Nsụgharị “New World Translation”—E Dere Ya nke Ọma na n’Ụzọ Eziokwu
“O JUPỤTARA n’okwu ụgha e leziri anya denye!” Laa azụ na narị afọ nke 16, nke a bụ ihe ndị mmegide kwuru banyere nsụgharị Bible nke Martin Luther. Ha kwere na ha pụrụ igosipụta na Bible Luther nwere “1,400 ihe ndị megidere okwukwe na okwu ụgha.” Taa, a na-ele Bible Luther anya dị ka nsụgharị kwesịrị ịrịba ama. Ọbụna na akwụkwọ ahụ bụ Translating the Bible na-akpọ ya “ọrụ nke onye ọkà”!
N’ime narị afọ nke 20 nke a, e bowokwa New World Translation ebubo nke idenye okwu ụgha. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ pụrụ iche n’ụzọ e sikarị ede ọtụtụ amaokwu, na-emesikwa ike iji aha Chineke, bụ́ Jehova, na-eme ihe. N’ihi nke a, ọ bụ nke na-eyighị ibe ya. Ma nke a ò mere ka ọ bụrụ okwu ụgha? Ee e. E ji ezi nlezianya na ileru anya ala mepụta ya, ihe pụkwara iyi ihe a na-amaghị ama na-egosipụta mgbalị e ji obi eziokwu mee iji were ezi nlezianya nọchite anya ọdịiche ndị dịkarịsịrị nta e nwere n’asụsụ ndị mbụ ahụ. Ọkà mmụta okpukpe bụ C. Houtman kọwara ihe mere nsụgharị New World Translation ji ghara iyi ibe ya, sị: “Ọtụtụ ụzọ ndị e sikarị asụgharị okwu ụfọdụ ndị sitere n’ihe odide ndị mbụ ahụ abụrụwo ndị e wepụrụ, o yikarịrị ka ọ bụ iji wee nweta nghọta kachasị mma nke a pụrụ inweta.” Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ banyere nke a.
Ọ Dị Iche—Ma O Hieghị Ụzọ
Otu ihe bụ na e ji okwu Bekee ndị dịgasị iche sụgharịa okwu ndị yiri ibe ha n’asụsụ mbụ ndị ahụ e ji dee Bible n’ebe o kwere omume, si otú a na-eme ka onye mmụta Bible mara banyere ihe pụrụ ịbụ ọdịiche ndị e nwegasịrị n’ihe ihe pụtara. Otú a, a sụgharịrị syn·teʹlei·a ịbụ “ọgwụgwụ” na teʹlos ịbụ “ngwụsị,” ọ bụ ezie na a sụgharịrị okwu abụọ ndị ahụ ịbụ “ngwụsị” n’ọtụtụ nsụgharị ndị ọzọ. (Matiu 24:3, 13) A sụgharịrị okwu ahụ bụ koʹsmos ịbụ “ụwa,” ai·onʹ ịbụ “usoro ihe dị iche iche,” na oi·kou·meʹne ịbụ “elu ala nke mmadụ bi.” Ọzọ, ọtụtụ nsụgharị Bible ji nanị “ụwa” mee ihe iji nọchite anya abụọ ma ọ bụ okwu Grik atọ ndị a nile, ọ bụ ezie na, n’ikwu eziokwu, e nwere ọdịiche ndị dị na ha.—Matiu 13:38, 39; 24:14.
N’otu aka ahụ, New World Translation ji nlezianya na-eme ka a mara ọdịiche dị n’etiti gnoʹsis (“ihe ọmụma”) na e·piʹgno·sis (nke a sụgharịrị ịbụ “ezi ihe ọmụma”)—bụ́ ọdịiche nke ọtụtụ ndị ọzọ leghaara anya. (Ndị Filipaị 1:9; 3:8) O gosipụtakwara ọdịiche dị n’etiti taʹphos (“ala ili,” nke bụ ebe e liri mmadụ), mneʹma (“ili”), mne·meiʹon (“ili ncheta”), na haiʹdes (“hedis,” bụ́ nke na-ezo aka n’ime Bible n’ebe ala ili nke ihe a kpọrọ mmadụ nwụrụ anwụ dị). (Matiu 27:60, 61; Jọn 5:28; Ọrụ 2:29, 31) Ọtụtụ nsụgharị Bible na-egosi ọdịiche dị n’etiti taʹphos na mne·meiʹon na Matiu 23:29 ma ha adịghị esochi ụkpụrụ ahụ anya n’ebe ndị ọzọ.—Lee Matiu 27:60, 61, New International Version.
E ji ezi nlezianya depụta echiche ndị na-egosi okwu bụ ngwaa kpọmkwem otú ha si dị. Dị ka ihe atụ, na Revised Standard Version, 1 Jọn 2:1 na-agụ, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie, anyị nwere onye na-ekwuchitere anyị ọnụ anyị n’ihu Nna ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst onye ezi omume.” N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, otu nsụgharị ahụ sụgharịrị 1 Jọn 3:6: “Ọ dịghị onye ọ bụla na-anọgide n’ime [Jisọs] nke na-eme mmehie.” Ọ bụrụ na ọ dịghị onye na-eso ụzọ Jisọs nke na-eme mmehie, olee otú a ga-esi ghọta 1 Jọn 2:1?
Nsụgharị New World Translation na-eme ka a ghọta ihe a yiri ka ọ bụ mmegiderịta. Na 1 Jọn 2:1, ọ na-asị: “Ana m edegara unu ihe ndị a ka unu wee ghara imehie. Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla emehie, anyị nwere onye enyemaka n’ebe Nna ahụ nọ, bụ́ Jisọs Kraịst, onye ezi omume.” Jọn ji echiche okwu nke na-egosi otu ihe meworo eme mee ihe n’amaokwu nke a, na-egosi ime otu mmehie nke dịpụrụ iche, bụ́ ụdị nke anyị nile na-eme site n’oge ruo n’oge n’ihi na anyị ezughị okè. Otú ọ dị, 1 Jọn 3:6 na-agụ, sị: “Onye ọ bụla nke na-anọgide n’ime ya adịghị anọgide n’ime mmehie; ọ dịghị onye ọ bụla na-anọgide n’ime mmehie nke hụworo ya ma ọ bụ bịaruo ịmara ya.” N’ebe a Jọn ji okwu na-egosi ihe ka na-eme eme mee ihe, na-egosipụta ime mmehie nke na-aga n’ihu, nke bụ àgwà e ji mara mmadụ bụ́ nke ga-eme ka okwukwu onye ọ bụla na-ekwu na ya bụ onye Kraịst ghara inwe isi.
Ndị Mmụta Ndị Ọzọ Kwenyere
Nsụgharị Bible ma ọ bụ akwụkwọ ntụaka ndị ọzọ na-akwado okwu ụfọdụ ndị a na-amaghị ama, bụ́ ndị e chere na ọ bụ Ndịàmà Jehova mepụtara ha. Na Luk 23:43, New World Translation dekọrọ okwu Jisọs gwara onye omekome nke a kpọgburu n’akụkụ ya, sị: “N’ezie ana m agwa gị taa, mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” N’asụsụ Grik mbụ, e nweghị ụkpụrụ ndị na-egosi ebe a ga-ekuru ume dị ka kọma; ma dị ka o si adịkarị, ndị nsụgharị na-etinye ihe na-egosi ebe e kwesịrị ikuru ume iji nye aka n’ịgụ ihe. Otú ọ dị, ọtụtụ mere ka Luk 23:43 yie ka à ga-asị na Jisọs na onye omekome ahụ aghaghị ịbanye Paradaịs kpọmkwem n’ụbọchị ahụ. Nsụgharị bụ The New English Bible na-agụ, sị: “Ana m agwa gị nke a: taa mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” Otú ọ dị, ọ bụghị ha nile na-egosipụta echiche nke a. Professor Wilhelm Michaelis dere n’amaokwu ahụ, sị: “N’ezie, taa ana m emesi gị obi ike: (otu ụbọchị) mụ na gị ga-anọkọ na paradaịs.” Ezi echiche dị n’ihe odide nke a karịa nke ahụ dị na The New English Bible. Onye omekome ahụ na-aga ịnwụ anwụ apụghị isoworịị Jisọs banye na Paradaịs otu ụbọchị ahụ. A kpọliteghị Jisọs n’ọnwụ ruo ụbọchị nke atọ mgbe ọnwụ ya gasịrị. Ka ọ dị mgbe ahụ, ọ ka nọ na Hedis, bụ́ ala ili nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Ọrụ 2:27, 31; 10:39, 40.
Dị ka ọ dị na Matiu 26:26 na New World Translation, Jisọs, mgbe ọ na-eguzobe ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, kwuru banyere achịcha ahụ nke ọ na-eke ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nke a pụtara ahụ m.” Ihe ka ná nsụgharị ndị ọzọ dere amaokwu nke a, sị: “Nke a bụ ahụ m,” e jikwa nke a na-eme ihe iji kwadoo nkwenkwe ahụ bụ na n’oge ememe nke Nri Anyasị Onyenwe anyị, achịcha ahụ na-aghọ ahụ Kraịst n’ụzọ nkịtị. Okwu ahụ a sụgharịrị na New World Translation ịbụ “pụtara” (es·tinʹ, bụ́ ụdị nke ei·miʹ) sitere n’okwu Grik nke pụtara “ịbụ,” ma ọ pụkwara igosipụta “ịpụta.” Otú a, akwụkwọ bụ Greek-English Lexicon of the New Testament nke Thayer dere na-ekwu na ngwaa nke a “na-abụkarị [ihe ya na ihe yiri] igosipụta ihe, ịnọchi anya ihe, isi ihe nke dị n’okwu.” N’ezie, “pụtara” bụ nsụgharị ezi uche dị na ya n’ebe a. Mgbe Jisọs Kraịst guzobere Nri Anyasị Ikpeazụ ahụ, anụ ahụ ya ka rapagidekwara n’ọkpụkpụ ya, ya mere olee otú achịcha ahụ pụrụ isiworị bụrụ anụ ahụ ya n’ụzọ nkịtị?a
Na Jọn 1:1 New World Translation na-agụ, sị: “Okwu ahụ bụkwa chi.” N’ọtụtụ nsụgharị, okwu nke a na-agụ, sị: “Okwu ahụ bụkwa Chineke,” e jikwa ya na-eme ihe iji kwadoo nkwenkwe Atọ n’Ime Otu. Ọ bụghị ihe ijuanya na ndị na-akwado Atọ n’Ime Otu enweghị mmasị n’ụzọ New World Translation si dee ya. Ma a ghaghị ụgha na Jọn 1:1 iji wee gosipụta na Jisọs abụghị Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Tinyere ọtụtụ ndị ọzọ, Ndịàmà Jehova eri ogologo oge ajụwo iji mkpụrụ akwụkwọ ukwu dee “chi” tupu e wepụta New World Translation, bụ́ nke na-agbalịsi ike iji izi ezi depụta asụsụ mbụ ahụ. Mmadụ ise bụ ndị nsụgharị Bible n’asụsụ German n’otu aka ahụ ji okwu ahụ bụ “chi” mee ihe n’amaokwu ahụ.b Ọ dịkarịsịa ala, 13 ndị ọzọ ejiriwo okwu ndị dị ka “ụdịdị nke onye bụ chi” ma ọ bụ “ụdịdị nke yiri chi” mee ihe. Ihe odide ndị a kwekọrọ n’akụkụ ndị ọzọ nke Bible iji gosi na, n’ezie Jisọs, bụ chi mgbe ọ nọ n’eluigwe n’echiche nke bụ na o nwere ụdịdị chi. Ma Jehova na Jisọs abụghị otu onye, ya bụ, otu Chineke.—Jọn 14:28; 20:17.
Aha Chineke Nwere n’Onwe Ya
Na Luk 4:18, dị ka ọ dị na New World Translation, Jisọs zoro aka n’onwe ya dị ka mmezu nke otu amụma dị n’Aịsaịa na-asị: “Mmụọ Jehova dị n’ahụ m.” (Aịsaịa 61:1) Ọtụtụ ndị na-ajụ ojiji e ji aha ahụ bụ Jehova mee ihe n’ebe a. Otú ọ dị, ọ bụ nanị otu n’ime ihe karịrị 200 ebe dị iche iche aha ahụ pụtara na New World Translation nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, bụ́ nke a na-akpọ Agba Ọhụrụ. N’eziokwu, ọ dịghị ihe odide Grik ochie dịgidere ruo oge a nke “Agba Ọhụrụ” nke nwere aha ahụ Chineke nwere n’onwe ya. Ma e tinyere aha ahụ n’ime New World Translation n’ihi ihe ndị ezi uche dị na ha, ọ bụghị nanị n’ihi mkpali efu. Ndị ọzọ agbasowokwa otu ụzọ ahụ. Nanị n’asụsụ German, ọ dịkarịa ala nsụgharị 11 ji “Jehova” (ma ọ bụ “Yahweh,” nke bụ ide okwu Hibru ahụ dị ka asụsụ ha si dị) mee ihe n’ihe odide nke “Agba Ọhụrụ,” ebe ndị nsụgharị anọ tinyere aha ahụ n’ime akara ngebichi mgbe ha desịrị “Onyenwe anyị.”c Ihe karịrị 70 nsụgharị Bible n’asụsụ German ji ya mee ihe na ntụaka ala ala peji ma ọ bụ n’okwu nkọwa dị iche iche.
N’Israel, a kpọrọ aha Chineke n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla ruo ihe karịrị otu puku afọ. Ọ bụ ya bụ aha nke pụtakarịsịrị mgbe mgbe n’Akwụkwọ Nsọ Hibru (“Agba Ochie”), ọ dịghịkwa ihe àmà na-eju afọ na-egosi na ọha mmadụ amaghị ya ma ọ bụ na e chefuwo otú e si akpọ ya na narị afọ mbụ nke Oge Anyị, bụ́ mgbe e nyere ndị Kraịst bụ ndị Juu ike mmụọ nsọ ide akwụkwọ ndị ahụ dị ‘n’Agba Ọhụrụ.’—Rut 2:4.
Wolfgang Feneberg kwuru na magazin ndị Jesuit bụ Entschluss/Offen (April 1985), sị: “O [Jisọs] meghị ka aha nna ya bụ́ YHWH ghara irute anyị aka, kama o nyere anyị ya. Ma ọ bụghị otú ahụ, ọ bụ ihe a na-apụghị ịkọwa akọwa bụ ihe mere arịrịọ mbụ nke dị n’Ekpere Onyenwe anyị kwesịrị iji kwuo, sị: ‘Ka e mee ka aha gị dị nsọ!’” Feneberg gara n’ihu ime ka a mara na “n’ihe odide e nwere tupu oge ndị Kraịst maka ndị Juu na-asụ asụsụ Grik, e jighị kýrios [Onyenwe anyị] kọwagharịa aha Chineke, kama e dere ya n’ụdịdị nke mkpụrụ okwu anọ [YHWH] n’asụsụ Hibru ma ọ bụ mkpụrụ okwu Hibru ndị ochie. Anyị na-achọta mweghachite nke aha ahụ n’ihe odide nke ndị Nna Chọọchị; ma ha enweghị mmasị n’ebe ọ dị. Site n’ịsụgharị aha nke a, kýrios (Onyenwe anyị), ndị Nna Chọọchị nwere mmasị ka ukwuu n’ime ka ịdị ebube nke kýrios dịịrị Jisọs Kraịst.” New World Translation weghachitere aha ahụ n’ihe odide nke Bible n’ebe ọ bụla e nwere ezi ihe ziri ezi a ga-eji mee otú ahụ.—Lee Appendix 1D na Reference Bible.
Ụfọdụ ndị na-akọcha ụdị ahụ bụ “Jehova” nke New World Translation ji dee aha Chineke. N’ihe odide Hibru, aha ahụ pụtara nanị dị ka mkpụrụ okwu anọ, bụ́ YHWH, ọtụtụ ndị na-esikwa ọnwụ na mkpọpụta kwesịrị ekwesị maka ya bụ “Yahweh,” ọ bụghị “Jehova.” N’ihi nke a, ha na-eche na iji “Jehova” mee ihe ezighị ezi. Ma, n’eziokwu, ndị ọkà mmụta ekwekọghị ma ọlị na ụdịdị ahụ bụ “Yahweh” na-anọchite anya ụzọ mbụ e si akpọpụta ya. Eziokwu dị na ya bụ na ebe Chineke chebere mkpụrụ okwu ndị dị n’aha ya, bụ́ YHWH ihe karịrị 6,000 ugboro n’ime Bible, o chebeghị ụzọ e si akpọpụta ya, bụ́ nke Mosis nụrụ n’Ugwu Saịnaị. (Ọpụpụ 20:2) Ya mere, ụzọ e si akpọpụta ya abụghị ihe kachasị mkpa n’oge a.
Na Europe, ụdị ahụ bụ “Jehova” abụrụwo nke a nabatara n’ebe nile eri ọtụtụ narị afọ, e jikwa ya mee ihe n’ọtụtụ Bible, gụnyere nsụgharị nke ndị Juu. Ọ na-apụta ọtụtụ ugbo n’ahụ ụlọ dị iche iche, mkpụrụ ego na n’ihe ndị ọzọ, na n’ihe ndị e biri ebi, nakwa n’ọtụtụ abụ chọọchị. Ya mere, kama ịgba mbọ ịnọchite anya ụzọ e si akpọ ya n’asụsụ Hibru oge gboo, New World Translation n’asụsụ nile ọ dị na ya, na-eji ụdịdị nke aha Chineke bụ́ nke a nabatara n’ebe nile na-eme ihe. Nke a bụkwa kpọmkwem ihe nsụgharị Bible ndị ọzọ mekwara banyere aha ndị ọzọ nile dị na Bible.
N’ihi Gịnị Ka E Ji Na-akatọ Ya n’Ụzọ Dị Oké Njọ?
A kọchara Bible Luther n’ihi na onye wepụtara ya bụ nwoke nke kpughere agazighị agazi nile nke okpukpe ọdịnala nke oge ya. Nsụgharị ya mepere ụzọ nye ndị nkịtị ịhụ eziokwu dị n’ọtụtụ n’ime ihe ndị o kwuru. N’ụzọ yiri nke a, a na-akọcha New World Translation n’ihi na ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya, bụ́ ndị na-ekwupụta hoo haa na ọtụtụ n’ime nkwenkwe ndị Krisendọm esiteghị na Bible. New World Translation—ee, Bible ọ bụla—na-eme ka nke a pụta ìhè.
N’ezie, New World Translation bụ nke e dere nke ọma. Na 1989, Professor Benjamin Kedar nke Israel kwuru, sị: “N’oge m na-eme nnyocha na nkà mmụta nke ntolite asụsụ n’ihe metụtara Bible nke Hibru na nsụgharị dị iche iche, ana m ezokarị aka ná mbipụta Bekee nke ihe a maara dị ka New World Translation. Mgbe m na-eme nke a, ana m achọpụta na a na-emesi echiche m ike nke bụ na akwụkwọ nke a na-egosi mgbalị e ji obi eziokwu mee irute ná nghọta kachasị zie ezi nke ihe odide ahụ ruo otú o kwere mee. N’inye ihe àmà nke ịma asụsụ mbụ ahụ nke ọma, ọ na-asụgharị okwu ndị mbụ ahụ gaa n’asụsụ ọzọ n’ụzọ kwere nghọta n’ahapụkebeghị ụzọ e si hazie asụsụ Hibru ahụ. . . . A na-enye ọ̀tụ̀tụ̀ inwe onwe ụfọdụ n’ịkọwa ma ọ bụ ịsụgharị okwu ọ bụla metụtara asụsụ. Ya mere na a pụrụ inwe nrụrịta ụka banyere ụzọ a ga-esi dozie ihe isi ike ọ bụla e nwere n’ihe banyere asụsụ n’ọnọdụ ọ bụla dịnụ. Ma ná nsụgharị New World Translation, ọ dịbeghị mgbe ọ bụla m hụrụ mgbalị ọjọọ ọ bụla itinye n’ime ihe odide ahụ ihe na-adịbughị na ya.”
Ọtụtụ nde ndị na-agụ Bible gburugburu ụwa ji New World Translation na-eme ihe n’ihi na ọ bụ nsugharị e dere n’asụsụ e ji eme ihe n’oge a nke depụtara okwu ndị dị na Bible n’ụzọ ziri ezi kpọmkwem. E nwere Bible ahụ n’ozuzu ya n’asụsụ 9 ugbu a, nweekwa nanị Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ 2 ndị ọzọ; a na-asụgharịkwa ya ugbu a gaa na 20 asụsụ ndị ọzọ. Nsụgharị ziri ezi chọrọ ọtụtụ afọ nke iji nlezianya rụsie ọrụ ike, ma anyị na-ele anya imesị nwee New World Translation n’asụsụ ndị a nile dịgasị iche iche ka o wee nwee ike inyere ọtụtụ ndị aka inweta nghọta ka mma nke “okwu nke ndụ.” (Ndị Filipaị 2:16) N’ihi na o nyeworo ọtụtụ nde ndị mmadụ aka ime otú ahụ, ọ bụ n’ezie ihe kwesịrị ekwesị ịgwa ndị ọzọ banyere ya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ná Mkpughe 1:20, Onye na-asụgharị okwu n’asụsụ German bụ́ Curt Stage dere otu ngwaa ahụ n’ụzọ dị otú a, sị: “Ihe ndọba oriọna asaa ahụ pụtara [ei·sinʹ] ọgbakọ asaa ahụ.” Fritz Tillmann na Ludwig Thimme n’otu aka ahụ dere ya ịbụ “pụtara” [es·tinʹ] na Matiu 12:7.
b Jürgen Becker, Jeremias Felbinger, Oskar Holtzmann, Friedrich Rittelmeyer, na Siegfried Schulz. Emil Bock na-asị, “onye dị ka chi.” Leekwa nsụgharị Bekee ndị bụ Today’s English Version, The New English Bible, Moffatt, Goodspeed.
c Johann Babor, Karl F. Bahrdt, Petrus Dausch, Wilhelm M. L. De Wette, Georg F. Griesinger, Heinrich A. W. Meyer, Friedrich Muenter, Sebastian Mutschelle, Johann C. F. Schulz, Johann J. Stolz, na Dominikus von Brentano. August Dächsel, Friedrich Hauck, Johann P. Lange, na Ludwig Reinhardt nwere aha ahụ n’ime akara ngebichi.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 28]
A nọ ugbu a na-asụgharị New World Translation gaa na 20 asụsụ ndị ọzọ
Igbe dị na peeji nke 29]
NSỤGHARỊ NA-EME KA A MARA YA
Otu n’ime Ndịàmà Jehova na Germany sooro otu agadi nwanyị nwee mkparịta ụka, bụ́ onye ọ gụụrụ Habakuk 1:12, sị: “Í siteghị na mgbe ochie gara aga, O Jehova? O Chineke m, Onye Nsọ m, ị dịghị anwụ anwụ.” Nwanyị ahụ jụrụ ịnakwere ya n’ihi na Bible ya sịrị, “Ka anyị ghara ịnwụ anwụ.” Onyeàmà ahụ mere ka ọ pụta ìhè na New World Translation na-arapagidesi ike n’ihe odide ndị mbụ. Ebe ọ bụ na agadi nwanyị ahụ na-asụ asụsụ Hibru, o wetara Bible ya nke e dere n’asụsụ Hibru ma jiri ịtụnanya chọpụta na New World Translation ziri ezi kpọmkwem. Sopherim (ndị odeakwụkwọ ndị Juu) gbanwere ihe odide nke a eri ogologo oge gara aga n’ihi na ha chere na akụkụ okwu mbụ ahụ adịghị egosi nsọpụrụ n’ebe Chineke nọ. E wezụga nanị ole na ole, nsụgharị Bible nile e nwere n’asụsụ German emeghị mgbalị ọ bụla iji dezie ndehie ihe nke a nke ndị odeakwụkwọ mere. New World Translation eweghachitewo ihe odide mbụ ahụ.
[Foto dị na peeji nke 26]
E nwere New World Translation nke zuru ezu ugbu a n’asụsụ: Danish, Dutch, Bekee, French, German, Italian, Japanese, Portuguese, na Spanish