na ige ntị n’abụ ọma ndị ahụ, a pụrụ inweta ume ọhụrụ dị mkpa. Devid tụụrụ anyị aro, sị: “Tụkwasị Jehova ihe o nyeworo gị dị ka ibu, ya onwe ya ga-anagidekwa gị.” O mesikwara anyị obi ike na Jehova bụ n’ezie “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 55:22; 65:2) Nzukọ Jehova, site n’akwụkwọ ya dị iche iche na ndị okenye ọgbakọ, dị njikere mgbe nile inyere anyị aka ịgba mgba megide ihe isi ike anyị dị iche iche.—1/1, peji 14-15.

◻ Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe o kwuru n’oge ọ nọ n’ụzọ na-eje ebe a ga-akpọgbu ya, sị: “A sị na ha na-eme ihe ndị a mgbe osisi dị ndụ, gịnị ka a ga-eme mgbe ọ kpọrọ nkụ?” (Luk 23:31)

Jisọs na-ezo aka n’ebe osisi nke bụ́ mba ndị Juu ahụ dị. N’ihi ọnụnọ Jisọs na ihe fọdụrụ ná ndị Juu ndị kweere na ya, mba ahụ ka nwetụrụ mmiri ndụ n’ime ya. Otú ọ dị, mgbe e wepụsịrị ndị a nile site ná mba ahụ, ọ bụ nanị osisi nke nwụworo anwụ n’ụzọ ime mmụọ ga-afọdụ, mba nke kpọnwụworo akpọnwụ dị ka otu òtù.—1/15, peji 9.

◻ Olee ụzọ “ndị dị ọcha n’obi” ndị ahụ e kwuru okwu ha na Matiu 5:8, pụrụ isi ‘hụ Chineke’?

Ha ‘na-ahụ Chineke’ mgbe ha hụtara ihe ọ na-eme n’ihi ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. (Tụlee Ọpụpụ 33:20; Job 19:26; 42:5.) Otú ọ dị, okwu Grik dị na Matiu 5:8 nke a sụgharịrị ịbụ ‘hụ’ pụtakwara “iji uche hụ, ịghọta, ịmata.” Ebe ọ bụ na Jisọs gosipụtara n’ụzọ zuru okè ọdịdị onye Chineke bụ, inyoba anya n’ime ọdịdị onye ahụ nyeere “ndị dị ọcha n’obi” aka ‘ịhụ Chineke.’ (Jọn 14:7-9)—1/15, peji 16.

◻ N’ihi gịnị ka anyị ji kwubie na ọ bụ Jisọs bụ onye isi mmụọ ozi ahụ bụ Maịkael?

Okwu Chineke hotara nanị otu onye isi mmụọ ozi, o kwukwara okwu banyere mmụọ ozi ahụ n’ụzọ na-ezo aka n’Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nke e meworo ka o si n’ọnwụ bilie, sị: “Onyenwe anyị onwe ya ga-ewere oké ịkpọ òkù, were olu isi mmụọ ozi, werekwa opi nke Chineke, si n’eluigwe rịdata.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:16) Na Jud 9, anyị na-ahụ na aha onye isi mmụọ ozi nke a bụ Maịkael.—2/1, peji 17.

◻ Olee akụkụ anọ ebe ndị anyị pụrụ igosi ndị ọzọ nsọpụrụ?

Anyị kwesịrị igosi ndị ọchịchị nsọpụrụ, ndị were mmadụ n’ọrụ, ndị nọ n’ime ezinụlọ anyị, nakwa ndị nọ n’ọgbakọ.—2/1, peji 20-22.

◻ Nwa mgbe nta tupu Jisọs anwụọ, ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka o setịpụrụ nye ndị nwere nne na nna meworo agadi?

Mgbe Jisọs ka nọ n’ihe mgbu n’elu osisi ịta ahụhụ ahụ, o chebara echiche n’ọdịmma ime mmụọ na nke anụ ahụ nke nne ya site n’inyefe ya n’aka Jọn onyeozi ahụ ọ hụrụ n’anya ka o lekọta ya. (Jọn 19:25-27)—2/15, peji 8.

◻ N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka Jisọs taa ahụhụ?

Ịta ahụhụ Jisọs mere ihe iji dozie ihe iseokwu ahụ metụtara iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị ohu Chineke. Ahụhụ ndị ahụ kwadebekwara ya maka ọrụ ya dị ka Onye isi Nchụaja nke nwere obi ebere maka ihe a kpọrọ mmadụ. (Ndị Hibru 4:15)—2/15, peji 14, 15.

◻ Ihe iseokwu dịgasị aṅaa ndị dị oké mkpa ka nnupụisi ahụ e mere n’Iden welitere?

Mmadụ ò nwere ike inwe ihe ịga nke ọma n’ịchị onwe ya n’adabereghị na Chineke? Ò ziri ezi n’akụkụ nke Chineke ikwu ka mmadụ doo onwe ya n’okpuru ọbụbụeze ya? N’iwere okwu ahụ gakwuo n’ihu, ọ̀ dị mmadụ ọ bụla nke ga-eji achọghị ọdịmma onwe onye họrọ ijere Chineke ozi n’abụghị ná mmanye?—3/1, peji 6.

◻ N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị jiworo kere òkè n’ụzọ na-ezighị ezi n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta ndị ahụ?

Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ndị na-etozubeghị okè enwebeghị nghọta ziri ezi nke nzube Chineke. Ọ pụrụ ịbụ na ha anakwereghị na otite mmanụ ‘abụghị nke onye na-achọ, ọ bụghịkwa nke onye na-agba ọsọ, kama ọ bụ nke Chineke.’ (Ndị Rom 9:16) Ọ bụghị onye ahụ n’onwe ya ga-ekpebi na ọ ga-amasị ya ịbụ onye e webatara n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ịbụkwa onye ga-eso Kraịst ketakọọ ihe. Ọ bụ nhọrọ nke Jehova bụ ihe dị mkpa, mmụọ ya na-agbakwara nhọpụta ahụ ama. (Ndị Rom 8:16; 1 Ndị Kọrint 12:18)—3/15, peji 21.

◻ Gịnị bụ ‘asụsụ dị ọcha’ ahụ e kwuru okwu ya na Zefanaịa 3:9?

Ọ bụ nghọta ziri ezi nke eziokwu banyere Chineke na nzube ya nile.—4/1, peji 21-22.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya