Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 23 p. 60-p. 61 para. 5
  • Jizọs Arụọ Ọtụtụ Ọrụ Ebube na Kapaniọm

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Arụọ Ọtụtụ Ọrụ Ebube na Kapaniọm
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọrụ Ebube Ndị Ọzọ A Rụrụ na Kapanaum
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ụlọ Nzukọ ndị Juu—Ebe Jizọs na Ndị Na-eso Ụzọ Ya Kwusara Ozi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Jizọs Ezisakwuo Ozi Ọma na Galili
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 23 p. 60-p. 61 para. 5
Mgbe ndị ọrịa gbakọtara n’ihu ụlọ Pita, Jizọs agwọọ ha

ISI NKE 23

Jizọs Arụọ Ọtụtụ Ọrụ Ebube na Kapaniọm

MATIU 8:14-17 MAK 1:21-34 LUK 4:31-41

  • JIZỌS ACHỤPỤ OTU MMỤỌ ỌJỌỌ

  • A GWỌỌ NNE NWUNYE PITA

Jizọs akpọọla mmadụ anọ ka ha bụrụ ndị ọkụ na-akụta mmadụ. Ha bụ Pita, Andru, Jems, na Jọn. N’otu Ụbọchị Izu Ike, ha niile gara n’ụlọ nzukọ dị na Kapaniọm. Mgbe ha ruru ebe ahụ, Jizọs kụziri ihe n’ụlọ nzukọ ahụ. N’oge a kwa, otú Jizọs si kụzie ihe juru ndị mmadụ anya. Ọ kụziri ihe ka onye nwere ikike, ọ bụghị dị ka ndị odeakwụkwọ ha.

N’Ụbọchị Izu Ike a, otu nwoke mmụọ ọjọọ ji bịara n’ụlọ nzukọ ahụ. Ọ nọ na-eti mkpu n’oké olu, sị: “Gịnị jikọrọ anyị na gị, Jizọs onye Nazaret? Ị̀ bịara ibibi anyị? Amaara m kpọmkwem onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke.” Jizọs baara mmụọ ọjọọ ahụ na-achị nwoke ahụ mba, sị: “Mechie ọnụ, sikwa n’ime ya pụta!”—Mak 1:24, 25.

Mgbe ọ gwara ya otú ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ tụrụ nwoke ahụ n’ala, mee ka ihe ọdịdọ dọwa ya, ya etiekwa mkpu n’oké olu. Ma, mmụọ ọjọọ ahụ si n’ime nwoke ahụ pụọ “n’emerụghị ya ahụ́.” (Luk 4:35) Ihe a juru ndị nọ n’ụlọ nzukọ ahụ anya. Ha jụwara, sị: “Gịnị bụ ihe nke a? . . . O ji ikike na-enye ọbụna ndị mmụọ na-adịghị ọcha iwu, ha na-erubekwara ya isi.” (Mak 1:27) Akụkọ ihe a dị́ ịtụnanya merenụ gbasara ebe niile na Galili.

Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya si n’ụlọ nzukọ ahụ pụọ, ha gawara n’ụlọ Saịmọn Pita. Ha hụrụ na oké ahụ́ ọkụ ji nne nwunye Pita aka ọjọọ. Ha rịọrọ Jizọs ka o nyere ya aka. N’ihi ya, Jizọs garuru ebe o dina, jide ya n’aka, ma selite ya. Nwaanyị ahụ gbakere ozugbo ahụ. Ọ malitekwara ijere Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ha na ya so ozi. O nwekwara ike ịbụ na o bidoro isiri ha ihe ha ga-eri.

N’ihe dị ka ná mgbede, ndị mmadụ si ebe dị iche iche kpọrọ ndị na-arịa ọrịa bịa n’ụlọ Pita. N’oge na-adịghị anya, o yiri ka à ga-asị na ọ bụ obodo ahụ dum gbakọtara n’ọnụ ụzọ ụlọ Pita. Maka gịnị? Ha chọrọ ka a gwọọ ha ọrịa. Nke bụ́ eziokwu bụ na “ndị niile nwere ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche kpọọrọ ha bịakwute ya. Ọ na-ebikwasị onye nke ọ bụla n’ime ha aka n’isi wee gwọọ ya.” (Luk 4:40) Ihe ọ sọkwara ya bụrụ ya na-arịa ndị mmadụ, Jizọs gwọrọ ha, dị nnọọ ka e buru ya n’amụma. (Aịzaya 53:4) O medịrị ka ndị mmụọ ọjọọ ji nwere onwe ha. Ndị mmụọ ọjọọ ahụ pụtawa n’ahụ́ mmadụ, ha na-adị eti mkpu, sị: “Ị bụ Ọkpara Chineke.” (Luk 4:41) Ma Jizọs na-adị abara ha mba, ọ naghịkwa ekwe ka ha na-ekwu okwu. Ha ma na Jizọs bụ Kraịst ahụ. Jizọs achọghịkwa ka ndị mmụọ ọjọọ ahụ mewe ka à ga-asị na ha na-ejere ezi Chineke ahụ ozi.

MMỤỌ ỌJỌỌ IJIDE MMADỤ

Ọ bụrụ na ndị mmụọ ọjọọ ejide mmadụ, ha nwere ike ịkpatara onye ahụ oké nhụsianya. (Matiu 17:14-18) Ma ọ bụrụ na a chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ahụ na-abịa nwetaghachi onwe ya, isi adịkwa ya mma. Jizọs gosiri ugboro ugboro na ya nwere ikike iji mmụọ nsọ Chineke chụpụ ndị mmụọ ọjọọ.—Luk 8:39; 11:20.

  • Gịnị mere n’otu ụlọ nzukọ dị na Kapaniọm n’Ụbọchị Izu Ike?

  • Mgbe Jizọs si n’ụlọ nzukọ ahụ pụọ, olee ebe ọ gara, gịnịkwa ka o mere ebe ahụ?

  • Gịnị ka ndị Kapaniọm mere mgbe ha hụrụ ihe ahụ Jizọs mere?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya