Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 21 p. 56-p. 57 para. 6
  • N’Ụlọ Nzukọ Ndị Juu Dị na Nazaret

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’Ụlọ Nzukọ Ndị Juu Dị na Nazaret
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’Ụlọ Nzukọ Dị n’Obodo Jisọs
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Nazaret—Obodo Nke Onye Amụma Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ọ Rụrụ Ọrụ Ebube, ma A Jụrụ Ya ma na Nazaret
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ịhapụ Ụlọ Jaịrọs na Ijeghachi Nazaret
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 21 p. 56-p. 57 para. 6
Mgbe Jizọs nọ n’ụlọ nzukọ ndị Juu na-agụpụta ihe dị́ n’akwụkwọ mpịakọta Aịzaya onye amụma

ISI NKE 21

N’Ụlọ Nzukọ Ndị Juu Dị na Nazaret

LUK 4:16-31

  • JIZỌS AGỤỌ IHE DỊ N’AKWỤKWỌ MPỊAKỌTA AỊZAYA

  • NDỊ NAZARET ANWAA IGBU JIZỌS

Ndị Nazaret na-atụsi anya Jizọs ike. Ihe dị ka otu afọ gara aga, tupu ya agaa ka Jọn mee ya baptizim, ihe ọ bụ bụ ọkwá nkà. Mana ugbu a, ihe e jizi mara ya bụ na ọ na-arụ ọrụ ebube. Ndị bi na Nazaret na-atụsikwa anya ike ka ọ bịa n’obodo ha rụọ ụfọdụ ọrụ ebube ndị ha nụrụ na ọ na-arụ.

Ha tụsiwekwuru anya ihe a ike mgbe Jizọs gara n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret dị ka o si eme. Ụfọdụ ihe a na-eme ebe ahụ bụ ikpe ekpere na ịgụ ihe e dere n’akwụkwọ Mozis otú ahụ e si eme “n’ụlọ nzukọ dị iche iche kwa ụbọchị izu ike.” (Ọrụ Ndịozi 15:21) A na-agụkwa amaokwu ụfọdụ n’akwụkwọ ndị amụma. Mgbe Jizọs biliri ịgụ ihe, ọ ga-abụ na ọ matara ọtụtụ ndị nọ n’ụlọ nzukọ ahụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ọ ma mgbe mbụ ọ na-abịa n’ụlọ nzukọ a. E nyere ya akwụkwọ mpịakọta Aịzaya onye amụma. Ọ chọtara ebe e kwuru banyere onye e ji mmụọ Jehova tee mmanụ. E nwere ike ịchọta ebe ihe a dị taa n’akwụkwọ Aịzaya 61:1, 2.

Jizọs gụrụ banyere otú Onye a e buru n’amụma ga-esi kpọsaara ndị a dọọrọ n’agha na a tọhapụla ha, meghee anya ndị ìsì, kpọsaakwa banyere afọ Jehova na-egosi ụmụ mmadụ ihu ọma ya. Mgbe ọ gụchara, o nyeghachiri onye na-eje ozi akwụkwọ mpịakọta ahụ ma nọdụ ala. Mmadụ niile nọ na-ele ya shii. Ọ maliteziri ikwu okwu. Ọ ga-abụkwa na o kwutetụrụ okwu ahụ aka. Ihe sokwa n’ihe ndị o kwuru bụ okwu a dị mkpa: “Taa ka ihe a e dere n’Akwụkwọ Nsọ unu nụrụ ugbu a mezuru.”—Luk 4:21.

“Okwu ọma ndị si n’ọnụ ya na-apụta” jukwara ndị mmadụ anya. Ha jụwara ibe ha: “Onye a ọ́ bụghị nwa Josef?” Ma, mgbe Jizọs chọpụtara na ha chọrọ ka ọ rụọrọ ha ụdị ọrụ ebube ndị ahụ ha nụrụ ọ rụrụ ebe ndị ọzọ, ọ gwara ha, sị: “Obi abụọ adịghị ya na unu ga-asị na ihe atụ a metụtara m, ‘Ọgwọ ọrịa, gwọọ onwe gị; ihe ndị ahụ anyị nụrụ i mere na Kapaniọm, mee ha n’ebe a, n’obodo a mụrụ gị.’” (Luk 4:22, 23) Ọ ga-abụ na ndị obodo Jizọs chere na o kwesịrị ibido n’ụlọ mara mma pụwa ámá, ya bụ, na o kwesịrị ibu ụzọ meere ndị obodo ya tupu ndị ọzọ. N’ihi ya, ha chere na Jizọs ledara ha anya.

Jizọs ma ihe ha nọ na-eche. O chetaara ha ihe ụfọdụ mere n’Izrel n’oge gara aga. Ọ gwara ha na e nwere ọtụtụ ụmụ nwaanyị dị ha nwụrụ n’Izrel n’oge Ịlaịja, mana a gwaghị Ịlaịja ka ọ gakwuru nke ọ bụla n’ime ha. Kama, e zigara ya na nke otu nwaanyị di ya nwụrụ, onye na-abụghị onye Izrel. Nwaanyị ahụ bụ onye Zarefat, obodo dị nso na Saịdọn. Ọ bụ n’ebe ahụ ka Ịlaịja rụrụ ọrụ ebube zọrọ ndị mmadụ ndụ. (1 Ndị Eze 17:8-16) N’oge Ịlaịsha kwa, e nwere ọtụtụ ndị ekpenta n’Izrel, ma, ọ bụ naanị Neaman onye Siria ka onye amụma ahụ mere ka ọ dị ọcha.—2 Ndị Eze 5:1, 8-14.

Mgbe ndị nọ n’ụlọ nzukọ ndị Juu dọọrọ Jizọs na-aga n’ugwu ka ha si ebe ahụ tụda ya

Olee ihe ndị obodo Jizọs mere n’ihi otú a o si jiri ha tụnyere ndị Izrel oge ahụ, si otú ahụ gosi na ha enweghị okwukwe, nakwa na ha na-achọ ihe ga-adịrị naanị ha mma? Iwe bịara ndị nọ n’ụlọ nzukọ ahụ, ha biliri ma dọkpụrụ Jizọs pụọ n’azụ obodo. Ha kpọ ya gaa n’ọnụ ọnụ ugwu ebe e wukwasịrị obodo Nazaret ma chọọ isi ebe ahụ tụda ya. Ma, Jizọs gbụpụrụ gbalaga. Jizọs gawaziri Kapaniọm dị n’ebe ugwu Osimiri Galili.

  • Gịnị mere ndị nọ n’obodo Jizọs bụ́ Nazaret ji na-atụsi anya ya ike?

  • Olee otú ihe Jizọs kwuru dị ndị mmadụ, mana, gịnị mere iwe ji bịa ha?

  • Gịnị ka ndị Nazaret nwara ime Jizọs?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya