Josef Onye Arimatia Ekpebie Ịbụ Onye Na-eso Ụzọ Jizọs
JOSEF ONYE ARIMATIA amaghị na ọ ga-akatali obi gakwuru gọvanọ Rom bụ́ Pọntiọs Paịlet. A ma gọvanọ a ama ka ekwe ekwe. Ma ọ bụrụ na a ga-eli Jizọs otú kwesịrị ekwesị, mmadụ ga-aga gwa Paịlet ka o bunye ya ozu Jizọs. Josef mechara gaa hụ Paịlet. Otú Josef si chee na ọ ga-adị abụghị otú ọ dị. Mgbe Paịlet chọpụtara n’aka onyeisi ndị agha na Jizọs anwụọla, o nyere Josef ikike ka o buru ozu Jizọs. N’agbanyeghị na obi ka na-ajọ Josef njọ, o mere ngwa ngwa laghachi n’ebe ahụ e gburu Jizọs.—Mak 15:42-45.
Ònye bụ Josef onye Arimatia a?
Olee ihe jikọrọ ya na Jizọs?
Gịnị mere anyị kwesịrị iji nwee mmasị n’akụkọ ya?
ONYE ÒTÙ SANHEDRIN
Oziọma Mak kpọrọ Josef ‘onye òtù Nzukọ a na-akwanyere ùgwù.’ Òtù Nzukọ a bụ Sanhedrin, ya bụ, ụlọikpe kacha elu nke ndị Juu. Ụlọikpe a bụ o kwuchaa o bie. (Mak 15:1, 43) Josef bụ otu n’ime ndị ndú ndị obodo ya, ọ bụ ya mere o ji nwee ike ịgakwuru gọvanọ Rom. O doro anya na Josef bụ ọgaranya.—Mat. 27:57.
Obi ọ̀ na-esi gị ike ịgwa ndị mmadụ na Jizọs bụ Eze anyị?
Ndị òtù Sanhedrin achọghị iji anya ahụ Jizọs. Ha gbara izu ka ha gbuo ya. Ma, a kpọrọ Josef “ezi mmadụ na nwoke ezi omume.” (Luk 23:50) Ọ naghị akpa àgwà ka ọtụtụ ndị òtù Sanhedrin ibe ya. Ọ na-akwụwa aka ya ọtọ, ọ naghị ebi ndụ rụrụ arụ. Ọ na-agbalịkwa irubere iwu Chineke isi. Ọ “nọkwa na-echere alaeze Chineke.” O nwere ike ịbụ Alaeze a mere o ji ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs. (Mak 15:43; Mat. 27:57) Ọ ga-abụ na ihe mere o ji nwee mmasị n’ihe Jizọs kụziri bụ n’ihi na o ji eziokwu na ikpe ziri ezi kpọrọ ihe.
ONYE NA-ESO ỤZỌ NZUZO
Baịbụl kwuru na Jọn 19:38 na Josef “bụ onye na-eso ụzọ Jizọs, kama ọ bụ na nzuzo.” Gịnị mere o ji na-atụ ụjọ? Ọ bụ n’ihi na ọ ma na ndị Juu kpọrọ Jizọs asị nakwa na ha dị njikere ịchụpụ onye ọ bụla kweere na Jizọs n’ụlọ nzukọ. (Jọn 7:45-49; 9:22) Ịchụpụ mmadụ n’ụlọ nzukọ pụtara na ndị Juu ga na-akwa onye ahụ emo, na-eme ya ka ọ̀ bụ onye mba ọzọ. N’ihi ya, ụjọ na-atụ Josef ikwu n’ihu ọha na ya kweere na Jizọs. Ikwu na ya bụ onye na-eso ụzọ Jizọs pụtara na ọ gaghị abụzi onye òtù Sanhedrin, a gaghịzi na-akwanyere ya ùgwù.
Ọ bụghị naanị Josef nọ ná nsogbu a. Baịbụl kwuru na Jọn 12:42, sị: “Ọbụna n’etiti ndị na-achị achị, ọtụtụ ndị nwere okwukwe n’ezie n’ebe ọ nọ, ma n’ihi ndị Farisii, ha adịghị ekwupụta ya, ka e wee ghara ịchụpụ ha n’ụlọ nzukọ.” Onye ọzọ ọ dị otú ahụ ọ dị Josef bụ Nikọdimọs. Ọ bụkwa otu n’ime ndị òtù Sanhedrin.—Jọn 3:1-10; 7:50-52.
Ọ bụ eziokwu na Josef bụ onye na-eso ụzọ Jizọs, ma o kwupụtaghị ya n’ihu ọha. Nke a bụ ezigbo nsogbu n’ihi ihe a Jizọs kwuru. O kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-ekwupụta na mụ na ya dị n’otu n’ihu ụmụ mmadụ, m ga-ekwupụtakwa na mụ na ya dị n’otu n’ihu Nna m nke nọ n’eluigwe; ma onye ọ bụla nke na-agọnahụ m n’ihu mmadụ, m ga-agọnahụkwa ya n’ihu Nna m nke nọ n’eluigwe.” (Mat. 10:32, 33) Josef agọnahụghị Jizọs. Ma, obi akaghị ya ikwu na ya bụ onye na-eso ụzọ Jizọs. Obi ọ̀ na-esi gị ike ikwu na ị bụ onye na-eso ụzọ Jizọs?
E nwekwara ihe dị mma Josef mere. Baịbụl kwuru na ọ kwadoghị izu ndị Sanhedrin gbara igbu Jizọs. (Luk 23:51) Ụfọdụ kwuru na o nwere ike ịbụ na ọ nọghị ya mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe. Nke ọ bụla ọ bụ, ọ ga-abụ na ikpe arụrụala ahụ e kpere Jizọs wutere Josef. Ma o nweghị ihe ọ ga-emeli.
Ọ KWỤSỊRỊ ỊTỤ ỤJỌ
Tupu e gbuo Jizọs, ọ ga-abụ na Josef akwụsịla ịtụ ụjọ ma kpebie ịkwado ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ihe Mak 15:43 kwuru gosiri na o mere otú ahụ. Ọ sịrị: “O ji obi ike gaa n’ihu Paịlet ma rịọ ka e bunye ya ozu Jizọs.”
Ọ ga-abụ na Josef nọ ebe ahụ mgbe Jizọs nwụrụ. O doro anya na o bu Paịlet ụzọ mata na Jizọs anwụọla. N’ihi ya, mgbe Josef gwara ya ka o bunye ya ozu Jizọs, Paịlet “chọrọ ịma ma [Jizọs] ọ̀ nwụọla.” (Mak 15:44) Ọ bụrụ na Josef hụrụ Jizọs ka ọ na-ahụsi anya n’elu osisi ịta ahụhụ, ò nwere ike imetụ ya n’obi, ya ejiri obi ike kwupụta na ya bụ otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs? O nwere ike. Ma, ihe doro anya bụ na Josef kwụsịrị ịtụ ụjọ. Ọ gaghịzi abụ onye na-eso ụzọ nzuzo.
JOSEF ELIE JIZỌS
Iwu ndị Juu kwuru na a ga-eli ndị a kwụwara n’elu osisi tupu anyanwụ adaa. (Diut. 21:22, 23) Ma, ndị Rom na-ahapụ ozu ndị omekome n’elu osisi ka ha nọrọ ebe ahụ ree ma ọ bụ ha elie ha n’ebe a na-eli ndị nkịtị. Ma, ihe ahụ abụghị ihe Josef bu n’obi ime ozu Jizọs. Josef nwere ili ọhụrụ o gwuru na nkume. Ili a dị nso n’ebe a kpọgburu Jizọs. O gosiri na ọ dịbeghị anya Josef si n’Arimatiaa kwaga na Jeruselem nakwa na ọ chọrọ iji ebe ahụ mere ebe a ga-eli ndị ezinụlọ ya. (Luk 23:53; Jọn 19:41) Ili Jizọs n’ili ahụ a ga-eli Josef ma ọ nwụọ gosiri na ọ bụ ihe ọma ka o mere. O mezukwara amụma ahụ e buru banyere Mezaya na ili ya ga-adị “n’etiti ndị ọgaranya.”—Aịza. 53:5, 8, 9.
Ò nwere ihe ndị i ji kpọrọ ihe karịa adịm ná mma gị na Jehova?
Akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn kwuru na mgbe e budara ozu Jizọs n’elu osisi, Josef ji ákwà linin ọma fụchie ya ma lie ya n’ili nke ya. (Mat. 27:59-61; Mak 15:46, 47; Luk 23:53, 55; Jọn 19:38-40) Naanị onye e kwuru nyeere Josef aka bụ Nikọdimọs, bụ́ onye wetaara ya ihe na-esi ísì ụtọ e ji akwadebe ozu. Ebe ọ bụ na ha abụọ bụ ndị a ma ama, o nwere ike ịbụ na ọ bụghị ha ji aka ha buru ozu Jizọs. Ọ ga-abụkwa na ọ bụ ndị ohu buuru Jizọs gaa lie. Ọ bụrụgodị na ọ bụ ndị ohu buuru Jizọs gaa lie, ihe a Josef na Nikọdimọs mere abụghị obere ihe. Onye ọ bụla metụrụ ozu aka agaghị adị ọcha ruo otu izu. Ihe ọ bụla ha metụrụ aka agaghịkwa adị ọcha. (Ọnụ Ọgụ. 19:11; Hag. 2:13) Ụdị ihe ahụ ga-eme ka ha na ndị ọzọ ghara imekọ ihe n’izu ahụ a ga-eme Ememme Ngabiga. Ha agaghịkwa eso eme ememme ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 9:6) Olili Jizọs Josef kwadebere ga-eme ka ndị òtù ya na-akparị ya. Ma, ọ dị njikere ili Jizọs otú kwesịrị ekwesị ma kwupụta n’ihu ọha na ya bụ onye na-eso ụzọ Jizọs n’agbanyeghị ihe ọ bụla a ga-eme ya.
NGWỤCHA AKỤKỌ JOSEF
Mgbe e lichara Jizọs, e nweghị ihe ọzọ Baịbụl kwuru banyere Josef onye Arimatia. Ma ajụjụ bụzi: Olee ihe mere ya? Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị amaghị. Ma, ihe ndị anyị kwurula n’isiokwu a banyere Josef gosiri na o nwere ike ịbụ na o kwuru n’ihu ọha na ya bụ onye na-eso ụzọ Jizọs. A sị ka e kwuwe, n’oge ndị ahụ ihe tara akpụ, okwukwe ya nọ na-esikwu ike. Nke a gosiri na o kwuru na ya bụ onye na-eso ụzọ Jizọs.
Akụkọ Josef onye Arimatia kwesịrị ime ka anyị niile jụọ onwe anyị ma ànyị ji ọkwá, ọrụ, ihe onwunwe, ịhụ ezinụlọ n’anya, ma ọ bụ ihe ndị anyị họọrọ ime kpọrọ ihe karịa adịm ná mma anyị na Jehova?
a O nwere ike ịbụ na aha e ji mara Arimatia bụ Rema. Ihe a na-akpọ ya ugbu a bụ Rentis ma ọ bụ Rantis. Ọ bụ obodo Samuel onye amụma. Ọ dị ihe dị ka kilomita iri atọ na ise ma e si n’ebe ugwu Jeruselem gawa ya.—1 Sam. 1:19, 20.